Job 4:1-21

  • Okwu mbụ Elifaz kwuru (1-21)

    • O kwuru na aka Job adịghị ọcha (7, 8)

    • Ihe otu mmụọ gwara ya (12-17)

    • ‘Chineke atụkwasịghị ndị ohu ya obi’ (18)

4  Elifaz+ onye Timan wee sị:   “Ọ bụrụ na mmadụ agbalịa ka ọ gwa gị okwu, ike ọ̀ ga-agwụ gị ige ya ntị? Ma ònye ga-agbachili nkịtị ghara ikwu okwu?   N’eziokwu, ị kụzierela ọtụtụ ndị ihe. Ị na-agbabu ndị ike gwụrụ ume.   Okwu gị na-agba onye ọ bụla na-ada mbà ume,Ị na-emekwa ka ndị chọrọ ịda ada kwụsie ike.   Ma ugbu a, nsogbu abịarala gị, ike ụwa agwụ gị. O ruola gị ahụ́, gị adaa mbà.   Ọ̀ bụ na nsọpụrụ ị na-asọpụrụ Chineke anaghị eme ka obi sie gị ike? Ọ̀ bụ na otú i si kwụsie ike n’ebe Chineke nọ+ anaghị eme ka i nwee olileanya?   Biko, è nwetụla onye aka ya dị ọcha i chetara nwụchuru ọnwụ? Olee mgbe e bibitụrụla onye ezi omume?   Ihe m hụrụla bụ na ndị na-akụ ihe ọjọọ ka mkpụrụNa ndị na-agha nsogbu ka mkpụrụ ga-aghọrọ otu ihe.   Ume Chineke kupụrụ na-ebibi ha,Ha na-anwụkwa ma o wee ezigbo iwe. 10  Ọdụm na-agbọ ụja, nwa ọdụm na-abakwa mba,Ma a na-agbaji ezé ọdụm siri ike. 11  Ọdụm na-anwụ n’ihi na e nweghị anụ ọ ga-eri,Ụmụ ọdụm na-agbasasịkwa. 12  E nwere okwu a gwara m na nzuzo. A takwunyeere m ya ná ntị. 13  N’abalị, mgbe ndị mmadụ nọ n’oké ụra,M hụrụ ọhụụ mere ka obi ghara izu m ike. 14  Ezigbo ụjọ jidere m,Ọkpụkpụ m niile ana-ama jijiji. 15  Otu mmụọ gafere n’ihu m,Akpata oyi awụọ m n’ahụ́. 16  Ọ kwụụrụ otu ebe,Ma amataghị m ihe ọ bụ. E nwere ihe guzo n’ihu m. Ebe niile dara jụụ, m wee nụ otu olu nke sịrị: 17  ‘Mmadụ efu ò nwere ike ịka Chineke bụrụ onye ezi omume? Mmadụ ò nwere ike ịka Onye kere ya bụrụ onye aka ya dị ọcha?’ 18  Lee, ọ tụkwasịghị ndị ohu ya obi,Ọ na-atakwa ndị mmụọ ozi ya* ụta, 19  Ma ya fọdụzie ndị mmadụ e ji ájá kpụọ,Ndị bụ́kwa naanị ájá,*+Ndị a na-azọpịa ọsọ ọsọ ka egu.* 20  Ha nọ ndụ n’ụtụtụ, ma tupu mgbede eruo, a zọpịachaala ha. A na-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi, e nweghịkwa onye na-ama. 21  Ọ̀ bụ na ha adịghị ka ụlọikwuu e fopụsịrị ụdọ e ji jide ya efopu? Ha na-anwụ n’amaghị ihe ọ bụla.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị na-ejere ya ozi.”
Na Hibru, “fọdụzie ndị bi n’ụlọ ájá, ndị a tọrọ ntọala ha n’ájá.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.