Ozi Ọma Luk Dere 18:1-43
18 O wee meere ha otu ihe atụ na-egosi ihe mere ha ji kwesị ịna-ekpe ekpere mgbe niile n’adaghị mbà.+
2 Ọ sịrị: “N’otu obodo, e nwere otu ọkàikpe na-anaghị atụ egwu Chineke, nke na-anaghịkwa akwanyere mmadụ ùgwù.
3 N’obodo ahụ, e nwekwara otu nwaanyị isi mkpe. Ọ nọ na-agakwuru ọkàikpe ahụ, na-asị, ‘Gbalịa kpee ikpe ziri ezi n’ikpe onye mụ na ya sere okwu.’
4 O kweghịkwa ná mmalite. Ma, o mechara gwa onwe ya, sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke, anaghịkwa m akwanyere mmadụ ọ bụla ùgwù,
5 ma n’ihi nsogbu nwaanyị isi mkpe a na-enye m, m ga-ekpe ikpe ziri ezi n’okwu ya, ka ọ ghara ịna-abịa enyegbu m ná nsogbu.’”+
6 Onyenwe anyị wee sị: “Ùnu nụrụ ihe ọkàikpe ahụ kwuru n’agbanyeghị na ọ bụ onye ajọ omume?
7 Ebe ọ bụ na Chineke na-enwere ndị ọ họọrọ ndidi,+ bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị,+ ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi?
8 Ana m asị unu, ọ ga-eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ. Ma, mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ ndị nwere okwukwe* n’ụwa?”
9 O mekwaara ndị na-ewere onwe ha ka ndị ezi omume ma na-ele ndị ọzọ anya ka ndị na-enweghị ihe ha bụ ihe atụ a:
10 “Ụmụ nwoke abụọ gara n’ụlọ nsọ ikpe ekpere. Otu bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ.
11 Onye Farisii ahụ guzooro ọtọ malite ikpe ekpere n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, na ndị na-akwa iko. Adịghịkwa m ka onye ọnaụtụ a.
12 Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu. M na-enyekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m kpatara.’+
13 Ma onye ọnaụtụ ahụ guzo ebe dị anya. Ọ chọghịdị ileli anya lee eluigwe, kama ọ nọ na-eti aka n’obi, na-asị, ‘Chineke, meere m ebere. Abụ m onye mmehie.’+
14 Ana m asị unu, nwoke a lara n’ụlọ ya bụrụ onye ezi omume karịa onye Farisii ahụ.+ N’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”+
15 Ndị mmadụ nọkwa na-akpọtara ya ụmụaka ha ka o bitụ ha aka. Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha malitere ịbara ha mba.+
16 Ma, Jizọs kpọrọ ụmụntakịrị ahụ ka ha bịakwute ya, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochila ha n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.+
17 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anabataghị Alaeze Chineke otú nwatakịrị si anabata ihe emekataghị banye na ya.”+
18 Otu n’ime ndị na-achị achị wee jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+
19 Jizọs asị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+
20 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu: ‘Akwala iko,+ egbula mmadụ,*+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+
21 O wee sị: “M na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.”
22 Mgbe Jizọs nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Ree ihe niile i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+
23 Mgbe ọ nụrụ ihe a, o wutere ya nnọọ, n’ihi na ọ bara ezigbo ọgaranya.+
24 Jizọs lere ya anya wee sị: “Ọ ga-esiri ndị nwere ego ezigbo ike ịbanye n’Alaeze Chineke.+
25 N’eziokwu, ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke.”+
26 Ndị nụrụ ihe a sịrị: “Ònyezi ka a ga-azọpụta?”+
27 Ya asị: “Ihe na-ekweghị omume n’anya ụmụ mmadụ kwere Chineke omume.”+
28 Pita wee sị ya: “Ma anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị.”+
29 O wee sị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, e nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ nne na nna ma ọ bụ ụmụ n’ihi Alaeze Chineke,+
30 nke na-agaghị enweta ihe ka ya okpukpu okpukpu n’oge a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.”*+
31 O wee kpọpụ ndịozi ya iri na abụọ iche, sị ha: “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-emezukwa ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke mmadụ.+
32 Dị ka ihe atụ, a ga-enyefe ya n’aka ndị mba ọzọ.+ A ga-akwa ya emo,+ mee ya ihe ihere, gbụọkwa ya asọ mmiri.+
33 Ha pịachaakwa ya ihe, ha ga-egbu ya.+ Ma ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”+
34 Ma, ha aghọtaghị ihe nke ọ bụla n’ime ihe ndị a pụtara, n’ihi na e zochiiri ha ihe okwu a pụtara, ha aghọtaghịkwa ihe ndị o kwuru.
35 Ma ka Jizọs na-eru Jeriko nso, otu onye ìsì nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.+
36 Mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ìgwè mmadụ na-agafe, ọ malitere ịjụ ihe na-eme.
37 Ha asị ya: “Jizọs onye Nazaret na-agafe.”
38 O wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Nwa Devid, meere m ebere!”
39 Ndị nọ ya n’ihu wee malite ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọ na-etisikwu mkpu ike, sị: “Nwa Devid, meere m ebere!”
40 Jizọs wee kwụsị ma sị ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, Jizọs jụrụ ya, sị:
41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ya asị: “Onyenwe anyị, mee ka m hụwa ụzọ.”
42 N’ihi ya, Jizọs sịrị ya: “Hụwa ụzọ. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+
43 O wee hụwa ụzọ ozugbo. Ọ malitekwara iso ya,+ na-eto Chineke. Mgbe ndị ahụ niile hụrụ ihe merenụ, ha toro Chineke.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ụdị okwukwe a.”
^ Ma ọ bụ “egbula ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “n’oge na-abịa abịa.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”