Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Asịrị A?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Asịrị A?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Asịrị A?

“Agara m oriri n’otu oge. N’echi ya, e bido kọwa na mụ na otu n’ime ụmụ okorobịa ndị bịara oriri ahụ nwere mmekọahụ. Ihe ahụ a kọrọ abụtụdịghị eziokwu!”—Linda. *

“Mgbe ụfọdụ, ana m anụ asịrị a na-akọ na m nwere enyi nwanyị. Ma nwanyị ha sịrị na ọ bụ, amatụdịghị m onye ọ bụ! Ọtụtụ ndị na-agba asịrị anadịghị achọ ịma ma ihe ahụ ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu.”—Mike.

ỌBỤRỤ na e jiri gị gbaa asịrị, ị ga-aghọzi onye ndị mmadụ ji akọ akụkọ karịa ka ha na-eji ihe ndị e mere na fim akọ akụkọ. Jụgodị Amber, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, ka ị hụ ihe ọ ga-agwa gị. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ ejirila m gbaa asịrị ọtụtụ ugboro. A sịrị na m dị ime, na mụ eteela ime ọtụtụ ugboro, na m na-ere ọgwụ ike, na-azụ ọgwụ ike, na-aṅụkwa ọgwụ ike. Gịnị mere ndị mmadụ ji ekwu ihe ndị a banyere m? N’eziokwu, amaghị m ihe kpatara ya!”

Iji Kọmputa Agba Asịrị

Mgbe ndị mụrụ gị nọ n’afọ iri na ụma ha, ọ bụ ọnụ ka ndị mmadụ na-ejikarị agba asịrị. Ma, taa, a na-ejikwu kọmputa agba asịrị. Ebe ọ bụ na e nwere ike iji kọmputa zipụ ozi n’egbughị oge, nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ nke buuru gị ihe ọjọọ n’obi nwere ike iji kọmputa mebie aha ọma gị n’ekwughịdị okwu ọ bụla. Nanị ihe ọ ga-efu ya bụ ide mkpụrụ okwu ole na ole jọgburu onwe ha na kọmputa ma zigara ya ọtụtụ ndị chọrọ ịnụ ihe dị otú ahụ banyere gị.

Ụfọdụ na-ekwu na asịrị e jizi kọmputa agba akarịala nnọọ nke e ji telefon agba. E nweela ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ ndị e meghere nanị iji mebie aha ndị mmadụ. Ọtụtụ mgbe, n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, bụ́ ebe ndị mmadụ nwere ike idebe ihe ọmụma nke aka ha, a na-agụtakarị ụdị asịrị ndị mmadụ na-agaghị ejili ọnụ ha kọọ. N’ezie, n’otu ajụjụ ọnụ a gbara ndị na-eto eto, ihe dị ka mmadụ atọ n’ime mmadụ ise ọ bụla kwuru na o nweela mgbe e dere ihe na-adịghị mma banyere ha n’Intanet.

Ma, ọ̀ bụ mgbe nile ka ikwu banyere ndị ọzọ dị njọ? Ọzọkwa, . . .

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịkọ Ihe Ọma Banyere Ndị Ọzọ?

Ihe a e dere n’ahịrịokwu na-esonụ ọ̀ bụ “eziokwu” ka ọ bụ “ụgha.”

 Ọ dị njọ mgbe nile ịkọ banyere ndị ọzọ. Eziokwu Ụgha

Olee nke bụ́ azịza ya? N’ezie, ọ dabeere n’ihe a na-akọ banyere onye ahụ. Ọ bụrụ na ihe a na-akọ banyere onye ahụ agaghị emebi aha ya, o nwere ike ọ gaghị adị njọ. A sị ka e kwuwe ya, Bible kwuru ka anyị ‘na-egosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’ (Ndị Filipaị 2:4) Nke ahụ apụtaghị na anyị ga na-enyonye anya n’ihe ndị na-agbasaghị anyị. (1 Pita 4:15) Ma ọtụtụ mgbe, a na-esi ná mkparịta ụka nkịtị amata ihe ndị bara uru, ihe ndị dị ka, onye na-aga ịlụ nwanyị, onye mụrụ nwa, na onye e kwesịrị inyere aka n’ihe ụfọdụ. N’eziokwu, anyị enweghị ike ikwu na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị adịghị akọ banyere ha.

Ma, e nwere ike isi ná mkparịta ụka nkịtị banye n’ịgba asịrị. Dị ka ihe atụ, onye na-enweghị ihe ọjọọ o bu n’obi pụrụ ikwu, sị, “Ihe ga-adabara Emeka na Nkechi ma ha lụọ.” Mgbe onye nụrụ ya chọrọ ịkọrọ ya onye ọzọ, ya asị, “Emeka na Nkechi achọwala ịgba akwụkwọ”—n’agbanyeghị na Emeka na Nkechi ekwutụbeghịdị okwu ọlụlụ. I nwere ike ịsị na ‘nke ahụ bụ obere okwu.’ Ma, ọ bụrụ na ọ bụ gị bụ Emeka ma ọ bụ Nkechi, ị ga-ama na ọ bụghị obere okwu!

E ji Julie, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, gbaa ụdị asịrị ahụ. Nke ahụ gbawakwara ya obi. O kwuru, sị: “Asịrị ahụ kpasuru m iwe. O mekwara ka m gharazie ịtụkwasị onye ọ bụla obi.” E jikwa Jane, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, gbaa ụdị asịrị ahụ. O kwuru, sị: “Amalitere m gbawara nwa okorobịa ahụ a sị na mụ na ya na-akpa ọsọ.” O kwukwara, sị: “Ama m na ọsọ m na-agbaziri ya adịghị mma n’ihi na mụ na ya bụ enyi. Echekwara m na anyị kwesịrị ịdị na-ekwurịta okwu n’enweghị ndị ga-eji anyị gbaa asịrị.”

O doro anya na asịrị na-emebi ihe. Otú ọ dị, ndị e jirila gbaa asịrị agaghị asị na ha ejitụbeghị mmadụ gbaa asịrị. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ị nọ n’ebe a na-ekwu okwu ọjọọ banyere mmadụ, ọ ga na-enu gị enu itinye ọnụ na ya. N’ihi gịnị? Phillip, bụ́ nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ, sịrị: “Ọ na-eme ka mmadụ wepụtụ obi ya ná nsogbu nke ya. Ọ na-atọkarị ndị mmadụ ụtọ ịhapụ nsogbu nke ha kọwa nke ndị ọzọ.” N’ihi ya, olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ezigbo mkparịta ụka aghọwa asịrị?

Jiri Amamihe Mee Ka Mkparịta Ụka Si n’Asịrị Gaa n’Ezigbo Mkparịta Ụka!

Chee echiche banyere nkà a chọrọ n’aka onye na-akwọ ụgbọala n’okporo ụzọ awara awara. N’oge ọ na-atụghị anya ya, o nwere ihe nwere ike ime nke ga-eme ka ọ dị mkpa ka o si n’ahịrị ọ nọ gafee n’ọzọ, ma ọ bụ ka ọ kwụsịtụ ka ụgbọala ọzọ gbafere, ma ọ bụkwanụ ka ọ kwụsị kpamkpam. Ọ bụrụ na anya ruru ya ala, uche ya adịrịkwa n’izere ihe mberede, ọ ga-ahụ ihe na-eme n’ihu ma mee ihe o kwesịrị ime banyere ya.

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ma a bịa ná mkparịta ụka. I nwere ike ịma mgbe mkparịta ụka na-aga n’ịgba asịrị. Mgbe ọ dị otú ahụ, ị̀ pụrụ iji amamihe mee ka mkparịta ụka ahụ si n’asịrị gaa n’ezigbo mkparịta ụka? Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, kpachara anya—asịrị na-emebi ihe. Mike sịrị: “Ekwuru m ihe na-adịghị mma banyere otu nwa agbọghọ—na ụmụ nwoke na-agba ya ara—o mesịkwara ruo ya ntị. Agaghị m echefu olu o ji gwa m okwu mgbe ọ bịakwutere m. Okwu ahụ m na-echeghị echiche kwuo banyere ya wutere ya nke ukwuu. Anyị mechara kpezie. Ma obi adịghị m mma na o nweela onye m gbara asịrị wutere ya!”

N’eziokwu, ọ chọrọ obi ike iji nwee ike ime ka mkparịta ụka si n’asịrị gaa n’ezigbo mkparịta ụka. Otú ọ dị, ihe i kwesịrị ime bụ ihe a Carolyn, bụ́ onye dị afọ iri na asaa, kwuru. Ọ sịrị: “I kwesịrị ịkpachara anya banyere ihe ị na-ekwu. Ọ bụrụ na ọ bụghị n’ọnụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi ka ị nụrụ ya, ihe ahụ ị na-akọsa nwere ike ịbụ akụkọ ụgha.”

Iji zere ịgba asịrị, gbasoo ndụmọdụ ndị a si na Bible:

“N’ọtụtụ okwu, njehie adịghị akwụsị, ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.” (Ilu 10:19) Ọ bụrụ na ị na-ekwu oké okwu, o yikarịrị ka ị ga-ekwu ihe ị ga-emecha kwaa ụta ya. N’ihi ya, ọ ka mma ka a mara gị dị ka onye na-anọ jụụ ege ntị karịa ịmara gị dị ka onye na-ekwu oké okwu!

“Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu, ma ọnụ ndị na-emebi iwu na-ekwuwa ihe ọjọọ dị iche iche.” (Ilu 15:28) Chee echiche tupu i kwuwe okwu!

“Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Tupu ị kọọrọ onye ọzọ ihe ị nụrụ, buru ụzọ jide n’aka na ọ bụ eziokwu.

 “Dị nnọọ ka unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emeso ha n’otu ụzọ ahụ.” (Luk 6:31) Tupu ị kọwadị akụkọ bụ́ eziokwu banyere onye ọzọ, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ na ọ bụ m bụ onye ahụ, onye ọzọ ana-akọsa akụkọ a bụ́ eziokwu banyere m?’

“Ka anyị na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.” (Ndị Rom 14:19) Ọbụna akụkọ ndị bụ́ eziokwu pụrụ ibutere mmadụ nsogbu ma ọ bụrụ na ọ bụghị akụkọ na-ewuli elu.

‘Meenụ ka ọ bụrụ nzube unu ibi ndụ n’ụzọ dị nwayọọ na ilekwasị anya n’ihe unu na-eme na iji aka unu na-arụ ọrụ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11) Eburula ihe gbasara ndị ọzọ n’isi. E nwere ihe ndị ka mma i nwere ike iji oge gị mee.

Mgbe Ọ Bụ Gị Ka E Ji Gbaa Asịrị

Eleghị anya, ị ga-ekweta na mmadụ kwesịrị ịkwa ire ya nga na izere iji ndị ọzọ agba asịrị. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ gị ka e ji gbaa asịrị, ị ga-aghọta na ọ bụghị obere okwu. Joanne, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na isii, nke e ji gbaa asịrị, kwuru, sị: “Agwara m onwe m na m gaghị enwekwa ndị enyi ọzọ. Mgbe ụfọdụ n’abalị, ana m ebegide ákwá ụra eburu m. Ọ dị m ka è mebichaala nnọọ aha m!”

Olee ihe i nwere ike ime ma e jiri gị na-agba asịrị?

Chọpụta ihe ọ ga-abụ ya kpalitere asịrị ahụ. Gbalịa ịghọta ihe na-akpali ndị mmadụ ịgba asịrị. Ụfọdụ na-agba ya iji ghọọ ndị a ma ama, ka o yie ka hà ma ihe nile na-aganụ. Karen, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na anọ, kwuru, sị: “Ha chọrọ ka ndị mmadụ chee na ha ma nke a na-akọ nanị n’ihi na ha na-akọ banyere ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị ntorobịa onwe ha na-adịghị eju afọ nwere ike ịkatọ ndị ọzọ nanị ka ha nwetatụ obi ụtọ. Renee, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, kwuru ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji agba asịrị. Ọ sịrị: “Ike ụwa agwụla ndị mmadụ. Ha na-achọ ime ka ụwa tọwakwuo ha ụtọ site n’iji asịrị sọkọta ndị mmadụ isi.”

Jide Obi Gị Aka. Onye asịrị e ji ya gbaa na-ewute, bụ́ onye na-achịkwaghị iwe ya, pụrụ ime ihe ọ ga-emecha kwaa ụta ya. Ilu 14:17 sịrị: “Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ ga-eme ihe nke uche ya gbagọrọ agbagọ.” Ọ bụ ezie na ọ ka mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme, mgbe e ji gị gbaa asịrị bụ mgbe ọ dị gị mkpa ịchịkwa iwe gị karịa ka ị na-achịkwabu ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-ezere ime otu omume ahụ amamihe na-adịghị na ya nke onye ahụ ji gị gbaa asịrị mere.

Ghọta kpọmkwem ihe mere e ji jiri gị na-agba asịrị. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ji n’aka na ihe m nụrụ bụ n’ezie ihe e kwuru banyere m? Ọ̀ bụ asịrị ka ọ̀ bụ na mụ na onye ahụ nwere nghọtahie? M̀ na-adị ngwa iwe iwe?’ O doro anya na o nweghị ezi ihe mere mmadụ ga-eji na-agba asịrị. Ma, iwebiga iwe ókè n’ihi asịrị e ji gị gbaa pụrụ imebiri gị ihe karịa ka asịrị ahụ e ji gị gbaa ga-emebiru. N’ihi ya, ọ́ gaghị aka mma ma i lee ihe anya otú Renee si lee ya anya, bụ́ nke nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Ọ na-ewutekarị m mgbe mmadụ kwuru ihe na-adịghị mma banyere m. Ma, m na-agbalị ijide onwe m. Ihe mere m ji eme otú ahụ bụ na, n’izu ọzọ, ha ga-ekwuwezi banyere onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ dị iche.” *

Ihe Ga-akasị Enyere Gị Aka

Bible kwuru na “anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro,” kwuokwa na “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) Ya mere, amamihe adịghị na ya ma ọ bụrụ na anyị na-eji okwu nile e kwuru banyere anyị akpọrọ oké ihe. Eklisiastis 7:22 sịrị: “Ọtụtụ mgbe [ka] obi gị mawooro na gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ.”

Ihe ga-akasị enyere gị aka ma e jiri gị gbaa asịrị bụ omume ọma gị. Jizọs kwuru, sị: “A na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Ya mere, gbalịa ka ị na-emeso ndị ọzọ omume enyi, na-ahụkwa ha n’anya. Ọ pụrụ iju gị anya otú nke ahụ ga-esi mee ka asịrị ahụ e ji gị gbaa kwụsị ngwa ngwa—ma ọ bụkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, nyere gị aka idi ya.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . ” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a.

^ par. 33 N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya iji akọ chọọ ụzọ ị ga-esi gakwuru onye ahụ ji gị gbaa asịrị. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ naghị adị mkpa ime otú ahụ, n’ihi na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee otú ị pụrụ isi zere iji ndị ọzọ agba asịrị?

▪ Olee ihe ị ga-eme ma ndị mmadụ jiri gị na-agba asịrị?