Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Poopu Ọ̀ “Nọchiri Anya Pita Dị Asọ”?

Poopu Ọ̀ “Nọchiri Anya Pita Dị Asọ”?

 Poopu Ọ̀ “Nọchiri Anya Pita Dị Asọ”?

N’AFỌ 2002, Poopu Jọn Pọl nke Abụọ degaara bishọp obodo Limbọg, nke dị na Jamanị akwụkwọ ozi, ma gwa bishọp ahụ na ya akagbuola ihe o kwuru banyere ite ime. Ná mmalite akwụkwọ ozi ahụ, poopu ahụ kwuru na ọ bụ ya na-ahụ maka “ọdịmma na ịdị n’otu nke chọọchị niile dị ka Jizọs Kraịst kwuru.” O kwuru na ya nwere ikike ịkagbu ihe bishọp ahụ kwuru n’ihi na ya bụ poopu, onye a sịrị na ọ “nọchiri anya Pita dị asọ.”

Otu akwụkwọ ndị Roman Katọlik sịrị: “Kraịst mere Pita dị asọ onyeisi nke ndịozi niile.” Chọọchị Katọlik sịkwara na “Kraịst kwuru na a ga na-enwe ndị ga na-anọchi anya Pita n’ọkwá a ruo mgbe ebighị ebi; nakwa na ọ ga na-abụ ndị bishọp nke Rom ga na-anọchi anya ya.”—New Catholic Encyclopedia (2003), Nke 11, peeji nke 495-496.

Ihe ndị a e kwuru abụghị obere okwu. Ì lebarala ha anya iji mata ma hà bụ eziokwu? Ka anyị lebagodị anya n’ajụjụ atọ a ka anyị wee chọpụta azịza ha: (1) Baịbụl ò kwuru na Pita bụ poopu mbụ? (2) Gịnị ka ihe ndị mere eme na-agwa anyị banyere otú e si malite inwe ndị poopu? (3) Omume ndị poopu na ihe ndị ha na-akụzi ọ̀ na-egosi n’eziokwu na ha nọchiri anya Pita dị ka ha kwuru?

Pita Ọ̀ Bụ Poopu Mbụ?

Kemgbe ụwa, ndị Katọlik na-ekwu na ihe Jizọs kwuru na Matiu 16:18 gosiri na ọ bụ Pita bụ onyeisi chọọchị ha. Ebe ahụ sịrị: “Ị bụ Pita, ọ bụkwa n’oké nkume a ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m.” E jidị asụsụ Latịn dee ihe ahụ e kwuru n’amaokwu a n’ime nnukwu ụlọ ụka Senti Pita, nke dị na Rom.

O nwere mgbe Augustine, bụ́ ụkọchukwu oge gboo a na-akwanyere ùgwù, kwuru na ọ bụ na Pita ka e wukwasịrị ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma tupu ụkọchukwu ahụ anwụọ, o kwugharịrị ihe ahụ o kwuru. N’otu akwụkwọ Augustine dere bụ́ nke a kpọrọ Retractations, o kwuru na ọ bụ na Jizọs ka e wukwasịrị ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ bụghị na Pita. *

N’eziokwu, e kwuru ọtụtụ ihe banyere Pita onyeozi n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Jizọs kpọrọ ndịozi ya atọ, bụ́ Jọn, Jems, na Pita, ka ha soro ya mee ihe ụfọdụ ndị ọzọ na-esoghị ya mee. (Mak 5:37, 38; 9:2; 14:33) Jizọs nyere Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe,” bụ́ nke Pita ji meghee ọnụ ụzọ nke Alaeze ahụ. Ndị mbụ o megheere ya bụ ndị Juu na ndị a tọghatara n’ofufe ndị Juu, ndị nke abụọ bụ ndị Sameria, ndị nke ikpeazụ abụrụ ndị Jentaịl. (Matiu 16:19; Ọrụ 2:5, 41; 8:14-17; 10:45) Ebe ọ bụ na Pita anaghị asọ anya, mgbe ụfọdụ, ọ na-ekwuchite ọnụ ndịozi ndị ọzọ. (Ọrụ 1:15; 2:14) Ma ihe ndị a ò mere ka Pita bụrụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ?

Pọl onyeozi kwuru na e nyere Pita ike ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị e biri úgwù.” (Ndị Galeshia 2:8) Ma ihe ndị ọzọ Pọl kwuru egosighị na Pọl na-ekwu na Pita bụ onyeisi nke ọgbakọ ahụ. Ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ ọrụ ikwusa ozi ọma nke Pita na-ekwusara ndị Juu n’oge ahụ.

Ọ bụ eziokwu na e nyere Pita nnukwu ọrụ, o nweghị ebe Pita kwuru na Baịbụl na ya bụ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, ma ọ bụkwanụ  na ọ bụ ya na-ekpebiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ihe ha na-eme. N’akwụkwọ ozi Pita dere, naanị ihe ọ kpọrọ onwe ya bụ “onyeozi” na “okenye.”—1 Pita 1:1; 5:1.

Gịnị Ka Ihe Ndị Mere Eme Na-agwa Anyị Banyere Otú E Si Malite Inwe Ndị Poopu?

Oleezi otú e si malite inwe ndị poopu, oleekwa mgbe a malitere inwe ha? Mgbe ndịozi Jizọs ka nọ ndụ, e nwere ndị bidoro ịchọ ka ha bụrụ ndị a ma ama karịa ibe ha. Olee otú ndịozi Jizọs si lee ndị ahụ anya?

Pita onyeozi gwara ụmụ nwoke ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha ghara ime ‘ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke ka ọ̀ bụ ha nwe ha’; gwakwa ha ka ha were ịdị nwayọọ n’obi na-emeso ibe ha ihe. (1 Pita 5:1-5) Pọl onyeozi kwuru na a ga-enwe ndị ga-esi n’ime ọgbakọ bilie “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:30) Jọn onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi n’ihe dị ka afọ 98 O.A. (Oge Anyị). N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ baara otu onye na-eso ụzọ Kraịst aha ya bụ Dayọtrefis ezigbo mba. Gịnị mere o ji baara ya mba? Ọ bụ maka na Dayọtrefis “na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ” n’ọgbakọ. (3 Jọn 9) Ihe ndị a ndịozi kwuru mere ka ndị ahụ chọrọ ka ha bụrụ ndị a ma ama kwụsịtụgodị oké ọchịchọ ha.—2 Ndị Tesalonaịka 2:3-8.

Obere oge ka onye ikpeazụ n’ime ndịozi Jizọs nwụchara, ụfọdụ ndị bidokwara ịchọ ka ha bụrụ ndị a ma ama. Akwụkwọ bụ́ The Cambridge History of Christianity kwuru, sị: ‘O nwere ike ịbụ na e nweghị otu bishọp bụ o kwuchaa o bie na Rom tupu afọ 150 O.A.’ Ma n’ihe dị ka afọ 250 O.A., bishọp nke Rom mere onwe ya onyeisi kachanụ na chọọchị Katọlik ụfọdụ. * Iji gosi na o kwesịrị ịbụ ndị bishọp nke Rom ga na-abụ ndị isi kachanụ, ụfọdụ ndị edepụtala aha ndị niile ha weere na ọ bụ ha nọchiri anya Pita.

Ma aha ndị ha depụtara anaghị egosi na ndị ahụ a kpọrọ aha nọchiri anya Pita. Ọ̀ bụ maka gịnị? Nke mbụ bụ na ọ bụghị mmadụ niile kwetara na ndị niile e depụtara aha ha bụcha ndị bishọp Rom. Nke ka nke bụ na aha onye ha dere na ọ bụ poopu mbụ ekwesịghị ịdị ebe ahụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ya bụrụgodị na Pita gara kwusaa ozi ọma na Rom, dị ka ụfọdụ akwụkwọ e dere n’oge gboo kwuru, o nweghị ihe gosiri na Pita bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Rom.

Otu ihe gosiri nke a bụ na mgbe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, ọ kpọrọ aha ọtụtụ Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ. Ma ọ kpọtụghịdị aha Pita. (Ndị Rom 16:1-23) Ọ bụrụ na Pita bụ onyeisi ọgbakọ ahụ, ì chere  na Pọl ga-echefu ịkpọ aha ya ma ọ bụ kpachara anya hapụ ịkpọta aha ya?

Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ n’ihe dị ka oge Pita dere akwụkwọ ozi mbụ o dere n’ike mmụọ nsọ ka Pọl si Rom degara Timoti akwụkwọ ozi nke abụọ. N’akwụkwọ ozi ahụ, Pọl kwuru banyere Rom, ma o kwuteghị okwu Pita. Pọl sikwa Rom dee akwụkwọ ozi ise ọzọ, ma o nweghị nke ọ kpọrọ aha Pita na ya.

Jọn onyeozi dere akwụkwọ ozi atọ nakwa akwụkwọ Mkpughe mgbe ihe dị ka afọ iri atọ Pọl dechara akwụkwọ ozi ndị o dere gafere. N’akwụkwọ ndị ahụ Jọn dere, o kwughị na ọgbakọ dị na Rom ka ọgbakọ ndị ọzọ, ma ọ bụdị kwuo na e nwere onyeisi bụ́ o kwuchaa o bie nke nọchiri anya Pita n’ọgbakọ ahụ. Ma Baịbụl ma ihe ndị mere eme enweghị nke gosiri na e nwere mgbe Pita mere onwe ya bishọp mbụ nke ọgbakọ dị na Rom.

Omume Ndị Poopu na Ihe Ndị Ha Na-akụzi Ọ̀ Na-egosi na Ha Nọchiri Anya Pita Dị Ka Ha Kwuru?

Anyị kwesịrị ịtụ anya na onye ọ bụla kwuru na ya “nọchiri anya Pita dị asọ,” nakwa na ya bụ “Onye Nnọchianya Kraịst” ga na-eme omume ka Pita na Kraịst, na-akụzikwa ihe ndị ha kụziri. Dị ka ihe atụ, Pita ò kwere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ nyewe ya nsọpụrụ pụrụ iche? Mba. Mgbe a chọrọ inye ya nsọpụrụ pụrụ iche, ọ jụrụ. (Ọrụ 10:25, 26) Oleekwanụ maka Jizọs? O kwuru na ya bịara ije ozi, ọ bụghị ka ndị ọzọ jeere ya ozi. (Matiu 20:28) Oleekwanụ maka ndị poopu? Ọ̀ bụ na ha anaghị achọ oké aha nakwa ka a mara ha amara, na-ebi ndụ okomoko ma na-achọ ka ọ bụrụ ha bụ o kwuchaa o bie?

Pita na Kraịst ebighị ndụ rụrụ arụ, ha bụkwa ndị na-achọ udo. Ma legodị ihe otu akwụkwọ ndị Katọlik kwuru banyere poopu aha ya bụ Poopu Leo nke Iri. Akwụkwọ ahụ sịrị: “O tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, melaara ndị ikwu ya na ndị enyi ya, ndụ okomoko na-atọgbukwa ya atọgbu. Leo nke Iri ejighị ihe ọ bụla gbasara ife Chineke kpọrọ ihe, nke bụ́ ọrụ ka mkpa o kwesịrị ịrụ.” Otu ụkọchukwu Katọlik nke aha ya bụ Karl Amon, onye bụ́kwa ọkà mmụta n’ihe ndị mere n’oge ndị gara aga na chọọchị Katọlik, kọrọ banyere Poopu Alexander nke Isii. O kwuru na ihe ndị mere eme gosiri na poopu a “rụrụ arụrụala dị iche iche, jiri ọkwá ya mee ọtụtụ ihe na-adịghị mma, nara ndị mmadụ ego iji nye ha ọkwá, meekwa omume rụrụ arụ.”

Oleekwanụ maka ihe ndị poopu na-akụzi? Hà na-akụzi ihe Pita na Kraịst kụziri? Pita ekwetaghị na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Mgbe ọ na-ekwu banyere Eze Devid, bụ́ onye ezi omume, o kwuru hoo haa, sị: “Devid arịgoghị n’eluigwe.” (Ọrụ 2:34) Pita akụzirighị ndị mmadụ na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Kama, ọ kụziiri ha na baptizim bụ ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eji aka ha ekpebiri onwe ha.—1 Pita 3:21.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na onye ọ bụla n’ime ha ekwesịghị ile onwe ya anya na ya dị mkpa karịa ibe ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’ebe mmadụ niile nọ na onye na-ejere mmadụ niile ozi.” (Mak 9:35) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu a doro anya: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.” (Matiu 23:1, 8-10) Ì chere na ndị poopu na-eme ihe ndị ahụ Pita na Kraịst kụziri?

Ụfọdụ ndị kwuru na a sịgodị na onye bụ́ poopu anaghị ebi ndụ otú Onye Kraịst kwesịrị ibi, ọ ka kwesịrị ịbụ poopu. Ihe a ha kwuru ọ̀ dị gị mma ná ntị? Jizọs sịrị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru; osisi ọma apụghị ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ.” N’ihi ihe ndị a anyị lebara anya, ì chere na àgwà ndị a ndị poopu na-akpa ma ọ bụ ihe ndị ha na-akụzi ga-adị Pita ma ọ bụ Kraịst mma?—Matiu 7:17, 18, 21-23.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Mgbe Jizọs gwara Pita ihe ahụ dị na Matiu 16:18, ihe ha nọ na-akpa abụghị ọrụ Pita ga-arụ kama ọ bụ onye Kraịst bụ na ọrụ Kraịst ga-arụ. (Matiu 16:13-17) Pita n’onwe ya mechara kwuo na ọ bụ Jizọs bụ nkume ahụ e wukwasịrị ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Pita 2:4-8) Pọl onyeozi gosikwara na ọ bụ Jizọs bụ “nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala” ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ bụghị Pita.—Ndị Efesọs 2:20.

^ par. 14 Ma Jizọs ma ndịozi ya kwuru na ọtụtụ ndị na-ezi ozizi ụgha ga-abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Matiu 13:24-30, 36-43; 2 Timoti 4:3; 2 Pita 2:1; 1 Jọn 2:18) Obere oge ndịozi Jizọs nwụchara, ihe ndị ahụ ha kwuru mezuru. A malitere iwebata omenala ndị ọgọ mmụọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na iji ihe ndị ọkà mmụta Gris kwuru na-akọwa Baịbụl.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ihe ndị na-eme eme hà na-egosi na ndị poopu na-eme ka Pita?