Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Papa M na Mama M Sewe Okwu?

Ọ DỊGHỊ ihe ị ga-eme ka okwu papa gị na mama gị na-ese ghara ịgbasa gị. A sị ka e kwuwe, ị hụrụ ha n’anya. Ọ bụkwa ha ka i lekwasịrị anya ka ha na-akwado gị. Ya mere, ọ bụrụ na ha ebighị n’udo, ọtụtụ ihe nwere ike ịdị na-echegbu gị. Olee ihe mere o ji adị mgbe ụfọdụ ka okwu anaghị adabara papa gị na mama gị?

Otú Ha Si Ele Ihe Anya Na-adị Iche Mgbe Ụfọdụ

Jizọs sịrị na mgbe nwoke na nwanyị lụrụ, ha aghọọla “otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5) Ma, nke ahụ ọ̀ pụtara na otú papa gị si ele ihe anya ka mama gị ga-esi ele ihe anya mgbe nile? Mbanụ. O doro anya na mmadụ abụọ ọ bụla—ọbụna di na nwunye bụ́ ndị e jikọtara ọnụ n’ezie—agaghị ekwe ihe ibe ha kwuru mgbe ụfọdụ.

Ọ bụrụ na papa gị ekweghị ihe mama gị kwuru ma ọ bụkwanụ na mama gị ekweghị ihe papa gị kwuru n’ihe ụfọdụ, ọ pụtaghị na ha achọwala ikewa. O yiri nnọọ ka papa gị na mama gị hà ka hụrụ onwe ha n’anya—ọ bụ ezie na ha na-akpasu ibe ha iwe mgbe ụfọdụ. Gịnịzi mere ha ji ese okwu? Ikekwe, ọ bụ maka na otú ha si ele ihe ụfọdụ anya anaghị abụ otu. Ọ bụghịkwa mgbe nile ka nke ahụ dị njọ. Ọ naghịkwa egosi na ha agaghị alụzikwa.

Iji maa atụ: Ò nwetụla mgbe gị na ezigbo ndị enyi gị na-ekiri fim, gị achọpụta na otú i si lee ihe unu na-ekiri anya dị iche n’otú ha si lee ya anya? Nke a nwere ike ime eme. Ọbụna ndị dị n’ezigbo mma adịghị ele ihe anya otu ụzọ mgbe nile.

O nwere ike ịdị otú ahụ n’ebe ndị mụrụ gị nọ. Ikekwe, ha abụọ na-echegbu onwe ha banyere ego a ga-eji na-elekọta ezinụlọ unu. Ma, onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ụzọ dị iche o si ele otú a ga-esi na-emefu ego anya. Ha abụọ chọrọ ka ezinụlọ unu gaa ebe ọzọ n’oge ezumike. Ma, ihe otu onye chere a ga-eme n’ebe ahụ iji tụrụ ndụ abụghị ihe onye nke ọzọ chere. Ma ọ bụkwanụ, ha abụọ chọsiri ike ka i mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ma, ihe ha chere banyere ụzọ kacha mma a ga-esi kpalie gị ka i mewe nke ọma abụghị otu. Isi ihe ị ga-eburu n’uche bụ na mmadụ na ibe ya ịdị n’otu apụtaghị na ihe otu onye chere ka onye nke ọzọ ga-eche. Ọbụna mmadụ abụọ e jikọrọ ọnụ, ha wee ghọọ otu anụ ahụ́, nwere ike inwe ọdịiche n’otú ha si ele ihe anya.

Ma, gịnị mere papa gị na mama gị ji ekwe mgbe ụfọdụ ka ọdịiche nke dị n’otú ha abụọ si ele ihe anya sewere ha okwu? Gịnị mere ha ga-eji sewe okwu mgbe ha na-akparịta ụka nanị maka na onye nke a kwuru ihe dị ya n’obi, onye nke ọzọ ekwuokwa ihe dị ya n’obi?

Ike Ezughị Okè Na-akpa

Ọ bụ ezughị okè na-akpata ọtụtụ okwu di na nwunye na-ese. Bible sịrị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ  ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè.” (Jems 3:2) Papa gị na mama gị ezughị okè. Gị onwe gị ezughịkwa okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nile na-ekwu ihe anyị na-ebuchaghị n’obi ikwu. Mgbe ụfọdụkwa, okwu anyị kwuru nwere ike ịfụ ụfụ dị ka “ndụpu nke mma agha.”—Ilu 12:18.

Ikekwe, ị hụla ebe gị onwe gị mere ihe yiri nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike icheta mgbe onye gị na ya dị ná mma sere ezigbo okwu? Ma eleghị anya, i nwere ike icheta. Otu onye na-eto eto nke aha ya bụ Marie * kwetara na “o nweghị onye ga-asị na ya na mmadụ esetụbeghị okwu. N’eziokwu, ọ bụ ndị m kacha hụ n’anya kacha akpasu m iwe. Ma eleghị anya, ihe kpatara ya bụ na ihe m na-atụ anya ka ha mee karịrị akarị!” Di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-atụ anya ọtụtụ ihe n’aka ibe ha ebe ọ bụ na ihe Bible kwuru ka di na nwunye na-eme abụghị obere ihe. (Ndị Efesọs 5:24, 25) Ebe ọ bụ na ha ezughị okè, tupu ị mara ihe na-emenụ, otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ emehiela. Bible sịrị: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23; 5:12.

Ya mere, o kwesịghị ịbụ ihe iju anya na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, papa gị na mama gị ga na-ese okwu mgbe ụfọdụ. N’eziokwu, Pọl onyeozi dere na di na nwunye ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha” ma ọ bụ “ihe mgbu na iru újú,” dị ka The New English Bible si sụgharịa ya. (1 Ndị Kọrint 7:28) E nwere ụfọdụ ihe nwere ike ime ka ahụ́ gbakasịwa ha n’ụlọ—ọ bụrụ na onyeisi ha n’ụlọ ọrụ bụ onye ọ na-esi ike imeta mma, ọ bụrụ na okporo ụzọ ekweghị ọgịga, ọ bụrụ na e wetaara ha akwụkwọ ka ha gaa kwụọ ụgwọ ha na-atụghị anya ya.

Ọ bụrụ na ị ghọta na papa gị na mama gị ezughị okè, nakwa na mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbakasịwa ha, ọ ga-enyere gị aka ile esemokwu ha anya otú kwesịrị ekwesị. Marie chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Papa m na mama m na-enwe nghọtahie ugbu a karịa ka ha na-enwebu. Mgbe ụfọdụkwa, m na-eche ma ọ̀ ga-abụ na ihe ha agbụla ibe ha. Ma, mgbe ahụ m na-asị onwe m, ‘Ọ̀ bụ na ị ghọtaghị ihe na-aga—ịlụ di na nwunye afọ iri abụọ na ise na ịzụ ụmụ ise adịghị mfe?’” Ma eleghị anya, gị onwe gị kwa nwere ike igosi na ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi’ site n’ịghọta na papa gị na mama gị bu nnukwu ibu.—1 Pita 3:8.

Otú Ị Ga-esi Die Ihe Ndị Na-emenụ

O nwere ike ịbụ na i kwetara na papa gị na mama gị ezughị okè, marakwa na ọtụtụ nsogbu na-abịara ha kwa ụbọchị. Ma, ajụjụ bụ, Gịnị ka i nwere ike ime mgbe ha na-ese okwu? Gbasoo aro ndị a:

Etinyerela ha ọnụ. (Ilu 26:17) Ọrụ gị abụghị inye ndụmọdụ banyere otú e si alụ di na nwunye ma ọ bụ idoziri papa gị na mama gị okwu. Itinyere ha ọnụ yiri ka ọ̀ bụ gị ka ọ ga-emebiri ihe. Charlene, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, sịrị: “O nweela oge ndị m nwara itinyere ha ọnụ. Ma ha na-agwa m ka m ghara itinyere ha ọnụ.” Hapụ papa gị na mama gị ka ha dozie nsogbu ha.

Lee ihe ndị na-emenụ anya otú kwesịrị ekwesị. (Ndị Kọlọsi 3:13) Dị ka e kwuru na mbụ, okwu papa gị na mama gị na-ese mgbe ụfọdụ apụtaghị  nnọọ na ha achọwala ikewa. Ya mere, ekwela ka okwu ha na-ese mgbe ụfọdụ mee ka egwu na-enweghị isi tụwa gị. Melanie, bụ́ onye dị afọ iri abụọ, kwuru banyere mama ya na papa ya, sị: “Ọ bụrụgodị na ha lụọ ọgụ, amaara m na ha ka hụrụ onwe ha n’anya, hụkwa ezinụlọ ha n’anya. Ha ga-edozi ya.” Papa gị na mama gị nwekwara ike ime otu ihe ahụ ma ha see okwu.

Tinye ihe ndị na-echegbu gị n’ekpere. Ekwela ka ihe i bu n’obi na-anyịgbu gị. Bible sịrị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Ekpere nwere ike inyere gị aka nke ukwuu. Pọl onyeozi degaara ndị Filipaị akwụkwọ, sị: “Meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Lekọta onwe gị. Ọ baghị uru ka i chegbuwe onwe gị maka ihe ị na-agaghị emekwatali. Ime otú ahụ nwere ike ibutere gị ọrịa, meekwa ka ị ghara inwe obi ụtọ. Bible sịrị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” (Ilu 12:25) Gbalịa ka nchegbu ị na-enwe belata. Ọ ga-ebelata ma ọ bụrụ na i wepụta oge ka gị na ndị enyi gị na-agba ume na-anọrị nakwa ma ọ bụrụ na ị rụọ ọrụ ndị ga-adị gị mma n’ahụ́.

Gwa papa gị na mama gị okwu. Ọ bụ ezie na i kwesịghị itinye ọnụ n’okwu papa gị na mama gị na-ese, i nwere ike ime ka ha mara otú esemokwu ha si enye gị nsogbu. Họrọ oge kwesịrị ekwesị ị ga-agakwuru ha. (Ilu 25:11) Jiri “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” gwa ha okwu. (1 Pita 3:15) Ebola ha ebubo. Nanị ihe ị ga-eme bụ ịkọwara ha otú esemokwu ha si enye gị nsogbu.

Gbalịa tinye aro ndị a a tụrụ n’ebe a n’ọrụ. Papa gị na mama gị nwekwara ike imezi ihe n’ihi mgbalị ị na-eme. Ọ bụrụgodị na ha emeghị otú ahụ, ị ga-enwe obi ụtọ na, ọ bụ ezie na ị nweghị ike ịchịkwa papa gị na mama gị, i nwere ike ime ihe banyere ihe ndị ị na-eme mgbe ha na-ese okwu.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . ” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 12 A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Gịnị mere o ji esiri ndị mụrụ ụmụ ike mgbe ụfọdụ ibi n’udo?

▪ Olee ihe ị ga-agwa nwanne gị nta bụ́ onye okwu papa gị na mama gị na-ese na-enye nsogbu nke ukwuu?

[Igbe dị na peeji nke 20]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

A ga-enwerịrị nghọtahie mgbe ụfọdụ n’alụmdi na nwunye. Ma, ọ bụ unu ka ọ dịịrị ikpebi otú unu ga-esi dozie nghọtahie nke unu. Okwu ndị nne na nna na-ese na-enye ụmụ ha nsogbu nke ukwuu. E kwesịghị iji nke a gwurie egwu, ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye unu bụụrụ ụmụ unu ihe nlereanya nke ha nwere ike iso ma ha lụọ di ma ọ bụ nwunye. (Ilu 22:6) Ọ́ gaghị aka mma ka unu were nghọtahie unu nwere dị ka ohere unu ga-eji gosi ụmụ unu ụzọ ndị kacha mma isi dozie esemokwu? Gbalịanụ ka unu mee ihe ndị a e kwuru n’okpuru:

Na-egenụ ibe unu ntị. Bible gwara anyị ka anyị ‘dị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.’ (Jems 1:19) Unu emela ka ihe ka njọ site ‘n’iji ihe ọjọọ akwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) Ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị achọghị ige gị ntị, gị onwe gị nwere ike ikpebi ige ya ntị.

Gbalịa ka i kwuo otú obi dị gị, ọ bụghị ịkatọ onye nke ọzọ. Jiri olu dị nwayọọ gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị otú omume ya si enye gị nsogbu. (“Obi anaghị adị m mma ma i . . . ”) Gbalịa ka ị ghara ibo di gị ma ọ bụ nwunye gị ebubo na ịkatọ ya. (“Ị naghị eche banyere m.” “Ọ dịghị mgbe ị na-ege m ntị.”)

Kwuonụ ya mgbe ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ọ kacha mma ka unu kwụsịtụgodị ihe unu na-ekwu banyere nsogbu ahụ ma kwuchapụ ya mgbe obi dajụrụ unu. Bible sịrị: “Dị ka mgbe mmadụ na-ehupụ mmiri, otú a ka isi mmalite iseokwu dị: n’ihi ya tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.”—Ilu 17:14.

Rịọnụ ibe unu mgbaghara—rịọkwanụ ụmụ unu mgbaghara, ma ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị. Brianne, bụ́ onye dị afọ iri na anọ, sịrị: “Mgbe ụfọdụ, mgbe papa m na mama m sechara okwu, ha na-arịọ mụ na nwanne m nwoke nke tọrọ m mgbaghara n’ihi na ha maara otú o si enye anyị nsogbu.” Otu n’ime ihe kasị mkpa i nwere ike ịkụziri ụmụ gị bụ otú ha ga-esi jiri umeala n’obi na-asị ndị ọzọ “ndo.”

Ọ bụrụ na unu chọrọ ịmụtakwu ihe ndị ọzọ unu ga-eme, leenụ Teta! nke January 8, 2001, peeji nke asatọ ruo nke iri na anọ, nakwa nke April 8, 1994, peeji nke atọ ruo nke iri na abụọ.

[Foto dị na peeji nke 19]

Ebola ha ebubo. Nanị ihe ị ga-eme bụ ịkọwara ha otú obi dị gị