Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụzọ Kacha Mma Isi Kụziere Ụmụaka Banyere Chineke?

Olee Ụzọ Kacha Mma Isi Kụziere Ụmụaka Banyere Chineke?

 Olee Ụzọ Kacha Mma Isi Kụziere Ụmụaka Banyere Chineke?

“Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.”—DIUTERỌNỌMI 6:6, 7.

MGBE ụfọdụ, ndị mụrụ ụmụ anaghị ama otú ha ga-esi zụọ ụmụ ha. Ha chọọkwanụ ịmata, ihe dị iche iche ha na-anụ ma ọ bụ ha na-agụta na-eme ka ha ghara ịma nke ha ga-eso eso. Ndị ikwu na ndị enyi ha na-enwekarị ọtụtụ aro ha na-atụrụ ha. Akwụkwọ ndị na-akụzi otú e si azụ ụmụ na-apụta kwa ụbọchị, otú ahụkwa ka e nwere ọtụtụ isiokwu na-agba n’Ịntanet. Ma mgbe ụfọdụ, ihe otu na-ekwu anaghị ekwekọ n’ibe ya.

Ma Baịbụl na-akụziri ndị mụrụ ụmụ ihe ha ga-akụziri ụmụ ha nakwa otú ha ga-esi kụzie ya. Ihe Baịbụl na-akụzi na-abakwa uru ma ha mee ya. Ihe e kwuru na Diuterọnọmi 6:6, 7, gosiri na ndị nne na nna kwesịrị ịchọta ụzọ ha ga-esi na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke kwa ụbọchị. N’isiokwu a, a kọwara naanị ihe anọ Baịbụl kwuru, bụ́ ndị nyeerela ọtụtụ ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke.

1. Jiri ihe ndị e kere eke kụziere ha ihe. Pọl onyeozi dere, sị: “Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20) Ndị nne na nna nwere ike inyere ụmụ ha aka ịghọta na ha na Chineke nwere ike ịbụ enyi. Otú ha nwere ike isi mee ya bụ igosi ụmụ ha ihe ndị Chineke kere ma nyeziere ha aka ịghọta àgwà ọma Chineke ndị ihe ndị ahụ e kere eke na-akụziri anyị.

Jizọs ji ihe ndị e kere eke kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghị aghọrọ mkpụrụ, ha adịghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa ha?” (Matiu 6:26) N’ebe a, Jizọs mere ka àgwà ọma abụọ Jehova nwere pụta ìhè. Àgwà ndị ahụ bụ ịhụnanya na obi ebere. Ma o nwekwara ihe ọzọ o mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta. O nyeere ha aka ichekwu echiche banyere otú Chineke si hụ ụmụ ya n’anya na otú o si eme ebere.

Eze Sọlọmọn, bụ́ nwoke maara ihe, ji amamihe Chineke nyere ndanda kụzie ihe dị mkpa. O dere, sị: “Gakwuru ndanda, gị onye umengwụ; hụ ụzọ ya wee mara ihe. Ọ bụ ezie na o nweghị ọchịagha, onyeisi ma ọ bụ onye  na-achị achị, ọ na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị; ọ chịkọtawo ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi.” (Ilu 6:6-8) Ọ̀ bụ na nke a abụghị ụzọ magburu onwe ya isi kụziere nwatakịrị na o kwesịrị inwe ihe ndị dị mma o kpebiri ime ma jiri ike Chineke nyere ya mee ha?

Ndị nne na nna nwere ike iji ihe ndị e kere eke kụziere ụmụ ha ihe otú ahụ Jizọs na Sọlọmọn mere. Otú ha nwere ike isi mee ya bụ: (1) Ịjụ ụmụ ha osisi na anụmanụ ndị na-amasị ha. (2) Ịmụtakwu banyere osisi na anụmanụ ndị ahụ. (3) Iji ihe ndị ahụ Chineke kere mee ka ụmụ ha mụta àgwà ọma ndị Chineke nwere.

2. Na-akụziri ụmụ gị ihe otú Jizọs si kụzie ihe. N’ime ndị niile dịtụrụla ndụ n’ụwa a, ọ bụ Jizọs bụ onye kacha nwee ihe dị mkpa ọ ga-agwa ndị mmadụ. Ma mgbe ọ na-akụzi ihe, ọ na-ajụkarị ndị mmadụ ajụjụ. Ọ na-achọkarị ịma ihe ndị ọ na-akụziri ihe chere. (Matiu 17:24, 25; Mak 8:27-29) Ndị nne na nna nwekwara ọtụtụ ihe dị mkpa ha ga-akụziri ụmụ ha. Ma, ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha ghọta ihe ha na-akụziri ha, ha kwesịrị ime ka Jizọs. Ha kwesịrị ịna-ajụ ụmụ ha ajụjụ ndị ga-eme ka ha kwuo ihe dị ha n’obi.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere àgwà ọjọọ ụmụ gị na-akpa ma ọ bụkwanụ na ha anaghị amụta ihe ndị ị na-akụziri ha ọsọ ọsọ? Legodị otú Jizọs si kụziere ndịozi ya ihe. Mgbe ụfọdụ, ha na-ese okwu, o sikwaara ha ike ịmụta na ọ dị mkpa ka ha dịrị umeala n’obi. Ma, Jizọs ji ndidi kụziere ha ihe, ọ gwakwara ha ugboro ugboro na ọ dị mkpa ka ha mụta ịdị umeala n’obi. (Mak 9:33, 34; Luk 9:46-48; 22:24, 25) Ndị nne na nna ndị na-eme ka Jizọs ga-eji ndidi na-akụziri ụmụ ha ihe ma ọ bụdị na-akụziri ha otu ihe ugboro ugboro ruo mgbe ụmụ ha mụtara ihe ahụ. *

3. Si n’omume gị na-akụziri ụmụ gị ihe. Ndị nne na nna kwesịrị ime ihe ahụ Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bi na Rom. Ọ gwara ha, sị: “Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị onye na-ekwusa “Ezula ohi,” ị̀ na-ezu ohi?”—Ndị Rom 2:21.

Ndụmọdụ a Pọl nyere dị ezigbo mkpa n’ihi na ihe ụmụaka na-aka amụta ngwa ngwa bụ ihe ha hụrụ ndị mụrụ ha na-eme, ọ bụghị ihe ha na-ekwu. N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ bụ ekwu ekwu emeghị eme, ọ ga-esiri ụmụ ha ike ime ihe ha na-agwa ha.

4. Bido ịkụziri nwa gị ihe mgbe ọ dị obere. Timoti, bụ́ onye ya na Pọl onyeozi so kwusaa ozi ọma, nwere aha ọma n’obodo ya. (Ọrụ 16:1, 2) Otu ihe kpatara ya bụ na a ‘malitere n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ’ kụziere ya “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” Mama Timoti na mama ukwu ya gụụrụ ya ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ ma nyekwara ya aka ichebara ihe ndị ọ nụrụ echiche.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

Ebe I Nwere Ike Isi Nweta Ihe Ga-enyere Gị Aka

Ndịàmà Jehova na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ ndị na-enyere ndị mụrụ ụmụ aka ịkụziri ụmụ ha eziokwu banyere Chineke. E bu obere ụmụaka n’obi dee ụfọdụ n’ime ha. E dere ndị ọzọ ka ha nyere ndị nne na nna aka ka ha na ụmụ ha ndị na-eto eto na-ekwurịta okwu nke ọma. *

O doro anya na tupu ndị nne na nna enwee ike ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke, o kwesịrị ka hanwa mara azịza ajụjụ ndị siri ike ụmụ ha nwere ike ịjụ ha. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ ndị a: Gịnị mere Chineke ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ? Gịnị ka Chineke bu n’obi kee ụwa? Ebee ka ndị nwụrụ anwụ nọ? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a na azịza ajụjụ ndị ọzọ ka gị na ndị ezinụlọ gị wee bịaruo Chineke nso.—Jems 4:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Okwu Hibru dị na Diuterọnọmi 6:7, bụ́ nke a sụgharịrị “kụnye,” pụtara ikwu otu ihe ugboro ugboro.

^ par. 15 Ndị mụrụ ụmụ nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ kụziere ụmụ ha ndị obere ihe. Akwụkwọ a kọwara ihe ndị Jizọs Kraịst kụziri. Ha nwekwara ike iji Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible, bụ́ nke kọrọ akụkọ ndị dị na Baịbụl otú ga-adịrị ụmụaka mfe nghọta. Ọ bụrụ na nwa ha aghọọla okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, ha nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1 na Nke 2.