Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ò Nwere Ike Inwe Afọ Ojuju?

Mmadụ Ò Nwere Ike Inwe Afọ Ojuju?

Mmadụ Ò Nwere Ike Inwe Afọ Ojuju?

“Inwe afọ ojuju na-eme ndị ogbenye ọgaranya; enweghị afọ ojuju na-eme ndị ọgaranya ogbenye.” —Benjamin Franklin.

DỊ KA ilu ahụ kwuru, ọtụtụ ndị amụtala na a naghị azụta afọ ojuju n’ahịa. Ka a sịkwa ihe mere afọ ojuju—nke bụ́ ihe mmadụ nwere iju ya afọ—ji yie ihe kọrọ ụkọ n’ụwa anyị a nke na-agba ndị mmadụ ume ịchọ inwekwu ihe onwunwe, imepụtakwu ihe ná ndụ, ma ọ bụ ibi ụdị ndụ ndị ọzọ na-ebi! Ò nwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị na-esonụ metụtarala gị?

• Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agwa gị mgbe niile na naanị ihe ga-eme ka i nwee afọ ojuju bụ ịzụtakwu otu ihe.

• Aka a na-amarịta n’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ na-agba gị ume ikwere na naanị ihe ga-eme ka ị baa uru bụ ime ihe ndị ọzọ na-eme.

• Ndị mmadụ anaghị ekele gị maka ihe ndị ị na-emere ha.

• Ndị enyi gị na-eme ka ị chọwa inwe ihe ndị ha nwere.

• I nwetabeghị azịza nke ajụjụ ndị kacha gị mkpa ná ndụ.

Mmadụ ò nwere nnọọ ike inwe afọ ojuju mgbe ihe ndị a chere ya aka mgba? Pọl onyeozi kwuru banyere ‘otú e si enwe afọ ojuju.’ Mgbe ụfọdụ, o nwere ihe n’ụba, nọrọkwa n’ụkọ n’oge ndị ọzọ. Ndị enyi ya na-akwanyere ya nnọọ ùgwù ma ndị ọzọ na-akwa ya emo. N’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru na ya ‘amụtala inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla.’—Ndị Filipaị 4:11, 12, New International Version.

Afọ ojuju bụụrụ ndị na-emebeghị ihe ọ bụla iji nweta ya ihe nzuzo, ma dị ka Pọl kwuru, mmadụ nwere ike ịmụta inwe ya. Anyị na-agba gị ume ugbu a ka ị tụlee ihe ise Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru ga-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju.