Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Meenụ Ka Ịhụnanya Dịrị n’Ụlọ Unu

Meenụ Ka Ịhụnanya Dịrị n’Ụlọ Unu

 Nke 2

Meenụ Ka Ịhụnanya Dịrị n’Ụlọ Unu

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Ịhụnanya dị ụmụaka mkpa. Ọ bụrụ na a hụghị ha n’anya, ha adịghị eme nke ọma. N’ihe dị ka afọ iri ise na asaa gara aga, ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ, bụ́ M. F. Ashley Montagu, dere, sị: “Ihe kasị mmadụ mkpa iji tolite nke ọma bụ igosi ya ịhụnanya; igosi mmadụ ịhụnanya, karịsịa, malite mgbe a mụrụ onye ahụ ruo mgbe ọ gbara afọ isii, ga-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ahụ́ sie ya ike [ma n’anụ ahụ́ ma n’uche].” Ndị na-eme nnyocha n’oge a kwetara ihe Montagu kwuru, ya bụ, na “ọ bụrụ na e gosirughị ụmụaka ịhụnanya otú o kwesịrị, ọ na-akpa ha aka ọjọọ.”

Ihe mere o ji esi ike: Ibi ndụ n’ụwa a ịhụnanya kọrọ, nke ndị bi na ya na-achọ nanị ọdịmma onwe ha, na-akpa mmekọrịta ezinụlọ aka ọjọọ. (2 Timoti 3:1-5) Di na nwunye na-achọpụta na ego ha na-emefu n’ịzụ ụmụ na obi ọ na-ekowe ha n’elu na-eme ka nsogbu ha kakwuo njọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di na nwunye enweghị nkwekọrịta banyere otú ha ga-esi na-adọ ụmụ ha aka ná ntị na ihe ha ga-emere ha ma ha kpaa àgwà ọma, o nwere ike na-esere ha okwu karị ma ọ bụrụ na ọ na-esiburu ha abụọ ike ikwurịta okwu.

Ihe ga-enyere unu aka: Wepụtanụ oge unu na ezinụlọ unu ga na-anọrị mgbe mgbe. Di na nwunye kwesịkwara iwepụta oge nanị ha abụọ ga na-anọrị. (Emọs 3:3) Jirinụ oge ụmụaka lakpuru mee ihe amamihe dị na ya. Unu ekwela ka televishọn nara unu oge a unu ga-eji mee ihe bara uru. Meenụ ka ịhụnanya dịgide n’alụmdi na nwunye unu site n’ịdị na-egwusa ibe unu egwu mgbe nile. (Ilu 25:11; Abụ nke Abụ 4:7-10) Kama ‘isewe okwu’ mgbe nile, chọọ ụzọ ị ga-esi na-eto di gị ma ọ bụ nwunye gị kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 103:9, 10; Ilu 31:28.

Na-agwanụ ụmụ unu na unu hụrụ ha n’anya. Jehova bụ́ Chineke gosiri ndị mụrụ ụmụ ihe nlereanya site n’ikwu n’ihu ọha na ya hụrụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, n’anya. (Matiu 3:17; 17:5) Fleck, bụ́ otu nna nke bi n’Austria, sịrị: “Achọpụtara m na ụmụaka dịtụ ka okooko osisi ụfọdụ. Dị nnọọ ka okooko osisi nta ndị a na-eche ihu n’anyanwụ ka anwụ chaa ha, ahụ́ ekporokwa ha ọkụ, ụmụaka na-elekwasị ndị mụrụ ha anya ka ha gosi ha ịhụnanya, meekwa ka obi sie ha ike na ha dị mkpa n’ezinụlọ ha.”

Ma ị̀ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nke nanị ya na-azụ ụmụ, ọ bụrụ na i nyere ezinụlọ gị aka ka ha mụta ịhụ ibe ha n’anya na ịhụ Chineke n’anya, otú ezinụlọ gị si ebi ndụ ga-aka mma.

Ma, gịnị ka Okwu Chineke kwuru banyere otú nne na nna ga-esi jiri ikike ha nwere na-achị ụmụ ha?

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 22]

“Ịhụnanya . . . bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:14