Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Ga-ekwe Ka Ị Chọta Ya”

“Ọ Ga-ekwe Ka Ị Chọta Ya”

 Bịaruo Chineke Nso

“Ọ Ga-ekwe Ka Ị Chọta Ya”

1 IHE E MERE 28:9

Ị̀ MAARA Chineke? Azịza ajụjụ a adịchaghị mfe otú o nwere ike iyi. Ịmata nnọọ Chineke gụnyere ịmara uche ya na ụzọ ya nke ọma. Nke ahụ na-eme ka anyị bịaruo ya nnọọ nso, bụ́kwa nke ga-emetụta ndụ anyị dum. Mmadụ ò nwere ike ịbịaru Chineke nso otú ahụ n’ezie? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú anyị ga-esi mee ya? Anyị nwere ike ịmata azịza ya site n’ịtụle ndụmọdụ Eze Devid nyere nwa ya Sọlọmọn, nke dị na 1 Ihe E Mere 28:9.

Jiri anya nke uche gị hụrụ ihe merenụ. Devid achịala Izrel ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri anọ, ọchịchị ya ewetakwarala mba ahụ ihe ịga nke ọma. Sọlọmọn, bụ́ onye ga-anọchi ya n’oge na-adịghị anya, ka bụ nnọọ nwata. (1 Ihe E Mere 29:1) Olee ndụmọdụ ikpeazụ Devid nyere nwa ya?

Devid si n’ọtụtụ ihe ọ mụtarala n’ofufe o fere Chineke malite okwu ya, sị: “Sọlọmọn nwa m, mara Chineke nke nna gị.” O doro anya na ihe Devid na-ekwu abụghị naanị ịmara ihe ụfọdụ banyere Chineke. Sọlọmọn adịla mbụ na-efe Chineke Devid, bụ́ Jehova. E dechaala ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, o dokwara anya na Sọlọmọn maara ihe ihe odide nsọ ndị a kwuru banyere Chineke. Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “mara” nwere ike ịpụta “ịmaru nnọọ ihe ala.” N’ezie, Devid chọrọ ka nwa ya nwee ihe ya onwe ya bụ́ Devid ji kpọrọ ihe, ya bụ, ịbụ ezigbo enyi Chineke.

Ịnọ Chineke nso otú ahụ kwesịrị nnọọ imetụta otú Sọlọmọn si ele ihe anya na otú o si ebi ndụ. Devid gbara nwa ya ume, sị: ‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi jupụtara n’aṅụrị jeere Chineke ozi.’ * Ị̀ hụrụ na o nyere ya iwu ka o jeere Chineke ozi mgbe ọ dụchara ya ọdụ ka ọ mara ya? Ịmara Chineke n’ezie na-eme ka mmadụ jewere ya ozi. Ma, a gaghị eji obi e kewara ekewa ma ọ bụ ihu abụọ na-ejere ya ozi. (Abụ Ọma 12:2; 119:113) Devid rịọrọ nwa ya ka o jiri obi ya dum na obi ụtọ jeere Chineke ozi.

Olee ihe mere Devid ji gbaa nwa ya ume ka ihe o bu n’obi na-efe Chineke na echiche ya zie ezie? Devid kọwara, sị: “N’ihi na Jehova na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” Sọlọmọn ekwesịghị ijere Chineke ozi naanị iji mee ka obi tọọ nna ya, bụ́ Devid, ụtọ. Chineke na-achọ ndị ji ezi obi na-achọ ijere Ya ozi.

Sọlọmọn ọ̀ ga-esoro ihe nlereanya nna ya ma bịaruo Jehova nso? Ọ bụ Sọlọmọn ka nke ahụ dị n’aka. Devid gwara nwa ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya; ma ọ bụrụ na ị hapụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ bụrụ na Sọlọmọn chọrọ ịbụ onye na-efe Chineke nke ya na Ya dị n’ezigbo mma, ọ ga-emerịrị ezigbo mgbalị iji mata Jehova. *

Ndụmọdụ Devid nyere nwa ya na-emesi anyị obi ike na Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. Iji bịaruo ya nso otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị “chọọ ya,” na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma iji maruo ya ala. Ịmara ya kwesịrị ime ka anyị jiri obi anyị dum na obi ụtọ jeere ya ozi. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe si fee ya, o rukwaara ya.—Matiu 22:37.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ụfọdụ nsụgharị kwuru n’ebe a, sị: “Jiri obi gị dum na uche dị nkwadebe jeere ya ozi.”

^ par. 9 Ọ dị mwute na n’agbanyeghị na Sọlọmọn ji obi zuru ezu jeere Chineke ozi ná mmalite, ọ nọgideghị na-ekwesị ntụkwasị obi.—1 Ndị Eze 11:4.