Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-akụzinụ Ihe Site n’Ihe Nlereanya Unu

Na-akụzinụ Ihe Site n’Ihe Nlereanya Unu

Nke 7

Na-akụzinụ Ihe Site n’Ihe Nlereanya Unu

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Nanị ihe okwu ọnụ na-eme bụ ịkọrọ mmadụ ihe ọ ga-eme. Ma, omume na-akụziri mmadụ otú ọ ga-esi eme ihe. Dị ka ihe atụ, nne na nna nwere ike ịgwa ụmụ ha ka ha na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù ma na-ekwu eziokwu. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye a na-eji olu ike agwa ibe ha okwu ma ọ bụ jiri olu ike na-agwa ụmụ ha okwu, na-aghakwa ụgha iji gbaara ọrụ ụfọdụ siiri ha ike ọsọ, ha na-akụziri ụmụ ha na ọ bụ otú ahụ ka ndị toruru ogo mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà. Otu onye dere akwụkwọ, onye aha ya bụ Dr. Sal Severe, kwuru na “otu n’ime ụzọ kasị mkpa ụmụaka si amụta ihe” bụ iṅomi ndị mụrụ ha.

Ihe mere o ji esi ike: Ndị mụrụ ụmụ ezughị okè. Pọl onyeozi, dere, sị: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) A bịa n’ihe metụtara ịkwa ire anyị nga, Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ma ire, ọ dịghị otu n’ime ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịzụta ya.” (Jems 3:8) Ụmụaka na-akpasukarịkwa ndị mụrụ ha iwe iji mara ma ò nwere ihe ha ga-eme ha. Larry, bụ́ nwoke mụrụ ụmụ abụọ, onye dị nwayọọ, nke nwekwara njide onwe onye, sịrị: “O juru m anya ịhụ na ọ na-adịrị ụmụ m mfe ime ka m wefee iwe ókè.”

Ihe ga-enyere unu aka: Gbalịanụ ka unu setịpụ ezigbo ihe nlereanya—ọ bụghị ihe nlereanya zuru okè. Ọ bụrụ na unu emehie ihe mgbe ụfọdụ, jirinụ ihe unu mehiere kụziere ụmụ unu ihe. Chris, bụ́ nwoke mụrụ ụmụ abụọ, sịrị: “Ọ bụrụ na m weso ụmụ m iwe gafee ókè ma ọ bụ mee mkpebi na-adịghị mma nke metụtara ha n’ụzọ na-adịghị mma, m na-ekweta na m mehiere ihe. M na-asịkwa ha ndo. Nke a kụziiri ụmụ m na ndị mụrụ ụmụ na-emekwa mmehie nakwa na anyị nile kwesịrị ịgbalị ka anyị na-emeziwanye omume anyị.” Kostas, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mbụ, sịrị: “Achọpụtara m na ebe ọ bụ na m na-asị ụmụ m ndo ma m wefee iwe ókè, ha amụtala ịsị ndo ma ha mehie ihe.”

Jehova bụ́ Chineke sịrị: “Unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Mgbe onye nọ n’isi na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ, ọ na-ewute ụmụaka dị ka ọ na-ewute ndị toruru ogo mmadụ, ma ọ bụrụdị na ọ naghị ewute ha karị. Ya mere, i nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a kwa ụbọchị mgbe chi jiri: Ọ bụrụ na ọ dịghị otu mkpụrụ okwu m kwuru malite n’ụtụtụ ruo n’abalị, gịnị ka ụmụ m ga-amụta n’omume m? Omume ndị m mere ọ̀ bụ ụdị ihe m ga-achọ ịkụziri ụmụ m n’ọnụ?

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 27]

“Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?” —Ndị Rom 2:21

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Mgbe nne ma ọ bụ nna sịrị nwa ya ndo, nwa ahụ na-amụtakwa ịsị onye ọzọ ndo