Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu nke Na-echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra

Nsogbu nke Na-echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra

 Nsogbu nke Na-echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra

SCOTT na Heather bụ di na nwunye obi ụtọ, ndị ahụ́ dị gara gara. Ha mụtakwara nwa nwoke ahụ́ gbasiri ike, nke dị afọ atọ, nke ụbụrụ na-aghọ nkọ. * Ha na-elekọta nwa ha nwoke nke ọma. N’ụwa taa, ilekọta nwatakịrị nke ọma abụghị obere ọrụ. Ọ na-akpata oké nchegbu. Ọrụ dị na ya karịkwara akarị. E nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ịkụziri ụmụaka. Otu n’ime ibu ọrụ kacha echu Scott na Heather ụra bụ nke a: Ha chọrọ ichebe nwa ha ka a ghara imetọ ya. N’ihi gịnị?

Heather kwuru, sị, “Papa m bụ onye aṅụrụma ihu na-adịghị atọ ọchị. Ọ na-ewekarịkwa iwe. Ọ na-akụ m isi aba okpu. O metọkwara mụ na ụmụnne m ndị nwanyị.” * Ọtụtụ mmadụ kwetara na ụdị mmetọ a na-enye onye e metọrọ nsogbu n’obi nke ukwuu. Ka a sịkwa ihe mere Heather ji kpebisie ike ichebe nwa ya nwoke! Scott chekwara na ọ dị mkpa ka ha chebe nwa ha.

Ọtụtụ ndị nne na nna na-echegbu onwe ha banyere mmetọ a na-emetọ ụmụaka. Ikekwe, ị na-echegbukwa onwe gị banyere ya. O nwere ike ịbụ na e metọbeghị gị dị ka e metọrọ Scott na Heather. O nwekwara ike ịbụ na ị maghị otú ọ na-adị. Ma o doro anya na ị nụtụla akụkọ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ banyere otú omume ọjọọ a si ju ebe nile. N’ụwa nile, obi na-amapụ ezigbo ndị nne na nna ma ha nụ ihe ndị a na-eme ụmụaka bi n’ógbè ha.

Ọ bụghị ihe ijuanya na otu onye na-eme nnyocha n’ihe banyere imetọ mmadụ kọwara otú imetọ ụmụaka si arị elu dị ka “otu n’ime ihe a chọpụtarala kasị akụda mmụọ n’oge anyị a.” Nke a bụ nnọọ akụkọ ọjọọ. Ma ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ na-eme omume ọjọọ ndị a? Ọ naghị eju ndị na-amụ Bible anya. Okwu Chineke kọwara na anyị bi n’oge nsogbu, nke a na-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ Ọ bụkwa oge ndị mmadụ ga “na-eme ihe ike ike,” oge ha ‘ga-ahụ nanị onwe ha n’anya,’ gharakwa inwe “obi mmadụ.”—2 Timoti 3:1-5.

Imetọ mmadụ bụ nsogbu a na-amaghị ihe a ga-eme ya eme. N’ezie, ọ na-eri ụfọdụ ndị nne na nna ọnụ ma ha cheta otú obi si fee ndị mmadụ azụ, bụ́ ndị na-achọgharị ụmụaka ha ga-emetọ. Ma, nsogbu a ọ̀ karịrị ndị mụrụ ụmụ nke na o nweghị ihe ha ga-emeli banyere ya? Ka è nwere ezigbo ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ ndị na-eso ya.

^ par. 3 Imetọ nwatakịrị pụtara onye toro eto iji nwatakịrị na-egbo agụụ mmekọahụ na-agụ ya. Nke a na-agụnyekarị ihe Bible kpọrọ ịkwa iko, ma ọ bụ por·neiʹa. Omume ndị so na nke a bụ ịpị nwoke aka n’amụ ma ọ bụ imetụ nwanyị aka n’ọtụ, idina mmadụ, iji ọnụ amịcha amụ ma ọ bụ ọtụ, na isi n’ikè enwe mmekọahụ. Omume mmetọ ndị ọzọ, ndị dị ka ịpị nwanyị aka n’ara, mmadụ ịgwa onye ọzọ ka ya na ya nwee mmekọahụ n’ezoghị ọnụ, igosi nwatakịrị foto ma ọ bụ fim ndị gba ọtọ, ikiri ndị na-enwe mmekọahụ, na mmadụ ịma ụma gbara ọtọ n’ebe ọ na-ekwesịghị ịgba ọtọ, nwere ike iso n’ihe ndị Bible katọrọ ma kwuo na ha bụ “omume rụrụ arụ” ma ọ bụ “ụdị anyaukwu . . . na-arụpụta adịghị ọcha.”—Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Efesọs 4:19.