Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-achọnụ Jehova na Ike Ya”

“Na-achọnụ Jehova na Ike Ya”

 “Na-achọnụ Jehova na Ike Ya”

“Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”—2 IHE E MERE 16:9.

1. Gịnị bụ ike, oleekwa otú ụmụ mmadụ siworo jiri ya mee ihe?

IKE pụrụ ịpụta ọtụtụ ihe, dị ka inwe nchịkwa, ikike, ma ọ bụ mmetụta n’ahụ ndị ọzọ; ikike nke ime ihe ma ọ bụ ịrụpụta ihe; ike ọkpụkpụ aka (ume); ma ọ bụ ịdị nkọ n’ọgụgụ isi ma ọ bụ n’omume. Ụmụ mmadụ enweghị ihe ndekọ dị mma ma a bịa n’ihe banyere iji ike eme ihe. N’ikwu banyere ike dị n’aka ndị ọchịchị, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Lord Acton, kwuru, sị: “Ike na-emerụ emerụ, ike kasị elu na-emerụkwa emerụ n’ụzọ kasị njọ.” Akụkọ ihe mere eme nke oge a jupụtara n’ihe atụ ndị na-egosi na okwu Lord Acton bụ eziokwu nke zuru ebe nile. N’ime narị afọ nke 20, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya,” dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ. (Eklisiastis 8:9) Ndị ọchịchị aka ike bụ́ ndị na-akpa àgwà na-ezighị ezi ejiwo ike ha mee ihe n’ụzọ jọgburu nnọọ onwe ya, ha alawokwa ndụ ọtụtụ nde mmadụ n’iyi. Ike, nke ịhụnanya, amamihe, na nke ikpe ziri ezi na-adịghị achịkwa dị ize ndụ.

2. Kọwaa otú àgwà ndị ọzọ nke Chineke si emetụta ụzọ o si eji ike ya eme ihe.

2 N’adịghị ka ọtụtụ ụmụ mmadụ, Chineke na-eji ike ya eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị mma. “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Jehova na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ a chịkwara achịkwa. Ndidi na-egbochi Chineke ibibi ndị ajọ omume iji nye ha ohere ichegharị. Ịhụnanya na-akpali ya ime ka anyanwụ na-amụkwasị ụdị mmadụ nile—ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ikpe ziri ezi ga-akpali ya n’ikpeazụ iji ike ya na-enweghị nsọtụ mee ihe iji bibie onye ahụ na-akpata ọnwụ, bụ́ Setan Ekwensu.—Matiu 5:44, 45; Ndị Hibru 2:14; 2 Pita 3:9.

3. N’ihi gịnị ka ike Chineke nke kasị ike nile ji bụrụ ihe mere a ga-eji atụkwasị ya obi?

3 Ike dị egwu nke Nna anyị nke eluigwe bụ ihe mere a ga-eji nwee ntụkwasị obi na obi ike—ma ná nkwa ya ma ná nchebe ya. Obere nwa na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’etiti ndị ọ na-amabughị mgbe o jidesiri aka nna ya ike, ebe ọ bụ na ọ maara na nna ya agaghị ekwe ka ihe ọ bụla merụọ ya ahụ. N’otu aka ahụ, Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye “dị ike ịzọpụta,” ga-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ ọ bụla na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na anyị esoro ya na-eje ije. (Aịsaịa 63:1; Maịka 6:8) Dịkwa ka ezigbo Nna, Jehova na-emezu nkwa ya mgbe nile. Ike ya na-enweghị nsọtụ na-eme ka e jide n’aka na ‘okwu ya ga-aga nke ọma n’ihe o zigara ya.’—Aịsaịa 55:11; Taịtọs 1:2.

4, 5. (a) Mgbe Eze Esa tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam, gịnị si na ya pụta? (b) Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị adabere ná ngwọta sitere n’aka mmadụ iji gboo nsogbu anyị?

4 N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa ka anyị kpebisie ike ịghara ileghara nchebe nke Nna anyị nke eluigwe anya? Ọ bụ n’ihi na o kwere omume ịbụ ndị ọnọdụ dị iche iche rikpuru ma chefuo ebe ezi nchebe anyị dabeere. A na-ahụ nke a n’ihe atụ nke Eze Esa, bụ́ nwoke tụkwasịrị Jehova obi n’akụkụ ka ukwuu nke ndụ ya. N’oge Esa na-achị, otu nde ndị agha dị ike nke Etiopia wakporo Juda. N’ịmata na ndị iro ya nwere ndị agha karịa ya, Esa kpere ekpere, sị: “Jehova, Ọ dịghị onye tinyere Gị inye aka, n’etiti onye bara ụba na onye ike na-adịghị: nyere anyị aka, Jehova, bụ́ Chineke anyị; n’ihi  na ọ bụ na Gị ka anyị dabeere, ọ bụkwa n’aha Gị ka anyị bịaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke anyị ka Ị bụ; ekwela ka ihe a kpọrọ mmadụ gbochigide Gị.” (2 Ihe E Mere 14:11) Jehova nabatara arịrịọ Esa ma mee ka o nwee mmeri doro anya.

5 Otú ọ dị, mgbe Esa jisịrị ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo ọtụtụ afọ, obi ike o nwere n’ike nzọpụta nke Jehova belatara. Iji gbanahụ iyi egwu agha nke alaeze ugwu nke Israel na-eyi ya, o chigharịkwuuru Siria maka enyemaka. (2 Ihe E Mere 16:1-3) Ọ bụ ezie na aka azụ o nyere Eze Ben-hedad nke Siria mere ka Israel kwụsị iyi Juda egwu, ọgbụgba ndụ Esa so Siria gbaa gosipụtara enweghị obi ike n’ebe Jehova nọ. Hanani onye amụma jụrụ ya hoo haa, sị: “Ndị Etiopia na ndị Lubim, hà abụghị usuu ndị agha n’ụba, na-enwe ụgbọala na ndị ịnyịnya bara ụba nke ukwuu? ma mgbe ị dabeere na Jehova, O nyere ha n’aka gị.” (2 Ihe E Mere 16:8) Otú o sina dị, Esa jụrụ ịdọ aka ná ntị a. (2 Ihe E Mere 16:9-12) Mgbe nsogbu chere anyị ihu, ka anyị ghara ịdabere ná ngwọta sitere n’aka mmadụ. Kama nke ahụ, ka anyị gosipụta obi ike n’ebe Chineke nọ, n’ihi na ịtụkwasị obi n’ike mmadụ ga-edugarịrị ná mmechu ihu.—Abụ Ọma 146:3-5.

Chọọ Ike nke Jehova Na-enye

6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘chọọ Jehova na ike Ya’?

6 Jehova pụrụ inye ndị ohu ya ike, chebekwa ha. Bible na-agba anyị ume ‘ịchọ Jehova na ike Ya.’ (Abụ Ọma 105:4) N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe anyị na-eme ihe n’ike Chineke, anyị ga-eji ike anyị mee ihe n’ụzọ ga-abara ndị ọzọ uru, kama imerụ ha ahụ. Ọ dịghị ebe ọzọ anyị pụrụ ịchọta ihe atụ ka mma banyere nke a karịa n’ebe Jisọs Kraịst nọ, bụ́ onye rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ‘n’ike nke Onyenwe anyị.’ (Luk 5:17) Jisọs pụrụ imikpuwo onwe ya n’ịghọ eze bara ọgaranya, nke a ma ama, ma ọ bụ ọbụna nke kasị ike. (Luk 4:5-7) Kama nke ahụ, o ji ike Chineke nyere ya mee ihe inye ọzụzụ na izi ihe, inye aka na ịgwọ ọrịa. (Mak 7:37; Jọn 7:46) Lee ihe nlereanya mara mma nke a bụụrụ anyị!

7. Àgwà dị aṅaa dị mkpa ka anyị na-azụlite mgbe anyị na-eme ihe n’ike Chineke kama ịbụ na nke anyị?

7 Ọzọkwa, mgbe anyị na-eme ihe “n’ike ahụ Chineke na-enyezu,” nke a ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị obi umeala. (1 Pita 4:11) Ndị na-achọrọ onwe ha ike na-aghọ ndị mpako. Otu ihe atụ bụ Eze Esar-haddon nke Asiria, bụ́ onye ji ịnya isi kwupụta, sị: “Adị m ike, ọ bụ m kasị ike, abụ m dike, agbara m dimkpa, abụ m odogwu.” N’ụzọ megidere nke ahụ, “ọ [bụ] ihe na-adịghị ike nke ụwa ka [Jehova] họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ihe dị ike.” N’ihi ya, ọ bụrụ na ezi onye kraịst anyaa isi, ọ na-anya ya n’ime Jehova, n’ihi na ọ maara na ọ bụghị ike nke onwe ya ka o ji rụọ ihe ọ rụrụ. ‘Iweda onwe anyị n’okpuru aka dị ike nke Chineke’ ga-eweta mbuli elu bụ́ ezie.—1 Ndị Kọrint 1:26-31; 1 Pita 5:6.

8. Gịnị ka anyị kwesịrị ibu ụzọ mee iji nweta ike Jehova?

8 Olee otú anyị si enweta ike Chineke? Nke mbụ, anyị aghaghị ịrịọ maka ya n’ekpere. Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Nna ya ga-ewere mmụọ nsọ nye ndị na-arịọ ya. (Luk 11:10-13) Tụlee otú nke a si nye ndị na-eso ụzọ Kraịst ike mgbe ha họọrọ irubere Chineke isi karịa ndị ndú okpukpe bụ́ ndị nyeworo ha iwu ịkwụsị ịgba àmà banyere Jisọs. Mgbe ha kpere ekpere  maka enyemaka Jehova, a zara ekpere ha sitere n’ezi obi, mmụọ nsọ nyekwara ha ike iji obi ike nọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 4:19, 20, 29-31, 33.

9. Kwuo ebe nke abụọ e si enweta ike ime mmụọ, hotakwa ihe atụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi ịdị irè ya.

9 Nke abụọ, anyị pụrụ inweta ike ime mmụọ site na Bible. (Ndị Hibru 4:12) Ike nke Okwu Chineke pụtara ìhè n’oge Eze Josaịa. Ọ bụ ezie na eze Juda a ekpochapụlarị arụsị nke ndị ọgọ mmụọ n’ala ahụ, nchọta a chọtara Iwu Jehova n’ụlọ nsọ ahụ na mberede kwaliri ya itinyekwu ihe n’atụmatụ mkpochasị a. * Mgbe Josaịa n’onwe ya gụsịịrị ndị ahụ Iwu ahụ, mba ahụ dum sooro Jehova gbaa ndụ, a malitekwara mkpọsa nke abụọ, bụ́ nke dị ike karị, megide ikpere arụsị. Ezi ihe si ná mgbanwe Josaịa mere pụta bụ na ‘n’ụbọchi ya nile ha esighị n’iso Jehova wezụga onwe ha.’—2 Ihe E Mere 34:33.

10. Olee ụzọ nke atọ e si enweta ike n’aka Jehova, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa?

10 Nke atọ, anyị na-esi ná mkpakọrịta ndị Kraịst enweta ike sitere n’aka Jehova. Pọl gbara ndị Kraịst ume ịgachi nzukọ anya iji “[na-akpasu] ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche” na iji na-agbarịta ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Mgbe a tọhapụsịrị Pita n’ụlọ mkpọrọ n’ụzọ ọrụ ebube, ọ chọrọ ịnọnyere ụmụnna ya, n’ihi ya ọ gara kpọmkwem n’ụlọ nne Jọn Mak, bụ́ “ebe ọtụtụ mmadụ zukọrọrịị na-ekpekwa ekpere.” (Ọrụ 12:12) N’ezie, ha nile pụrụ ịnọwo n’ebe obibi ha kpee ekpere. Ma ha họọrọ ịbịakọta ọnụ ikpe ekpere na ịgbarịta ibe ha ume n’oge ahụ tara akpụ. N’ọgwụgwụ nke njem dị ogologo ma dị ize ndụ nke Pọl mere gaa Rom, o zutere ụmụnna ụfọdụ na Pọtiọli, e mesịakwa, o zutere ndị ọzọ bụ́ ndị bịara izute ya. Gịnị bụ mmeghachị omume ya? “Mgbe Pọl hụrụ ha [ndị nke ikpeazụ ahụ], o kelee Chineke, nweekwa obi ike.” (Ọrụ 28:13-15) E wusiri ya ike site n’ịnọnyere ndị Kraịst ibe ya ọzọ. Anyị onwe anyị na-enwetakwa ike site n’iso ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta. Ọ bụrụhaala na anyị nweere onwe anyị ma nwee ike iso ibe anyị na-akpakọrịta, anyị agaghị anwa ịga nanị anyị n’okporo ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.—Ilu 18:1; Matiu 7:14.

11. Kwuo ọnọdụ ụfọdụ ebe “ọkịka nke ike” dị mkpa karịsịa.

11 Site n’ikpechi ekpere anya, ịmụchi Okwu Chineke anya, na iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-akpachi anya, anyị ‘ga-eme onwe anyị ka anyị dị ike n’ime Onyenwe anyị, ya na n’ime ịdị ike nke ike Ya.’ (Ndị Efesọs 6:10) Obi abụọ adịghị ya na anyị nile chọrọ “ike n’ime Onyenwe anyị.” Ụfọdụ na-arịa ọrịa ndị na-agwụ ike, ndị ọzọ bụ ndị ịka nká na-akpa aka ọjọọ ma ọ bụ ndị onye òtù ọlụlụ ha nwụnahụrụ. (Abụ Ọma 41:3) Ndị ọzọ na-edi mkpagbu sitere n’aka di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe. Ndị nne na nna, nke ka nke ndị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ nanị ha, pụrụ ịhụ na ịrụ ọrụ oge nile ka ha na-azụlite ezinụlọ, bụ ibu ọrụ na-agwụ ike. Ike nke iguzogide nrụgide ndị ọgbọ na nke ịjụ ọgwụ ọjọọ na omume rụrụ arụ, dị ndị Kraịst na-eto eto mkpa. Ọ dịghị onye kwesịrị igbu oge ịrịọ Jehova “ọkịka nke ike” iji nagide ihe ịma aka ndị dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.

‘Inye Onye Dara Mbà Ike’

12. Olee otú Jehova si akwagide anyị n’ozi ndị Kraịst?

12 Ọzọkwa, Jehova na-enye ndị ohu ya ike mgbe ha na-eje ozi ha. Anyị na-agụ n’amụma Aịsaịa, sị: “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. . . . Ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:29-31) Pọl onyeozi n’onwe ya natara ike iji jee ozi ya. N’ihi ya, ozi ya rụpụtara ihe. O degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 1:5) Nkwusa na izi ihe ya nwere ike nke iweta mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ndị gere ya ntị.

13. Gịnị wusiri Jeremaịa ike ịnọgidesi ike n’agbanyeghị mmegide?

13 Mgbe anyị zutere mmụọ enweghị mmasị  n’ókèala anyị—ókèala nke anyị pụrụ imewo nkwusa na ya ugboro ugboro ruo ọtụtụ afọ ma na-ahụ mmeghachi omume dị nta—anyị pụrụ ịda mbà n’obi. Jeremaịa nwere nkụda mmụọ n’otu aka ahụ n’ihi mmegide, ịkwa emo, na enweghị mmasị ndị o zutere. “M gaghị ehota [Chineke], m gaghị ekwukwa okwu ọzọ n’aha Ya,” ka ọ gwara onwe ya. Ma ọ pụghị ịgbachi nkịtị. Ozi ya “dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ [ya] nile.” (Jeremaịa 20:9) Gịnị nyere ya ike ọhụrụ n’agbanyeghị ọtụtụ ahụhụ? “Jehova nọnyeere m dị ka dike nke na-eme ka a maa jijiji,” ka Jeremaịa kwuru. (Jeremaịa 20:11) Nghọta Jeremaịa nwere banyere ịdị oké mkpa nke ozi ya na ọrụ Chineke nyere ya mere ka ọ nabata agbamume Jehova.

Ike nke Imerụ Ahụ na Ike nke Inye Ọgwụgwọ

14. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka ire bụruru ngwá ọrụ dị ike? (b) Nye ihe atụ iji gosi mbibi ire pụrụ ịkpata.

14 Ọ bụghị ike nile anyị nwere sitere kpọmkwem n’aka Chineke. Dị ka ihe atụ, ire nwere ike nke imerụ ahụ nakwa ike nke inye ọgwụgwọ. “Ọnwụ na ndụ dị ire n’aka,” ka Solomọn na-adọ aka ná ntị. (Ilu 18:21) Ihe si n’obere mkparịta ụka Setan na Iv nwere pụta na-egosi ókè okwu ọnụ pụrụ imebiru ihe. (Jenesis 3:1-5; Jemes 3:5) Anyị onwe anyị pụkwara iji ire mebie ihe dị ukwuu. Ikwu okwu mweda n’ala gwa nwa agbọghọbịa banyere ibu o buru, pụrụ ime ka ọ malite ịtụ nri ụjọ. Ikwughachi okwu nkwutọ n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya pụrụ imebi ọbụbụenyi gaara adịru ogologo ndụ mmadụ. Ee, ọ dị mkpa ka a chịkwaa ire.

15. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ire anyị mee ihe iji wulie elu na iji gwọọ ọrịa?

15 Otú ọ dị, ire pụrụ iwuli elu, ọ pụkwara itida etida. Ilu Bible na-asị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Ndị Kraịst maara ihe na-eji ike nke ire eme ihe iji kasie ndị dara mbà n’obi na ndị mmadụ nwụnahụrụ, obi. Okwu ọmịiko pụrụ ịgba ndị nọ n’afọ iri na ụma ume bụ́ ndị na-alụso nrụgide ndị ọgbọ bụ́ nke na-emerụ ahụ, ọgụ. Ire na-eche ihe eche ekwu pụrụ imesighachi ụmụnna nwoke na nwanyị meworo agadi obi ike na ha ka dị mkpa, bụrụkwa ndị a ka hụrụ n’anya. Okwu e ji obiọma kwuo pụrụ ime ka ụbọchị dịtụrụ ndị na-arịa ọrịa mma. Karịsịa, anyị pụrụ iji ire anyị soro ndị nile ga-ege ntị kerịta ozi Alaeze ahụ dị ike. Ịkpọsa Okwu Chineke dị n’ike aka anyị ma  ọ bụrụ na obi anyị dị na ya. Bible na-ekwu, sị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.”—Ilu 3:27.

Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

16, 17. Mgbe ha ji ikike Chineke nyere ha na-eme ihe, olee otú ndị okenye, ndị nne na nna, ndị bụ́ di, na ndị bụ́ nwunye pụrụ isi ṅomie Jehova?

16 Ọ bụ ezie na Jehova pụrụ ime ihe nile, ọ na-eji ịhụnanya achịkwa ọgbakọ. (1 Jọn 4:8) N’iṅomi ya, ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta na-eji ịhụnanya elekọta ìgwè atụrụ Chineke—na-eji ikike ha eme ihe n’ụzọ ziri ezi, ọ bụghị n’ụzọ na-ezighị ezi. N’eziokwu, ọ dị ndị nlekọta mkpa mgbe ụfọdụ ‘ịtụ mmadụ mmehie ha n’anya, ịba mbá, ịrịọ arịrịọ,’ ma a na-eme nke a “n’ogologo ntachi obi nile na ozizi nile.” (2 Timoti 4:2) Ya mere, ndị okenye na-atụgharị uche mgbe nile n’okwu ndị ahụ Pita onyeozi degaara ndị nwere ikike n’ọgbakọ, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na unu dị ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa dị ka a ga-asị na unu na-eme ndị bụ́ ihe nketa dị ka ùnu bụ ndị nwe ha, kama na-eme onwe unu ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi.”—1 Pita 5:2, 3; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.

17 Ndị nne na nna na ndị bụ́ di nwekwara ikike Jehova nyere ha, ha kwesịkwara iji ike a mee ihe iji nye aka, zụlite, ma gosi ịhụnanya. (Ndị Efesọs 5:22, 28-30; 6:4) Ihe nlereanya Jisọs na-egosi na a pụrụ iji ịhụnanya jiri ikike mee ihe n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na a na-enye ụmụaka ịdọ aka ná ntị ziri ezi ma kwekọọ ekwekọ, obi agaghị efu ha. (Ndị Kọlọsi 3:21) A na-ewusikwu alụmdi na nwunye ike mgbe ndị Kraịst bụ́ di ji ịhụnanya na-achị isi, ndị bụ́ nwunye ana-akwanyekwara ịbụisi di ha ùgwù n’ụzọ miri emi, kama ịgabiga ókè nke Chineke kpaara ha, iji chịkwaa ma ọ bụ nweta ihe ha na-achọ.—Ndị Efesọs 5:28, 33; 1 Pita 3:7.

18. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi ṅomie ihe nlereanya Jehova n’ịchịkwa iwe anyị? (b) Gịnị ka ndị nwere ikike kwesịrị ịgbalị ịkụnye n’ime ndị ha na-elekọta?

18 Ndị nwere ikike n’ime ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ kwesịrị ịkpachara anya karịsịa ịchịkwa iwe ha, ebe ọ bụ na iwe na-emenye egwu kama ịkụnye ịhụnanya. Nehum onye amụma kwuru, sị: “Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ dịkwa ukwuu n’ike.” (Nehum 1:3; Ndị Kọlọsi 3:19) Ịchịkwa iwe anyị bụ ihe àmà nke ịdị ike, ebe igosipụta ya na-egosi adịghị ike. (Ilu 16:32) Ma n’ime ezinụlọ ma n’ime ọgbakọ, ihe mgbaru ọsọ bụ ime ka e nwee ịhụnanya—ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, ịhụnanya n’ebe ibe anyị nọ, na ịhụnanya n’ebe ụkpụrụ ziri ezi dị. Ịhụnanya bụ ihe nkekọ kasịnụ nke ịdị n’otu na ihe kasị akwalị mmadụ ime ihe ziri ezi.—1 Ndị Kọrint 13:8, 13; Ndị Kọlọsi 3:14.

19. Olee ihe mmesi obi ike na-akasi obi nke Jehova na-enye, oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?

19 Ịmara Jehova bụ ịmata ike ya. Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Ị́ maghị? ị́ nụghị? Chineke nke mgbe ebighị ebi ka Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, bụ; Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya.” (Aịsaịa 40:28) Ike Jehova adịghị agwụ agwụ. Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ, ọ bụghịkwa n’ebe anyị onwe anyị nọ, ọ gaghị ahapụ anyị. Ọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.” (Aịsaịa 41:10) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ná nlekọta ịhụnanya ya? Dị ka Jisọs, ka anyị jiri ike ọ bụla Jehova na-enye anyị na-eme ihe mgbe nile iji nyere ndị mmadụ aka na iji wulie ha elu. Ka anyị chịkwaa ire anyị ka o wee na-enye ọgwụgwọ kama imerụ ahụ. Ka anyị na-echekwa nche n’ụzọ ime mmụọ mgbe nile, na-eguzosi ike n’okwukwe, ma na-adị ike n’ike nke Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke.—1 Ndị Kọrint 16:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ma eleghị anya, ndị Juu chọtara ihe odide mbụ nke Iwu Mosis, bụ́ nke e debere n’ụlọ nsọ ahụ ọtụtụ narị afọ gara aga.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú Jehova si eji ike ya eme ihe?

• N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi nweta ike Jehova?

• Olee otú e kwesịrị isi jiri ike nke ire na-eme ihe?

• Olee otú ikike Chineke na-enye pụrụ isi bụrụ ngọzi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs ji ike Jehova mee ihe iji nyere ndị ọzọ aka

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ịkpọsa Okwu Chineke dị n’ike aka anyị ma ọ bụrụ na obi anyị dị na ya