Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike nke Ekpere

Ike nke Ekpere

 Ike nke Ekpere

Anyanwụ na-ada n’obodo Nehoa nke dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Otu nwoke onye Siria nke aha ya bụ Elieza achịrị camel iri na-aga n’usoro bịaruo n’otu olulu mmiri dị ná mpụga nke obodo ahụ. Ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na ike gwụrụ ya, akpịrị na-akpọkwa ya nkụ, Elieza nwere nchegbu banyere mkpa nke ndị ọzọ karị. O si n’ala ọzọ bịa ịchọtara nwa nna ya ukwu nwunye. Ọzọkwa, ọ ghaghị ịchọta nwunye a n’etiti ndị ikwu nke nna ya ukwu. Olee otú ọ ga-esi rụzuo ọrụ a tara akpụ?

ELIEZA kweere n’ike nke ekpere. N’inwe okwukwe dị ịrịba ama nke yiri nke nwatakịrị, ọ rịọrọ arịrịọ obi umeala a: “Jehova, bụ́ Chineke nke onyenwe m Abraham, biko, mee ka o zute m taa, bụ́ ihe m na-achọ, meekwara onyenwe m Abraham ebere. Lee, mụ onwe m na-eguzo n’akụkụ isi iyi mmiri a; ụmụ ndị inyom nke ndị obodo a na-apụtakwa isere mmiri: ka o ruokwa, na nwa agbọghọ ahụ onye m ga-asị, Biko, zie ite gị ka m ṅụọ; onye ga-asịkwa, Ṅụọ, ọzọkwa, camel gị ka m ga-eme ka ha ṅụọ: ka ọ bụrụ nwanyị ahụ ka Ị họpụtaworo nye ohu gị, bụ́ Aịsak; ọ bụkwa n’ime nke a ka m ga-amara na I meworo onyenwe m ebere.”—Jenesis 24:12-14.

Obi ike Elieza nwere n’ike nke ekpere abụghị na nkịtị. Leenụ, kpọmkwem nwa agbọghọ mbụ bịara n’olulu mmiri ahụ bụ nwa nwa nke nwanne nwoke Abraham! Aha ya bụ Rebeka, ọ lụbeghịkwa di, ọ dị ọcha n’omume ma maa mma. N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụghị nanị na o nyere Elieza mmiri ọṅụṅụ kama o ji obiọma kwuo ka ya mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ nke camel ya nile. Mgbe e mesịrị, mgbe ndị ezinụlọ ya gbasịrị izù, Rebeka ji ọchịchọ obi kwere isoro Elieza laghachi n’ala dị anya iji ghọọ nwunye nke nwa Abraham bụ́ Aịsak. Lee azịza dị ịtụnanya ma doo anya nye ekpere Elieza nke a bụ, laa azụ n’oge Chineke na-etinye aka mgbe ụfọdụ n’ụzọ ọrụ ebube n’ihe omume dị iche iche!

Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ekpere Elieza. O gosipụtara okwukwe pụtara ìhè, obi umeala, na nchegbu nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị bụ́ nke o nwere maka mkpa nke ndị ọzọ. Ekpere Elieza gosikwara nkwenye o kwenyere n’ụzọ Jehova si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe. Obi abụọ adịghị ya na ọ maara banyere njikọ pụrụ iche nke Chineke na Abraham nwere nakwa nkwa O kwere na ngọzi ga-abịara ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu site n’aka Abraham. (Jenesis 12:3) N’ihi ya, Elieza ji okwu ndị bụ́: “Jehova, bụ́ Chineke nke onyenwe m Abraham,” malite ekpere ya.

Ọ bụ Jisọs Kraịst bụ nwa Abraham ahụ nke a ga-esite n’aka ya gọzie ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (Jenesis 22:18) Ọ bụrụ na anyị chọro ka a zaa ekpere anyị n’oge a, ọ dị anyị mkpa iji obi umeala mata ụzọ Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe site n’aka Ọkpara ya. Jisọs  Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu na-anọgide n’ime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu na-achọ, a ga-emekwara unu ya.”—Jọn 15:7.

Pọl onyeozi bụ onye na-eso ụzọ Kraịst nke hụrụ na okwu Jisọs ndị a bụ eziokwu. Okwukwe o nwere n’ike nke ekpere abụghị na nkịtị n’ezie. Ọ gbara ndị Kraịst ibe ya ume iwegara Chineke nchegbu ha nile n’ekpere ma gbaa akaebe, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Nke a ọ̀ pụtara na e mere ihe nile Pọl rịọrọ n’ekpere o kpekuru Chineke? Ka anyị lee.

Ọ Bụghị Ihe Nile A Rịọrọ Ka A Na-eme

N’ozi o ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị jee, Pọl hụsiri anya site n’ihe ọ kọwara dị ka “ogwu n’anụ ahụ.” (2 Ndị Kọrint 12:7) Nke a pụrụ ịbụwo ahụhụ mmetụta uche nke ndị mmegide na “ụmụnna ụgha” kpatara. (2 Ndị Kọrint 11:26; Ndị Galetia 2:4) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụwo ahụ erughị ala nke ọrịa anya na-adịghị ala ala. (Ndị Galetia 4:15) Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, “ogwu n’anụ ahụ” a nwere mmetụta na-akụda mmụọ n’ebe Pọl nọ. “Ugbo atọ ka m rịọrọ Onyenwe anyị arịrịọ banyere ihe a, ka ọ pụọ n’ahụ m,” ka o dere. Otú ọ dị, e meghị ihe Pọl rịọrọ. A kọwaara Pọl na uru ime mmụọ ndị o nwetawororịị n’aka Chineke, dị ka ike nke ịtachi obi n’ọnwụnwa, ezuwo. Ọzọkwa, Chineke sịrị: “E mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:8, 9.

Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe atụ Elieza na Pọl? N’ezie Jehova Chineke na-anụ ekpere nke ndị ji obi umeala achọ ijere ya ozi. Ma nke a apụtaghị na ọ na-eme ihe ha rịọrọ mgbe nile n’ihi na Chineke nwere ụzọ sara mbara o si ele ihe anya. Ọ maara ihe bụ́ maka ọdịmma anyị kasịnụ karịa ka anyị maara. Nke ka mkpa, ọ na-eme ihe mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya o kwupụtara ekwupụta dị ka e dekọrọ ya na Bible.

Oge Maka Ọgwụgwọ Ime Mmụọ

Chineke na-ekwe nkwa ịgwọ ọrịa anụ ahụ, uche, na nke mmetụta uche nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Ọkpara ya nke ga-achị ụwa. (Mkpughe 20:1-3; 21:3-5) Ezi ndị Kraịst ji okwukwe zuru ezu n’ike Chineke nwere imezu ya, na-atụsi anya ọdịnihu a e kwere ná nkwa, ike. Ọ bụ ezie na ha adịghị atụ anya ọgwụgwọ ọrụ ebube dị otú ahụ ugbu a, ha na-ekpeku Chineke ekpere maka nkasi obi na ikike ya iji nagide ule dị iche iche. (Abụ Ọma 55:22) Mgbe ha dara ọrịa, ha pụkwara ikpe ekpere maka nduzi Chineke n’inweta ọgwụgwọ kasị mma ha ga-akwụli ụgwọ ya.

Okpukpe ụfọdụ na-agba ndị ọrịa ume ikpe ekpere ka a gwọọ ha ugbu a, na-atụga aka n’ọgwụgwọ ọrụ ebube ndị Jisọs na ndị ozi ya gwọrọ. Ma a rụrụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ n’ihi nzube pụrụ iche. Nzube ha bụ iji gosipụta na Jisọs Kraịst bụ ezi Mesaịa ahụ na iji gosi na e siwo ná mba ndị Juu bufee ihu ọma Chineke n’ọgbakọ ndị Kraịst ka bidoro ebido. Laa azụ n’oge ahụ, onyinye ịrụ ọrụ ebube dị mkpa iji wusie okwukwe nke ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ ike. Mgbe ọgbakọ ọhụrụ ahụ ghọrọ a kwaa a kwụrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma tozuo okè, e mere ka onyinye ịrụ ọrụ ebube ndị ahụ “ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 13:8, 11.

N’oge a dị oké mkpa, Jehova Chineke na-eduzi ndị na-efe ya ofufe n’ọrụ ahụ ka mkpa bụ́ ọgwụgwọ ime mmụọ. Mgbe oge ka dịịrị ha, ọ dị ndị mmadụ mkpa nke ukwuu ịṅa ntị n’arịrịọ a: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na Ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:6, 7.

A na-enyezu ọgwụgwọ ime mmụọ a nke ndị mmehie nwere nchegharị site ná nkwusa nke ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Site n’inye ndị ohu ya ike ịrụ ọrụ a na-azọpụta ndụ, Jehova Chineke na-enyere ọtụtụ nde mmadụ si ná mba nile aka isi ná mmehie ha chegharịa ma soro ya na-enwe mmekọrịta dị mma tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. N’ezie a na-aza ekpere nke ndị nile ji ezi obi ekpe ekpere maka ọgwụgwọ ime mmụọ dị otú ahụ nakwa nke ndị nile na-ekpe ekpere maka enyemaka iji rụọ ọrụ ọgwụgwọ a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Elieza na Rebeka/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications