Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe Pọl onyeozi bu n’obi mgbe o kwuru na ya bu ‘apa n’ahụ́ ya, bụ́ ndị na-egosi na ya bụ ohu Jizọs’? —Ndị Galeshia 6:17.

E nwere ụzọ dị iche iche ndị gụrụ ihe Pọl kwuru na narị afọ mbụ nwere ike isi ghọta ya. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, a na-eji ígwè dị ezigbo ọkụ ada ndị a dọtara n’agha, ndị ohi ụlọ arụsị, na ndị ohu gbara ọsọ ndụ, n’ahụ́ iji hụwa ha ama. Mgbe ụmụ mmadụ bu apa ndị dị otú ahụ, a na-ele ya anya ka ihe ihere.

Ma, ọ bụghị mgbe niile ka a na-ele apa anya ọjọọ. Ọtụtụ ndị oge ochie na-eji ha egosi agbụrụ ha si ma ọ bụ okpukpe ha. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament kwuru na “ndị Siria na-egbunye onwe ha akara n’aka na n’olu iji gosi na ha ararala onwe ha nye chi ndị bụ́ Hadad na Atargatis . . . A na-egbunye ndị na-efe Dionysus akara ahịhịa n’ahụ́.”

Ọtụtụ ndị na-akọwa Baịbụl n’oge a chere na ihe Pọl na-ekwu banyere ya bụ apa ndị o nwetara n’oge dị iche iche e tiri ya ihe mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma Ndị Kraịst n’ala ọzọ. (2 Ndị Kọrịnt 11:23-27) Ma, o nwere ike ịbụ na Pọl na-ekwu banyere ụdị ndụ o biri nke gosiri na ọ bụ Onye Kraịst—ọ bụghị apa nkịtị.

Obodo mgbaba ndị e nwere n’Izrel oge ochie hà ghọrọ ebe ndị omekome na-agbaba?

N’ọtụtụ obodo oge ochie na-efe arụsị, ọtụtụ ụlọ arụsị ghọrọ ebe ndị gbara ọsọ ndụ ma ọ bụ ndị omekome na-agbaba. Na Krisendọm oge ochie, otu ihe ahụ mekwara n’ogige ndị mọnk ma ọ bụ nke ndị nọn nakwa na chọọchị dị iche iche. Ma, iwu ndị na-achị obodo mgbaba n’Izrel oge ochie mere ka ha ghara ịghọ ọgba ndị omekome.

Iwu Mozis kwuru na obodo mgbaba ndị ahụ ga-echebe naanị ndị gburu mmadụ n’amaghị ama. (Diuterọnọmi 19:4, 5) Onye ahụ nwere ike ịgbaga n’obodo mgbaba kacha ya nso, ka aka nwoke ya na onye ahụ nwụrụ anwụ kacha bụrụ nwanne ghara ịkpara ya, ya abọọ ọ́bọ̀ maka ọbara ahụ ọ kwafuru. Mgbe onye ahụ gbara ọsọ ndụ kọchaara ndị okenye obodo ahụ ihe merenụ, a ga-akpọga ya n’obodo nwe ebe ihe ahụ mere ka e kpee ya ikpe. Ọ ga-agọrọ ọnụ ya n’ebe ahụ. Ndị okenye ahụ ga-atụle mmekọrịta onye ahụ gbara ọsọ ndụ na onye ahụ nwụrụ anwụ, mata ma hà nọbu n’iro.—Ọnụ Ọgụgụ 35:20-24; Diuterọnọmi 19:6, 7; Jọshụa 20:4, 5.

Ọ bụrụ na a hụ na aka onye ahụ gbara ọsọ ndụ dị ọcha, a ga-akpọghachi ya n’obodo mgbaba ahụ, ya anọgidekwa ebe ahụ. Obodo ndị a abụghị ụlọ mkpọrọ. Onye ahụ gbara ọsọ ndụ na-arụ ọrụ ma baara ọha na eze uru. Mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ, ndị niile gbara ọsọ ndụ nweziri ike ịhapụ obodo mgbaba ndị ahụ n’udo.—Ọnụ Ọgụgụ 35:6, 25-28.

[Map dị na peeji nke 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OBODO MGBABA

1 KIDESH

2 GOLAN

3 REMỌT-GILIED

4 SHIKEM

5 BIZA

6 HIBRỌN

Osimiri Jọdan