Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Pụrụ Ime Ma M Nọrọ n’Obodo Omenala Ha Dị Iche na nke Anyị?

Gịnị Ka M Pụrụ Ime Ma M Nọrọ n’Obodo Omenala Ha Dị Iche na nke Anyị?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Ka M Pụrụ Ime Ma M Nọrọ n’Obodo Omenala Ha Dị Iche na nke Anyị?

“Anyị bụ ndị Itali. Ndị obodo anyị hụrụ ibe ha n’anya. Ha na-egosikwa nke a n’ihu ọha. Ugbu a, anyị bi na Britain. N’ebe a, o yiri ka onye ọ bụla na-anọrọ onwe ya. Ndị mmadụ adịghịkwa eme ihe otú ọ bụla sọrọ ha. Ọ na-adị m ka ọ dịghị ebe m kwụ akwụ n’omenala abụọ ahụ. Amaghị m ma à ga-akpọ m onye Itali ka à ga-akpọ m onye Britain.”—Giosuè, England.

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, onye nkụzi anyị gwara m ka m na-ele ya anya ma ọ na-ekwu okwu. Ma a bịa n’ụlọ anyị, ọ bụrụ na m legide papa m anya ná mkpụrụ anya mgbe ọ na-agwa m okwu, ya asị na m na-awa anya. Ọ dị m ka ọ dịghị ebe m kwụ akwụ n’omenala abụọ ahụ.”—Patrick, onye Algeria nke bi na France.

Obodo papa gị ma ọ bụ mama gị ọ̀ dị iche n’ebe unu bi?

Ee Mba

Asụsụ a na-asụ ma ọ bụ otú e si eme ihe n’ụlọ akwụkwọ unu, ọ̀ dị iche n’asụsụ a na-asụ ma ọ bụ otú e si eme ihe n’ụlọ unu?

Ee Mba

ỌTỤTỤ nde mmadụ na-akwaga n’obodo ọzọ kwa afọ. Ọtụtụ nsogbu ndị tara akpụ na-abịara ọtụtụ n’ime ha. Ozugbo ha garuru, ha na-ahụ onwe ha n’etiti ndị asụsụ ha, omenala ha, na ejiji ha dị iche na nke ha. N’ihi ya, ndị kwagara n’obodo ọzọ na-aghọzi ndị a na-ejikarị eme ihe ọchị. Nwa agbọghọ aha ya bụ Noor chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ya na ndị ezinụlọ ha si n’obodo Jordan kwaga North America. O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ejiji anyị dị iche, ndị mmadụ ji anyị mere ihe ọchị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghịdị ụdị ihe na-atọ ndị America ọchị.”

Nwa agbọghọ aha ya bụ Nadia nwere nsogbu ọzọ dị iche. O kwuru, sị: “Amụrụ m na Germany. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m bụ ndị Itali, anaghị m eji olu ndị Germany asụ asụsụ ndị Germany. N’ihi ya, ihe ụmụ akwụkwọ anyị na-akpọ m bụ ‘onye mbịarambịa na-amaghị ebe a nọ.’ Mgbe ọ bụla m gakwara Itali, ana m achọpụta na m na-eji olu ndị Germany asụ asụsụ ndị Itali. Ya mere, ana m eche na abụghị m onye Itali, nke m ji abụ onye Germany. Ebe ọ bụla m gara, abụ m onye mbịarambịa.”

Olee nsogbu ndị ọzọ na-abịara ụmụ nke ndị kwagara n’obodo ọzọ? Oleekwa otú ha nwere ike isi jiri ọnọdụ ha mee ihe bara uru?

 Mgbe Omenala na Asụsụ Ụmụ Dị Iche na nke Ndị Mụrụ Ha

Ọbụna n’ime ezinụlọ nke ndị kwagara n’obodo ọzọ, omenala ndị na-eto eto na-agbaso nwere ike ịdị iche na nke ndị mụrụ ha. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Ụmụaka na-amụtakarị omenala ọhụrụ ngwa ngwa karịa ndị mụrụ ha. Dị ka ihe atụ, Ana dị afọ asatọ mgbe ya na ndị mụrụ ya kwagara England. O kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na London maara mụ na nwanne m nwoke ahụ́ ozugbo. Ma o siiri papa m na mama m ike n’ihi na ha ebiteela aka na Madeira, bụ́ obere obodo mmiri gbara gburugburu nke dị na Portugal.” Voeun, onye dị afọ atọ mgbe ndị mụrụ ya bụ́ ndị Cambodia kwagara Australia, sịrị: “Ndị mụrụ m amụtachabeghị omenala ndị ebe ahụ. Iwe na-ewekarị papa m maka na anaghị m aghọtacha omume ya na otú o si eche echiche.”

Ọdịiche a nwere ike iyi olulu mmiri nke kewara ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha. Ma, dị ka mgbidi nke e wuru n’akụkụ olulu mmiri ahụ, asụsụ nwedịrị ike ikewakwu ezinụlọ. Nkewa ahụ na-amalite mgbe ụmụaka mụtara asụsụ ọhụrụ ngwa ngwa karịa ndị mụrụ ha. Nkewa ahụ na-akakwu njọ mgbe ụmụaka malitere ichefu asụsụ ala ha, inwe ezigbo nkwurịta okwu n’ime ezinụlọ esikwuo ike.

Ian, bụ́ onye dị afọ iri na anọ ugbu a, hụrụ mgbe ya na ndị mụrụ ya malitere inwe ụdị nsogbu ahụ n’oge ezinụlọ ha si n’Ecuador kwaga New York. O kwuru, sị: “Bekee na-agazi m were were n’ọnụ karịa Spanish. N’ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi anyị na-asụ Bekee. Ndị enyi m na-asụkwa Bekee. Asụsụ mụ na nwanne m nwoke ji ekwurịta okwu bụkwa Bekee. Asụsụ Bekee ejula m isi. Ọ na-esiziri m ike ịsụ Spanish.”

Ọ̀ bụ otú ahụ ọ dị Ian ka ọ dị gị? Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kwagara n’obodo ọzọ mgbe ị ka dị obere, o nwere ike ị gaghị amata na asụsụ ala gị nwere ike ịbara gị uru ma i too. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na i kwela ka ọ pụọ gị n’uche. Noor, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Papa m gbalịsiri ike ịhụ na anyị na-asụ asụsụ ya bụ́ Arabic n’ụlọ anyị. Ma anyị anaghị achọ ịsụ ya. Ịmụ asụsụ Arabic dị anyị ka ibunyekwu anyị ibu karịrị anyị akarị. Ndị enyi anyị na-asụ Bekee. Ihe nile a na-eme na Televishọn anyị na-ekiri bụcha n’asụsụ Bekee. Gịnị ka anyị jikwanụ asụsụ Arabic eme?”

Ma, mgbe ị na-etolitekwu, i nwere ike hụwa uru ịsụ asụsụ ala gị nke ọma bara. Otú ọ dị, o nwere ike isiri gị ike icheta otú e si asụ asụsụ ahụ na-agabu gị were were n’ọnụ. Michael, bụ́ nwa okoro dị afọ iri na atọ nke ndị mụrụ ya si China kwafee England, kwuru, sị: “Ọ na-abụ m chọọ ịsụ China, Bekee abata m ọnụ. M chọọkwa ịsụ Bekee, China abata m ọnụ.” Ornelle, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na ise nke ezinụlọ ya si na Congo (Kinshasa) kwaga London, kwuru, sị: “Ana m anwa ịgwa mama m okwu n’asụsụ Lingala, ma ọ naghị ekwe m n’ihi na Bekee amarala m ahụ́.” Ọ na-ewute Lee, bụ́ onye a mụrụ n’Australia, onye ndị mụrụ ya bụ ndị Cambodian, na ọ machaghị asụ asụsụ ndị mụrụ ya. O kwuru, sị: “M gwawa ndị mụrụ m okwu n’asụsụ ha ma chọọ ịkọwakwuru ha otú obi dị m banyere ihe m na-ekwu, ana m achọpụta na amaghị m asụ asụsụ ha nke ọma.”

Ihe Mere Nkewa Ahụ Na-ekwesịghị Ịdịgide

Ọ bụrụ na ị machaghịzi asụ asụsụ ala gị, echela na nke ị na-eme agwụla. Ị ka nwere ike ịmụtaghachi ya. Ma, ị ga-ebugodị ụzọ ghọta uru ndị dị n’ime otú ahụ. Olee ụfọdụ n’ime uru ndị dị na ya? Giosuè, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Amụtara m asụsụ ndị mụrụ m n’ihi na achọrọ m ka mụ na ha na-eru ibe anyị n’obi. Ma nke ka nke bụ ka mụ na ha na-efekọ Chineke ọnụ. Asụsụ ha m mụtara enyerela m aka ịghọta otú obi na-adị ha. O nyekwarala ha aka ịghọta ụdị onye m bụ.”

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-amụta asụsụ ndị mụrụ ha n’ihi na ha chọrọ iji ya zie ndị obodo ha bụ́ ndị mbịarambịa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Salomão, bụ́ onye ndị ezinụlọ ha kwagara London mgbe ọ dị afọ ise, kwuru, sị: “Ịkọwa Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ abụọ bara ezigbo uru! Ọ fọrọ obere ka m chefuchaa asụsụ ala anyị. Ma ugbu a m nọ n’ọgbakọ a na-asụ Portuguese, enwere m ike ịsụ ma Bekee ma Portuguese nke ọma.” Oleg, bụ́ nwa okoro dị afọ iri na ise, onye bi na France ugbu a, kwuru, sị: “Inyere ndị mmadụ aka na-eme m obi ụtọ. Enwere m ike iji Bible nyere ndị na-asụ Russian, French, ma ọ bụ Moldovan, aka.” Noor chọpụtara na a chọkwuru ndị maara e ji asụsụ Arabic ezisa ozi ọma. O kwuru,  sị: “Ana m amụ asụsụ ahụ ugbu a. Ana m agbalịkwa ịmụtaghachi asụsụ ahụ m chefurula. Agbanweela m echiche m. Ugbu a, achọrọ m ka mmadụ gbazie m olu mgbe ọ bụla m na-asụtaghị ya. Achọrọ m ịmụta ya.”

Olee ihe i nwere ike ime iji maliteghachi ịsụ asụsụ ndị mụrụ gị nke ọma? Ụfọdụ ezinụlọ achọpụtala na ọ bụrụ na ha ana-asụ nanị asụsụ ala ha n’ụlọ ha, ụmụ ha ga-amụta ka e si asụ asụsụ abụọ ahụ. * I nwekwara ike ịgwa ndị mụrụ gị ka ha kụziere gị otú e si ede asụsụ ahụ. Stelios, onye toro na Germany, nke asụsụ ala ha bụ Gris, kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-akụziri m otu amaokwu Bible kwa ụbọchị. Ha na-agụ ya n’olu dara ụda, mụ edetuo ya n’akwụkwọ. Ugbu a, ama m ka e si agụ na ka e si ede Grik na German.”

N’eziokwu, ọ bụrụ na ị maara omenala abụọ, na-asụkwa asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa, i riela. Ọmụma ị maara omenala abụọ ga-eme ka ị matakwuo otú ndị mmadụ si eche echiche, nyekwara gị aka ịza ajụjụ ndị ha nwere ịjụ banyere Chineke. Bible kwuru, sị: “Ọṅụ dịịrị onye ọ bụla n’ọzịza okwu nke ọnụ ya: ọzọ, okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” (Ilu 15:23) Preeti, onye a mụrụ n’England, nke nne na nna ya bụ ndị India, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m maara omenala mba abụọ, ahụ́ na-eru m ala karị mgbe m na-ezi ozi ọma. Ana m aghọta ndị si ná mba abụọ ahụ—ma ihe ndị ha kweere ma otú ha si eme ihe.”

“Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”

Ekwela ka obi na-ajọ gị njọ ma ọ bụrụ na i chere na omenala obodo i bi na ya dị iche na nke gị. Ọnọdụ gị yiri nke ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe Josef ka bụ nwata, e si n’ebe a na-eme omenala e ji mara ndị obodo ya, bụ́ ndị Hibru, kpọpụ ya. Ọ bụkwa n’Ijipt ka o biri ndụ ya nile. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na o chefughị asụsụ ala ya. (Jenesis 45:1-4) Ọ bụ ya mere ka o nwee ike ịgbatara ndị ezinụlọ ya ọsọ enyemaka.—Jenesis 39:1; 45:5.

Nna Timoti bụ onye Grik, nne ya abụrụ onye Juu. Ma, ya na Pọl onyeozi so gaa ebe dị iche iche dị anya. (Ọrụ 16:1-3) Kama ikwe ka nke a nyewe ya nsogbu n’obi, obi abụọ adịghị ya na ọmụma ọ maara omenala abụọ mere ka o nwee ike inyere ndị ọzọ aka mgbe ọ nọ n’ozi ala ọzọ.—Ndị Filipaị 2:19-22.

Ọ́ gaghị aka mma ka i lee ọnọdụ gị anya dị ka ohere i nwere iji mee ezigbo ihe kama ile ya anya dị ka nsogbu? Cheta na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Jehova hụrụ gị n’anya n’ihi ụdị onye ị bụ, ọ bụghị n’ihi obodo i si. Dị ka ndị ntorobịa e kwuru okwu ha n’isiokwu a, ọ́ gaghị adị mma ka i jiri ihe ọmụma na ahụmahụ i nwere nyere ndị obodo gị aka ịmụta banyere Chineke anyị nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, nke hụkwara ndị mmadụ n’anya, bụ́ Jehova? Ime nke a nwere ike ime ka i nwee ezigbo obi ụtọ!—Ọrụ 20:35.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . ” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 21 Iji nwetakwuo aro ndị bara uru, lee isiokwu bụ́ “Ịzụlite Ụmụ n’Ala Ọzọ—Ihe Ịma Aka na Ụgwọ Ọrụ Ndị Dị na Ya,” nke gbara n’Ụlọ Nche October 15, 2002.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ọdịiche dị n’omenala gị na ndị mụrụ gị nakwa n’asụsụ gị na ha?

▪ Olee otú i nwere ike isi merie ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ịsụ asụsụ ndị mụrụ gị nwere ike ime ka gị na ha dịrịkwuo ná mma