Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!

A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!

 Maka Ndị Na-eto Eto

A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Neaman, Ịlaịsha, na nwatakịrị nwaanyị Izrel a na-akpọghị aha

Nchịkọta: A gwọrọ onyeisi ndị agha Siria, bụ́ Neaman, otu ọrịa na-asọ oyi mgbe otu nwatakịrị nwaanyị Izrel tụụrụ ya aro ka ọ gaa hụ Ịlaịsha.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 2 NDỊ EZE 5:1-19.

Olee otú i chere obi ga na-adị nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ ebe ọ bụ na a kpọpụrụ ya n’ezinụlọ ya bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke?

․․․․․

Olee otú i chere obi ga na-adị Neaman, bụ́ dike nke nwere ọrịa na-asọ oyi?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Neaman na ndị na-ejere ya ozi ka ha na-enwe mkparịta ụka ahụ dị n’amaokwu nke 11 ruo 13?

․․․․․

Olee otú i chere Neaman si gbanwee otú o si ele ihe anya malite n’amaokwu nke 15?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ha so mee ka Neaman dị mpako? (Gụghachi amaokwu 1.)

․․․․․

Jiri ihe ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta ihe ụfọdụ banyere ihe a na-akpọ ekpenta n’oge Baịbụl. * (Dị ka ihe atụ, olee otú ọrịa ahụ jọruru ná njọ? Ọ̀ na-efe efe? Olee otú e si agwọ ya?)

․․․․․

Olee otú i chere ọgwụgwọ Neaman nwere ike isi metụta nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ?

․․․․․

Olee otú ihe Ịlaịsha zara nwere ike isi ghọọrọ Neaman ule? (Gụọ amaokwu 10.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Nsogbu mpako na-eweta.

․․․․․

Iji obi ike ekwu ihe ndị i kweere.

․․․․․

Ike Jehova nwere ịgwọ ọrịa.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ BỤRỤ NA I NWEGHỊ BAỊBỤL, GWA NDỊÀMÀ JEHOVA KA HA NYE GỊ OTU, MA Ọ BỤ GỊ AMATAKWUO BANYERE YA NA www.watchtower.org na www.jw.org

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 18 Ọrịa a na-akpọ ọrịa Hansen taa so n’ọrịa akpụkpọ ahụ́ a kpọrọ ekpenta n’oge Baịbụl.