Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibi Ndụ Dị Mfe Iji Jeere Jehova Ozi

Ibi Ndụ Dị Mfe Iji Jeere Jehova Ozi

 Akụkọ Ndụ

Ibi Ndụ Dị Mfe Iji Jeere Jehova Ozi

DỊ KA CLARA GERBER MOYER SI KỌỌ

Adị m afọ 92, apụghịkwa m ịgacha ije, ma aka m nwere uche dị nkọ, nke na-echeta ihe. Lee ekele m na-enwe maka inwewo ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi kemgbe m bụ nwata! Ibi ndụ dị mfe, nke na-adịghị mgbagwoju anya atụnyela ụtụ dị ukwuu n’ihe ùgwù ahụ.

A MỤRỤ m n’August 18, 1907, n’Alliance, Ohio, U.S.A., abụ m nke mbụ n’ime ụmụ ise. Mgbe m dị afọ asatọ, otu onye ozi oge nile nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, gbaara ịnyịnya ígwè bịa n’ugbo mmiri ara ehi anyị. O zutere mama m, bụ́ Laura Gerber, n’ọnụ ụzọ ma jụọ ya ma ọ̀ maara ihe mere e ji kwere ka ajọ omume dịrị. Mama m anọwo na-eche banyere nke ahụ mgbe nile.

Mgbe mama m jụsịrị papa m, bụ́ onye nọ n’ọba, ọ tụrụ ọda mpịakọta isii nke Studies in the Scriptures. Ọ gụchapụrụ ha, eziokwu Bible ndị ọ na-amụta kwalikwara ya n’ụzọ miri emi. Ọ mụrụ Mpịakọta nke 6, bụ́ The New Creation, ma ghọta nke ọma ịdị mkpa nke baptism ndị Kraịst site n’imikpu ná mmiri. Ebe ọ bụ na ọ maghị otú ọ ga-esi achọta Ndị Mmụta Bible, ọ gwara papa m ka o mee ya baptism n’obere ọwa mmiri dị n’ugbo ahụ, n’agbanyeghị na ọ bụ n’ọnwa oyi nke March 1916.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mama m hụrụ mkpọsa e mere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ nke na-ama ọkwa okwu a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Daughters of Veterans nke dị n’Alliance. Isiokwu nke okwu ahụ bụ “Atụmatụ nke Chineke Banyere Ọgbọ Nile.” O mere ihe ozugbo, ebe ọ bụ na isiokwu nke Mpịakọta 1 nke Studies in the Scriptures na isiokwu nke okwu ahụ bụ otu ihe. A kwadebere ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ, ezinụlọ anyị dum jikwara ya gaa nzukọ mbụ anyị. Site  mgbe ahụ gaa n’ihu, anyị gara nzukọ n’uhuruchi Sunday na Wednesday n’ebe obibi ụmụnna. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, onye nnọchiteanya nke ọgbakọ ndị Kraịst, mere mama m baptism ọzọ. Papa m, bụ́ onye na-arụkarị ọrụ n’ugbo, mesịrị nwee mmasị n’ọmụmụ Bible, e mekwara ya baptism mgbe afọ ole na ole gasịrị.

Izute Ndị Na-edu Ndú

Na June 10, 1917, J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, bịara n’Alliance iji kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Mba Dị Iche Iche Ji Alụ Agha?” Adị m afọ itoolu, mụ na ụmụnne m ndị nwoke abụọ, bụ́ Willie na Charles sooro ndị mụrụ anyị gaa. Anyị dị ihe karịrị otu narị mmadụ bịaranụ. Mgbe Nwanna Rutherford kwusịrị okwu, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ bịaranụ gara see foto n’èzí Ụlọ Ihe Nkiri Columbia, bụ́ ebe ọ nọ kwuo okwu ya. N’izu sochirinụ, A. H. Macmillan nọrọ n’otu ebe ahụ kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Alaeze Chineke nke Na-abịanụ.” Ọ bụụrụ anyị nnọọ ihe ùgwù, ụmụnna ndị a ileta obodo nta anyị.

Mgbakọ Ndị Mbụ Bụ́ Ndị Kwesịrị Ncheta

Mgbakọ mbụ m gara bụ na 1918 n’Atwater, Ohio, nke dị kilomita ole na ole site n’Alliance. Mama m jụrụ onye nnọchiteanya Society nọ n’ebe ahụ ma etoruwo m ka e mee m baptism. Echere m na ararawo m onwe m n’ụzọ kwesịrị ekwesị nye Chineke ime uche ya, ya mere e kwere ka e mee m baptism n’ụbọchị ahụ n’otu ọwa mmiri dị nso n’otu nnukwu ugbo mkpụrụ osisi apple. Agbanwere m uwe m n’otu ụlọ ntú nke ụmụnna guzobere maka ya, eyikwa m uwe mwụda dị arọ mee baptism.

Na September 1919, mụ na ndị mụrụ m banyere n’ụgbọ okporo ígwè na-aga Sandusky, Ohio, n’Ọdọ Mmiri Erie. N’ebe ahụ, anyị banyere n’ụgbọ mmiri, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị rutere Cedar Point bụ́ ebe anyị ga-anọ enwe mgbakọ ahụ kwesịrị ncheta. Mgbe anyị si n’ụgbọ mmiri ahụ pụta, e nwere ebe a na-ere obere nri n’ebe ahụ ụgbọ mmiri na-akwụsị. Enwetara m bred e tinyere anụ n’ime, bụ́ nke bụụrụ m nnọọ nri ndị oké ozu n’oge ahụ. Ọ dị nnọọ ụtọ! Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara mgbakọ ụbọchị asatọ anyị dị 7,000. Ígwè okwu adịghị, n’ihi ya aghaghị m ige ntị nke ọma.

Ná mgbakọ a, e wepụtara magazin ahụ ya na Ụlọ Nche na-agakọ, nke a kpọrọ The Golden Age (nke bụ́ Teta! ugbu a). Iji gaa mgbakọ ahụ, agaghị m akwụkwọ n’izu mbụ nke ụlọ akwụkwọ, ma o ruru ya nnọọ. Cedar Point bụ ebe a na-eme nleta n’oge ezumike, ha nwekwara ndị osi ite n’ụlọ nri dị n’ebe ahụ bụ́ ndị na-esiri ndị nnọchiteanya nri. Ma n’ihi ihe ụfọdụ, ndị osi ite na ndị na-ebute nri gbara abụbọ ọrụ, ya mere ụmụnna bụ́ ndị Kraịst, ndị nwere ihe ọmụma banyere isi nri batara ma siere ndị nnọchiteanya ahụ nri. Ruo ọtụtụ iri afọ mgbe e mesịrị, ndị Jehova siiri onwe ha nri ná mgbakọ dị iche iche.

Anyị nwekwara ihe ùgwù nke ịlọghachite Cedar Point na September nke 1922 maka mgbakọ were ụbọchị itoolu nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya karịrị 18,000. Ọ bụ ebe ahụ ka Nwanna Rutherford gbara anyị ume ‘ịkpọsa, ịkpọsa, ịkpọsa, Eze ahụ na alaeze ya.’ Otú ọ dị, amalitela m ozi ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ site n’ikesa traktị na The Golden Age.

Inwe Ekele Maka Ozi Ahụ

Ná mmalite 1918, ekeere m òkè n’ikesa traktị bụ́ The Fall of Babylon, n’ugbo ndị anyị na ha gbara agbata obi. N’ihi oyi, anyị ga-etinye nkume soapstone n’usekwu n’ebe obibi anyị ma buru ya mgbe anyị na-abanye n’ụgbọala ahụ ịnyịnya na-adọkpụ iji mee ka ụkwụ anyị nọgide na-ekpo ọkụ. Anyị na-eyi kootu dị arọ na okpu, ebe ọ bụ na ụgbọala ahụ ịnyịnya na-adọkpụ nwere nanị ihe mkpuchi n’elu na ákwà mgbochi n’akụkụ ya ma o nweghị ihe na-enye okpomọkụ. Ma anyị nwere obi ụtọ n’oge ndị ahụ.

Na 1920, a kwadebere mbipụta pụrụ iche nke The Finished Mystery, bụ́ nke a kpọrọ ZG, n’ụdị magazin. * Mụ na ndị mụrụ m ji akwụkwọ a gagharịa n’Alliance. N’oge ahụ, onye ọ bụla na-aga n’ọnụ ụzọ nanị ya, ya mere eji m ụjọ rịgoro n’otu varanda bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ nọ ala. Mgbe  m kwusịrị okwu, otu nwanyị kwuru, sị: “O kwuru obere okwu dị mma,” ma nara akwụkwọ ahụ. Etinyere m ZG 13 n’ụbọchị ahụ, bụ́ nke mbụ m kwuru okwu totụrụ ogologo site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

Mgbe m nọ na klas nke itoolu, oyi bara mama m ahụ, o dinakwara n’àkwà ruo ihe karịrị otu ọnwa. Nwanne m nwanyị nke anyị tọchara, bụ́ Hazel, bụ nwa ọhụrụ, ya mere akwụsịrị m ịga akwụkwọ iji nye aka n’ọrụ ugbo na iji lekọta ụmụaka. Ma, ezinụlọ anyị ka ji eziokwu Bible kpọrọ ihe, anyị gachikwara nzukọ nile nke ọgbakọ anya.

Na 1928 n’Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, e nyere ndị nile bịaranụ otu traktị nke isiokwu ya bụ “Where Are the Nine?” Ọ tụlere Luk 17:11-19, bụ́ ebe Bible na-ekwu na ọ bụ nanị otu n’ime ndị ekpenta iri e mere ka ha dị ọcha ji obi umeala kelee Jisọs maka ọgwụgwọ ọrụ ebube ahụ. Nke ahụ metụrụ m n’obi. Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Ruo ókè ha aṅaa ka m na-enwe ekele?’

Ebe ọ bụ na ihe na-agazi agazi n’ebe obibi anyị ugbu a, ahụ sikwara m ike, enweghịkwa ibu ọrụ ọ bụla na-egbochi m, ekpebiri m ịhapụ ụlọ anyị iji banye n’ozi ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ozi oge nile. Ndị mụrụ m gbara m ume ime otú ahụ. N’ihi ya, e kenyere mụ na onye òtù m, bụ́ Agnes Aleta, ọrụ, n’August 28, 1928, anyị banyekwara n’ụgbọ okporo ígwè n’elekere 9:00 nke abalị. Onye nke ọ bụla n’ime anyị bu otu akpa njem na otu akpa nta anyị ji tinye akwụkwọ anyị ji amụ Bible. N’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, ụmụnne m ndị nwanyị na ndị mụrụ m nọ na-ebe ákwá, anyị onwe anyị nọkwa na-ebe. Echere m na e nwere ike m gaghị ahụkwa ha ọzọ, ebe ọ bụ na anyị kweere na Amagedọn dị nso. N’ụtụtụ echi ya, anyị rutere ebe e kenyere anyị ọrụ na Brooksville, Kentucky.

Anyị nwetara otu obere ọnụ ụlọ n’ụlọ ndị ọbịa, zụtakwa ọtụtụ mkpọ spaghetti ma na-emere onwe anyị bred e tinyere anụ n’ime. Kwa ụbọchị anyị na-aga ebe dị iche, onye nke ọ bụla ana-arụ nanị ya ma na-enyefe ndị nwe ụlọ akwụkwọ ukwu ise n’ụtụ $1.98. Nke nta nke nta, anyị gazuru obodo ahụ, na-ezute ọtụtụ ndị nwere nnọọ mmasị na Bible.

N’ihe dị ka ọnwa atọ, anyị akpọtụworo mmadụ nile nọ n’ime nakwa gburugburu Brooksville tinyere Augusta. Ya mere, anyị gara n’ihu ịrụ ọrụ n’obodo Maysville, Paris, na Richmond. N’ime afọ atọ sochirinụ, anyị gazuru ọtụtụ ógbè dị na Kentucky bụ́ ebe a na-enweghị ọgbakọ ọ bụla. Anyị nwetara enyemaka mgbe mgbe site n’aka ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ anyị bụ́ ndị na-eji ụgbọala esi Ohio abịa isonyere anyị n’ozi ruo otu izu ma ọ bụ karị n’otu mgbe.

Mgbakọ Ndị Ọzọ Kwesịrị Ncheta

Mgbakọ ahụ e mere na Columbus, Ohio, na July 24-30, 1931, kwesịrị ncheta n’ezie. Ọ bụ ebe ahụ ka a mara ọkwa na a ga-eji aha ahụ dabeere na Bible bụ́ Ndịàmà Jehova, mara anyị. (Aịsaịa 43:12) Tupu mgbe ahụ, mgbe ndị mmadụ jụrụ anyị okpukpe anyị na-ekpe, anyị na-asị, “Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile.” Ma nke ahụ emeghị n’ezie ka a mara anyị nke ọma, ebe ọ bụ na e nwere ndị mmụta Bible bụ́ ndị nọ n’òtù okpukpe ndị ọzọ dị iche iche.

Onye òtù m, bụ́ Agnes, alụọla di, anọkwa m nanị; ya mere enwere m obi ụtọ mgbe a mara ọkwa na ndị na-achọ onye ha na ha ga na-asụkọ ụzọ kwesịrị ịbịa n’otu ebe. N’ebe ahụ ka m zutere Bertha na Elsie Garty nakwa Bessie Ensminger. Ha nwere ụgbọala abụọ, ha nọkwa na-achọ nwanna nwanyị bụ́ ọsụ ụzọ nke ga-emezu ha anọ isoro ha rụkọọ ọrụ. Anyị yịkọrọ si ná mgbakọ ahụ laa, n’agbanyeghị na anyị ezutetụbeghị mbụ.

N’oge okpomọkụ, anyị rụrụ ọrụ na steeti Pennsylvania dum. E mesịa, ka oge oyi na-akpụdewe nso, anyị rịọrọ ka e kenye anyị ọrụ na steeti ndị dị n’ebe ndịda bụ́ North Carolina, Virginia, na Maryland bụ́ ndị nwere okpomọkụ karị. N’oge opupu ihe ubi, anyị lọghachiri n’ebe ugwu. Nke ahụ bụ omenala ndị ọsụ ụzọ n’oge ahụ. Na 1934, John Booth na Rudolph Abbuhl, bụ́ ndị gbasoro omenala a, kpọọrọ Ralph Moyer na nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ bụ́ Willard gaa Hazard, Kentucky.

Ezutewo m Ralph ọtụtụ ugbo, anyị matakwara onwe anyị nke ọma ná mgbakọ ukwu ahụ e mere na Washington, D.C., na May 30–June 3, 1935. Mụ na Ralph nọdụrụ ala na varanda mgbe a na-ekwu okwu banyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ. (Mkpughe 7:9-14) Tupu mgbe ahụ, anyị kweere  na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị nketa eluigwe, ndị na-ekwesịrughị ntụkwasị obi ka 144,000 ahụ. (Mkpughe 14:1-3) N’ihi ya, achọghị m ịbụ otu n’ime ha!

Mgbe Nwanna Rutherford kọwara na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-alanarị Amagedọn ma biri n’ụwa, o juru ọtụtụ ndị anya. Ọ gwaziri ndị nile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha bilie ọtọ. Ebilighị m ọtọ, ma Ralph biliri. Mgbe e mesịrị, ihe bịara dokwuo m anya, ya mere 1935 bụ afọ ikpeazụ m keere òkè n’achịcha na mmanya nnọchiteanya ahụ n’Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Otú ọ dị, mama m nọgidere na-ekere òkè na ya ruo mgbe ọ nwụrụ na November 1957.

Onye Òtù Na-adịgide Adịgide

Mụ na Ralph nọgidere na-ederịta akwụkwọ ozi. Anọ m na-eje ozi na Lake Placid, New York, ya onwe ya nọkwa na Pennsylvania. Na 1936 ọ rụrụ otu obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke ọ pụrụ iji ụgbọala ya na-adọkpụ. O si na Pottstown, Pennsylvania, dọkpụrụ ya gaa Newark, New Jersey, maka mgbakọ ahụ e mere ebe ahụ n’October 16-18. Mgbe usoro ihe omume gasịrị n’otu uhuruchi, ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ gara ịhụ ụlọ ọhụrụ Ralph nke ụgbọala na-adọkpụ. Mụ na ya guzo n’ime ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ, n’akụkụ obere efere e ji akwọ aka nke a rụnyere n’ime ya mgbe ọ jụrụ m, sị, “Ụlọ a ụgbọala na-adọkpụ ọ̀ masịrị gị?”

Mgbe m kwere n’isi, ọ jụrụ, sị, “Ị̀ chọrọ ibi n’ime ya?”

“Ee,” ka m zaghachiri, o wee sutụ m ọnụ nke m na-agaghị echefu ma ọlị. Ụbọchị ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, anyị gbatara laịsensị alụmdi na nwunye. N’October 19, bụ́ ụbọchị sochiri mgbakọ ahụ, anyị gara Brooklyn ma gagharịa n’ụlọ obibi akwụkwọ Watch Tower Society. E mesịa, anyị rịọrọ ka e nye anyị ókèala anyị ga-arụ ọrụ na ya. Grant Suiter, na-ahụ maka ókèala, ọ jụkwara anyị onye ga na-arụ ya. Ralph sịrị, “Anyị ga-arụ ya ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịlụ.”

“Ọ bụrụ na unu alọghachi n’elekere 5:00 nke uhuruchi, anyị pụrụ ime ndokwa maka ya,” ka Nwanna Suiter zaghachiri. Ya mere, n’uhuruchi ahụ, anyị lụrụ n’ebe obibi nke otu Onyeàmà nke dị na Brooklyn Heights. Anyị na ụfọdụ ndị enyi anyị rikọrọ nri ọnụ n’otu ụlọ nri dị n’ógbè ahụ ma banyezie n’ụgbọ njem ọha na eze iji rute n’ụlọ Ralph nke ụgbọala na-adọkpụ bụ́ nke dị na Newark, New Jersey.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, anyị malitere njem ịga Heathsville, Virginia, bụ́ ebe mbụ e kenyekọrọ anyị ọrụ ịsụ ụzọ. Anyị rụrụ ọrụ n’Ógbè Northumberland ma gazie n’ógbè Fulton na Franklin bụ́ ndị dị na Pennsylvania. Na 1939, a kpọrọ Ralph ịrụ ọrụ zonu, bụ́ ọrụ nke anyị ga na-eleta ọtụtụ ọgbakọ n’usoro n’usoro. Anyị letara ọgbakọ ndị dị na steeti Tennessee. N’afọ sochirinụ, a mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Allen, na 1941 kwa, anyị kwụsịrị ọrụ zonu. E kenyeziri anyị ọrụ na Marion, Virginia, dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’oge ahụ, nke ahụ pụtara itinye awa 200 n’ozi kwa ọnwa.

 Ime Mgbanwe

Na 1943, ahụrụ m na ọ dị mkpa ka m kwụsị ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ibi n’obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, ilekọta obere nwa, isi nri, ime ka anyị nile na-eyi ákwà dị ọcha, na itinye ihe dị ka awa 60 n’ozi kwa ọnwa bụ nanị ihe m pụrụ ime. Ma Ralph nọgidere dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Anyị laghachiri n’Alliance, Ohio, na 1945, ree ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ bụ́ nke ghọworo ebe obibi anyị ruo afọ itoolu, ma soro ndị mụrụ m biri n’ụlọ ugbo ha. Ọ bụ ebe ahụ, na varanda nke dị n’ihu ụlọ, ka m nọ mụọ nwa anyị nwanyị, bụ́ Rebekah. Ralph nwetara ọrụ nwa oge n’ebe mepetụrụ emepe ma nọgide dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Ana m arụ ọrụ n’ugbo ma na-eme ihe nile m pụrụ ime iji nyere ya aka ịnọgide na-asụ ụzọ. Ọ bụ ezie na ezinụlọ m nyere anyị ala na ụlọ n’efu, Ralph jụrụ. Ọ chọrọ ịnọgide n’enweghị oké ibu ọrụ ka anyị wee nwee ike ịchụso ọdịmma Alaeze n’ụzọ zuru ezu karị.

Na 1950, anyị kwagara Pottstown, Pennsylvania, ma nweta otu ụlọ nke anyị ga na-akwụ $25 n’ọnwa maka ya. N’ime afọ 30 sochirinụ, ọnụ ego ahụ rịrị elu ruo nanị $75. Anyị nwere mmetụta na Jehova na-enyere anyị aka ime ka ndụ anyị dị mfe. (Matiu 6:31-33) Ralph na-arụ ọrụ ụbọchị atọ n’izu dị ka onye na-akpụ isi. Kwa izu, anyị na-eso ụmụ anyị abụọ na-amụ Bible, na-aga nzụkọ ọgbakọ, na-ekwusakwa ozi ọma nke Alaeze dị ka ezinụlọ. Ralph jere ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ dị n’ógbè ahụ. Site n’ime ka ndụ anyị dị mfe, anyị mere ihe dị ukwuu n’ozi Jehova.

Ọnwụ nke Onye Òtù M M Hụrụ n’Anya

Na May 17, 1981, anyị nọ ọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ege otu okwu ihu ọha. Ahụ adịchaghị Ralph, ọ gaa n’ebe azụ nke ụlọ nzukọ ahụ, ma gwa onye atendantị ka o wetara m ihe odide na-ekwu na ya alawala n’ebe obibi anyị. Nke a bụ ihe Ralph na-adịtụghị eme nke na agwara m otu onye ka ọ kwọga m n’ebe obibi anyị ozugbo. Ajọ ọrịa strok gburu Ralph n’ime otu awa ahụ. Ka e mechara ọmụmụ ihe Ụlọ Nche n’ụtụtụ ahụ, a maara ọgbakọ ọkwa na ọ nwụọla.

Ralph etinyelarị ihe karịrị awa 50 n’ozi n’ọnwa ahụ. Ọrụ oge nile ya dị ka ọsụ ụzọ gbatịrị ruo ihe karịrị afọ 46. O duziiri ihe karịrị otu narị mmadụ ọmụmụ Bible bụ́ ndị mesịrị ghọọ Ndịàmà Jehova e mere baptism. Ngọzi ime mmụọ ndị anyị nwetara ruru àjà ọ bụla anyị chụrụ n’ime afọ ndị gafeworonụ.

Inwe Ekele Maka Ihe Ùgwù M

Ruo afọ 18 gara aga, ebiri m nanị m, na-aga nzukọ, na-eme nkwusa nye ndị ọzọ ruo ókè m nwere ike, ma na-amụ Okwu Chineke. Ugbu a ebi m n’ụlọ ndị agadi lara ezumike nká. Enwere m nanị arịa ụlọ ole na ole ma họrọ na m gaghị enwe telivishọn. Ma ndụ m juru m afọ ma bụrụ nke ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ. Ndị mụrụ m na ụmụnne m ndị nwoke abụọ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ha, ụmụnne m ndị nwanyị abụọ jikwa ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ụzọ nke eziokwu.

Ana m aṅụrị ọṅụ na nwa m nwoke, bụ́ Allen, na-eje ozi dị ka onye Kraịst bụ́ okenye. Ruo ọtụtụ afọ, o tinyewo ígwè okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’Ụlọ Mgbakọ, ọ rụwokwa ọrụ n’itinye ígwè okwu maka mgbakọ ndị a na-enwe n’oge okpomọkụ. Nwunye ya bụ ohu Chineke nke na-eguzosi ike n’ihe, ụmụ ha ndị nwoke abụọ na-ejekwa ozi dị ka ndị okenye. Ada m, bụ́ Rebekah Karres, etinyewo ihe karịrị afọ 35 n’ozi oge nile, gụnyere afọ anọ ọ rụrụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn. Ya na di ya ejiriwo afọ 25 gara aga rụọ ọrụ njegharị n’ọtụtụ akụkụ nke United States.

Jisọs kwuru na Alaeze ahụ dị ka akụ̀ e zoro ezo nke a pụrụ ịchọta achọta. (Matiu 13:44) Enwere m ekele na ezinụlọ m chọtara akụ̀ ahụ ọtụtụ afọ gara aga. Lee ihe ùgwù ọ bụ ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 80 nke ozi a raara nye Chineke—n’enweghị ihe ịkwa ụta ọ bụla! Ọ bụrụ na m pụrụ ịmalite ndụ m n’isi ọzọ, aga m ebi ya n’otu ụzọ ahụ n’ihi na, n’ezie, ‘ebere Chineke dị mma karịa ndụ n’onwe ya.’—Abụ Ọma 63:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 The Finished Mystery bụ nke asaa n’usoro mpịakọta akwụkwọ dị iche iche nke a kpọrọ Studies in the Scriptures, Charles Taze Russell dere isii ndị mbụ n’ime ha. E bipụtara The Finished Mystery mgbe Russell nwụsịrị.

[Foto dị na peeji nke 23]

Anyị nụrụ okwu Nwanna Rutherford kwuru na 1917 n’Alliance, Ohio

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Ralph n’ihu ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ ọ rụrụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na ụmụ m abụọ taa