Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Ọ Bụghị Ego na Ihe Onwunwe

Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Ọ Bụghị Ego na Ihe Onwunwe

 Nke 1

Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Ọ Bụghị Ego na Ihe Onwunwe

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”—1 Timoti 6:10.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-eme ka ihe ndị anyị nwere ghara iju anyị afọ. Ha na-achọ ka anyị na-adọlị ịkpata ego anyị ga-eji zụọ ihe ndị ka ọhụrụ, ndị ka mma, na ndị ka buo ibu. Ego na-adọrọ adọrọ, ọ dịkwa mfe anyị ịmalite ịhụ ya n’anya. Ma, Baịbụl na-adọ anyị aka ná ntị na onye hụrụ akụnụba n’anya agaghị emekata nwee afọ ojuju. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekliziastis 5:10.

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Ṅomie Jizọs ma mụta ịhụ ndị mmadụ n’anya kama ịhụ ihe onwunwe n’anya. Jizọs dị njikere inye ihe niile o nwere—ọbụna ndụ ya—n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. (Jọn 15:13) O kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụrụ na anyị emee ka ọ mara anyị ahụ́ inye ndị mmadụ oge anyị na ihe onwunwe anyị, ha ga-emekwara anyị otú ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.” (Luk 6:38) Ndị na-achụso ego na ihe onwunwe na-akpatara onwe ha ihe mgbu na ahụhụ. (1 Timoti 6:9, 10) Ma, ihe na-eme ka mmadụ nwee ezi afọ ojuju bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya na ndị ọzọ ịhụ ya n’anya.

Ọ́ gaghị adị mma ka ị tụlee ma ì nwere ike iselata aka n’ihe ndị i tinyere aka ná ndụ? Ì nwere ike ibelata ihe ndị i nwere ma ọ bụ ihe ndị ị na-eme atụmatụ inwe? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i nwere ike ịhụ na ị ga-enwekwu oge na ikike ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa ná ndụ, ya bụ, inyere ndị ọzọ aka na ife Chineke, onye nyere gị ihe niile i nwere.—Matiu 6:24; Ọrụ 17:28.

[Foto dị na peeji nke 4]

“Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe”