Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ò Buru Amụma Banyere Mba Izrel nke Oge A?

Baịbụl Ò Buru Amụma Banyere Mba Izrel nke Oge A?

 Baịbụl Ò Buru Amụma Banyere Mba Izrel nke Oge A?

TAA ụwa niile chị obi n’aka ka ha na-ahụ ihe ndị na-eme n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ihe e ji mara ebe ahụ bụ ịgbapụ bọmbụ, ọgụ ndị agha nnupụisi na ibe ha na-alụ, na bọmbụ ndị na-eyi ọha egwu na-atụ. E wezụga ọnọdụ ọjọọ ahụ e nwere n’ebe ahụ, e nwekwara ike ịtụ ngwá agha ọgwụrụ mba n’ebe ahụ. Ka a sịkwa ihe mere obi ji koro ndị mmadụ n’elu n’ebe niile!

Ụwa dum chịkwa obi n’aka ka ha na-ele ihe na-eme n’ebe ahụ n’ọnwa Mee afọ 1948. N’oge ahụ, bụ́ afọ iri isii na abụọ gara aga, oge e nyere ndị Briten ịchị ebe a na-akpọ Palestaịn n’oge ahụ na-akụ kwarapụ kwarapụ, agha na-agakwa ịda n’oge na-adịghị anya. N’afọ bu ya ụzọ, Òtù Mba Ụwa enyela ikike ka e hiwe Mba Ndị Juu kwụụrụ onwe ya n’otu akụkụ nke ebe ahụ ndị Briten na-achị. Mba ndị Arab gbara ya gburugburu eforola ntụtụ taa igbochi ya n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe. Òtù Mba Ndị Arab dọrọ aka ná ntị, sị: “Ihe a ga-eji kewapụta ya bụ nnọọ agha na nkwafu ọbara.”

Ọ bụ n’ehihie Fraịdee, Mee 14, 1948, n’elekere anọ nke uhuruchi. Oge Briten ji akwụsị ịchị ebe ahụ na-akụzi kwarapụ kwarapụ. N’Ụlọ Ndebe Ihe Ochie dị na Tel Aviv, obere ìgwè mmadụ dị otu narị na iri ise, bụ́ ndị a kpọrọ òkù na nzuzo zukọrọ ịnụrụ ọkwa ha na-atụsi anya ya ike, ya bụ, na obodo Izrel nke oge a aghọọla mba kwụụrụ onwe ya. Ndị agha chechiri ebe niile, ka ndị iro nke mba ọhụrụ ahụ ghara itisa nnọkọ ahụ.

David Ben-Gurion, onyeisi nke Kansụl Obodo Izrel, gụpụtara akwụkwọ nkwupụta a kpọrọ The Declaration of the Establishment of the State of Israel. Ụfọdụ n’ime ihe e dere na ya bụ: “Anyị, bụ́ ndị òtù Kansụl Obodo Izrel, ndị nnọchianya Ndị Juu bi n’Eretz-Izrel . . . ji ikike anyị nwere dị ka ụmụ afọ na nke akụkọ ihe mere eme nyere anyị nakwa ikike Mkpebi Ụlọ Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ụwa nyere anyị na-ekwupụta na e hiwela Mba Ndị Juu n’Eretz-Izrel, bụ́ nke a ga na-akpọ Mba Izrel.”

Ọ̀ Bụ Mmezu Amụma Baịbụl?

Ụfọdụ ndị Chọọchị Protestant Na-agbasa Ozi Ọma  kweere na Mba Izrel nke oge a si otú ahụ mezuo amụma Baịbụl. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Jerusalem Countdown, ụkọchukwu bụ́ John Hagee kwuru, sị: “Onye amụma bụ́ Aịzaya eburula ụzọ dee ihe a pụrụ iche merenụ, sị, ‘A ga-amụ otu mba n’otu ụbọchị.’ (Gụọ Aịzaya 66:8.) . . . Ọ bụ amụma kacha pụọ iche mezutụrụlanụ na narị afọ nke iri abụọ. Ọ bụ ihe akaebe a na-ahụ anya ga-eme ka ndị mmadụ mara na Chineke Izrel ka dị ndụ ma mụrụ anya.”

Ihe ahụ o kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Aịzaya 66:8 ò buru amụma na a ga-ehiwe Mba Izrel nke oge a? Mee 14, 1948, ọ̀ bụ ụbọchị “amụma kacha pụọ iche mezutụrụlanụ na narị afọ nke iri abụọ” mezuru? Ọ bụrụ na Mba Izrel nke oge a ka bụ mba Chineke họọrọ, ọ bụrụkwa na Chineke ji ya emezu amụma Baịbụl, ndị na-amụ Baịbụl n’ebe niile ga-enwe mmasị na ya.

Amụma Aịzaya kwuru, sị: “Ònye nụtụrụla ụdị ihe a? Ònye hụtụrụla ụdị ihe ndị a? À ga-amụ ala n’otu ụbọchị site n’ime oké mgbalị? Ka à ga-amụ mba n’otu mgbe? N’ihi na ime mere Zayọn, ọ mụwokwa ụmụ ya ndị ikom.” (Aịzaya 66:8) Amaokwu ahụ na-ebu nnọọ amụma na a ga-amụ otu mba na mberede, dị ka ọ̀ bụ n’otu ụbọchị. Ma, ònye ga-eme ka a mụọ mba a? Amaokwu na-eso ya kwuru ihe anyị ga-eji mata onye ọ bụ: “‘M̀ ga-eme ka akpa nwa meghee ma ghara ime ka a mụpụta nwa?’ ka Jehova kwuru. ‘Ka m̀ na-eme ka a na-amụ nwa ma mechie akpa nwa emechi?’ ka Chineke gị kwuru.” Jehova Chineke mere ka o doo anya na ọ bụ ya ga-eme ka a mụọ mba ahụ na mberede.

Mba Izrel nke oge a bụ mba na-achị ọchịchị onye kwuo uche ya nke na-anaghị ekwu na ha na-eso iwu Chineke nke Baịbụl. Ndị Izrel ahụ hà chere n’afọ 1948 na ọ bụ Jehova Chineke mere ka ha ghọọ mba kwụụrụ onwe ha? Ha echeghị otú ahụ. A kpọtụghị aha Chineke ma ọ̀ bụdị okwu bụ́ “Chineke” aha n’akwụkwọ nkwupụta ahụ e ji mee ka ha ghọọ mba. Akwụkwọ bụ́ Great Moments in Jewish History kwuru banyere ihe odide ahụ, sị: “Ọbụna n’elekere mbụ nke ehihie mgbe Kansụl Mba Izrel zukọrọ, ndị nọ na ya ekwekọrịtalighị kpọmkwem n’okwu ndị a ga-edenye n’akwụkwọ ahụ ha ji kwupụta na ha aghọọla mba. . . . Ndị Juu anya dị nkọ chọrọ ka a kpọtụ ‘Chineke Izrel’ aha n’ihe odide ahụ. Ndị na-ejighị ofufe Chineke kpọrọ ihe n’etiti ha jụwara isi. Iji hụ na o metara mmadụ niile mma, Ben-Gurion kpebiri na a ga-edenye okwu bụ́ ‘Oké Nkume’ kama idenye ‘Chineke.’”

Mba Izrel nke oge a ghọrọ mba n’ihi mkpebi Òtù Mba Ụwa mere na n’ihi ihe ha kpọrọ ikike ha nwere dị ka ụmụ afọ Juu na nke akụkọ ihe mere eme nyere ha. È kwesịrị ịtụ anya na Chineke nke Baịbụl ga-arụ ọrụ ebube iji mezuo amụma kacha pụọ iche mezutụrụlanụ na narị afọ nke iri abụọ maka ndị na-ekweghị ịsọpụrụ ya?

Nhiwe E Hiwere Mba Izrel n’Oge A Ọ̀ Dabara n’Amụma Baịbụl?

Enweghị mmasị nke Mba Izrel nke oge a n’ofufe Chineke dị nnọọ iche n’otú ihe dị n’afọ 537 T.O.A. (Tupu Oge Anyị) N’oge ahụ, a ‘mụghachiri’ nnọọ mba Izrel ka à ga-asị na ọ bụ n’otu ụbọchị mgbe iri afọ asaa ndị Babịlọn bibichara obodo ha ma dọrọ ndị bi na ya n’agha gasịrị. N’oge ahụ, Aịzaya 66:8 mezuru nnọọ mgbe onye Peshia bụ́ Saịrọs Onye Ukwu merichara Babịlọn ma nye ndị Juu ikike ịlaghachi n’ala nna ha.—Ezra 1:2.

Eze Saịrọs nke Peshia ghọtara na aka Jehova dị n’ihe ahụ mere n’afọ 537 T.O.A., ihe mekwara ndị Juu ahụ laghachiri Jeruselem ji mee otú ahụ bụ ịmaliteghachi ife Jehova Chineke na iwughachi ụlọ nsọ ya. Ọ dịghị mgbe Mba Izrel nke oge a kwurula na ha chọrọ ime ihe dị otú ahụ.

Ọ̀ Ka Bụ Mba Chineke Họọrọ?

N’afọ 33 O.A. (Oge Anyị), Izrel anụ ahụ́ kwụsịrị ịbụ mba Chineke họọrọ mgbe ha jụrụ Ọkpara Jehova, bụ́ Mesaya. Mesaya ahụ n’onwe ya si otú a kwuo ya: “Jeruselem, Jeruselem,  nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume . . . Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:37, 38) Ihe ahụ Jizọs kwuru mezuru n’afọ 70 O.A., mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya na ndị nchụàjà ya. Ma, oleekwanụ banyere nzube ahụ Chineke nwere inwe “ihe onwunwe . . . pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ, . . . alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ”?—Ọpụpụ 19:5, 6.

Pita onyeozi, onye bụ́ onye Juu anụ ahụ́, zara ajụjụ ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst—ma ndị Jentaịl ma ndị Juu. O dere, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke,’ . . . n’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke; unu bụbu ndị a na-emereghị ebere, ma ugbu a, unu bụ ndị e meere ebere.”—1 Pita 2:7-10.

Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ họrọ si otú ahụ ghọọ mba ime mmụọ, bụ́ ndị ihe mere ha ji soro ná mba ahụ na-abụghị ebe ma ọ bụ obodo a mụrụ ha. Pita onyeozi si otú a kọwaa ya: “Ibi úgwù abụghị ihe ọ bụla, ebighị úgwù abụghịkwa, ma ihe e kere ọhụrụ nwere ihe ọ bụ. Ndị niile ga-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ụkpụrụ omume a, ka udo na ebere dịkwasị ha, dịkwasịkwa Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 6:15, 16.

Mba Izrel oge a na-ekwe nkwa ime onye Juu anụ ahụ́ ma ọ bụ onye ọ bụla na-ekpe okpukpe ndị Juu nwa amaala ha, ma, ọ bụ naanị ndị “na-erube isi na ndị e fesara ọbara Jizọs Kraịst” ka a na-eme ụmụ amaala nke ihe Baịbụl kpọrọ “Izrel nke Chineke.” (1 Pita 1:1, 2) Mgbe Pọl na-ekwu banyere ndị so n’Izrel nke Chineke a, ma ọ bụ ndị Juu ime mmụọ, o dere, sị: “Ọ bụghị onye bụ́ onye Juu n’elu ahụ́ bụ onye Juu, ọ bụghịkwa úgwù e biri n’elu ahụ́ bụ ibi úgwù. Kama, ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu, úgwù e biri ya bụkwa n’obi site na mmụọ, ọ bụghị site n’iwu e dere ede. Otuto onye ahụ na-abịa, ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’aka Chineke.”—Ndị Rom 2:28, 29.

Amaokwu ahụ nyeere anyị aka ịghọta otu ihe Pọl kwuru nke ọtụtụ ndị na-aghọtahie. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, ọ kọwara otú ndị Juu anụ ahụ́ na-ekweghị ekwe si yie alaka osisi oliv ihe atụ bụ́ ndị a nyakapụrụ ka e wee nwee ike ịnyado ‘alaka ọhịa’ bụ́ ndị Jentaịl. (Ndị Rom 11:17-21) Mgbe ọ na-apịachi ihe atụ a, o kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị Izrel ghọrọ ndị ihe na-adịkwaghị emetụ n’obi ruo mgbe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị mba ọzọ batara, otú a ka a ga-esikwa zọpụta Izrel dum.” (Ndị Rom 11:25, 26) Pọl ọ̀ na-ebu amụma na ndị Juu niile ga-aghọ Ndị Kraịst mgbe oge gwụrụla agwụ? O doro anya na ụdị ihe ahụ emebeghị.

Mgbe Pọl kwuru “Izrel dum,” o bu Izrel ime mmụọ n’obi, ya bụ, Ndị Kraịst mmụọ nsọ họpụtara. Ihe ọ na-ekwu bụ na ọjụjụ ndị Juu anụ ahụ́ jụrụ Mesaya ahụ agaghị eme ka nzube Chineke nke bụ́ inwe ‘osisi oliv’ ime mmụọ nke nwejuru alaka ndị na-amị mkpụrụ ghara imezu. Nke a kwekọrọ n’ihe atụ Jizọs mere bụ́ ebe o kwuru na ya dị ka osisi vaịn nke a ga-anyakapụ alaka ya ndị na-adịghị amị mkpụrụ. Jizọs kwuru, sị: “Abụ m ezi osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya. Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.”—Jọn 15:1, 2.

Ọ bụ ezie na Baịbụl ebughị amụma banyere nhiwe e hiwere Mba Izrel nke oge a, o buru nnọọ amụma banyere nhiwe e hiwere Izrel ime mmụọ! Ọ bụrụ na ị mata mba ahụ taa ma soro ha na-akpa, ị ga-enweta ọtụtụ ngọzi.—Jenesis 22:15-18; Ndị Galeshia 3:8, 9.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Olee ihe ihe atụ Pọl banyere osisi oliv pụtara?

[Foto dị na peeji nke 27]

David Ben-Gurion, Mee 14, 1948

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Gọọmenti Izrel, Onye Sere Foto: Kluger Zoltan

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 27]

Todd Bolen/Bible Places.com