Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

Ònye Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

 Ònye Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

“Nwa akwụkwọ adịghị aka onye nkụzi ya, ma onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.”—LUK 6:40.

Ọ NA-ADỊ ụfọdụ ndị nne na nna ka ha erughị eru ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke. Ha nwere ike ịna-eche na ha agaghị akụzi ya nke ọma n’ihi na ha agaghị akwụkwọ ma ọ bụ na ha amaghị ihe ha ga-akụziri ha. Ọ bụ ya mere ha ji ahapụrụ onyeisi okpukpe ma ọ bụ onye ikwu ha ọrụ a dị ezigbo mkpa.

Ma, ọ̀ bụ onye kwesịrị ịkụziri ụmụaka banyere Chineke na ihe bụ́ àgwà ọma? Lee ihe Baịbụl nwere ikwu n’okwu a, jirikwa ya tụnyere ihe ndị ọkachamara chọpụtarala.

Gịnị Bụ Ọrụ Nna Kwesịrị Ịrụ?

Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Ihe ndị ọkà mmụta chọpụtarala: Olee uru ọ bara ma ọ bụrụ na nna nwere okpukpe ọ na-ekpe? Otu isiokwu nke kwuru banyere ịzụ ụmụ, bụ́ nke e bipụtara n’afọ 2009, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị bụ́ nna nwere okpukpe ha na-ekpe, o nwere ike inyere ha aka ịbụkwu ezigbo nna. Ebe ọ bụ na okpukpe  ọ bụla nwere ihe ọ na-akụzi na iwu na-achị ndị òtù ya, ọ na-enyere ndị bụ́ nna aka idebe iwu okpukpe ha, na-emekwa ka ha ghara ime ihe ga-eme ka ndị ọzọ lewe ha anya ọjọọ.”

Baịbụl kwusiri ike na ọ dị mkpa ka ndị bụ́ nna na-azụ ụmụ ha. (Ilu 4:1; Ndị Kọlọsi 3:21; Ndị Hibru 12:9) Ma, ihe ahụ Baịbụl kwuru ọ̀ ka bara uru taa? N’afọ 2009, Mahadum Flọrịda bipụtara otu isiokwu kwuru uru ndị bụ́ nna na-abara ụmụ ha. Ndị chọpụtara ihe e dere n’isiokwu ahụ kwuru na ụmụaka ndị nna ha so zụọ na-aka amụta imetere ndị ọzọ ebere, obi na-akakwa esi ha ike n’ihe ndị ha na-eme. Ndị nke nwoke anaghị emekarị isi ike, ndị nke nwaanyị na-echekwa echiche nke ọma. O doro anya na ihe ahụ Baịbụl kwuru ka bara ezigbo uru.

Ọrụ Nne Na-arụ Ọ̀ Dị Ezigbo Mkpa?

Ihe Baịbụl kwuru: “Ahapụkwala iwu nne gị.”—Ilu 1:8.

Ihe ndị ọkà mmụta chọpụtarala: N’afọ 2006, otu akwụkwọ nke na-ekwu maka ụmụaka kwuru na n’ọtụtụ mba, ụmụaka ndị obere na nne ha na-anọ karịa ka ha na nna ha na-anọ. N’ihi ya, otú nne si ekwu okwu, àgwà ya ma ọ bụ omume ya na-eso ekpebi otú nwa ya ga-esi na-akpa àgwà.

Ọ bụrụ na nne na nna agbakọọ aka na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke, e nwere ihe abụọ dị ezigbo mkpa ha na-enye ha. Nke mbụ, ụmụ ha ga-enwe ike ịmụta otú ha na Nna ha nke eluigwe ga-esi bụrụ enyi, nke bụ́kwanụ ihe ga-abara ha uru ná ndụ ha niile. Nke abụọ, ụmụaka ga-esi n’aka nne na nna ha mụta na di na nwunye kwesịrị ịgbakọ aka ọnụ na-eme ihe n’ezinụlọ. (Ndị Kọlọsi 3:18-20) Ọ bụ eziokwu na ndị ọzọ nwere ike inyere ndị nne na nna aka ịzụ nwa ha, ma, ọ bụ ndị nne na nna ka e nyere ọrụ ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke nakwa ịkụziri ha otú Chineke chọrọ ka ihe si na-aga n’ezinụlọ.

Ma oleezi otú ndị nne na nna kwesịrị isi kụziere ụmụ ha ihe? Olee ụzọ ga-akacha mma isi mee ya?