Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ

Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ

Alicia, * bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-achọ nnọọ ịmata ihe banyere mmekọahụ, ma m na-eche na m jụọ ndị mụrụ m, ha ga-eche na m mebiela.”

Inez, bụ́ nne Alicia, kwuru, sị: “M ga-achọ ka mụ na ada m nọrọ ala kọọ banyere mmekọahụ, ma ọtụtụ ihe ọ na-eme anaghị enye ya ohere. Ọ na-esi ike ịhụ mgbe o nwere efe.”

TAA, a na-egosi ihe banyere mmekọahụ n’ebe niile—na tiivii, n’ihe nkiri, nakwa na bọọdụ mkpọsa ngwá ahịa. O yiri ka naanị mgbe a ka weere ikwu banyere mmekọahụ ka arụ ọ̀ bụ mgbe ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwurịta okwu. Otu onye na-eto eto si Kanada aha ya bụ Michael kwuru, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na ndị mụrụ anyị maara otú o si esiri anyị ike ma na-eme anyị ihere ịgwa ha banyere mmekọahụ. Ọ na-akara anyị mfe ịgwa ya ndị enyi anyị.”

Mgbe mgbe, ọ na-esiri ndị nne na nna ike otú ọ na-esiri ụmụ ha ikwu banyere mmekọahụ. Onye na-akụzi banyere ahụ́ ike bụ́ Debra W. Haffner kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Beyond the Big Talk, sị: “Ọtụtụ ndị nne na nna agwala m na ha zụụrụ ụmụ ha akwụkwọ na-ekwu banyere mmekọahụ ma ọ bụ banyere ihe na-eme n’oge mmadụ dị afọ iri na ụma, hapụ ya n’ime ụlọ ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na ụma, n’enwekwaghị mgbe ọzọ ha kwuru banyere ya.” Haffner kwuru na ihe nke ahụ na-agwa ụmụaka doro anya, ya bụ: “Anyị chọrọ ka unu mara banyere ahụ́ unu na banyere mmekọahụ; ọ bụ naanị na anyị achọghị ịgwa unu ihe ọ bụla banyere ya.”

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i kwesịghị ime otú ahụ. N’ezie, ọ dị ezigbo mkpa ka i jiri aka gị gwa ụmụ gị banyere mmekọahụ. Ka anyị tụlee ihe atọ mere o ji dị otú ahụ:

1. Otú ụwa si akọwa mmekọahụ agbanweela. James, onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Mmekọahụ adịghịzi mfe nkọwa otú ọ dịbu, ya bụ, di na nwunye idina. Ugbu a, e nweziri mmekọahụ e si n’ọnụ enwe, nke e si n’ikè enwe, na nke Ịntanet—a na-ejidị ekwe ntị ezipụ ozi ndị metụtara mmekọahụ.”

2. E nwere ike ịkọrọ ụmụ gị ihe ndị na-ezighị ezi banyere mmekọahụ mgbe ha ka dị obere. Otu nwaanyị aha ya bụ Sheila kwuru, sị: “Ha ga-anụ banyere mmekọahụ ozugbo ha malitere akwụkwọ, ha agaghịkwa aghọta ya otú ị chọrọ ka ha si ghọta ya.”

3. Ụmụ gị nwere ajụjụ ndị ha ga-achọ ịjụ gị banyere mmekọahụ ma o yighị ka hà ga-anọkata jụọ gị ha n’onwe ha. Ana, bụ́ onye dị afọ iri na ise nke si Brazil kwuru, sị: “Ịgwa gị eziokwu, amatụghị m  otú m ga-esi malite ịgwa ndị mụrụ m banyere mmekọahụ.”

N’ezie, ịgwa ụmụ gị banyere mmekọahụ so n’ọrụ ndị Chineke nyere gị dị ka nne ma ọ bụ nna. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ma gị ma ha ihere. Ma, ihe dị mma na ya bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto kweere ihe a Danielle dị afọ iri na anọ kwuru, “Anyị chọrọ ịmụta ihe banyere mmekọahụ n’aka ndị mụrụ anyị—ọ bụghị n’aka onye nkụzi ma ọ bụ n’ihe omume tiivii.” Oleezi otú i nwere ike isi gwa ụmụ gị okwu banyere okwu a dị mkpa nke na-emekwanụ ihere? *

Gwa Ha Ihe Ha Kwesịrị Ịma Dabere n’Afọ Ndụ Ha

Ụmụaka na-amalite ịnụ banyere mmekọahụ mgbe ha ka dị nnọọ obere, ọ gwụla ma hà bi n’ebe ndị mmadụ na-ebighị. Ihe kadị enye nsogbu n’obi bụ na “n’oge ikpeazụ” a, ndị ajọ mmadụ ‘ajọwanyela njọ.’ (2 Timoti 3:1, 13) Ọ dị mwute na ọtụtụ ụmụaka adabala n’aka ndị toro eto chọrọ ụmụaka ha ga-emetọ.

N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ị malite ịkụziri ụmụ gị banyere mmekọahụ mgbe ha ka dị nnọọ obere. Otu nwaanyị ji ụmụ nke bi na Jamanị aha ya bụ Renate, kwuru, sị, “Ọ bụrụ na i chere ruo mgbe ha ruwere afọ iri na ụma, ha nwere ike ghara ịchọ ikwu ya n’ihu gị n’ihi ihere na-eme ụmụaka dị ihe dị ka afọ iri na ụma.” Ihe ga-enyere gị aka bụ ịgwa ụmụ gị ihe ha kwesịrị ịma dabere n’afọ ndụ ha.

Maka ndị na-amalitebeghị akwụkwọ: Lekwasị anya n’ịkụziri ha ezigbo aha nke akụkụ ahụ́ ndị e ji enwe mmekọahụ, gwasiekwa ha ike na onye ọzọ ekwesịghị ibitụ akụkụ ahụ́ ha ndị ahụ aka. Otu nwaanyị bi na Meksiko nke aha ya bụ Julia kwuru, sị, “Amalitere m ịkụziri nwa m nwoke ihe banyere mmekọahụ mgbe ọ dị naanị afọ atọ. Naanị ịmara na ndị nkụzi, ndị na-eku nwa, na ụmụaka ndị tọrọ ya nwere ike imebi ya wutere m nke ukwuu. Ọ dị ya mkpa ịmata otú ọ ga-esi chebe onwe ya.”

MEGODỊ IHE A: Kụziere nwa gị ka ọ ghara ikwe ka onye ọ bụla metụ ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ n’ihe o ji bụrụ nwaanyị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkụziri nwa gị ikwu, sị: “Kwụsị ya! Aga m akọrọ ndị ọzọ ihe ị na-eme m!” Mee ka obi sie nwa gị ike na o kwesịrị nnọọ ịgwa ndị ọzọ mgbe ọ bụla mmadụ mesoro ya ihe dị otú ahụ—ya bụrụgodị na onye ahụ ekwe nkwa inyetụ ya ihe ma ọ bụ yie ya egwu. *

Maka ụmụaka ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị: Jiri afọ ndị a kụzitụkwuoro nwa gị ihe nwayọọ nwayọọ. Otu nna aha ya bụ Peter kwuru, sị, “Matagodị ihe na-aganụ tupu gị na ụmụ gị ekwuwe okwu. Matagodị ihe ha ma ama, matakwa ma hà chọrọ ịmatakwu. Amanyela ha ka gị na ha kwuo maka ya. Ahụ́ nwere ike iru ụmụ gị ala ịgwa gị maka ya ma ọ bụrụ na gị na ha ana-anọ mgbe niile.”

MEGODỊ IHE A: Gị na ha na-ekwu banyere ya obere obere, site n’oge ruo n’oge, ọ bụghị ikwu ‘ogologo okwu’ n’otu mgbe. (Diuterọnọmi 6:6-9) Nke a ga-eme ka ị ghara ịgwa ụmụ gị ihe karịrị ha akarị. E wezụga nke ahụ, ka ha na-eto, ha ga na-amata ihe ndị o kwesịrị ịmara dabara n’afọ ndụ ha.

Maka ndị dị afọ iri na ụma: Ugbu a bụ oge ị ga-eji hụ na nwa gị matara ihe niile o kwesịrị ịma banyere mmekọahụ, otú o si emetụta mmadụ n’uche na n’ahụ́, na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya. Ana, bụ́ onye dị afọ iri na ise nke e kwuburu ihe o kwuru, kwuru, sị, “N’ụlọ akwụkwọ anyị, ụmụaka ndị nwoke na ndị nwaanyị amalitelarị inwe mmekọahụ aghara aghara. Echere m na ebe m bụ Onye Kraịst, ọ dị mkpa ka m mara ihe niile m kwesịrị ịmara banyere mmekọahụ. N’agbanyeghị na ikwu banyere ya na-eme ihere, ọ dị mkpa ka m mata banyere ya.” *

Ịdọ aka ná ntị: O nwere ike isiri ndị dị afọ iri na ụma ike ịjụ ajụjụ banyere ya n’ihi na ụjọ na-atụ ha na ndị mụrụ ha ga-enyowe ha enyowe na ha akpawala àgwà ọjọọ. Nke ahụ bụ ihe otu nwoke aha ya bụ Steven chọpụtara. O kwuru, sị: “Ahụ́  erughị nwa anyị nwoke ala ikwu banyere mmekọahụ. Ma, anyị mechara chọpụta na o chere na anyị na-enyo ya enyo na ọ kpawala àgwà ọjọọ. Anyị mere ka o doo ya anya na ihe mere anyị ji chọọ ịgwa ya okwu banyere ya abụghị na anyị na-enyo ya enyo na ọ dị ihe o mere; naanị ihe anyị chọrọ bụ ijide n’aka na ọ maara ihe niile ọ dị mkpa ka ọ mara iji zere omume ọjọọ gbara ya gburugburu.”

MEGODỊ IHE A: Kama ịjụ nnọọ nwa gị dị afọ iri na ụma ajụjụ banyere otu ihe metụtara mmekọahụ, jụọ ya ihe ụmụ klas ya chere banyere ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ọtụtụ ndị taa chere na isi n’ọnụ enwe mmekọahụ abụghị mmekọahụ. Ọ̀ bụ ihe ụmụ akwụkwọ ibe gị chere?” O yiri ka ụdị ajụjụ ndị ahụ i ji akọ jụọ hà ga-aka eme ka nwa gị dị afọ iri na ụma kwuo echiche ya.

Ịkwụsị Ime Ihere

N’ezie, ịgwa ụmụ gị okwu banyere mmekọahụ nwere ike ịbụ otu n’ime ọrụ ndị kacha eme ihere ị ga-arụ dị ka nne ma ọ bụ nna. Ma, mbọ gị agaghị efu ọhịa. Otu nne aha ya bụ Diane kwuru, sị, “Ka oge na-aga, ihere ahụ ga-akwụsị, ịgwa nwa gị okwu banyere mmekọahụ nwekwara ike ime ka gị na ya dịkwuo ná mma.” Steven, bụ́ onye e kwuburu ihe o kwuru, kwetara. O kwuru, sị: “Ọ na-aka adị mfe ikwurịta okwu ndị na-eme ihere dị ka nke mmekọahụ ma ọ bụrụ na unu emee ka ọ mara unu ahụ́ ikwu okwu n’ezoghị ọnụ banyere ihe ọ bụla dapụtara n’ezinụlọ.” O kwukwara, sị: “Ihere ahụ adịghị mgbe ọ ga-akwụsịcha, ma ihe dị mkpa na-eme ka ihe na-aga were were n’ezinụlọ Ndị Kraịst bụ ikwurịta okwu n’ezoghị ọnụ.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 11 Isiokwu a ga-atụle mkpa ọ dị gị ịgwa ụmụ gị okwu banyere mmekọahụ. Isiokwu anyị ga-ede n’ọdịnihu ga-ekwu otú a ga-esi kụziere ụmụaka àgwà ọma mgbe a na-agwa ha okwu dị otú ahụ.

^ par. 16 E si na peeji nke 171 nke akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, nweta ya.

^ par. 19 Jiri isi 1-5, 2829, na nke 33 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, kụziere nwa gị dị afọ iri na ụma banyere mmekọahụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

Gụọ ihe ndị a ndị na-eto eto nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa kwuru ma jụọ onwe gị ajụjụ ndị e dere n’okpuru ha.

• “Ndị mụrụ m na-agwa m ka m gụọ akwụkwọ ndị kwuru banyere mmekọahụ ma bịakwute ha ma m nwee ajụjụ. Ma, ọ gaara akara m mma ma ọ bụrụ na ha ga-agwakwu m okwu banyere ya.”—Ana, Brazil.

Olee ihe i chere mere o ji dị mkpa ime ihe karịrị inye nwa gị akwụkwọ ka ọ gụọ?

• “Amaara m ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu banyere mmekọahụ—ihe ndị m chere na nna m amaghị banyere ha. Ahụ́ ga-anwụ ya ma m jụọ ya banyere ha.”—Ken, Kanada.

Olee ihe ndị nwere ike ịnọ na-atụ nwa gị ụjọ ịgwa gị ihe ndị na-echegbu ya?

• “Mgbe m mechara kata obi jụọ ndị mụrụ m ajụjụ banyere mmekọahụ, ha zara m ka à ga-asị na ha na-ebo m ebubo, jụọ m, sị, ‘Olee ihe mere ị ga-eji jụwa ụdị ajụjụ ahụ? Ọ̀ dị ihe mere?’”—Masami, Japan.

Mgbe nwa gị jụrụ gị ajụjụ banyere mmekọahụ, olee otú ihe i mere nwere ike isi gbaa ya ume ịgwa gị okwu mgbe ọzọ banyere ya ma ọ bụ kụda ya obi ime otú ahụ?

• “Obi ga-erukwu m ala ma a sị na ndị mụrụ m ga-emesi m obi ike na mgbe ha dị afọ ole m dị ugbu a, ha na-ajụ ụdị ajụjụ ndị ahụ nakwa na ọ dịghị ihe o mere ma m jụọkwa ajụjụ ndị ahụ.”—Lisette, Frans.

Olee otú i nwere ike isi mee ka ahụ́ ruo nwa gị ala, ka o nwee ike ịgwakwu gị okwu banyere mmekọahụ?

• “Nne m na-ajụ m ajụjụ banyere mmekọahụ—ma ọ na-eji olu ọma ajụ m ya. Echere m na nke a dị mkpa, ka ọ ghara ịdị nwatakịrị ka à na-ekpe ya ikpe.”—Gerald, Frans.

Olee olu ị na-eji agwa nwa gị okwu banyere mmekọahụ? Ọ̀ dị mkpa ka ị gbanwee ya?