Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

 Ihe Ndị Na-eme Ka E nwee Obi Ụtọ N’ezinụlọ

Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

Jọn * sịrị: “Mgbe ọ bụla iwe na-ewe Esta, ọ na-ebegide ákwá ike agwụ. Ọ bụrụ na mụ na ya anọrọ ala ka anyị kparịta ihe na-ewe ya, ahụ́ agbakasịwa ya ma ọ bụdị ya ajụ ịtụpụrụ m ọnụ. O yiri ka o nweghị ihe m mere na-adị ya mma. Ike ya agwụla m.”

Esta sịrị: “Mgbe di m lọtara, anọ m na-ebe ákwá. Mgbe m bidoro ịkọrọ ya ihe na-ewe m, ọ napụrụ m okwu n’ọnụ. Ọ sịrị m ma ọ̀ bụ obere ihe a mere m ji na-ebe ákwá. Ihe ahụ o kwuru mere ka iwe wekwuo m.”

Ò NWETỤLA mgbe ọ dị gị otú ahụ ọ dị Jọn ma ọ bụ Esta? Onye nke ọ bụla chọrọ ka a ghọta otú obi dị ya, ma o kweghị ha omume. Ọ̀ bụ gịnị kpatara ya?

Otú ụmụ nwoke si ekwu ihe dị ha n’obi abụghị otú ụmụ nwaanyị si ekwu nke ha. Mkpa ha anaghịkwa abụ otu. Ọtụtụ mgbe ọ na-agụ nwaanyị agụụ ịgwa di ya ihe niile dị ya n’obi. Ma, ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị achọ oké okwu. Ihe ka ha mkpa bụ ka okwu bie ngwa ngwa, ha anaghị achọ ka ha na nwunye ha kpawa isiokwu. N’agbanyeghị ọdịiche a dị n’etiti nwoke na nwaanyị, olee otú gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-esi na-ekwurịta ihe dị unu n’obi? Ọ bụ ịkwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù.

Onye na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù anaghị eji ha egwuri egwu, ọ na-agbalịkwa ịghọta otú obi dị ha. Kemgbe ị bụ nwata, o nwere ike ị na-akwanyere ndị tọrọ gị na ndị ka gị ùgwù. Ma ugbu a ị lụrụla di ma ọ bụ nwunye, o nwere ike isiri gị ike ịkwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù n’ihi na gị na ya bi n’ụlọ. Otu nwaanyị aha ha bụ Linda, onye lụrụ di kemgbe afọ asatọ, sịrị: “Ama m na di m na-ewetu obi ala gee onye ọ bụla bịara ịgwa ya okwu ntị. Naanị ihe m chọrọ bụ ka o sikwa otú ahụ na-ege m ntị.” O nwere ike mgbe gị na ndị enyi gị ma ọ bụdị ndị ị na-amaghị na-ekwurịta okwu, ị na-ewetu obi ala gee ha ntị ma ọ bụ jiri olu ọma gwa ha okwu. Ma, ọ̀ bụ otú ahụ ka i si emeso di gị ma ọ bụ nwunye gị?

Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị akwanyere ibe ha ùgwù, udo anaghị adị n’ụlọ ha, ha ga na-esekwa okwu. Otu eze maara ihe kwuru, sị: “Ọ dị mma iri iberibe achịcha kpọrọ nkụ biri n’udo: karị ịnọ n’ụlọ a na-eriju afọ ma na-alụ ọgụ.” (Ilu 17:1, Bible Nsọ Ọhụụ) Baịbụl gwara di ka ọ na-asọpụrụ nwunye ya, ma ọ bụ na-akwanyere ya ùgwù. (1 Pita 3:7) ‘Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.’—Ndị Efesọs 5:33.

 Olee otú ị ga-esi na-akwanyere di ma ọ bụ nwunye gị ùgwù mgbe ị na-agwa ya okwu? Legodị ndụmọdụ ụfọdụ Baịbụl nyere, bụ́ ndị ga-abara gị uru.

Mgbe Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Chọrọ Ịgwa Gị Okwu

Ihe Nwere Ike Ime Ka O Siere Gị Ike: Ọtụtụ ndị na-achọ ka a na-ege ihe ha na-ekwu, ma ha anaghị ege ndị ọzọ ntị. Ị̀ na-eme otú ahụ? Baịbụl kwuru na onye ọ bụla “na-aza okwu tupu ya anụ ya” bụ onye nzuzu. (Ilu 18:13) N’ihi ya, tupu gị ekwuo okwu, gee ntị. Gịnị mere ị ga-eji mee otú ahụ? Otu nwaanyị aha ya bụ Karo, onye lụrụ di kemgbe afọ iri abụọ na isii, sịrị: “Ọ naghị adị m mma ma di m gwawa m ihe m ga-eme ozugbo m kọọrọ ya nsogbu m nwere. Ihe dị m mkpa abụghị ka o kweta na m nwere nsogbu ahụ ma ọ bụ ka ọ gwa m ihe kpatara ya. Naanị ihe m chọrọ bụ ka o gee m ntị ma ghọta otú obi dị m.”

Ma, e nwekwara ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ọ na-esiri ike ikwu ihe dị ha n’obi ma ọ bụrụ na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enye ha nsogbu ka ha kwuo ya. Lọrịta, bụ́ onye lụrụ di n’oge na-adịbeghị anya, chọputara na ọ na-esiri di ya ike ịkọrọ ya ihe dị ya n’obi. Ọ sịrị: “Ana m enwe ndidi ruo mgbe di m chọrọ ịkọrọ m ya.”

Ihe I Nwere Ike Ime: Ọ bụrụ na o nwere ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ịkpa, ya abụrụ na ihe ahụ nwere ike isere unu okwu, kwulite ya mgbe obi dị unu abụọ mma. Ya bụrụkwanụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị achọghị ikwu ya mgbe ahụ? Otu ihe ị ga-eburu n’obi bụ na “echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.” (Ilu 20:5) Ọ bụrụ na i ji ọkụ ọkụ na-esepụta mmiri n’olulu mmiri, mmiri ị ga-awụfu ga-ebu ibu. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na i sowe ya ọkụ ọkụ, o nwere ike ime ka o loo ihe ọ chọrọ ikwu, ị gaghị enwekwa ike ịchọpụta ihe dị ya n’obi. Kama iso ya ọkụ ọkụ, wetuo obi jụọ ya ajụjụ ụfọdụ, nweekwara ya ndidi ma ọ bụrụ na o kweghị ekwu ihe dị ya n’obi ọsọ ọsọ.

Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu okwu, ‘bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Onye na-ege ntị nke ọma anaghị ege naanị ihe a na-ekwu kamakwa ọ na-agbalị ịghọta otú obi dị onye na-agwa ya okwu. Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu okwu, gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ya. Otú i si na-ege ya ntị ga-eme ka ọ mara ma ị̀ na-akwanyere ya ùgwù ma ọ bụ na ị naghị akwanyere ya.

Jizọs kụziiri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ege ntị. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke bịakwutere Jizọs ka o nyere ya aka, Jizọs egboroghị ya mkpa ya ozugbo ahụ. Ihe mbụ o mere bụ ige nwoke ahụ ntị ka o kwuo ihe ọ chọrọ ka o meere ya. Nke abụọ bụ na ihe ahụ ọ nụrụ mere ka o metere nwoke ahụ ebere. N’ikpeazụzi, ọ gwọrọ nwoke ahụ. (Mak 1:40-42) Ọ bụrụ na o nwere ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akọrọ gị, mee ihe ahụ Jizọs mere. Cheta na o nwere ike ihe dị ya mkpa bụ ka i gee ya ntị, ọ bụghị ka i gbooro ya mkpa ya ozugbo. N’ihi ya, wetuo obi gee ya ntị. Mgbe ị ghọtara otú obi dị ya, gbalịzie ka ihe o kwuru ruo gị n’obi. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike inyere ya aka. I mee ihe ndị a, ị na-egosi na ị na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù.

MEGODỊ IHE A: Mgbe ọzọ di gị ma ọ bụ nwunye gị na-agwa gị okwu, gbalịa ka ị ghara ịgwa ya ihe ọ ga-eme ozugbo ahụ. Chere ka o kwuchaa, ka ị hụ na ị ghọtara ihe ọ na-ekwu. E mechaa, gakwuru ya jụọ ya, sị, “Ì chere na m gere gị ntị mgbe ahụ ị na-ekwu okwu?”

Mgbe Ị Chọrọ Ịgwa Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Okwu

Ihe Nwere Ike Ime Ka O Siere Gị Ike: Linda, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya, sịrị: “Ihe ndị a na-egosi na tiivi na-eme ka ndị mmadụ chewe na ọ dịghị njọ ma mmadụ kparịa di ya ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụkwanụ maa ya njakịrị.” Ụfọdụ ndị tolitere n’ezinụlọ ebe onye ọ bụla na-agwa ibe ya okwu otú masịrị ya. Ọ bụrụ na ha mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ha na-esikwa otú ahụ agwa di ha ma ọ bụ nwunye ha okwu. Alice, bụ́ onye bi na Kanada, sịrị: “Etoro m n’ebe ndị mmadụ na-abakarị mba, na-ama njakịrị ma na-akpọ ibe ha iyi.”

Ihe I Nwere Ike Ime: Mgbe ị na-akọrọ ndị ọzọ banyere di gị ma ọ bụ nwunye gị, ka ihe ị na-ekwu “bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya  nweta ihe dị mma.” (Ndị Efesọs 4:29) Otú i si ekwu okwu kwesịrị ime ka ndị ọzọ na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù.

Ọ bụrụgodị mgbe naanị gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ, gbalịa ka ị ghara ịma ya njakịrị ma ọ bụ kpọọ ya iyi. N’Izrel oge ochie, Maịkal wesara di ya bụ́ Eze Devid iwe. Ọ kparịrị di ya ma kwuo na di ya “dị nnọọ ka otu n’ime ndị ikom na-enweghị uche.” Ihe ahụ o kwuru wutere di ya, weekwa Chineke iwe. (2 Samuel 6:20-23) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Mgbe ọ bụla gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu okwu, chee echiche tupu i kwuo okwu. (Ndị Kọlọsi 4:6) Filip, onye lụrụ nwaanyị kemgbe afọ asatọ, kwuru na ya na nwunye ya ka na-ese okwu mgbe ụfọdụ. Ọ chọpụtala na mgbe ụfọdụ, ọ bụ ihe ya kwuru na-eme ka ihe ka njọ. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na mgbe ọ bụla mụ na nwunye m sere okwu, ihe anaghị akara anyị mma ma okwu bie n’olu m. Obi ga-atọ m ụtọ, ọ ga-akakwa baara m uru ma ọ bụrụ na anyị anaghị ese okwu.”

Otu agadi nwaanyị di ya nwụrụ gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ ‘ka onye nke ọ bụla n’ime ha nweta ebe izu ike n’ụlọ di ya.’ (Rut 1:9) Ọ bụrụ na di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù, ụlọ ha ga-abụ “ebe izu ike.”

MEGODỊ IHE A: Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị wepụta oge kparịta ihe ndị a e kwuru n’isiokwu a. Jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ajụjụ ndị a: “Mgbe mụ na ndị ọzọ na-ekwu banyere gị, ọ̀ na-adị gị ka m̀ na-akwanyere gị ùgwù, ka ọ̀ na-adị gị ka m̀ na-akparị gị? Olee ebe ndị ị ga-achọ ka m mezie?” Gee nwunye gị ma ọ bụ di gị ntị nke ọma mgbe unu na-akparịta ihe ndị a. Gbalịakwa ka i mee ihe ndị ọ gwara gị.

Ghọta na Obi Unu Agaghị Abụ Otu n’Ihe Niile

Ihe Nwere Ike Ime Ka O Siere Gị Ike: Ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ na-eche na ebe ọ bụ na Baịbụl sịrị na di na nwunye bụ “otu anụ ahụ́,” ihe ọ pụtara bụ na obi ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha ga-abụ otu n’ihe niile ma ọ bụkwanụ na ha ga na-akpa otu àgwà. (Matiu 19:5) Ma, ọ naghị adị anya ha achọpụta na ụdị ihe a enweghị ike ime eme. Ozugbo di na nwunye lụrụ, ọdịiche dị n’otú ha abụọ si eme ihe na-emekarị ka ha na-ese okwu. Linda sịrị: “Otu ọdịiche dị n’etiti mụ na di m bụ na ihe anaghị echegbu di m otú o si echegbu m. Mgbe ụfọdụ, ahụ́ na-eru ya ala mgbe obi koro m n’elu. Nke a na-akpasu m iwe n’ihi na ọ na-adị m ka ihe anaghị adị ya mkpa otú ọ na-adị m.”

Ihe I Nwere Ike Ime: Were di gị ma ọ bụ nwunye gị otú ọ dị, ghọtakwa na e nwere ihe dị iche n’unu abụọ. Iji maa atụ: Anya gị na ntị gị anaghị arụ otu ọrụ; n’agbanyeghị nke ahụ, ha abụọ na-arụkọ ọrụ mgbe ị chọrọ ịgafe okporo ụzọ. Ada, bụ́ onye lụrụ di kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ, sịrị: “Ọ bụrụhaala na ihe m chọrọ ma ọ bụ ihe di m chọrọ emegideghị iwu Chineke, di m na-ahapụ m ka m mee ya, mụnwa na-ahapụkwa ya ka o mee ya. A sị ka e kwuwe, ihe anyị bụ bụ di na nwunye, anyị enweghị otu isi.”

Ọ bụrụ na otú di gị ma ọ bụ nwunye gị si eme ihe dị iche n’otú gịnwa si eme ihe, ma ọ bụkwanụ na ihe ọ chọrọ dị iche n’ihe ị chọrọ, achọla naanị ọdịmma onwe gị. Chọọ ọdịmma ya. (Ndị Filipaị 2:4) Okechukwu, bụ́ di Ada, sịrị: “Ọ bụghị mgbe niile ka m na-ekweta ihe nwunye m kwuru ma ọ bụ ghọta ihe mere o ji kwuo ihe o kwuru. Ma ihe m na-echeta bụ na ahụrụ m ya n’anya karịa ihe ọ bụla m chere. Mgbe ọ bụla obi dị ya ụtọ, obi na-adịkwa m ụtọ.”

MEGODỊ IHE A: Were akwụkwọ depụta ebe ndị ị maara nwunye gị ma ọ bụ di gị na-eme nke ọma karịa gị.—Ndị Filipaị 2:3.

Di na nwunye ịkwanyere ibe ha ùgwù bụ otu ihe dị mkpa nke na-eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ, na-emekwa ka di na nwunye biri n’udo. Linda sịrị: “Mgbe di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù, obi na-eru ha ala n’ezinụlọ ha. N’eziokwu, ọ dị mma ka di na nwunye mụta ịkwanyere ibe ha ùgwù.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

▪ Olee uru ezinụlọ anyị riterela n’ihi na otú di m ma ọ bụ nwunye m si eche echiche dị iche n’otú m si eche?

▪ Gịnị mere o ji dị mma ka m kwere ka e mee ihe nwunye m ma ọ bụ di m chọrọ ma ọ bụrụhaala na o megideghị ihe Baịbụl kwuru?