Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ha Chọpụtaworo na Jezreel?

Gịnị Ka Ha Chọpụtaworo na Jezreel?

 Gịnị Ka Ha Chọpụtaworo na Jezreel?

EBE obodo ochie bụ́ Jezreel dị abụwo mkpọmkpọ ebe ruo ọtụtụ narị afọ. N’otu oge ọ bụ ebe a ma ama n’akụkọ Bible. Ugbu a, n’ịbụ nke a napụrụ ebube mbụ ya ma bụrụ nke ikpo ájá kpuchisịrị, ọ ghọwo ebe dị mkputamkpu ma ọ bụ ugwu. N’afọ ndị a, ndị ọkà mmụta ihe ochie amalitewo inyocha ihe ndị fọdụrụnụ na Jezreel. Gịnị ka mkpọmkpọ ebe ndị a na-ekpughe banyere ihe ndekọ Bible?

Jezreel n’Ime Bible

N’ịbụ nke dị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Ndagwurugwu Jezreel, Jezreel dị n’otu n’ime akụkụ ndị ka emepụta nri n’ala Israel oge ochie. Kpọmkwem n’ebe ugwu n’ofe ndagwurugwu ahụ ka ugwu More dị bụ́ ebe ndị Midia mara ụlọikwuu mgbe ha na-ejikere ịwakpo Onyeikpe Gideọn na usuu ndị agha ya. Igatụkwu ntakịrị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ bụ ebe olulu mmiri Harọd dị, n’ala ala Ugwu Gilboa. Ọ bụ n’ebe a ka Jehova webilatara usuu ndị agha Gideọn nke ọtụtụ puku ndị agha mejupụtara gaa na nanị ndị ikom 300, iji gosipụta ikike ya ịnapụta ndị ya n’ejighị usuu ndị agha dị ike. (Ndị Ikpe 7:1-25; Zekaraịa 4:6) N’Ugwu Gilboa nke dị nso ka ndị Filistia meriri Sọl, bụ́ eze mbụ nke Israel, n’otu ọgụ dị ịrịba ama, bụ́ nke a nọ na ya gbuo Jonatan na ụmụ ndị ikom abụọ ndị ọzọ nke Sọl, Sọl n’onwe ya gbukwara onwe ya.—1 Samuel 31:1-5.

Ebe ndị e kwuru banyere obodo ochie ahụ bụ́ Jezreel n’ime Bible na-egosipụta ọnọdụ ndị dịrịtara iche n’ụzọ ndị dị ịrịba ama. Ha na-akọ banyere iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na isi n’ezi ofufe dapụ nke ndị ọchịchị Israel nakwa banyere ikwesị ntụkwasị obi na ịnụ ọkụ n’obi n’akụkụ nke ndị ohu Jehova. Ọ bụ na Jezreel ka Eze Ehab—onye na-achị alaeze ebo iri nke ebe ugwu Israel n’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke iri T.O.A.—wuru obí ya, ọ bụ ezie na ebe a maara bụ́ isi obodo ya bụ Sameria. (1 Ndị Eze 21:1) Ọ bụ na Jezreel ka nwunye ala ọzọ nke Ehab bụ́ Jezebel nọ yie onye amụma Jehova bụ́ Elaịja egwu ọnwụ. Iwe were ya n’ihi na Elaịja egbusịwo ndị amụma Beal n’atụghị egwu, mgbe e mesịrị nnwale banyere chi nke bụ́ ezigbo Chineke bụ́ nke Elịaja mere n’Ugwu Kamel.—1 Ndị Eze 18:36–19:2.

E mesịa, e mere mpụ na Jezreel. E gburu Nebọt bụ́ onye Jezreel. Eze Ehab nwere ọchịchọ inweta ubi vine Nebọt. Mgbe eze ahụ kwuru ka o nye ya ala ahụ, Nebọt ji iguzosi ike n’ihe zaghachi, sị: “Ya bụrụ m ihe arụ sitere na Jehova, bụ́ inye gị ihe nketa nna m hà.” Azịza a nke ụkpụrụ chịkwara were Ehab iwe nke ukwuu. Mgbe Eze Nwanyị Jezebel hụrụ ihu eze nke gbarụrụ agbarụ, ọ haziri ikpe iwu na-akwadoghị, na-ebo Nebọt ebubo nkwulu. A mara Nebọt aka ya dị ọcha ikpe ma tụgbuo ya na nkume, eze ahụ weghakwaara ubi vine ya.—1 Ndị Eze 21:1-16.

N’ihi omume ọjọọ a, Elaịja buru n’amụma, sị: “Nkịta ga-eri Jezebel n’ékpè Jezreel.” Onye amụma ahụ kwupụtakwuru, sị: “Onye nke Ehab nke nwụrụ anwụ n’obodo, nkịta ga-eri ya . . . Otú ọ dị, ọ dịghị onye dị ka Ehab, onye rere onwe ya ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, onye Jezebel,  bụ́ nwunye ya, rafuru.” Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Ehab wedara onwe ya ala mgbe Elaịja kwupụtara ikpe Jehova, Jehova kwupụtara na ntaramahụhụ a agaghị abịa n’oge ndụ Ehab. (1 Ndị Eze 21:23-29) Ihe ndekọ Bible ahụ gara n’ihu ịkọ na e tere Jihu mmanụ ịbụ eze Israel n’oge nke onye nọchiri anya Elaịja, bụ́ Elaịsha. Ka Jihu gbabara Jezreel, o nyere iwu ka e si na windo nke obí Jezebel tụpụ ya, ịnyịnya zọrikwara ya n’ụkwụ. E mesịa, a chọpụtara na nkịta ndị na-eri ihe e kpofuru ekpofu rifọrọ nanị okpokoro isi ya, ụkwụ ya abụọ, na ọbọ aka ya abụọ. (2 Ndị Eze 9:30-37) Ihe omume ikpeazụ e dekọrọ na Bible bụ́ nke metụtara Jezreel kpọmkwem bụ mgbe e gbusịrị mmadụ 70 n’ime ụmụ Ehab. Jihu tụkọtara isi ha na nnukwu ikpo abụọ dị n’ọnụ ụzọ ámá obodo Jezreel, mgbe nke ahụ gasịrị, o gburu ndị ikom ndị ọzọ na-edu ndú na ndị nchụàjà bụ́ ndị keere òkè n’ọchịchị ndị si n’ezi ofufe dapụ nke Ehab.—2 Ndị Eze 10:6-11.

Gịnị Ka Ndị Ọkà Mmụta Ihe Ochie Chọpụtaworo?

Na 1990, a malitere ọrụ nke a gbakọtara aka na-arụ bụ́ igwu ebe ahụ Jezreel dị. Ndị keere òkè na ya bụ Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Ihe Ochie nke Mahadum Tel Aviv (nke David Ussishkin nọchitere anya ya) na Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Ihe Ochie nke Britain dị na Jerusalem (nke John Woodhead nọchitere anya ya). Ruo ugboro asaa (nke ọ bụla na-ewe izu isii) n’afọ 1990-1996, ndị ọrụ afọ ofufo dị n’agbata 80 na 100 rụrụ ọrụ n’ebe ahụ.

Ụzọ ọgbara ọhụrụ e ji eso nkà mmụta ihe ochie bụ inyocha ihe àmà dịnụ n’ebe ahụ na-adabere n’ihe ọ pụtara, n’ezoghị aka ná nchepụta echiche ndị a dị mbụ chepụta. Ya mere, nye ọkà mmụta ihe ochie nke na-enyocha ala ndị a kpọrọ aha na Bible, ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ abụghị o kwusịa ọ gwụ n’isiokwu ahụ. A ghaghị ịtụle ma jiri nlezianya nyochaa ebe na ihe àmà ndị ọzọ nile a na-ahụ anya. Otú ọ dị, dị ka John Woodhead si na-akọ, e nweghị ihe àmà oge ochie e dere ede banyere Jezreel ma e wezụga isiakwụkwọ ole na ole nke Bible. N’ihi ya, ihe ndekọ na ọgụgụ oge nke Bible kwesịrị ịbụ akụkụ nke nnyocha ọ bụla. Gịnị ka mgbalị nke ndị ọkà mmụta ihe ochie kpugheworo?

Ka a na-egwupụta mgbidi na ihe ndị a kpụrụ akpụ, ọ bịara doo anya site ná mmalite na mkpọmkpọ ebe ahụ malitere laa azụ n’oge a sị na ọ bụ Ọ́gbọ̀ Ígwè, na-egosi na ha dịrị kpọmkwem n’oge Jezreel nke Bible. Ma ka ihe ogwugwu ndị ahụ gara n’ihu, e nwere ọtụtụ ihe ijuanya. Nke mbụ bụ otú ebe ahụ hàruru na akatamkpo mgbidi ndị o nwere. Ndị ọkà mmụta ihe ochie ahụ nọ na-atụ anya ịhụ ebe nwere mgbidi a pụrụ iji tụnyere ndị dị na Sameria oge ochie, bụ́ isi obodo nke alaeze Israel. Otú ọ dị, ka ihe ogwugwu ahụ gara n’ihu, ọ bịara doo anya na Jezreel dị nnọọ ukwuu karịa ya. N’ịbụ nke mgbidi ya dị ihe dị ka mita 300 n’ogologo na mita 150 n’obosara, ngụkọta nke ebe ndị dị n’ime mgbidi ya ji okpukpu atọ karịa obodo ọ bụla ọzọ a chọpụtara n’Israel site n’oge  ahụ. E ji olulu mmiri nke mmiri na-adịghị gbaa ya gburugburu, bụ́ nke dị ala ruo ihe dị ka mita 11 site ná mgbidi ndị ahụ. Dị ka Prọfesọ Ussishkin si kwuo, olulu a bụ ihe a na-enwetụbeghị ụdị ya n’oge Bible. “Anyị ahụghị ihe ọzọ dị ka nke a n’Israel ruo n’oge Ndị Agha Ntụte,” ka o kwuru.

Ihe ọzọ a na-atụghị anya ya bụ ụkọ nke ihe owuwu ndị sara mbara n’etiti obodo ahụ. Ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke ájá na-acha nchara nchara tụrụ agwa uhie bụ́ nke e webatara n’oge a na-ewu obodo ahụ abụrụwo nke e ji rụọ ebe dị elu ma dị larịị—dị ka ikpo okwu buru ibu—gburugburu ebe ahụ a gbachigidere ogige. Akwụkwọ bụ́ Second Preliminary Report bụ́ nke kọrọ banyere ihe ogwugwu ndị a na-egwu na Tel Jezreel na-ekwu na ikpo okwu a ma ama pụrụ ịbụ ihe àmà na-egosi na Jezreel bụ ebe karịrị obí eze. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị ga-achọ ikwu na o nwere ike bụrụ na Jezreel bụbu isi ọnọdụ ndị agha nke ndị eze Israel n’oge nke ndị eze sitere n’agbụrụ Omri [Omri na ụmụ ya] . . . bụ́ ebe a na-edebe ma na-azụ ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya ndị eze.” N’ịdabere n’otú ikpo okwu a hà, tinyere otú ebe ahụ a gbachigidere ogige n’onwe ya hà, Woodhead na-eche na nke a pụrụ ịbụwo otu ụdị nke ebe a nọ eme ememe ịkwụ n’ahịrị iji gosipụta ikike nke usuu ụgbọ ịnyịnya kasị ukwuu n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ahụ ga-enwe n’agha.

Ihe ndị fọdụrụnụ e gwupụtara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ bụ akụkụ na-adọrọ mmasị pụrụ iche nye ndị ọkà mmụta ihe ochie. Ha na-egosipụta ọnụ ụzọ mbata nke nwere ma ọ dịkarịa ala ọnụ ụzọ ámá nwere ọnụ ụlọ anọ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na e bukọrọwo ọtụtụ nkume dị n’ebe ahụ ruo ọtụtụ narị afọ, ihe ndị a chọpụtara ezughị ezu. Woodhead na-eche na ihe ndị fọdụrụnụ na-egosi ọnụ ụzọ ámá nwere ọnụ ụlọ isii nke hà otú ahụ ndị dị na Megido, Hezoa, na Gezea hà. *

Ihe ndị ọkà mmụta ihe ochie chọpụtara na-egosi ịdị adị dị mkpirikpi n’ụzọ na-eju anya nke obodo dị nnọọ n’ebe kwesịrị ekwesị, ma n’ụzọ agha ma n’ọdịdị ya. Woodhead na-emesi ya ike na dị ka obodo ukwu a gbachigidere ogige, Jezreel dịrị adị nanị ruo nwa oge—bụrụ nke e ji mee ihe ruo nanị iri afọ ole na ole. Nke a dị nnọọ iche n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ a ma ama n’Israel bụ́ ndị a kpọrọ aha na Bible, dị ka Megido, Hezoa, na isi obodo ya bụ́ Sameria, bụ́ ndị e wughachiri, gbasawanyekwuo, ma birighachi ugboro ugboro n’oge dị iche iche. Gịnị mere ebe a dị n’ebe kwesịrị ekwesị ji ghọọ nnọọ ebe tọgbọrọ n’efu ngwa ngwa? Woodhead kwubiri na Ehab na usoro ndị eze ya fọrọ nke nta ka ha kpata ndakpọ akụ̀ na ụba n’ihi irida akụ̀ nke mba ahụ. Nke a pụtara ìhè n’otú gabigara ókè Jezreel haruru ma dịruo ike. Ọchịchị ọhụrụ ahụ nke Jihu nọ n’isi ya yikarịrị ka ọ chọrọ ichefu Ehab, ya mere ọ gbahapụkwara obodo ahụ.

Ihe àmà nile ahụ e gwupụtarala ka ọ dị ugbu a na-akwado na ebe Jezreel dị bụ ógbè bụ́ isi nke Israel n’oge Ọ́gbọ̀ Ígwè ahụ. Otú ọ hàruru na mgbidi ya kwekọrọ n’ụzọ e si kọwaa ya na Bible dị ka obí eze a ma ama maka Ehab na Jezebel. Ihe ịrịba ama banyere obibi dị mkpirikpi e biri na ya n’oge a na-ekwekọ n’ihe ndekọ Bible banyere obodo ahụ: ọ ghọrọ nke a ma ama ngwa ngwa n’oge ọchịchị Ehab ma mgbe e mesịrị, site n’iwu nke Jehova, ihe àmà na-egosi na e wedara ya n’ala n’ihere mgbe Jihu “[tigburu] ndị nile fọdụụrụ ụlọ Ehab n’ime Jezreel, na ndị ukwu ya nile, na ndị ọ maara nke ọma, na ndị nchụàjà ya, ruo mgbe ọ dịghị onye fọdụrụ ọ hapụụrụ ya.”—2 Ndị Eze 10:11.

Oge Jezreel Dịrị

“O siri nnọọ ike na nkà mmụta ihe ochie inweta kpọmkwem ihe ndabere maka ịgụ oge,” ka John Woodhead na-ekweta. Ya mere ka ndị ọkà mmụta ihe ochie na-enyocha ihe e  gwupụtara n’ihe ogwugwu ahụ were afọ asaa, ha na-eji ihe ndị a atụnyere ihe ndị a chọpụtara n’ebe ndị ọzọ a na-egwupụta ihe mgbe ochie. Nke a edugawo ná nnyochaghachi na nrụrịta ụka. N’ihi gịnị? N’ihi na kemgbe onye ọkà mmụta ihe ochie si Israel bụ́ Yigael Yadin gwuru ihe ogwugwu na Megido n’afọ ndị 1960 nakwa ná mmalite afọ ndị 1970, e lere ya anya dị ka ihe ọtụtụ ndị ọkà mmụta ihe ochie kwadoro na ọ chọpụtawo mgbidi na ọnụ ụzọ ámá obodo ndị malitere n’oge nke Eze Solomọn. Ugbu a, mgbidi, ihe ọkpụkpụ, na ọnụ ụzọ ámá ndị a hụrụ na Jezreel na-eme ka ụfọdụ nwee obi abụọ banyere nkwubi okwu ndị a.

Dị ka ihe atụ, ihe ọkpụkpụ ndị a hụrụ na Jezreel yiri ndị ahụ a hụrụ na Megido bụ́ nke Yadin jikọrọ ha na ọchịchị Solomọn. Ọdịdị ọnụ ụzọ ámá ahụ na otú ha hà yiritara, ma ọ bụrụ na ha abụghị otu ihe ahụ. Woodhead na-ekwu, sị: “Ihe àmà nile ahụ na-egosi na ebe ahụ Jezreel dị malitere ịdị laa azụ n’oge Solomọn ma ọ bụ na-ewedata oge e kwuru na ihe ndị a malitere ịdị n’ebe ndị ọzọ [Megido na Hezoa] rute n’oge Ehab.” Ebe ọ bụ na Bible na-ejikọ ebe Jezreel dị na oge Ehab n’ụzọ doro anya, ọ na-ele ya anya dị ka ihe ezi uche ka dịrị na ya ịnakwere na ebe ndị a e si gwupụta ihe ndị a na-egosipụta oge ọchịchị Ehab. David Ussishkin na-ekwenye, sị: “Bible na-ekwu na Solomọn wulitere Megido—ọ dịghị ekwu na o wuru ọnụ ụzọ àmà ndị ahụ kpọmkwem.”

À Pụrụ Ịmata Akụkọ Ihe Mere Eme nke Jezreel?

Ihe ndị a ndị nkà mmụta ihe ochie chọpụtara na nrụrịta ụka ndị sochirinụ, hà na-eme ka e nwee obi abụọ n’ihe ndekọ Bible banyere Jezreel ma ọ bụ Solomọn? N’ezie, arụmarụ ahụ ndị nkà mmụta ihe ochie na-arụ nwere ntakịrị ihe jikọrọ ya na ihe ndekọ Bible kpọmkwem. Nkà mmụta ihe ochie na-enyocha akụkọ ihe mere eme na-adabere n’ihe dị iche site n’ihe ihe Bible kọrọ. Ọ na-ewelite ajụjụ ndị dị iche, na-emesikwa ihe ndị dị iche ike. Mmadụ pụrụ iji onye na-amụ Bible na onye ọkà mmụta ihe ochie tụnyere ndị na-eme njem n’ụzọ ndị dị ibe ha nso bụ́ ndị na-aga otu ebe. Otu onye njem na-akwọ ụgbọala n’okporo ámá, onye nke ọzọ na-aga ije n’akụkụ ndị ji ụkwụ si aga. Ebe ha tụkwasịrị uche na nchegbu ha dịgasị iche. Ma, echiche ha na-emejukarị onwe ha kama imegiderịta onwe ha. Iji mmetụta ndị njem abụọ ahụ tụnyere ibe ha pụrụ ime ka a ghọta ihe ndị na-adọrọ adọrọ.

Bible nwere ihe ndekọ banyere ihe ndị mere n’oge ochie na ụmụ mmadụ bi n’oge ahụ; nkà mmụta ihe ochie na-anwa inwetaghachi ihe ọmụma banyere ihe omume na ụmụ mmadụ ndị a site n’inyocha ihe àmà ọ bụla a pụrụ ịhụ banyere ha bụ́ ndị ka fọdụrụ n’ime ala. Otú ọ dị, ihe ndị a fọdụrụnụ adịghị ezukarị ezu, bụrụkwa ndị a pụrụ ịkọwa n’ụzọ dịgasị iche. Banyere nke a, Amihai Mazar na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Archaeology of the Land of the Bible—10,000−586 B.C.E., sị: “Ịrụ ọrụ n’ebe ndị ọkà mmụta ihe ochie na-egwupụta ihe . . . bụ, n’ụzọ dị ukwuu nkà, tinyere njikọta nke ọzụzụ na nkà ọkachamara. Ọ dịghị otu usoro a na-adịghị agbanwe agbanwe nke ga-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma, ime mgbanwe na nkà echiche nke sitere n’aka ndị ntụzi ọrụ n’ebe a na-egwu ihe ogwugwu bụkwa ihe a na-aghaghị inwe. Àgwà, nkà, na ezi uche nke onye ọkà mmụta ihe ochie dịkwa mkpa dị ka ọzụzụ ya na ngwá ọrụ ndị o nwere.”

Nkà mmụta ihe ochie akwadowo na e nwere na Jezreel, ebe bụ́ isi maka ndị eze na ndị agha, bụ́ ebe dịrị adị ruo oge dị mkpirikpi n’ụzọ na-eju anya n’oge ahụ mere ihe akụkọ bụ́ nke ya na oge ọchịchị Ehab dabakọrọ—dị nnọọ ka Bible na-akọ. E welitewo ajụjụ ndị ọzọ na-akpali mmasị bụ́ ndị ndị ọkà mmụta ihe ochie pụrụ ịdị na-atụle ruo ọtụtụ afọ ndị na-abịanụ. Ma, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-anọgide na-ekwupụ okwu n’ụzọ doro anya, na-enye anyị akụkọ zuru ezu n’ụzọ ndị ọkà mmụta ihe ochie na-apụtụghị inye.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Lee isiokwu bụ́ “Ihe Omimi nke Ọnụ Ụzọ Ámá Ndị Ahụ” n’Ụlọ Nche (Bekee) nke August 15, 1988.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ebe ndị ọkà mmụta ihe ochie na-egwupụta ihe na Jezreel

[Foto dị na peeji nke 28]

Arụsị ndị Kenean a hụrụ na Jezreel