Aịzaya 2:1-22

  • E buliri ugwu Jehova elu (1-5)

    • Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè (4)

  • A ga-eweda ndị dị mpako ala n’ụbọchị Jehova (6-22)

2  Ihe a ka Aịzaya nwa Emọz hụrụ n’ọhụụ gbasara Juda na Jeruselem:+  2  N’oge ikpeazụ,Ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu yaGa-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.+ A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile. Mba niile ga-enurukwa na-agbago na ya.+  3  Ọtụtụ ndị ga-ejekwa, sị: “Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+ Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya. Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,*Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.+  4  Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe,Doziekwara ọtụtụ ndị okwu ha. Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+ Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+  5  Ndị ezinụlọ Jekọb, bịanụKa anyị jee ije n’ìhè Jehova.+  6  Chineke, ị hapụla ndị gị, bụ́ ndị ezinụlọ Jekọb,+N’ihi na ha emewela ọtụtụ ihe a na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ha na-eme anwansi*+ ka ndị Filistia. Ha na ụmụ ndị ala ọzọ bikwa.  7  Ọlaọcha na ọlaedo juru eju n’obodo ha. Akụ̀ ha anaghịkwa agwụ agwụ. Ịnyịnya juru eju n’obodo ha. Ụgbọ ịnyịnya ha bụkwa agụta agụta.+  8  Chi dị iche iche na-abaghị uru juru n’obodo ha.+ Ihe ha na-akpọrọ isiala bụ ihe ha ji aka ha rụọ,Ya bụ, ihe mkpịsị aka ha rụrụ.  9  Otú a ka ha si eweda onwe ha ala, na-emenyekwa onwe ha ihere. Ị gaghịkwa agbaghara ha. 10  Banyenụ n’ọgba nkume, zookwanụ n’ájáN’ihi na ike Jehova na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+ 11  A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala. A ga-ewedakwa ndị dị elu ala. Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ. 12  N’ihi na ọ bụ ụbọchị Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ Ọ ga-abịa n’ihi ndị niile dị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu. Ọ ga-abịakwa n’ihi mmadụ niile, ma onye ukwu ma onye nta.+ 13  Ọ ga-abịa n’ihi osisi sida niile dị na Lebanọn, ma ndị nke dị elu ma ndị nke e buliri elu. Ọ ga-abịakwa n’ihi osisi ook niile dị na Beshan. 14  Ụbọchị ahụ ga-abịakwa n’ihi ugwu ukwu niile dị eluNa ugwu nta niile dị elu. 15  Ọ ga-abịakwa n’ihi ụlọ nche niile dị elu, nakwa n’ihi mgbidi niile a rụsiri ike. 16  Ọ ga-abịakwa n’ihi ụgbọ mmiri niile na-aga Tashish+Nakwa n’ihi ụgbọ epeepe niile mara ezigbo mma. 17  A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala. A ga-ewedakwa ndị dị elu ala. Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ. 18  A gaghị ahụkwa chi dị iche iche na-abaghị uru.+ 19  Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,Ndị mmadụ ga-abanye n’ọgba nkume,Banyekwa n’ime ọnụ ndị dị n’ala,+N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+ 20  N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-atụfusị chi ha dị iche iche na-abaghị uru, ma ndị e ji ọlaọcha mee ma ndị e ji ọlaedo mee,Ndị ha meere onwe ha ka ha na-akpọrọ isiala. Ha ga-atụpụrụ ha nkapị na ụsụ,+ 21  Ka ha nwee ike banye n’oghere ndị dị n’oké nkumeNakwa n’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume,Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu. 22  Maka ọdịmma unu, unu atụkwasịzila mmadụ nkịtị obi,Onye naanị ihe ji ya ndụ bụ ume ọ na-eku.* Gịnị mere a ga-eji jiri ya kpọrọ ihe?

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “kwuo ihe a ga-eme.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “Onye na-eji imi ya eku ume.”