Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị Sọl: “Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike”?—Ọrụ 26:14.

N’oge Baịbụl, ndị ọrụ ugbo na-eji ndụdụ e ji achị anụ eduzi ụmụ anụmanụ ha ji akọ ugbo. Ndụdụ ahụ bụ osisi pịrị ọnụ nke nwere ike iru mita abụọ na ọkara n’ogologo. Otu isi ndụdụ ahụ na-enwe ígwè dị nkọ n’ọnụ ọnụ ya. Ọ bụrụ na anụmanụ alaa azụ, ndụdụ ahụ na-adụ ya, merụọ ya ahụ́. Isi ya nke ọzọ na-enwe obere mmà e nwere ike iji wepụ ájá, ahịhịa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nyapagidere n’ọ́gụ̀ e ji na-akọ ala.

Mgbe ụfọdụ, a na-eji ndụdụ a e ji achị anụ emere ngwá ọgụ. Otu ọchịagha na onyeikpe e nwere n’Izrel, nke aha ya bụ Shamga, ji “ndụdụ e ji achị ehi” gbuo narị ndị Filistia isii.—Ndị Ikpe 3:31.

E jikwa ndụdụ a e ji achị ehi mee ihe atụ n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, Eze Sọlọmọn dere na okwu onye maara ihe “dị ka ndụdụ e ji achị ehi,” nke mmadụ ji adụtụ enyi ya ka enyi ya nwee ike ime mkpebi dị mma.—Ekliziastis 12:11.

Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, o jikwa ndụdụ e ji achị anụ mee ihe atụ. Ọ gwara Sọl, bụ́ onye nọ na-akpagbu Ndị Kraịst, ka ọ kwụsị ‘ịgba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.’ Ihe ga-agbata onye nụrụ ihe a Jizọs kwuru n’obi bụ anụmanụ dị isi ike nke jụrụ ịga ebe onye nwe ya na-agwa ya ka ọ gaa. Ọ dị mma na Sọl nabatara ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ya ma gbanwee ndụ ya, ghọzie Pọl onyeozi.

Olee otú ndị Juu nke oge Jizọs si amata ihe na-akụ n’abalị?

Ọ bụrụ na anwụ na-acha, ndị Juu nke oge Jizọs nwere ike iji onyinyo amata ihe na-akụ n’ehihie. Ma, ọ bụrụ n’abalị ma ọ bụ oge mmiri ruru, ihe ha na-eji amata ihe na-akụ bụ ihe a na-akpọ klọọkụ mmiri. E wezụga ndị Juu, ndị Ijipt oge ochie, ndị Peshia, ndị Gris, na ndị Rom jikwara klọọkụ mmiri mata oge.

Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia kwuru na akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah na nke a na-akpọ Talmud kwuru banyere klọọkụ mmiri ahụ ma kpọọ ya “aha dị iche iche. O nwere ike ihe mere ha ji kpọọ ya aha dị iche iche bụ na klọọkụ a dị n’ụdị n’ụdị. Ma aha niile ahụ pụtara otu ihe, ya bụ, mmiri ji nwayọọ na-atapụ kpọm kpọm kpọm.”

Olee otú klọọkụ a si arụ ọrụ? A na-agbanye mmiri n’ime karama abụọ, kpọpuo ha abụọ obere ka mmiri nwee ike isi na nke dị n’elu na-abanye na nke dị n’ala. A na-akanyekwa ihe n’ahụ́ karama ndị ahụ ka e nwee ike ịma ebe mmiri dị na ha ruru. Mmadụ nwere ike ịma ihe na-akụ ma o lee ebe mmiri dị na karama nke dị n’elu ma ọ bụ nke dị n’ala ruru.

Ndị agha ndị Rom na-eji ụdị klọọkụ a ama oge nche dị iche iche a na-enwe n’abalị. Mgbe ọ bụla oge nche nke ọ bụla ruru, ha afụọ opì. Onye ọ bụla nụrụ opì ahụ ga-eji ya mara mgbe nke ọ bụla n’ime oge nche anọ a na-enwe n’abalị bidoro na mgbe ọ gwụrụ.​—Mak 13:35.