Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

 Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE ihe kpaliri onye bụ́bu onye agha nnupụisi na onye ohi ịgbanwe ndụ ya? Gịnị mere ọkaibe na karat ji gbanwee ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ? Olee otú obi otu nwoke tụkwasịrị nwa ya nwoke si rụpụta ezi ihe? Gụọ akụkọ ndị a iji hụ azịza ha.

“N’agbanyeghị ndụ ọjọọ m biri na mbụ, enwere m obi ụtọ ugbu a.”—GARRY P. AMBROCIO

ADỊ M AFỌ: 47

ABỤ M ONYE: FILIPINS

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE AGHA NNUPỤISI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’obere obodo a na-akpọ Vintaa. Ugwu ndị ahịhịa ndụ juru na osimiri ndị na-egbuke egbuke gbara nnukwu ndagwurugwu ebe anyị bi gburugburu, ikuku ndụ na-ekukwa nnọọ ebe ahụ. N’agbanyeghị na ebe ahụ dara jụụ, ndụ siri ike. Ndị mmadụ na-ezuru anụ ụlọ anyị ma na-akụka ụlọ anyị.

Mgbe m dị afọ iri na ụma, mụ na ndị enyi m na-aṅụ oké mmanya, m na-ese sịga, na-ezukwa ohi iji nweta ego m ga-eji na-ebi ndụ ọjọọ a. M zudịrị ọla nne nne m. Ndị agha mba anyị nọ na-enyo m enyo na m so n’òtù ndị agha nnupụisi a na-akpọ Ndị Agha Ọhụrụ nke Obodo (NPA) ma kụkasịa m ahụ́ ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, m kpebiri isonyere òtù ndị agha nnupụisi ahụ. M soro ndị agha NPA bie n’ugwu afọ ise. Ihe siiri anyị ike. Anyị anaghị anọ otu ebe n’ihi ọsọ anyị na-agbara ndị agha mba anyị. Ike izogharị n’ugwu mechara gwụ m, n’ihi ya, m nyefere gọvanọ Ilokos Nọte onwe m. O lekọtara m nke ọma, nyedịrị m aka ịchọta ezigbo ọrụ. Ma, m ka nọ na-akpa àgwà ọjọọ m, na-ezu ohi n’ụlọ ndị mmadụ ma na-amaja ndị mmadụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu nwaanyị mụ na ya na-arụkọ ọrụ nke aha ya bụ Loida bụ Onyeàmà Jehova. M si n’aka ya mata Jovencio, ya amalitekwa ịmụrụ m Baịbụl. Ma, ndụ ochie m ekweghị m nhapụ. M na-ese sịga tupu Jovencio abịa ịmụrụ m Baịbụl, m ka na-emekwa ihe ndị megidere iwu. Ndị uwe ojii mechara jide m ebe m na-emebi iwu, anọkwara m ọnwa iri na otu n’ụlọ mkpọrọ. N’oge ahụ, m kpegaara Jehova ekpere, rịọsie ya arịrịọ ike ka o nyere m aka. M rịọrọ ya mgbaghara nakwa ka mmụọ nsọ ya duzie m ma wusie m ike.

Ka oge na-aga, otu Onyeàmà Jehova letara m n’ụlọ mkpọrọ ma wetara m Baịbụl. M gụrụ ya ma mụta na Jehova na-eme ebere ma hụ anyị n’anya, na-agbagharakwa mmehie. Aghọtara m na Jehova emeerela m ebere ma nye m ohere ịmụta ụzọ ya. Arịọrọ m ya ka o nye m ike imeri àgwà ọjọọ m. Ihe m gụrụ n’Ilu 27:11 ruru m n’ahụ́. Elere m amaokwu ahụ anya ka ọ̀ bụ okwu Jehova na-agwa m.  Ebe ahụ kwuru, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”

Mgbe m si mkpọrọ pụta, Ndịàmà maliteghachiri ịmụrụ m Baịbụl, m malitere ịga ọmụmụ ihe ha, malitekwa iso ụkpụrụ Baịbụl ná ndụ m. Site n’enyemaka Jehova, emechara m kwụsị àgwà ọjọọ m. Enyefeziri m Jehova Chineke ndụ m.

URU NDỊ M RITERELA: N’agbanyeghị ndụ ọjọọ m biri na mbụ, enwere m obi ụtọ ugbu a. Ọ bụ ezie na m bụbu ohu àgwà ọjọọ, aghọọla m mmadụ ọhụrụ. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Taa, ọ bụụrụ m ihe ùgwù iso ndị Jehova dị ọcha na-akpakọrịta na inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke anyị pụrụ ime ihe niile, bụ́ Jehova.

“M chọrọ ịnọchite anya Brazil.”—JULIANA APARECIDA SANTANA ESCUDEIRO

ADỊ M AFỌ: 31

ABỤ M ONYE: BRAZIL

NDỤ M BIRI: ABỤ M ỌKAIBE NA KARAT

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m na Londrina. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ebe ahụ dara ogbenye, ógbè ahụ dị ọcha ma daa jụụ. Mgbe m dị afọ iri, deede m gbara m ume ka m soro ya mụwa karat. Egwuregwu ọhụrụ ahụ m malitere ime amasịghị nna m, ma, o mechara hapụ m ka m mewe ya.

M mụsiri nnọọ egwuregwu ahụ ike ma merie n’ọtụtụ asọmpi ịgba karat na steeti Parana. Emechara m merie n’asọmpi ndị e nwere ná mba anyị, n’afọ 1993 kwa, e nyere m ihe nrite ọkaibe n’ịgba karat na Brazil. M chọrọ ịga asọmpi mba na mba. Ma, ezinụlọ m dara ogbenye, ha enweghịkwa ego iziga m ofesi.

M nọ na-enwe olileanya na a ga-ewebata ịgba karat n’Egwuregwu Olimpik, nke a mechakwara mee. M chọrọ ịnọchite anya Brazil n’Egwuregwu Olimpik, n’ihi ya, m mụsiri egwuregwu ahụ ike, nwetakwa ndị nkwado mere ka m nwee ike ịga sọọ mpi na Frans, Vietnam, Saụt Koria, na Japan, nakwa n’Egwuregwu Ebe Ndịda Amerịka. Ihe mgbaru ọsọ ọzọ m nwere bụ iso sọọ mpi n’Egwuregwu Mba Amerịka Niile, emekwara m nnọọ nke ọma nke na m so ná mmadụ atọ ga-asọ mpi n’egwuregwu ahụ na Santo Domingo, Dominikan Ripọblik, n’afọ 2003.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 2001, mụ na enyi m nwoke zutere Ndịàmà Jehova, ha amalitekwa ịmụrụ anyị Baịbụl. Ná mmalite, ọ masịchaghị m. Ike na-agwụ m nnọọ mgbe ọ bụla ha bịara ịmụrụ anyị ihe, ụra na-eburukarịkwa m. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe m na-amụta ruru m n’obi—bụ́ ihe pụtara ìhè ná nnukwu asọmpi ọzọ m gara.

Ebe ọ bụ na m so ná ndị a họọrọ ịga Egwuregwu Mba Amerịka Niile, ndị isi ịgba karat gwara m gaa asọmpi ndị a ga-eji kwado maka ya. Mgbe o ruuru m ịgba karat, eguzoro m nnọọ n’ọgbọ n’emegharịghị ahụ́—n’enwetụghị nnọọ mmasị ịsọ mpi ahụ. Na mberede,  ọ bịara doo m anya na Onye Kraịst ekwesịghị ịlụso ndị ọzọ ọgụ—ọbụna n’egwuregwu! Iwu Baịbụl bụ́ “hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị” gbatara m n’obi. (Matiu 19:19) Atụgharịrị m nnọọ ma si n’ọgbọ egwuregwu ahụ pụọ n’eleghị anya n’azụ. O juru nnọọ ndị nọ ebe ahụ anya.

Mgbe m lọrutere, anọdụrụ m ọdụ ma chee ihe m ga-eji ndụ m mee. Agụrụ m otu broshuọ Ndịàmà Jehova bipụtara nke kwuru banyere ihe ndị Chineke chọrọ anyị n’aka. N’ime ya, ahụrụ m ebe e dere Abụ Ọma 11:5, bụ́ ebe kwuru banyere Jehova, sị: “Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” Okwu ndị ahụ ọbụ abụ kwuru ruru m n’ahụ́, ekpebikwara m ịkwụsị ịgba karat.

Obi adịghị ndị isi m na karat mma. Ha nwara ime ka m gbanwee obi m site n’ikwu na ọ bụ m bụ ọkaibe ná mba anyị nakwa na ọ fọrọ obere ka m soro sọọ mpi n’Egwuregwu Olimpik. Ma, ekpebichaala m ihe m chọrọ ime.

N’oge a, mụ na enyi m nwoke lụrụ. O sorolarị Ndịàmà na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ na-eji nnọọ obi ụtọ alọta ma kọọrọ m ihe niile ya na ndị mmadụ kwurịtara. Amaara m na ọ bụrụ na m chọrọ inwekwa ihe ùgwù ahụ, m ga-agbanwerịrị ndụ m. Apụtara m n’okpukpe m nọbu ma mechaa ruo eruo ịghọ Onyeàmà e mere baptizim.

URU NDỊ M RITERELA: Mụ na di m nwere nnọọ obi ụtọ ma dị n’otu n’ihi na anyị na-agbalị iso ụkpụrụ Baịbụl n’alụmdi na nwunye anyị. Obi na-adị m ụtọ ịkwado ya ka ọ na-enye aka n’ilekọta ọgbakọ anyị nọ na ya. M gaara agba mbọ irite ihe nrite ọlaedo ma ghọọ onye a ma ama. Ma, echere m na ọ dịghị ihe ụwa ọjọọ a ga-enye m nke m ga-eji tụnyere ihe ùgwù nke ijere Jehova Chineke ozi.

“Ọ dịghị mgbe ike m gwụrụ nna m.”—INGO ZIMMERMANN

ADỊ M AFỌ: 44

ABỤ M ONYE: JAMANỊ

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NCHE ỤLỌ ORIRI NA NKWARI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’ezinụlọ na-anaghị ekpe otu okpukpe n’obodo a na-egwu kool bụ́ Gelsenkichen. Nna m bụ Onyeàmà Jehova. Ma, nne m ekweghị ka o jiri nkwenkwe okpukpe ya zụlite mụ na nwanne m nwoke na ụmụnne m nwaanyị abụọ. Ọ na-eji awa iri ma ọ bụ karịa n’ụbọchị arụ ọrụ ịnya nnukwu ụgbọala ọ na-arụ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-amalite ọrụ n’ihe dị ka elekere abụọ ma ọ bụ atọ nke ụtụtụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ewepụta oge mgbe niile ịzụ anyị ịhụ Chineke n’anya. Ma, ejighị m mgbalị ya kpọrọ ihe.

Mgbe m dị afọ iri na ise, ọmụmụ ihe okpukpe ya ọ na-akpọ m aga gbụrụ m, enupụkwaara m ya isi. Mgbe otu afọ gafere, esonyeere m òtù na-amụ ọkpọ. N’ime afọ abụọ sochirinụ, ebiri m ụdị ndụ mere ka nna m chaa isi awọ n’ike. Ahapụrụ m ụlọ mgbe m ruru afọ iri na asatọ.

Ime egwuregwu riri m isi, m na-amụkwa ya  ihe ruru ugboro isii n’izu—m mụchaa ịkụ ọkpọ, mụ amụọ ibuli ihe dị arọ. Ná ngwụcha izu, mụ na ndị enyi m na-agakarị oriri na nkwari. Otu mgbe, mụ na otu onye yiri onye ọjọọ nke bịara n’ụlọ oriri na nkwari ahụ lụrụ ọgụ, mụ ejituo ya n’egbughị oge. Onye nwe ebe ahụ hụrụ ihe merenụ ma nye m ọrụ ozugbo ịbụ onye nche ebe ahụ. Ego ole o kwuru ọ ga na-akwụ m buru ibu, n’ihi ya, m kwetara.

Ná ngwụcha izu ọ bụla, m na-eguzoro n’ọnụ ụzọ ụlọ oriri na nkwari ahụ ma na-ekpebi onye ga-abanye na onye na-agaghị abanye. Ihe ruru otu puku mmadụ na-abịa ebe ahụ, n’ihi ya, anaghị m enwe ohere. A na-alụkarị ọgụ n’ebe ahụ. Ndị mmadụ na-eji égbè na karama a kụwara akụwa eyi m egwu. Ụfọdụ n’ime ndị m na-ekweghị banye ma ọ bụ ndị m si n’ụlọ oriri na nkwari ahụ kwapụ na-echere m n’èzí ka ha megwara m. M dị afọ iri abụọ mgbe ahụ ma chee na m bụ anwụ anwụ. Ma, n’ezie ndụ m ghasara aghasa—m na-esi ọnwụ, dị mpako, nwee oké ọchịchọ ma dị isi ike.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ọ dịghị mgbe ike m gwụrụ nna m. O mere ndokwa ka a na-ezitere m magazin Ụlọ Nche na Teta! * n’ebe m bi. Ha juru n’ụlọ m—ọ dịghị nke m na-agụ agụ. Otu ụbọchị, ekpebiziri m ilebatụ anya n’ụfọdụ n’ime ha. Isiokwu ndị m gụrụ, bụ́ ndị kwuru banyere otú ọchịchị ụwa, akụ na ụba ya, na okpukpe ya ndị e nwere ugbu a ga-esi laa n’iyi, mere ka m kpọọ nwanne m nwaanyị. Ya na di ya bụ Ndịàmà Jehova. Ha kwere nkwa ịmụrụ m Baịbụl, m kwetakwara.

Ụkpụrụ ahụ e dere ná Ndị Galeshia 6:7 mere ka m gbanwee ndụ m. Ihe ndị merela m ná ndụ mere ka m mara na ihe ọ bụla m mere, kwuo, ma ọ bụ kpebie ime taa ga-emetụta ndụ m echi. Òkù Chineke kpọrọ n’Aịzaya 1:18 gbakwara m ume, bụ́ nke kwuru, sị: “‘Bịanụ ka anyị kpezie,’ ka Jehova kwuru. ‘Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.’” Amaokwu ahụ nyeere m aka malite mgbe m bidoro ịmụ Baịbụl ịghara iche na ọ dịghịzi uru m bara ma ọ bụ na ohere ịlọghachikwuru Jehova adịrịghị m.

N’ime ọnwa isii, emere m ezigbo mgbanwe ná ndụ m, ma ọ dịrịghị m mfe. Ọ dị m mkpa ịhapụ ịnọ n’ebe rụrụ arụ na ndị enyi ọjọọ m ji gbaa onwe m gburugburu. N’ihi ya, amalitere m ịgwa ndị enyi m na m na-amụ Baịbụl ma na-akọrọ ha ihe ndị m na-amụta. Ha malitere ize m eze ma na-akpọ m pastọ. Nwanne m nwaanyị nyeere m aka ịchọta ọrụ ọzọ ka mma.

Amalitekwara m ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe nwanne m nwaanyị na di ya na-aga, n’agbanyeghị na ọ dị ihe dị ka kilomita iri atọ site n’ebe m bi. E nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ka nso n’ụlọ m, ma ụjọ na-atụ m na m ga-ahụ ndị maara m malite mgbe m bụ nwatakịrị. Ụjọ ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe m bi na-atụkwa m. Olee ihe m ga-eme ma m hụ onye m kwapụrụ n’ụlọ oriri na nkwari n’oge na-adịbeghị anya ma ọ bụ onye m nyere ọgwụ ike? Ma, echetara m ihe m mụtara n’ebe m na-amụ egwuregwu—mmega ahụ́ ndị na-akacha esi ike omume na-abụ ndị kacha mkpa. N’ihi ya, mgbe m ruru eru ikwusa ozi ọma, ana m eme ya mgbe ọ bụla m nwere ike.

O nwere nsogbu ọzọ ọ dị m mkpa imeri—enweghị m mmasị ịgụ ihe ma ọ bụ ịmụ ihe. Ma, amaara m na ọ bụrụ na m chọrọ inwe okwukwe siri ike, m ga-amanye onwe m inyocha eziokwu ndị dị na Baịbụl nke ọma. Achọpụtara m na dị nnọọ ka ọ dị n’ibuli ihe dị arọ, ị ga-etinyerịrị mgbalị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịgbasi ike.

URU NDỊ M RITERELA: M ka dị ndụ! M ka na-akpachara anya ịghara ịlaghachi n’àgwà ochie m. Ma, mụ na nwunye m, bụ́ ezigbo Onye Kraịst, bi n’obi ụtọ ugbu a. Enwere m ezi ndị enyi m nwere nnọọ ike ịtụkwasị obi n’etiti Ndịàmà Jehova. Nna m nwụrụ afọ ise gara aga, ma tupu ya anwụọ, obi tọrọ ya ụtọ ịnabataghachi nwa ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 34 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta ha.