Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Obi Ụtọ na nke Ịtụ Anya Ihe Ọma

Ụbọchị Obi Ụtọ na nke Ịtụ Anya Ihe Ọma

 Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 130 nke Gilied

Ụbọchị Obi Ụtọ na nke Ịtụ Anya Ihe Ọma

O DORO anya na ụbọchị ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri atọ nke ụlọ akwụkwọ Gilied bụ ụbọchị obi ụtọ na nke ịtụ anya ihe ọma. Na Satọdee, Mach 12, 2011, ihe karịrị puku mmadụ asatọ na narị ise zukọtara maka ememme ngụsị akwụkwọ ahụ, ma ụmụ akwụkwọ ahụ ma ndị ikwu ha na ndị enyi ha. Mmadụ niile chọrọ nnọọ ịma otú ememme ngụsị akwụkwọ ahụ ga-esi aga nakwa ebe dị iche iche a ga-eziga ndị ahụ a zụrụ nke ọma ka ha gaa kụziere ndị mmadụ Baịbụl.

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Niile Na-atụ Anya” Jehova

Okwu a na-agba ume nke si n’akwụkwọ Aịzaya 30:18 bụ isiokwu nke okwu Geoffrey Jackson kwuru. Nwanna Jackson so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ọ bụkwa ya bụ onyeisi oche nke ememme ngụsị akwụkwọ a. O kwuru ihe tọrọ mmadụ niile ọchị mgbe ọ malitere okwu ya ma jaa ụmụ akwụkwọ ahụ mma maka mbọ ha gbara gụchaa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe. Ọ gwakwara ha na n’agbanyeghị na obi na-akụ ha kpum kpum n’ụbọchị a, ihe niile ga-aga were were. Gịnị ka ụmụ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịtụ anya ha n’ọdịnihu? O nwere ụzọ ihe atọ si n’Aịzaya 30:18-21 bụ́ ndị o kwuru na ha kwesịrị ịtụ anya ha.

Nwanna Jackson sịrị na nke mbụ bụ na ‘Jehova ga-anụ ekpere ha.’ O gosiri ha ihe na-agba ume e kwuru n’amaokwu nke 19, bụ́ ebe sịrị: “[Chineke aghaghị] imere gị amara mgbe ọ nụrụ mkpu ákwá gị.” Nwanna Jackson sịrị na okwu Hibru a sụgharịrị “gị” n’amaokwu a na-egosi na Jehova na-anụ ekpere anyị n’otu n’otu. Ọ sịrị: “Nna anyị bụ́ Jehova anaghị ajụ onye na-efe ya, ‘Gịnị mere na ị dịghị ka ibe gị?’ Kama nke ahụ, ọ na-atọ ntị n’ala gee onye ọ bụla n’ime anyị ntị. Ọ na-azakwa ekpere anyị niile.”

Ihe nke abụọ Nwanna Jackson kwuru na ha ga-atụ anya ya bụ nsogbu. O kwuru, sị, “Jehova ekweghị anyị nkwa na ihe niile ga na-agaziri anyị ná ndụ, ma, o kwere nkwa na ọ ga-enyere anyị aka.” Amaokwu nke 20 gosiri na Chineke buru amụma na mgbe ndị mba ọzọ ga-anọchibido Izrel, ahụhụ na mmegbu ga-ezu ebe niile ná mba ha. Ọ ga-adị ndị Izrel ka hà na-aṅụ ahụhụ na mmegbu ka mmiri, na-erikwa ya ka ihe oriri. Ma, Jehova kwuru na ya ga-agbatara ha ọsọ enyemaka mgbe niile. Ihe isi ike na nsogbu ga-abịakwara ụmụ akwụkwọ a, o nwekwara ike ịbụ ụdị nke ha na-atụghị anya ya! Nwanna Jackson kwuziri, sị, “Ma, unu kwesịrị ịtụ anya na Jehova ga-enyere unu aka ná nsogbu ọ bụla unu nwere.”

Nwanna Jackson gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na ihe e kwuru n’amaokwu nke 20 na nke 21 gosiri ihe nke atọ ha nwere ike ịtụ anya ya. Ọ sịrị ha: “Unu kwesịrị ịtụ anya nduzi Chineke, n’ihi ya, chọọnụ nduzi ya!” Nwanna Jackson kwuru na n’oge a, onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ige ntị nke ọma n’ihe ndị Jehova si na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na-agwa anyị. Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị n’ihi na ọ ga-eme ka ha nweta ndụ.

“Na-atụnụ Egwu Jehova”

Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kọwara ihe “egwu Jehova” pụtara. (2 Ihe E Mere 19:7) Ọ pụtaghị ịtụ ụjọ na-enweghị isi, kama ọ pụtara mmadụ ịchọsi ike ime ihe dị Chineke mma na onye ahụ iji obi ya niile na-asọpụrụ Chineke ma na-akwanyere ya ùgwù nke na ọ ga na-atụ ụjọ ime ihe na-adịghị Chineke mma. Nwanna Morris gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Mgbe unu ruru n’ebe unu ga-aga ikwusa ozi ọma, na-atụnụ ụdị egwu a.” Olee otú ha nwere ike isi gosi na ha na-atụ Jehova ụdị egwu a? Ọkà okwu a kwuru ụzọ abụọ ha ga-esi mee ya.

Na nke mbụ, Nwanna Morris gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha mee ihe e kwuru na  Jems 1:19 nke bụ́: “[Bụrụ] onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.” O kwuru na ụmụ akwụkwọ ahụ amụtala ọtụtụ ihe n’ọnwa ise ha nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ma ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịga gosiwe ndị mmadụ na ha ma ihe mgbe ha ruru n’ebe a ga-eziga ha. Ọ sịrị ha: “Unu kwesịrị ibu ụzọ gee ndị ọzọ ntị. Geenụ ndị nọ n’ọgbakọ ebe ahụ ntị, geenụ ndị na-edu ndú n’ebe ahụ ntị; geekwanụ ha ntị mgbe ha ga-agwa unu banyere mba ha na omenala ha. Ọ bụrụ na o nwere ihe unu na-amaghị, unu kwuo na unu amaghị ya. Ọ bụrụ na unu mụtara ihe n’ụlọ akwụkwọ a, unu ga-aghọta na ihe ndị unu ga-amụtakwu kwesịrị ime ka unu ghọta na o nweghị oké ihe unu ma.”

Na nke abụọ, Nwanna Morris gụrụ Ilu 27:21, bụ́ ebe sịrị: “Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha, ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo; a na-anwale mmadụ site n’otuto a na-enye ya.” O kwuru na otú ahụ ọ na-adị mkpa ka a nụchaa ọlaọcha na ọlaedo, otuto nwere ike ime ka àgwà anyị ka mma. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ bụrụ na mmadụ e too anyị, o nwere ike ịbụrụ anyị ọnwụnwa. O nwere ike ime ka anyị nyawa isi ma mebie mmekọrịta anyị na Jehova, ma ọ bụkwanụ mee ka anyị nye Jehova otuto ebe ọ bụ ya nyere anyị ihe niile, meekwa ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị emekata emekata hapụ idebe iwu ya. N’ihi ya, Nwanna Morris gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha lee otuto ọ bụla e nyere ha anya otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, ka ha were ohere ahụ gosi na ha na-atụ “egwu Jehova.”

“Jiri Ozi Gị Kpọrọ Ihe”

Guy Pierce onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kwuru okwu bụ́ isi n’ememme ngụsị akwụkwọ ahụ. Isiokwu ya bụ “Jiri Ozi Gị Kpọrọ Ihe.” O kwuru na okwu Bekee a sụgharịrị “onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ” pụtara “onye e dunyere ozi.” Ọ sịrị na ọ bụ ya mere e ji nwee òtù dị iche iche ndị na-eziga ndị mmadụ n’ala ọzọ ka ha gaa mee ụdị ihe dị iche iche. Ihe bụ ọrụ ọtụtụ n’ime ha bụ ịgwọ ndị mmadụ ọrịa na idozi nsogbu ndị e nwere n’ọchịchị obodo ebe e zigara ha. Nwanna Pierce gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Unu dị iche.” Olee otú ha si dị iche?

Ụmụ akwụkwọ a agụọla ọtụtụ ebe na Baịbụl bụ́ ebe ndị kọrọ otú e si gwọọ ndị mmadụ ọrịa. Mgbe Jizọs kpọlitere otu nwata nwaanyị n’ọnwụ, ndị mụrụ ya “nwere oké obi ụtọ.” (Mak 5:42) Mgbe e mere ka ndị kpuru ìsì hụwa ụzọ, aṅụrị juru ha obi. Otu n’ime ihe mere Kraịst ji rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ bụ iji gosi anyị ihe ndị ọ ka ga-eme n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, bụ́ mgbe ọ ga-agwọ “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị ezi omume ga-afọdụ mgbe e bibichara ụwa ọjọọ a ọrịa ha niile. (Mkpughe 7:9, 14) Ahụ́ ga-esikwa ndị nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ ezigbo ike. Chegodị ụdị obi ụtọ a ga-enwe n’oge ahụ!

Ma, Nwanna Pierce kwukwara na ịgwọ ndị mmadụ ọrịa abụghị ụdị ọgwụgwọ kacha mkpa. Ndị ọrịa niile Jizọs gwọrọ mechara rịa ọrịa ndị ọzọ. Ndị ọ kpọlitere n’ọnwụ mechakwara nwụọ. E nwekwara ike ikwu na ndị ìsì o mere ka ha hụ ụzọ kpukwara ìsì ọzọ n’ihi na ha mechara nwụọ. Ma ọgwụgwọ kachanụ Jizọs gwọrọ ndị mmadụ bụ ọrịa ọ gwọrọ ha n’ụzọ ime mmụọ. Ụmụ akwụkwọ Gilied nwekwara ọrụ ịgwọ ndị mmadụ ọrịa n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-enyere ndị mmadụ aka ka ha na Nna ha nke eluigwe dịwa ná mma, nke ga-eme ka ha dịrị ndụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ naanị ndị a gwọrọ n’ụzọ ime mmụọ ga-enweta ndụ ebighị ebi. Nwanna Pierce sịrị: “Ọ bụ ịgwọ ndị mmadụ n’ụzọ ime mmụọ na-ewetara Chineke otuto. Ọ bụ ya ga-eme ka ozi unu na-aga nke ọma.”

Okwu Atọ Ọzọ E Kwuru n’Ụbọchị Ahụ

“Ụbọchị Ọ Bụla Ọ̀ Ga-abụ Ụbọchị Ọma?” Ajụjụ a bụ isiokwu nke okwu Robert Rains, onye so na Kọmitii Alaka nke mba Amerịka, kwuru. Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha hụ na ha ji oge ha rụpụta ihe bara uru n’ụbọchị ọ bụla ha nọrọ n’ebe e zigara ha. Ihe ga-eme ka ụbọchị ọ bụla bụrụ ụbọchị ọma bụ ha ịgụ Okwu Chineke mgbe ọ bụla ha nwere nsogbu nakwa ikpegara Jehova ekpere mgbe ọ bụla.

“Ị̀ Ga-eme Ka Ihe Ochie Dị Ọhụrụ?” Mark Noumair, onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilied, jụrụ ajụjụ a n’okwu ya. Ọ kọwara ihe dị na 1 Jọn 2:7, 8, bụ́ ebe Jọn onyeozi kwuru banyere “iwu ochie” nke bụ́kwa “iwu ọhụrụ.” Iwu ochie ahụ na iwu ọhụrụ ahụ bụ otu iwu. Ihe iwu ahụ na-ekwu bụ  ka ndị na-eso ụzọ Kraịst jiri obi ha niile hụ ibe ha n’anya, ka ha ghara ịchọ naanị ọdịmma onwe ha, kama ka ha dị njikere ịnwụrụ ibe ha. (Jọn 13:34, 35) Ihe mere iwu a ji bụrụ iwu ochie bụ na Kraịst bu ụzọ nye ndị na-eso ụzọ ya iwu a ọtụtụ afọ tupu Jọn onyeozi edee akwụkwọ ozi ya; ma, ọ bụkwa iwu ọhụrụ n’ihi na Ndị Kraịst na-enwe nsogbu ndị ha na-enwetụbeghị, ọ bụkwa ya mere o ji dị mkpa na ha ga-amụta ụzọ ọhụrụ ndị ha ga-esi na-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya, ma na-ahụkwa ha n’anya karịa otú ha na-emebu. Ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-enwekwa nsogbu ndị ha na-enwetụbeghị, ọ dịkwa mkpa na ha ga-amụta ụzọ ọhụrụ ndị ha ga-esi na-egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya. Gịnị ga-enyere ha aka ime nke a?

Nwanna Noumair gwara ha, sị: “Unu emekwala ihe unu kpọrọ asị.” O kwuru na ọ bụrụ na o nwere omume ọjọọ mmadụ mesoro anyị, ọ bụrụ na anyị emegwara onye ahụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị emeela ihe ahụ anyị kpọrọ asị. Nke ahụ bụkwa ihe ọjọọ. Ma, ọ bụrụ na anyị achọta ụzọ ọhụrụ anyị ga-esi gosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya mgbe ha mesoro anyị omume ọjọọ, anyị na-eme ka “ezi ìhè” malite inwu ma na-achụpụ ọchịchịrị ime mmụọ.

“Buo ibu gị.” Michael Burnett, onye ọzọ bụ́ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilied, kwuru okwu n’isiokwu a nke ga-abara ụmụ akwụkwọ ahụ uru. Ọ kọrọ otú ụfọdụ ndị Afrịka si ebu ibu dị arọ n’isi. O kwuru na ha na-ebu ụzọ gwọọ ajụ ma dọkwasịzie ibu n’elu ya ka ọ nọzie anọzie n’isi ma ghara ịfụ ha ụfụ. Nke a ga-eme ka ha na-aga ije nke ọma n’agbanyeghị ibu ha bu. Ndị a gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied ga-enwe ọtụtụ ibu ha ga-ebu n’ebe a ga-eziga ha, ma e nyela ha ihe yiri ajụ nke ha ga-eji buru ha. Ihe ahụ bụ ezigbo ọzụzụ e si na Baịbụl nye ha. Ọ bụrụ na ha emee ihe ndị a kụziiri ha, ibu ndị ha ga-ebu agaghị esiri ha ike obubu.

Ajụjụ Ọnụ na Ihe Ndị Mere n’Ozi Ọma

Iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị nso n’ụlọ akwụkwọ Gilied aga ozi ọma so n’ihe ụmụ akwụkwọ Gilied na-eme. William Samuelson, bụ́ onye na-elekọta Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ekwekwala Ka Aka Gị Zuo Ike.” (Ekliziastis 11:6) N’okwu ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ kọrọ ihe ụfọdụ mere mgbe ha gara ozi ọma ma gosi otú ha si mee. Ha gosiri otú ha si gbaa mbọ zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe ha nọ n’ụgbọelu, n’ebe a na-eri nri nakwa n’ebe a na-agbara mmanụ ụgbọala. Ha gakwara ozi ọma ụlọ n’ụlọ, zie ozi ọma n’oge ha na-anọghị ozi ọma, jirikwa akwụkwọ ozi zie ozi ọma. N’eziokwu, ha ekweghị ka aka ha zuo ike, ha rụpụtakwara ihe buru ibu.

Kenneth Stovall, bụ́ onye na-arụ ọrụ ná ngalaba na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ Gilied, gbara ụmụnna nwoke atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị kwusarala ozi ọma ọtụtụ afọ ná mba ndị ọzọ. Ụmụnna ndị a bụ Barry Hill, onye jere ozi n’Ekwedọọ nakwa na Dọminikan Ripọblik, Eddie Mobley, onye jere ozi na Kot Devụa, nakwa Tab Honsberger, onye jere ozi na Senigal, Benin, na Heiti. Ha atọ kọrọ ihe ndị mere ka a ghọta isiokwu bụ́ “Nwaleenụ Jehova ma Nweta Ngọzi.” (Malakaị 3:10) Dị ka ihe atụ, Nwanna Hill kọrọ otú ya na nwunye ya si die ihe isi ike ndị ha nwere mgbe ha bidoro ije ozi n’Ekwedọọ. Otu n’ime ha bụ oké okpomọkụ na uzuzu na-adị n’ebe ahụ nakwa pọtọpọtọ na-adị n’okporo ụzọ. Ọ sịrị na ọ bụ bọket ka ha na-eji ekuru mmiri asa ahụ́ ruo afọ abụọ na ọnwa isii n’agbanyeghị na ha asatụbeghị ahụ́ otú ahụ ná ndụ ha. Ma o nweghị mgbe ọ batara ha n’obi ka ha hapụ ozi ha; ha weere na ozi ha na-eje ebe ahụ bụ ngọzi si n’aka Jehova. Nwanna Hill sịrị: “Ozi anyị bụ ndụ anyị.”

Tupu ememme ahụ agwụ, otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi na-emetụ n’obi nke ụmụ akwụkwọ ahụ dere iji gosi otú obi dị ha. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha sịrị: “Okwukwe anyị esikwuola ike, ma anyị maara na anyị ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta.” E nyere ụmụ akwụkwọ ahụ niile asambodo ha, zigakwa ha mba dị iche iche. Nwanna Jackson mechiziri ememme ngụsị akwụkwọ ahụ mgbe ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka obi sie ha ike na Jehova ga-enyere ha aka, nke ka nke mgbe ihe isi ike bịaara ha. Okwukwe ndị niile bịara ememme ahụ sikwuru ike, ha jikwa obi ụtọ laa. O doro anya na Jehova ga-eji ndị ọhụrụ a e zigara mba ndị ọzọ rụọ ọtụtụ ọrụ ọma.

 [Chaatị/Map dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

9 mba ole ha si

34 nkezi afọ ndụ ha

18 nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim

13 nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E zigara ndị klas ahụ ná mba ndị a e dere n’okpuru ebe a

EBE NDỊ E ZIGARA HA

AJENTINA

AMINIA

BỌKINA FASO

BURUUNDI

KỌNGO (KINSHASA)

CHEK RIPỌBLIK

HEITI

HỌNG KỌNG

INDONISHA

KENYA

LITUWANỊA

MALESHA

MOZAMBIK

NIPỌL

PAPIUWA NIU GINI

ROMENỊA

SENIGAL

TANZANIA

YUGANDA

ZIMBABWE

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Klas nke 130 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

E nyere ahịrị ndị dị na foto a nọmba malite n’ihu laa azụ, aha ha malitekwara n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Molina, Z.; Bassolino, S.; Alatsis, C.; Arroyo, A.; Niño, L.; Merkling, S.; Clark, M.

(2) Little, C.; Tibaudo, S.; Jakobsson, S.; Moreno, J.; Rodriguez, A.; Lee, K.; Cárdenas, H.; Aguilar, L.

(3) Clairbush, A.; Polley, A.; Caldwell, S.; Adame, J.; Hildebrandt, S.; Shoemaker, I.; Grohman, N.; Galvez, G.

(4) Clark, J.; Bassolino, A.; Packham, K.; Adame, J.; Knaus, M.; Niño, M.; Moreno, R.; Galvez, J.

(5) Rodriguez, D.; Geynes, M.; Molina, J.; Aguilar, A.; Alatsis, I.; Manno, A.; Grohman, R.; Packham, J.

(6) Geynes, S.; Cárdenas, M.; Arroyo, C.; Manno, C.; Merkling, J.; Lee, H.; Clairbush, X.; Jakobsson, P.

(7) Little, J.; Hildebrandt, B.; Shoemaker, M.; Knaus, K.; Caldwell, J.; Tibaudo, F.; Polley, C.