Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

Gịnị Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

 Echiche nke Bible

Gịnị Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

CHINEKE ekeghị ụmụ ya bụ́ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 8:20, 21) N’eziokwu, n’oge mbụ Jehova gwara Adam banyere ọnwụ, o kwughị na ọ bụ ihe mmadụ kwesịrị ịtụ anya na ọ ga-emecha bịara ya. Kama, o kwuru na ọ bụ ahụhụ a ga-enye mmadụ ma o nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:17) Adam ghọtara ihe ọnwụ bụ n’ihi na ọ hụtụla ka ụmụ anụmanụ nwụrụ.

Adam mere mmehie ma kwụọ ụgwọ mmehie ya site n’ịnwụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri atọ. (Jenesis 5:5; Ndị Rom 6:23) Ebe ọ bụ na a chụpụrụ ya ka ọ ghara isokwa n’ezinụlọ Chineke n’ihi isi o nupụrụ, a kwụsịrị iwere ya dị ka nwa Chineke. (Deuterọnọmi 32:5) Bible kwuru banyere ihe ọjọọ nnupụisi ahụ wetaara ụmụ mmadụ. Ọ sịrị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata  n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile.”—Ndị Rom 5:12.

Gịnị Na-eme Echiche Mmadụ Mgbe Mmadụ Nwụrụ?

Bible sịkwara: “Ihe na-adabara ụmụ mmadụ, ihe na-adabakwara anụmanụ; ọbụna otu ihe ahụ na-adabara ha: dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; ee, otu mmụọ ka ha nile nwere; ọ dịghịkwa ọkaaka mmadụ nwere karịa anụmanụ: n’ihi na ha nile bụ ihe efu. Ha nile na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” (Eklisiastis 3:19, 20) Gịnị ka ịlaghachi n’ájá pụtara?

Okwu ahụ bụ́ ‘ịlaghachi n’ájá’ na-echetara anyị ihe Chineke gwara mmadụ mbụ. Ọ sịrị ya: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Ihe nke a pụtara bụ na ụmụ mmadụ bụ anụ ahụ́ e kere eke otú ụmụ anụmanụ bụ. Anyị abụghị ndị mmụọ e yikwasịrị anụ ahụ́. Ikike iche echiche anyị na-akwụsị ịrụ ọrụ mgbe ahụ́ anyị lara n’iyi. Lee ihe Bible kwuru banyere mmadụ nke na-anwụ anwụ: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.

Ọ bụrụ na ọ bụ ihe a na-eme echiche mmadụ mgbe mmadụ nwụrụ, gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Okwu Chineke zara ajụjụ a n’ụzọ doro anya, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ọnwụ abụghị enyi nke na-akpọbata anyị ná ndụ ka mma. Kama nke ahụ, Bible kpọrọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ,” n’ihi na ọ na-akwụsị ihe nile anyị na-eme. (1 Ndị Kọrint 15:26; Eklisiastis 9:10) Nke a ọ̀ pụtara na mgbe mmadụ nwụrụ olileanya adịghịziri ya?

Ozi Ọma Banyere Ọnwụ

Nye ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ anwụ, ọnwụ ha nwụrụ yiri ebe mmadụ na-ehi ụra nke ọ ga-emecha teta. Otu mgbe, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere enyi ha nwụrụ anwụ, sị: “Lazarọs enyi anyị agawo izu ike, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya n’ụra.” Mgbe Jizọs na-aga n’ili ncheta ahụ, ọ hụrụ ìgwè mmadụ na-eru újú. Mgbe ọ garuru, o nyere iwu ka e meghee ili ahụ. Mgbe e meghere ya, o tiri mkpu n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta!” Nwoke ahụ nwụworo anwụ ruo ụbọchị anọ pụtara. (Jọn 11:11-14, 39, 43, 44) Ebe ọ bụ na anụ ahụ́ Lazarọs erewela ure, Jizọs gosiri na Chineke nwere ike icheta ihe nile banyere ndị nwụrụ anwụ—ụdị ndị ha bụ, ikike ha nwere icheta ihe, nakwa otú ha dị n’ile anya. Ọ ga-emeli ka ha dị ndụ ọzọ. N’oge ọzọ Jizọs sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [ya bụ, olu Jizọs] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

Bible zikwara anyị ozi ọma ọzọ. Ọ sịrị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26) A gaghịkwa enwe mgbe ndị na-eru uju ga-agawa ebe a na-eli ozu ka ha lie onye ha hụrụ n’anya. Bible sịrị: “Ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Ọ̀ bụ na i kweghị na echiche Bible banyere ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ na-akasi anyị obi?

Ì CHETỤWO NKE A N’ECHICHE?

▪ Ndị nwụrụ anwụ hà ma ihe na-emenụ?—Eklisiastis 9:5.

▪ Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ olileanya ọ̀ dịghịziri ya?—Jọn 5:28, 29.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 31]

“Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4