Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

È Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

 È Kwesịrị Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke?

“Okpukpe dị iche iche anyị nwere na-eme ka anyị kpọọ ibe anyị asị kama ime ka anyị hụ ibe anyị n’anya.”—JONATHAN SWIFT, ONYE ỊNGLAND NKE NA-EDE AKWỤKWỌ.

Ọ BỤ ihe dị ka narị afọ atọ gara aga ka Jonathan Swift dere ihe a, ma ọtụtụ ndị taa ga-ekweta na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-ekwu na e kwesịghị ikwe ka ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke. Ha weere na ụmụaka ndị mụrụ ha kụziiri banyere Chineke anaghị echezi echiche echezi.

Gịnị ka i chere? N’ime ihe ndị a e kwuru n’okpuru ebe a, olee nke i chere kwesịrị ekwesị?

● E kwesịghị ikwe ka ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke.

● Ndị nne na nna kwesịrị ichere ka ụmụ ha too tupu ha akụziwere ha banyere Chineke.

● Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ibido mgbe ụmụ ha dị obere kụziwere ha ihe hanwa kweere banyere Chineke. Ma mgbe ụmụ ha toro, ha kwesịrị ịgba ha ume ka ha chebara ihe ndị a kụziiri ha echiche ma jiri aka ha kpebie ma hà ga-efe Chineke.

● Ụmụaka kwesịrị isoro ndị mụrụ ha kpewe okpukpe ha na-ekpe ma ọ̀ dị ụmụaka ahụ mma ma ọ bụ na ọ dịghị ha.

Ịkụziri Ụmụaka Banyere Chineke Ọ̀ Na-emebiri Ha Ihe?

O nweghị nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya nke ga-achọ imerụ nwa ya ahụ́. Ma ihe ndị na-eme eme ọ̀ na-egosi na ndị kwuru na e kwesịghị ịkụziri ụmụaka banyere Chineke kwuru ihe dị mma? Kemgbe ọtụtụ iri afọ, ndị ọkachamara nọ na-eme nchọpụta ka ha mara ma ò nwere otú okpukpe ndị mụrụ ụmụ na-ekpe si emetụta ụmụ ha. Gịnị ka ha chọpụtara?

Ha achọpụtala na ịkụziri ụmụaka banyere Chineke anaghị emebiri ụmụaka ihe mgbe ha na-eto, kama ọ na-abara ha uru. N’afọ 2008, otu isiokwu e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ Social Science Research * sịrị: “A chọpụtala na ịkụziri ụmụaka banyere Chineke na-eme ka ha na ndị mụrụ ha dịrị ná mma.” Ọ sịkwara: “O yiri ka ịkụziri ụmụaka banyere Chineke na inyere ha aka igbo mkpa ime mmụọ ha ọ̀ dị mkpa ná ndụ ọtụtụ ụmụaka, na-emekwa ka ezinụlọ na-ebi n’udo.” Ị̀ hụrụ na nchọpụta a e mere dabara n’ihe Jizọs Kraịst kwuru? Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Oleekwanụ maka ndị na-ekwu na ndị nne na nna kwesịrị ichere ka ụmụ ha too tupu ha akụziwere ha banyere Chineke ma ọ bụ okpukpe? Ndị na-ekwu ihe a na-echefu ihe a dị mkpa: Uche nwatakịrị dị ka bọket na-enweghị ihe dị ya, nke e kwesịrị ịwụnye ihe n’ime ya. Ndị mụrụ ụmụ ga-ekpebi nke kaara ha mma; ọ̀ bụ iji aka ha kụziere ụmụ ha ihe ndị ha maara dị mma, ka ọ̀ bụ ka ndị ọzọ jiri ihe ọjọọ juru n’ụwa wụjuo obi ụmụ ha.

Gịnị Ga-enyere Ndị Nne na Nna Aka Ịkụziri Ụmụ Ha Ihe Dị Mma?

Ihe ndị na-eme eme n’ụwa na-egosi na okpukpe dị iche iche na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị ma na-erosa ibe ha iro. N’ihi ya, olee otú ndị mụrụ ụmụ nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ihe ahụ Jonathan Swift kwuru ghara ime ụmụ ha, ya bụ, ka ha ghara ịmụta ịkpọ ndị ọzọ asị? Olee otú ha ga-esi kụziere ụmụ ha ihe ndị ga-eme ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya?

Ihe ga-enyere ndị nne na nna aka bụ ịmata azịza ajụjụ atọ a: (1) Gịnị ka e kwesịrị ịkụziri ụmụaka? (2) Ònye kwesịrị ịkụziri ha ihe? (3) Olee ụzọ kacha mma isi kụziere ha ihe?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Mgbe a na-eme nchọpụta a, a gbara ihe karịrị puku ụmụaka iri abụọ na otu, bụ́ ndị bi n’Amerịka, ajụjụ ọnụ, gbaakwa ndị mụrụ ha na ndị nkụzi ha.