Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27

“Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”

“Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”

“Nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike. Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.”​—ỌMA 27:14.

ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. (a) Olee olileanya Jehova nyere anyị? (b) Gịnị ka inwe “olileanya n’ebe Jehova nọ” pụtara? (Kwuo ihe e dere ná “Nkọwakwu.”)

 JEHOVA nyere ndị niile hụrụ ya n’anya olileanya magburu onwe ya. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọrịa, iru uju, na ọnwụ kwụsị. (Mkpu. 21:3, 4) Ọ ga-enyere “ndị dị umeala n’obi” nwere olileanya n’ebe ọ nọ aka ime ka ụwa ghọọ Paradaịs. (Ọma 37:9-11) Ọ ga-emekwa ka o kwe omume ya na onye ọ bụla n’ime anyị ịdị ná mma karịa otú anyị na ya dị ugbu a. Olileanya a magburu onwe ya. Ma, olee ihe mere anyị ga-eji kweta na Jehova ga-emezu nkwa ya? Ọ bụ n’ihi na o nwebeghị mgbe o kwere nkwa ghara imezu ya. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị inwe “olileanya n’ebe Jehova nọ.” * (Ọma 27:14) Otú anyị si egosi na anyị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ bụ inwe ndidi ma jiri obi ụtọ chere ka Jehova mezuo nzube ya.​—Aịza. 55:10, 11.

2. Olee ihe Jehova merela?

2 Jehova egosila na ọ na-emezu nkwa ya. Ka anyị hụ otu ihe atụ. N’akwụkwọ Mkpughe, Jehova kwere nkwa na n’oge anyị a, ọ ga-achịkọta ndị si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile, mee ka ha jiri otu obi na-efe ya. Taa, ndị a pụrụ iche bụ “oké ìgwè mmadụ.” (Mkpu. 7:9, 10) N’agbanyeghị na ha bụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka si n’agbụrụ dị iche iche, asụsụ dị iche iche, nakwa n’ezinụlọ dị iche iche, ha dị ka otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, dị n’udo ma dịrịkwa n’otu. (Ọma 133:1; Jọn 10:16) Oké ìgwè mmadụ a na-ekwusasikwa ozi ọma ike. Ha na-adị njikere ịgwa onye ọ bụla chọrọ ige ntị na ha nwere olileanya na ụwa ọhụrụ na-abịa. (Mat. 28:19, 20; Mkpu. 14:6, 7; 22:17) Ọ bụrụ na i so n’oké ìgwè mmadụ a, o doro anya na ị naghị eji ọmarịcha olileanya a i nwere egwu egwu.

3. Gịnị ka Ekwensu chọrọ ime?

3 Ekwensu achọghị ka i nwee olileanya. Ihe ọ chọrọ bụ ime ka i kweta na Chineke ahụghị gị n’anya, nakwa na ọ gaghị emezu nkwa ndị o kwere. Ọ bụrụ na Ekwensu emee ka anyị gharazie inwe olileanya, anyị agaghịzi enwe obi ike. Anyị nwedịrị ike ịkwụsị ife Jehova. Anyị ga-amụta otú Ekwensu si gbalịa ime ka Job kwụsị inwe olileanya nakwa ime ka ọ kwụsị ife Jehova.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a? (Job 1:9-12)

4 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú Ekwensu si gbalịa ịmanye Job ka ọ kwụsị irubere Jehova isi. (Gụọ Job 1:9-12.) Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị ga-amụta n’akụkọ Job nakwa n’ihe mere anyị ji kwesị ịna-echeta na Chineke hụrụ anyị n’anya, nakwa na ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere.

EKWENSU GBALỊRỊ IME KA JOB KWỤSỊ INWE OLILEANYA

5-6. Gịnị mere Job n’otu ntabi anya?

5 Ihe nọ na-agara Job nke ọma. Ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Ezinụlọ ya buru ibu, dịkwa n’udo. Ọ bakwara ezigbo ọgaranya. (Job 1:1-5) Ma, n’otu ụbọchị, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Job gbazi aka ihe niile o nwere. Ihe mbụ mere ya bụ na anụ ụlọ ya niile nwụrụ. (Job 1:13-17) Ihe ọzọ mere ya bụ na ụmụ ya niile nwụrụ. Chegodị gbasara ụdị ọdachi ahụ. Ọ na-agbawa nne na nna obi ma otu nwa ha nwụọ. Chezie otú obi si gbawaa Job na nwunye ya mgbe ha matara na ụmụ ha iri anwụọla. Ka a sịkwa ihe mere Job ji dọwaa uwe ya mgbe ọ na-eru uju ma daa n’ala.​—Job 1:18-20.

6 Ihe ọzọ Setan mere Job bụ ịkpatara ya ọrịa na-asọ oyi. (Job 2:6-8; 7:5) E nwere mgbe Job bụbu onye a ma ama a na-akwanyere ùgwù n’obodo ha. Ndị mmadụ na-abịakwute ya ka ọ gwa ha ihe ha ga-eme. (Job 31:18) Ma ugbu a, ha niile na-agbaziri ya ọsọ. O yiziri onye a chụpụrụ achụpụ, ụmụnne ya, ndị enyi ya, na ndị na-ejere ya ozi ajụ ya.​—Job 19:13, 14, 16.

Ọtụtụ ụmụnna anyị taa ghọtara otú obi dị Job mgbe nsogbu nọ na-ezoro ya ka mmiri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. (a) Olee ebe Job chere na nsogbu ya si? Gịnị ka ọ na-ekweghị eme? (b) Olee nsogbu nwere ike ịbịara Onye Kraịst yiri ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a?

7 Ekwensu chọrọ ka Job kweta na ihe mere o ji na-ata ahụhụ bụ na ya na Jehova adịghịzi ná mma. Dị ka ihe atụ, Ekwensu mere ka oké ifufe kwatuo ụlọ ebe ụmụ Job iri nọ na-ekpori ndụ. (Job 1:18, 19) O mekwara ka ọkụ si n’eluigwe daa regbuo anụ ụlọ Job niile, ma ndị ohu ya na-elekọta ha. (Job 1:16) Ebe ọ bụ na ifufe ahụ na ọkụ ahụ si n’eluigwe, Job chere na ha si n’aka Chineke. N’ihi ya, Job kwetara na ọ ga-abụ na o nwere ihe o mere kpasuru Jehova iwe. N’agbanyeghị ya, Job ekweghị akpọ Nna ya nke eluigwe iyi. Job chetara na Jehova emeerela ya ọtụtụ ihe ọma kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi ya, ọ sịrị na ebe ọ bụ na obi dị ya ụtọ ịnabata ihe ọma si n’aka Jehova, o kwesịkwara ịdị njikere ịnabata ihe ọjọọ si n’aka ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ka a na-eto aha Jehova.” (Job 1:20, 21; 2:10) N’agbanyeghị na Job gbazi aka ụmụ ya na ihe o ji akpa afọ ya, ajọ ọrịa abịakwa ya, ọ kwụsịghị irubere Jehova isi. Ma, Setan akwụsịghị ịnwa ya.

8. Olee ihe ọzọ Ekwensu ji nwaa Job?

8 Ụzọ ọzọ Setan si nwaa Job bụ na o ji mmadụ atọ sịrị na ha bụ ndị enyi Job gbalịa ime ka o chee na o nweghị uru ọ bara. Ụmụ nwoke ndị ahụ kwuru na Job na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ndị o mere. (Job 22:5-9) Ha gbalịkwara ime ka o kweta na ọ bụrụgodị na ọ bụghị onye ọjọọ, na mbọ niile ọ na-agba ime ihe dị Jehova mma abaghị uru n’anya Chineke. (Job 4:18; 22:2, 3; 25:4) Ha ji ihe ndị ahụ ha kwuru na-agbalị ime ka Job chee na Chineke ahụghị ya n’anya, na ọ naghị elekọta ya, nakwa na ife ya abaghị uru. Ihe ndị a ha kwuru nwere ike ime ka Job chewe na nke ọ na-eme agwụla.

9. Gịnị nyeere Job aka inwe obi ike ma die nsogbu ya?

9 Weregodị ya na ị na-ahụ ihe na-eme. Job nọdụrụ ala ná ntụ, ahụ́ ana-afụ ya ezigbo ụfụ. (Job 2:8) Ndị enyi ya nọ na-ekwu na ọ bụghị ezigbo mmadụ, nakwa na e nweghị ihe ọ dị mma ya. Nsogbu ya niile ekweghị ya kuru ume ndụ. Ọ nọkwa na-eru uju ụmụ ya nwụrụ anwụ. Ná mbido, Job ekwughị ihe ọ bụla. (Job 2:13–3:1) Ọ bụrụ na ndị ahụ sị na ha bụ ndị enyi ya chere na nkịtị ahụ ọ gbara gosiri na ọ ga-ahapụ Jehova, ihe ahụ ha chere ezighị ezi. E nwere ebe o ruru, Job asị: “Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike.” (Job 27:5) O nwere ike ịbụ na Job welitere ihu ya, lee ha anya n’ihu, kwuzie ihe a o kwuru. Gịnị nyeere Job aka inwe ụdị obi ike a? N’agbanyeghị ahụhụ niile ọ tara, ma mgbe ọ dị ka ike ụwa ọ̀ gwụla ya, ọ kwụsịghị inwe olileanya na Chineke hụrụ ya n’anya ga-emecha mee ka nsogbu ya kwụsị. Ọ ma na ọ bụrụgodị na ya anwụọ, Jehova ga-akpọlite ya.​—Job 14:13-15.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EME KA JOB?

10. Gịnị ka akụkọ Job na-akụziri anyị?

10 Akụkọ Job na-akụziri anyị na Setan agaghị amanyeli anyị ịhapụ Jehova, nakwa na Jehova ma ihe niile na-eme ná ndụ anyị. Akụkọ Job nwekwara ike ịkụziri anyị ihe ndị ọzọ dị ezigbo mkpa. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Job.

11. Ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ịtụkwasị Jehova obi, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya? (Jems 4:7)

11 Ihe Job mere gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasị Jehova obi, anyị nwere ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị, nakwa na anyị nwere ike ịlụso Ekwensu ọgụ ma merie. Olee uru ọ ga-abara anyị? Baịbụl mesiri anyị obi ike na Ekwensu ga-esi n’ebe anyị nọ gbapụ.​—Gụọ Jems 4:7.

12. Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ si mee ka Job ghara inupụrụ Jehova isi?

12 Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Setan na-agbalị iji ụjọ ọnwụ mee ka anyị kwụsị irubere Jehova isi. Na nke Job, Setan kwuru na Job nwere ike ime ihe ọ bụla, ma inupụrụ Jehova isi, iji zọọ ndụ ya. Ma, ihe ahụ Setan kwuru abụghị eziokwu. Job enupụrụghị Jehova isi, ma mgbe ọ dị ya ka ọ̀ ga-anwụ. Obi siri ya ike na Jehova dị mma, nakwa na ọ ga-enyere ya aka idi nsogbu ya. Job nwere okwukwe na ọ bụrụgodị na Jehova enyereghị ya aka mgbe ọ dị ndụ, ọ ga-akpọlite ya n’ọdịnihu. Job kwetasiri ike na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na anyị ekwetasie ike na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, anyị agaghị enupụrụ Jehova isi ọ bụrụgodị na anyị anọrọ n’ọnụ ọnwụ.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji leba anya n’ụzọ ndị Setan si chọọ ime ka Job kwụsị irubere Jehova isi?

13 Anyị kwesịrị ileba anya n’ụzọ ndị Ekwensu gbalịrị isi mee ka Job kwụsị irubere Jehova isi n’ihi na ọ ka na-eme ụdị ihe ahụ taa. Legodị ihe Setan kwuru. Ọ sịrị: “Mmadụ [ọ bụghị naanị Job] nọrọ n’ọnụ ọnwụ, ọ ga-enye ihe niile o nwere ka ọ zọọ ndụ ya.” (Job 2:​4, 5) Ihe Setan na-ekwu bụ na anyị ejighị obi anyị niile hụ Jehova n’anya, nakwa na anyị ga-enupụrụ Chineke isi iji zọọ ndụ anyị. Ihe ọzọ Setan na-ekwu bụ na Chineke ahụghị anyị n’anya, nakwa na mbọ niile anyị na-agba ime ihe dị ya mma agbasaghị ya. Ụgha ndị a Setan na-agha agaghị emegharị anyị anya n’ihi na anyị ma na ihe Setan chọrọ ime bụ ka anyị kwụsị ife Chineke.

14. Gịnị ka ọnwụnwa ndị na-abịara anyị nwere ike igosi gbasara anyị? Mee ihe atụ.

14 Anyị kwesịrị ịna-ele ọnwụnwa ndị na-abịara anyị anya ka ụzọ ndị anyị ga-esi na-amụtakwu gbasara onwe anyị. Ọnwụnwa ndị bịaara Job nyeere ya aka ịchọpụta ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma ma mewe nke ọma na ha. Dị ka ihe atụ, ọ chọpụtara na o kwesịrị ịmụtakwu ịdị umeala n’obi. (Job 42:3) Anyị nwekwara ike isi n’ọnwụnwa ndị na-abịara anyị chọpụta ọtụtụ ihe gbasara onwe anyị. O nwere otu nwanna aha ya bụ Nikolay. * A tụrụ ya mkpọrọ n’agbanyeghị na ezigbo ahụ́ adịghị ya. Ọ sịrị: “Ụlọ mkpọrọ dị ka ahụ́ e lere mmadụ. Ọ na-eme ka anyị mata àgwà Ndị Kraịst anyị kwesịrị inwekwu.” Ọ bụrụ na anyị achọpụta ebe ndị anyị na-anaghị eme nke ọma, anyị ga-agbazi mbọ mewe nke ọma n’ebe ndị ahụ.

15. Ònye ka anyị kwesịrị ịna-ege ntị, n’ihi gịnịkwa?

15 Anyị kwesịrị ige Jehova ntị, ọ bụghị ndị iro anyị. Job gere ezigbo ntị mgbe Jehova na-agwa ya okwu. Chineke jụrụ Job ajụjụ ndị mere ka o chee echiche. Ọ dị nnọọ ka Chineke ọ̀ na-asị ya: ‘Ị̀ hụrụ ụdị ike m ji kee ihe ndị m kere? Ama m ihe niile merela gị. Ì chere na agaghị m elekọta gị?’ Job weturu obi kwuo ihe ndị gosiri na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma niile Chineke meere ya. Ọ sịrị: “Ntị m anụla banyere gị. Ma ugbu a, eji m anya m na-ahụ gị.” (Job 42:5) Mgbe Job kwuru ihe ahụ, ọ ga-abụ na ọ ka nọ ọdụ ná ntụ, ọnyá eju ya ahụ́, ya aka na-erukwa uju ọnwụ ụmụ ya. N’agbanyeghị ihe ndị a, Jehova mere ka Job ghọta na ọ hụrụ ya n’anya, meekwa ka obi sie ya ike na ihe ya masịrị ya.​—Job 42:​7, 8.

16. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 49:15, 16, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma ọnwụnwa bịara anyị?

16 Taa, ndị mmadụ nwekwara ike ịna-akparị anyị ma ọ bụkwanụ na-emeso anyị ka ndị na-enweghị uru ha bara. Ha nwere ike ịna-agbalị ikwutọ anyị ma ọ bụ nzukọ Jehova, “na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile na-abụghị eziokwu banyere” anyị. (Mat. 5:11) Akụkọ Job na-akụziri anyị na obi siri Jehova ike na anyị ga na-erubere ya isi n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara anyị. Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ gaghịkwa agbahapụ ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ. (Gụọ Aịzaya 49:​15, 16.) Egela ụgha ọ bụla ndị iro Chineke na-agha gbasara anyị iji mebie aha anyị. E nwere otu nwanna si Tọki aha ya bụ James. Ọtụtụ ọnwụnwa tara akpụ bịaara ndị ezinụlọ ya. Ọ sịrị: “Anyị chọpụtara na ige ụgha ndị mmadụ na-agha gbasara ndị Chineke ga-eme ka anyị daa mbà. N’ihi ya, anyị lekwasịrị anya n’olileanya anyị nwere na Alaeze Chineke ga-abịa, na-agbasikwa mbọ ike n’ozi Jehova. Ihe a mere ka anyị na-enwe obi ụtọ.” Anyị na-ege Jehova ntị ka Job. Ụgha ndị iro anyị na-aghagide anyị anaghị eme ka anyị kwụsị inwe olileanya.

OLILEANYA GỊ GA-ENYERE GỊ AKA

Jehova gọziri Job n’ihi na o rubeere ya isi. Ya na nwunye ya biri ogologo ndụ, ngọzi Jehova zukwara ha ahụ́ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Gịnị ka ị mụtara n’aka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị rubeere Jehova isi e kwuru okwu ha ná Ndị Hibru isi nke 11?

17 E wepụ Job, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-akwụsịghị inwe obi ike mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara ha. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, o kwuru gbasara ọtụtụ ndị, kpọọ ha “oké ìgwè ndị àmà.” (Hib. 12:1) Ọnwụnwa ndị tara akpụ bịaara ha niile, ma ha rubeere Jehova isi ná ndụ ha niile. (Hib. 11:​36-40) Ntachi obi ha na ọrụ ha rụsiri ike ọ̀ lara n’iyi? Mbanụ. N’agbanyeghị na Chineke emezughị nkwa ya niile n’oge ha dị ndụ, ha akwụsịghị inwe olileanya n’ebe Jehova nọ. Ha kwetasiri ike na ha ga-ahụ mgbe a ga-emezu nkwa ndị ahụ n’ihi na obi siri ha ike na ha na Jehova dị ná mma. (Hib. 11:​4, 5) Akụkọ ha ga-eme ka anyị kpebisie ike ịna-enwe olileanya n’ebe Jehova nọ.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime? (Ndị Hibru 11:6)

18 Ụwa anyị bi n’ime ya na-akakwu njọ. (2 Tim. 3:13) Ekwensu akwụsịbeghị ịnwa ndị Chineke. N’agbanyeghị nsogbu ndị ga-abịa n’ọdịnihu, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-arụsi ọrụ ike n’ofufe Jehova, obi esie anyị ike na “anyị tụkwasịrị Chineke dị ndụ obi.” (1 Tim. 4:10) Cheta na ihe Jehova mechara meere Job gosiri na “ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.” (Jems 5:11) Ka anyịnwa na-erubekwara Jehova isi. Ka obi siekwa anyị ike na “ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”​—Gụọ Ndị Hibru 11:6.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

^ Ọ bụrụ na e kwuwe gbasara onye diri ọtụtụ nsogbu, anyị na-echetakarị Job. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ nwoke a rubeere Jehova isi? Anyị na-amụta na Ekwensu agaghị amanyeli anyị ịhapụ Jehova, nakwa na Jehova ma otú ihe si dịrị anyị. Otu ụbọchị, Jehova ga-eme ka ahụhụ niile anyị na-ata kwụsị otú ahụ o si mee ka nke Job kwụsị. Ọ bụrụ na ihe ndị anyị na-eme egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-eme ihe ndị a, anyị so ná ndị na-enwe “olileanya n’ebe Jehova nọ.”

^ NKỌWAKWU: Okwu Hibru a sụgharịrị “olileanya” pụtara ichere ka ihe mee ma na-atụsi anya ya ike. O nwekwara ike ịpụta ịtụkwasị mmadụ obi.​—Ọma 25:2, 3; 62:5.

^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ NKỌWA FOTO: Ebe Job na nwunye ya na-ele ebe ụlọ dagburu ụmụ ha.

^ NKỌWA FOTO: Job tachiri obi n’ọnwụnwa niile bịaara ya. Ya na nwunye ya nọ na-eche gbasara ihe ọma ndị Jehova meere ha na ezinụlọ ha.