ABỤ NKE 150

Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

(Zefanaya 2:3)

  1. 1. Mba niile bịara

    Ka ha buso Kraịst agha.

    Ma, Jehova sị n’o ruola

    K’ọchịchị ’madụ kwụsị.

    Ọchịchị h’agwụla.

    K’Al’eze Chineke chịa.

    Jizọs g’ebibin-d’iro niile.

    Ọ g’eme n’egbugh’oge.

    (UKWE)

    Chọọ Chineke k’o chebe gị.

    N’atụkwasị Chinek’obi.

    Chọọ ezio-mume.

    Fewe Chineke.

    N’akwado naanị Chineke.

    Jehova g’anapụta gị

    N’ụbọch’iwe ya.

  2. 2. Anyị ga n’ezi ha

    Ozi Jehova ziri,

    Ka ha jir’aka ha kpebie

    Ma hà g’anụ m’ọ bụ jụ.

    Nsogbu bịar’anyị,

    K’anyị ghar’ịtụ egwu.

    Anyị ma na Jehova nọ ya.

    Anyị kpọọ ya, ọ g’aza.

    (UKWE)

    Chọọ Chineke k’o chebe gị.

    N’atụkwasị Chinek’obi.

    Chọọ ezio-mume.

    Fewe Chineke.

    N’akwado naanị Chineke.

    Jehova g’anapụta gị

    N’ụbọch’iwe ya.