Ị̀ Maara?
Olee otú ndị mgbe ochie si agụ afọ na ọnwa?
N’ALA NKWA ahụ, afọ ndị Juu na-ebido ma a malite ịkọ ihe. Ọ na-abụ n’ọnwa Septemba ma ọ bụ Ọktoba.
Ọ na-abụ ọnwa ọhụrụ pụta, ha ebido ịgụ otu ọnwa. Otu ọnwa na-abụ abalị iri abụọ na itoolu ma ọ bụ iri atọ. Ha na-eji anyanwụ agụ afọ. Ma, otu afọ e ji ọnwa ọhụrụ gụọ anaghị aharu ka afọ e ji anyanwụ gụọ. N’ihi ya, ha kwesịrị ịchọta otú ha ga-esi eme ka ha abụọ hara. Otú ha si mee ya bụ itinye ụbọchị ụfọdụ, ma ọ bụ ha nọkata, ha etinye otu ọnwa. O nwere ike ịbụ tupu afọ ọzọ amalite. Ihe a na-eme ka mgbe afọ ọzọ ga-amalite daba na mgbe a na-amalite ịkọ ihe ma gwụ mgbe a na-aghọrọ ihe a kụrụ.
Ma n’oge Mosis, Chineke gwara ndị ya na n’ihe gbasara ofufe ya, otu afọ ga-ebido n’ọnwa Ebib ma ọ bụ Naịsan, ya bụ, ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel n’oge anyị a. (Ọpụ. 12:2; 13:4) Ha na-eji ọka bali a ghọtara n’ubi eme ememme ha na-eme n’oge ahụ.—Ọpụ. 23:15, 16.
Otu ọkà mmụta kwuru na ọ na-adị mfe ịmata mgbe a ga-etinye otu ọnwa n’afọ. O kwuru na Ememme Ngabiga a na-eme mgbe ọnwa gbazuru n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan ga-abụrịrị n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel, n’oge e nwechara ehihie na abalị há nhata. N’ihi ya, ọ bụrụ na a chọpụta n’ebe ngwụcha afọ na Ememme Ngabiga ga-adaba tupu ọnwa agbazuo, ha na-etinye otu ọnwa tupu ọnwa Naịsan.
Ndịàmà Jehova na-eburu ihe a n’obi ma ha kpebiwe mgbe ha kwesịrị iji mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ na-adabakarị n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel nakwa n’ụbọchị dabara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan na kalenda ndị Hibru. A na-agwa ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile ụbọchị ọ dabara tupu oge eruo. *
Ma, olee otú ndị Juu si ama mgbe otu ọnwa gwụrụ, ọnwa ọzọ amalite? Taa, i nwere ike ile anya na kalenda ma ọ bụkwanụ gị ejiri ekwentị gị mata mgbe ọnwa gwụrụ ma ọ bụkwanụ mgbe ọnwa malitere. Ma, ọ dịghị mfe otú ahụ n’oge ochie.
Otu ọnwa na-abụ ụbọchị iri atọ n’oge Iju Mmiri Noa. (Jen. 7:11, 24; 8:3, 4) Ka oge na-aga, a kụghịzi ya ntu na ọ bụ abalị iri atọ ga-abụ otu ọnwa. Na kalenda ndị Hibru, otu ọnwa na-ebido ma ha hụhaala ọnwa ọhụrụ. Ọ na-abụ mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na itoolu ma ọ bụ iri atọ mgbe ọnwa bu ụzọ malitechara.
E nwere mgbe Devid na Jonatan kwuru gbasara ọnwa ọhụrụ. Ha sịrị: “Echi bụ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.” (1 Sam. 20:5, 18) N’ihi ya, o yiri ka n’oge ahụ, à na-agbakọ mgbe ọnwa ọhụrụ ga-amalite tupu ya amalite. Olee otú ndị Izrel si amata mgbe ọnwa ọhụrụ malitere? Akwụkwọ a na-akpọ Mishna e dere iwu ndị Juu e nyere n’ọnụ ga-enyere anyị aka. O kwuru na mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta, ọ bụ ndị Sanhedrin, ya bụ, ụlọikpe ndị Juu nke kacha elu, na-ekwu mgbe ọnwa ọhụrụ ga-amalite. N’ime ọnwa asaa a na-eme ememme dị iche iche, ndị Sanhedrin na-ezukọ n’abalị iri atọ n’ọnwa. Ọ bụ hanwa na-ekpebi mgbe ọnwa ọzọ ga-amalite. Olee otú ha si ekpebi ya?
Ụmụ nwoke ụfọdụ na-anọ n’ebe ndị dị elu na Jeruselem n’abalị, na-ele eluigwe anya ka ha mara mgbe ọnwa ọhụrụ ga-apụta. Ha na-agwa ndị Sanhedrin ozugbo. Ozugbo ndị Sanhedrin nụrụ ihe mere ka o doo ha anya na a hụla ọnwa ọhụrụ, ha na-ekwuzi na ọnwa ọhụrụ amalitela. Ọ bụrụkwanụ na urukpuru ekpuchie eluigwe, mee ka ụmụ nwoke ndị ahụ ghara ịma
mgbe ọnwa ọhụrụ pụtawara? A na-ekwuzi na ọnwa ahụ ha ka nọ na ya nwere mkpụrụ ụbọchị iri atọ, ọnwa ọhụrụ amalitezie.Akwụkwọ ndị Juu ahụ a na-akpọ Mishna kọwara na a na-amụnye ọkụ n’elu Ugwu Oliv dị nso na Jeruselem iji mee ka ndị mmadụ mara na ọnwa ọhụrụ amalitela. A na-amụnyekwa ọkụ n’ebe ndị ọzọ dị elu n’Izrel niile iji mee ka ndị mmadụ mata na ọnwa ọhụrụ amalitela. Ka oge na-aga, a na-ezipụ ndị ozi ka ha gaa kwuo ya. Ọ bụ otú a ka a na-esi agwa ndị Juu niile nọ na Jeruselem nakwa n’ebe ndị ọzọ na ọnwa ọhụrụ amalitela. Ha niile ga-enwezi ike ime ememme ndị ha na-eme n’otu oge.
Chaatị dị n’okpuru ebe a nwere ike inyere gị aka ịghọta ọnwa ndị Juu, ememme ha, na oge dị iche iche dị na kalenda ha.
^ Gụọ Ụlọ Nche February 15, 1990, peeji nke 15, nakwa “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche December 15, 1977.