Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

 Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere otu nwoke nke lụrụ ọtụtụ nwaanyị ji kpebie ịghọ Onyeàmà Jehova n’agbanyeghị na ọ naghị ejibu anya ahụ Ndịàmà Jehova? Gịnị mere pastọ otu chọọchị Pentikọstal ji gbanwee ihe ndị o kweere ma ghọọ Onyeàmà Jehova? Gịnị nyeere otu nwaanyị nke ọtụtụ ihe ọjọọ mere mgbe ọ bụ nwata aka idi mwute ọ na-enwe ma nwee ike ịbịaru Chineke nso? Gịnị mere otu nwoke nke egwú rọk riri isi ji ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma? Gụọ akụkọ ndị a ka ị mata ihe kpatara ya.

“Aghọkwuola m ezigbo di.”—RIGOBERT HOUETO

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1941

ABỤ M ONYE: BENIN

NDỤ M BIRI: ALỤRỤ M ỌTỤTỤ NWAANYỊ, ANAGHỊ M EJI ANYA AHỤ NDỊÀMÀ JEHOVA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Abụ m onye Kotonu, bụ́ otu nnukwu obodo dị na mba Benin. Abụ m onye Katọlik, ma anaghị m agachi ụka anya. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Katọlik ndị bi n’obodo anyị na-alụ ọtụtụ nwaanyị n’ihi na iwu obodo anyị kwadoro ya. Mụnwa lụrụ ụmụ nwaanyị anọ.

N’ihe dị ka afọ 1975, e nwere ndị chọrọ ịgbanwe ihe n’ọchịchị mba anyị, echekwara m na mgbanwe a ga-aba uru. Akwadosiri m ndị ahụ ike ma si otú ahụ malite itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ahụ chọrọ iweta mgbanwe n’ọchịchị kpọrọ Ndịàmà Jehova asị n’ihi na ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Eso m ná ndị mesiri Ndịàmà Jehova ike. N’afọ 1976, a chụpụrụ Ndịàmà Jehova si mba ọzọ bịa ikwusa ozi ọma ná mba anyị, obi sikwara m ike na ha agaghị alọghachi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbanwe ahụ e nwere n’ọchịchị mba anyị kwụsịrị n’afọ 1990. O juru m anya na n’oge na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma lọghachiri. Nke a mere ka m chewe na o nwekwara ike ịbụ na Chineke nọnyeere ha. N’oge ahụ, amalitere m ọrụ n’ebe ọhụrụ. Otu onye mụ na ya na-arụ ọrụ n’ebe ahụ bụ Onyeàmà Jehova, o bidoro izi m ozi ọma ozugbo. O gosiri m ebe ndị Baịbụl kwuru na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diuterọnọmi 32:4; 1 Jọn 4:8) Àgwà ọma ndị Chineke nwere masịrị m. Ebe ọ bụ na m chọrọ ịmụtakwu banyere Jehova, ekwetara m ka Ndịàmà Jehova bịa mụwara m Baịbụl.

Ka obere oge gafere, ebidoro m ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Otú ha si jiri obi ha niile hụ ibe ha n’anya masịrị m. Ha anaghịkwa akpa ókè. Ka mụ na ha na-akpachi anya, ọ bịara dokwuo m anya na ha bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Jọn 13:35.

Ọ bịara doo m anya na m kwesịrị ịhapụ chọọchị Katọlik ebe ọ bụ na ekpebiela m ife Jehova. Ọ dịrịghị m mfe ime nke a n’ihi na m na-atụ ụjọ ihe ndị ọzọ ga-ekwu. Ogologo oge gafere tupu m kata obi hapụ chọọchị ahụ. Ama m na ọ bụ Jehova nyeere m aka.

 O nwekwara ihe ọzọ dị mkpa m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m. Na Baịbụl, amụtara m na Chineke achọghị ka nwoke lụọ ihe karịrị otu nwaanyị. (Jenesis 2:18-24; Matiu 19:4-6) N’anya Chineke, ọ bụ naanị nwaanyị mbụ m lụrụ bụ ezigbo nwunye m. N’ihi ya, achụrụ m ndị nwunye m ndị nke ọzọ, kpọrọzie nwunye m nke mbụ gaa deba aha anyị n’akwụkwọ na anyị bụ di na nwunye. Enyekwara m ndị nwunye m ndị nke ọzọ ihe ndị ha ga-eji na-elekọta onwe ha. Ka oge na-aga, mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwaanyị atọ ahụ bụ́bu ndị nwunye m ghọrọ Ndịàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Ọ bụ eziokwu na nwunye m ka bụ onye Katọlik, ọ naghị enye m nsogbu n’ofufe m na-efe Jehova. Mụ na ya kweere na aghọkwuola m ezigbo di.

Echeburu m na itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-eme ka ihe ka mma n’obodo anyị, ma mbọ niile m gbara n’oge ahụ enweghị isi. Ugbu a, amatala m na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile. (Matiu 6:9, 10) Ana m ekele Jehova maka ịkụziri m ihe ndị mere ka m nwee ezigbo obi ụtọ ná ndụ.

“Ọ dịrịghị m mfe ime mgbanwe ndị m kwesịrị ime.”​—ALEX LEMOS SILVA

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1977

ABỤ M ONYE: BRAZIL

NDỤ M BIRI: ABỤ M PASTỌ OTU CHỌỌCHỊ PENTIKỌSTAL

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’ebe dị nso n’obodo a na-akpọ Itu, nke dị na Sau Paulo Steeti. E nwere ọtụtụ ndị ọjọọ n’ebe ahụ.

Abụ m onye ike, ana m emekwa omume rụrụ arụ, na-erekwa ọgwụ ike. Ka oge na-aga, aghọtara m na ndụ ahụ m na-ebi ga-akpọga m ụlọ mkpọrọ ma ọ bụkwanụ kpatara m ọnwụ. Nke a mere ka m sepụ aka n’ihe ọjọọ. Abanyeziri m otu chọọchị Pentikọstal, mechazie ghọọ pastọ.

Echere m na ebe m bụ pastọ, aga m enwe ike inyere ndị mmadụ aka. Ebidodịrị m ikwu okwuchukwu na redio, nke mere m ji ghọọ onye a ma ama n’obodo anyị. Ma ka oge na-aga, abịara m chọpụta na ndị isi chọọchị anyị ebughị ọdịmma ndị na-abịa chọọchị n’obi, ịsọpụrụ Chineke adịghịdị ha mkpa. Ahụrụ m na naanị ihe ka ha mkpa bụ inweta ego. Ihe ndị a mere ka m hapụ chọọchị ahụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl, ahụrụ m ozugbo na ha dị iche n’okpukpe ndị ọzọ. O nwere ihe abụọ m hụrụ mere ha ji dị iche. Nke mbụ, Ndịàmà Jehova anaghị ekwu n’ọnụ na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, ha na-egosi ya n’omume. Nke abụọ bụ na ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha anaghịkwa alụ agha. (Aịzaya 2:4) Ihe abụọ a mere ka o doo m anya na achọtala m ezi okpukpe, nke bụ́ ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14.

Aghọtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe dị Chineke mma, m ga-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ m. Ekwesịrị m ilebakwuru ndị ezinụlọ m anya. Ekwesịkwara m ịdịkwu umeala n’obi. Ọ dịrịghị m mfe ime mgbanwe ndị a, ma Jehova nyeere m aka ime ha. Mgbanwe ndị a m mere tọgburu nwunye m atọgbu. O bu m ụzọ malite ịmụ Baịbụl, ma ugbu a ọ mụsiwere Baịbụl ike  karịa m. O mechara doo anyị abụọ anya na anyị chọrọ ịghọ Ndịàmà Jehova. E mere anyị abụọ baptizim otu ụbọchị.

URU NDỊ M RITERELA: Mụ na nwunye m nwere obi ụtọ na ụmụ atọ anyị mụrụ na-efe Jehova. Anyị niile n’ezinụlọ anyị nwere obi ụtọ. Ana m ekele Jehova maka otú o si nyere m aka ịmata eziokwu dị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. N’eziokwu, Baịbụl na-agbanwe ndụ ndị mmadụ! Eji m onwe m mara.

“Adịla m ọcha, obi m anaghịzi ama m ikpe.”​—VICTORIA TONG

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1957

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: ỌTỤTỤ IHE ỌJỌỌ MERE M MGBE M BỤ NWATA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’obodo Niukasụl, nke dị na Niu Saụt Wels. Ndị mụrụ m mụrụ ụmụ asaa. Abụ m nwa mbụ ha. Nna m bụ onye aṅụrụma, nne m bụkwa onye ike. Mama m na-eti m ihe mgbe niile, na-abakarịkwara m mba. Ọtụtụ mgbe, ọ na-agwa m na m bụ nwa ọjọọ nakwa na m ga-aga ọkụ mmụọ. Ihe ndị ahụ ọ na-agwa m mere ka ụjọ na-atụ m.

Ọtụtụ mgbe, anaghị m aga akwụkwọ n’ihi otú mama m si merụọ m ahụ́ mgbe o tiri m ihe. Mgbe m dị afọ iri na otu, ndị gọọmenti kpọpụrụ m n’aka ndị mụrụ m ma kpọga m n’ebe a na-elekọta ụmụaka ndị mụrụ ha na-emesi ike. E mechakwara kpọga m n’ebe ndị sista bi. Mgbe m dị afọ iri na anọ, esi m n’ụlọ ndị sista ahụ gbapụ. Achọghị m ịlaghachi n’ụlọ ndị mụrụ m. Agaziri m ebe a na-akpọ Kins Krọs nke dị nso n’obodo Sidni, na-arahụ n’okporo ụzọ.

N’oge ahụ m bi n’okporo ụzọ, m malitere ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, na ịgba akwụna. O nwere otu ihe mere m, bụ́ nke tụrụ m ezigbo ụjọ. N’oge ihe ahụ mere, ebi m n’ụlọ otu nwoke nke nwere ụlọ oriri na nkwari. Otu mgbede, ụmụ nwoke abụọ bịara ịhụ ya, ya asị m banye n’ime ọnụ ụlọ nke dị n’ime. Anọ m ebe ahụ na-anụ ihe ha na-ekwu. Nwoke ahụ m bi n’ụlọ ya chọrọ iresị m ndị ahụ bịara ịhụ ya. Ha chọrọ izoro ezoro tinye m n’ụgbọ mmiri ga-ebuga m mba Japan ka m gaa rụwa ọrụ n’ebe a na-aṅụ mmanya. Mgbe m nụrụ ihe a, ụjọ jidere m. Esizi m na veranda ụlọ ahụ wụpụ, gbaa ọsọ.

Ahụrụ m otu nwoke bụ́ onye ọbịa n’obodo Sidni. Akọọrọ m ya nsogbu m, na-atụkwanụ anya ka o nye m ego. Kama inye m ego, ọ gwara m ka m bịa rie nri ma saa ahụ́ n’ebe o bi. Otú ahụ ka mụ na ya si biwezie. Anyị lụrụ ka otu afọ gafere.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, anaghị m ama otú obi na-adị m adị. Iwe were m mgbe m matara na ọ bụ Setan kpatara ihe ọjọọ niile juru n’ụwa a. Ihe a kụziiri m kemgbe m bụ nwata bụ na ọ bụ Chineke mere anyị ji ata ahụhụ. Ma obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara na Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ mmụọ. Kemgbe m bụ nwata, ụjọ ọkụ  mmụọ na-atụ m n’ihi ihe ndị a kụziiri m banyere ya.

Ihe ọzọ masịrị m bụ na Ndịàmà Jehova na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ha anaghị ekwu ọzọ eme ọzọ. Abụ m ekwe ekwe, ma Ndịàmà Jehova kwanyeere m ùgwù, gosikwa m na ha hụrụ m n’anya n’agbanyeghị otú m si agwa ha okwu ma ọ bụ emeso ha.

Ihe kacha siere m ike bụ iwepụ echiche ọjọọ nke na-abata m n’obi, nke bụ́ na o nweghị uru m bara. Onwe m na-asọ m oyi. Ọtụtụ afọ m ghọchara Onyeàmà Jehova e mere baptizim, ọ ka nọkwa na-adị m ka o nweghị uru m bara. Ama m na ahụrụ m Jehova n’anya, ma obi m na-agwasi m ike na o mekataghị hụ m n’anya.

Mgbe ihe dị ka afọ iri na ise e mere m baptizim gafere, e nwere ihe mere ka m gbanwee otú m si ele onwe m anya. Ọ bụ okwu otu nwanna kwuru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Mgbe ọ na-ekwu okwu ahụ, o kwuru ihe e dere na Jems 1:23, 24. Amaokwu ndị ahụ ji Okwu Chineke tụnyere enyo nke na-enyere anyị aka ịhụ onwe anyị otú Jehova si ahụ anyị. Mgbe o kwuchara okwu ahụ, abịara m jụwa onwe m ma ọ̀ bụ otú Jehova si ahụ m ka m si ahụ onwe m. Ná mmalite, achọghị m ikweta na ihe a obi m na-agwa m ugbu a bụ eziokwu. Obi m ka na-agwasi m ike na Jehova agaghị ahụli m n’anya.

Mgbe ụbọchị ole na ole gafere, agụrụ m otu amaokwu Baịbụl nke gbanwere ndụ m. Amaokwu ahụ bụ Aịzaya 1:18, bụ́ ebe Jehova kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie. . . . Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” Ọ bịara dị m ka Jehova ọ̀ na-agwa m, sị: “Vicky nwa m, bịa ka mụ na gị kpezie. Ama m gị, ama m mmehie ndị i merela, ama m obi gị, ahụkwara m gị n’anya.”

Ụra ekweghị m ohihi n’abalị ahụ. Obi esichabeghị m ike na Jehova nwere ike ịhụ m n’anya, ma m malitere iche echiche banyere ájá mgbapụta Jizọs. Anya meghere m ozugbo ahụ. Abịara m ghọta na Jehova nọ na-enwere m ndidi kemgbe, e nweela ọtụtụ ụzọ o si na-egosi m na ya hụrụ m n’anya. Ma, o yiri ka m̀ nọ na-agwa ya, sị: “Otú ọ sọkwara ịhụnanya gị ya haruo, o nweghị ike irute n’ebe m nọ. Àjà Ọkpara gị chụrụ agaghị ekpuchili mmehie m.” O yiri ka m̀ na-ajụ àjà ahụ Jehova ji Ọkpara ya chụọ maka anyị. Ma ugbu a, m chebaara onyinye ahụ Jehova nyere echiche, ọ malitere ido m anya na Jehova hụrụ m n’anya.

URU NDỊ M RITERELA: Adịla m ọcha, obi m anaghịzi ama m ikpe. Mụ na di m adịkwuola ná mma, obi dịkwa m ụtọ na m nwere ike iji ihe ndị mere ná ndụ m nyere ndị ọzọ aka. Mụ na Jehova na-adịkwu ná mma ugbu a.

“Chineke azala m ekpere m.”​—SERGEY BOTANKIN

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

ABỤ M ONYE: RỌSHỊA

NDỤ M BIRI: EGWÚ RỌK RIRI M ISI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Votkinsk, bụ́ ebe a mụrụ otu nwoke a ma ama na-ede egwú nke aha ya bụ Pyotr Ilich Tchaikovsky. Ndị mụrụ m bụ ogbenye. Papa m bụ ezigbo mmadụ, ma, ọ bụ onye aṅụrụma. Nke a mere ndị ezinụlọ anyị ji achị obi n’aka mgbe niile.

N’oge m na-aga akwụkwọ, enweghị m isi akwụkwọ. Nke a mere ka ọ̀ dị m ka o nweghị uru m bara, meekwa ka m na-eche na ndị ọzọ ka m mma.  Ebidoro m ịnọrọ onwe m na ile ndị ọzọ anya ọjọọ. Ụjọ akwụkwọ bidoro tụwa m. Dị ka ihe atụ, e nwere otu oge a gwara m ka m bịa kwuo okwu n’ihu ụmụ klas ibe m, enweghịdị m ike ikwu ihe m chọrọ ikwu n’agbanyeghị na m maara ihe ahụ nke ọma. Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ihe e dere na repọt kaadị m n’otu oge bụ: “Okwu anaghị aga ya werewere n’ọnụ, ọ naghị ekwupụtali ihe dị ya n’obi.” Ihe a e dere gburu mmụọ m, mee ka ọ dịwakwuo m ka ọ dịghị uru m bara. Ebidoziri m iche ma ndụ m ọ̀ bakwadịrị uru.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na ise, ebidoro m ịṅụ mmanya na-aba n’anya. M ṅụchaa mmanya, obi na-adị m mma. Ma m ṅụọ ya nnukwu, akọnuche m ebido pịawa m ụtarị. Ọ dịwara m ka ndụ m enweghị isi. Ike ụwa bịara gwụwa m nke na mgbe ụfọdụ, anaghị apụ èzí ruo ụbọchị ole na ole. Echewere m echiche igbu onwe m.

Mgbe m ruru afọ iri abụọ, achọtara m ihe ọzọ ga na-enye m obi ụtọ. Ihe ahụ bụ egwú rọk. M nụhaala egwú ahụ, obi na-atọ m ụtọ. Achọwara m ndị ọzọ egwú ahụ na-amasị. Ahapụrụ m ntutu isi m ka o too ogologo, kpọpuo ntị m, ma na-eji ejiji ka ndị na-akụ egwú rọk. Eji m nwayọọ nwayọọ bido ime ihe ike na iwe iwe ọkụ, mụ na ndị ezinụlọ anyị na-esekarịkwa okwu.

Echere m na ige egwú rọk ga-eme ka m nwee obi ụtọ, ma o mere ka m kpawa àgwà ndị m na-anaghị akpabu! Mgbe m mechara nụ na ndị na-agụ egwú rọk, bụ́ ndị m na-agbalị ịdị ka ha, na-akpa àgwà ọjọọ, o wutere m n’ihi na atụghị m anya na ha ga-eme ụdị ihe ahụ.

Ebidokwara m chewe echiche igbu onwe m. Echesiwere m ya ike na nke ugbu a. Naanị ihe mere na emeghị m ya bụ na m na-echeta otú ọ ga-esi ewute mama m. Ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, o mekwaarala m ọtụtụ ihe. Amaghị m ihe m ga-eme eme. Ike ụwa agwụla m, ma obi ekweghị m gbuo onwe m.

Ka m nwee ike wepụ obi m n’igbu onwe m, amalitere m ịgụ akwụkwọ ndị kọrọ akụkọ banyere mba Rọshịa. Otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ m gụrụ kọrọ banyere otu dike nke rụrụ ọrụ n’otu chọọchị. Akụkọ ahụ mere ka ife Chineke na imere ndị mmadụ ihe ọma gụsiwa m agụụ ike. Ekpere m ekpere kọọrọ Chineke ihe dị m n’obi, nke bụ́ ihe m na-emetụbeghị. M rịọrọ Chineke ka o gosi m otú m ga-esi mee ka ndụ m nwee isi. Mgbe m nọ na-ekpe ekpere ahụ, obi ruru m nnọọ ala. Ihe kadị tụọ m n’anya bụ ihe mezịrịnụ. Naanị awa abụọ m kpechara ekpere ahụ, otu Onyeàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m ma gwa m ka mụ na ya mụwa Baịbụl. Obi m gwara m ozugbo na Chineke azala m ekpere m. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ndụ m gbanwere, obi amalite ịdị m ụtọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Etufuru m ihe niile m nwere bụ́ ndị gbasara egwú rọk n’agbanyeghị na o siiri m ike ime ya. Ma, egwú ahụ ekweghị apụ m apụ n’obi. Mgbe ọ bụla m na-agafe ebe a na-akpọ egwú rọk, ozugbo ahụ, m na-echeta ndụ m biri na mbụ. Achọghị m ichetawa ihe ndị ahụ ugbu a m mụtawarala ihe ọma. Eji m maka ya na-agbara ebe ndị m na-anụ egwú ahụ ọsọ. Mgbe ọ bụla egwú rọk batara m n’obi, ana m ekpesi ekpere ike. Ekpere ahụ m na-ekpe na-eme ka m nwee “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”—Ndị Filipaị 4:7.

Ka m na-amụ Baịbụl, amụtara m na Ndị Kraịst kwesịrị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere. (Matiu 28:19, 20) Echere m na agaghị m emeli ya. Ma ihe ọhụrụ ndị m na-amụta nyere m ezigbo obi ụtọ, meekwa ka obi ruo m ala. Ama m na ọ dị mkpa ka ndị ọzọ mụta ihe ọma ndị ahụ. N’agbanyeghị na ụjọ ji m, ebidoro m ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta. O juru m anya na mgbe m bidoro ịkọrọ ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru, obi katawara m. O mekwara ka ihe ndị ahụ m na-amụta na Baịbụl bamie abami n’obi m.

URU NDỊ M RITERELA: Alụọla m nwaanyị, mụ na nwunye m na-ebikwa n’udo. Enyekwarala m ụfọdụ ndị aka ịmụta ihe Baịbụl na-ekwu, ma mama m ma nwanne m nwaanyị. Ijere Chineke ozi na inyere ndị ọzọ aka ka ha mata Chineke emeela ka m nwee ezigbo obi ụtọ ná ndụ.