Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Ga-esi “Mee Ka Ụzọ Gị Gaa nke Ọma”?

Olee Otú Ị Ga-esi “Mee Ka Ụzọ Gị Gaa nke Ọma”?

Olee Otú Ị Ga-esi “Mee Ka Ụzọ Gị Gaa nke Ọma”?

O NWEGHỊ onye na-achọghị ka ihe gaara ya nke ọma ná ndụ. Ụfọdụ ndị agbaala ezigbo mbọ baa ọgaranya, bụrụzie ndị a ma ama. Ndị ọzọ achọsiela ike ka ihe gaziere ha, ma mbọ niile ha gbara kụrụ afọ n’ala.

Ihe ga-aka ekpebi ma ị̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ̀ bụ na ị gaghị enwe bụ ihe ị na-achụ ná ndụ. Ihe abụọ ọzọ dị mkpa ka i chebara echiche bụ ihe ndị i ji oge gị na ume gị eme, nakwa ma ị̀ na-agba mbọ n’onwe gị ka i nwee ihe ịga nke ọma.

Ọtụtụ Ndị Kraịst achọpụtala na ịgachi ozi ọma anya emeela ka ha nwee ezigbo obi ụtọ ná ndụ. Ozi oge niile enyerela ma ụmụaka ma ndị agadi nọ na ya aka inwe ihe ịga nke ọma. Ma, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ozi ọma na-agwụ ike, na-eje ya mgbe ọ masịrị ha n’ihi na ha na-achụ ihe ndị ọzọ. Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eme otú a? Olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịhapụ ihe ndị dị oké mkpa? Oleekwa otú i nwere ike isi mee ka “ụzọ gị gaa nke ọma”?—Jọsh. 1:8.

Ihe Ndị Na-esoghị n’Ihe Ọmụmụ Ụlọ Akwụkwọ na Ihe Ndị A Na-eme Iji Tụrụ Ndụ

Ndị Kraịst na-eto eto ekwesịghị ikwe ka ihe ndị ọzọ ha na-eme ná ndụ gbochie ha ijere ezi Chineke ozi. Ndị na-ekweghị ka nke a mee ga-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ, e kwesịkwara ịja ha ezigbo mma.

Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst na-eto eto na-eso eme ọtụtụ ihe ndị na-esoghị n’ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nakwa ihe ndị a na-eme iji tụrụ ndụ. O nwere ike ihe ndị a adịghị njọ. Ma, Onye Kraịst na-eto eto kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú oge m ga-eji na-eme ihe ndị a ga-aha? Olee ụdị ndị ga-anọ ebe ahụ? Olee ụdị àgwà ha na-akpa? Oleekwa ihe ihe ndị ahụ nwere ike ime ka m jiri ndụ m chụwa?’ I nwere ike ịchọpụta na mmadụ nwere ike imikpu onwe ya n’ihe ndị a nke na ọ gaghị enwechazi oge na ume ọ ga-eji eme ihe ndị ga-eme ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ị̀ ghọtala ugbu a ihe mere o ji dị mkpa ka mmadụ bute ihe ndị ka mkpa ụzọ?—Efe. 5:15-17.

Legodị ihe mere Wiktor. * Ọ sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na abụọ, abanyere m otu klọb na-akụ vọlibọl. Ka oge na-aga, enwetara m ọtụtụ ihe nrite. Enwere m ohere ịghọ onye a ma ama.” Ka oge na-aga, ihe egwuregwu a Wiktor na-egwu na-eme adịm ná mma ya na Chineke malitere ichu ya ụra. Otu ụbọchị, ụra buuru ya ka ọ na-agụ Baịbụl. Ọ chọpụtakwara na ozi ọma ọ na-aga anaghị atọcha ya ụtọ. Ọ sịrị: “Ike na-agwụru m n’ọkpụkpụ ma m gwuchaa egwuregwu ahụ. N’oge na-adịghịkwa anya, achọpụtara m na ọ na-eme ka m gharazie ịna-enwe mmasị n’ihe ime mmụọ. Ama m na anachaghị m eme ihe m kwesịrị ime.”

Ịga Mahadum

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Onye Kraịst nwere ezinụlọ kwesịrị ilekọta ezinụlọ ya, otu ụzọ ọ ga-esikwa mee ya bụ igboro ha mkpa anụ ahụ́. (1 Tim. 5:8) Nke a, ọ̀ pụtara na ọ ga-azụrịrị ha na mahadum?

Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla chebara ihe ịga mahadum nwere ike ime mmekọrịta mmadụ na Jehova echiche. Ka anyị jiri otu onye Baịbụl kwuru okwu ya mee ihe atụ.

Barọk bụ odeakwụkwọ Jeremaya onye amụma. Kama Barọk ga-elekwasị anya n’ozi ọ na-ejere Jehova, o nwere mgbe ọ chọwaara onwe ya ihe ukwu. Jehova chọpụtara nke a ma si n’ọnụ Jeremaya dọọ ya aka ná ntị, sị: “Ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.”—Jere. 45:5.

Olee “ihe ukwu” Barọk chọwaara onwe ya? O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ imere onwe ya aha n’anya ndị Juu. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ chọrọ ịba ọgaranya. Nke ọ bụla ọ bụ, o chefuru ihe ndị ka mkpa, ya bụ, ihe ndị ga-eme ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. (Fil. 1:10) Ma, o doro anya na Barọk gere ntị n’ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya gwa ya ma nweta mkpụrụ obi ya dị ka ihe nkwata.—Jere. 43:6.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Ndụmọdụ e nyere Barọk gosiri na o mere ihe ọ na-ekwesịghị ime. Ọ na-achọrọ onwe ya ihe ukwu. Ọ bụrụ na ị na-akpata ihe ị na-eri, ì chere na ọ dị mkpa ka i jiri oge gị, ego gị, na ume gị na-achọ ịgụkwu akwụkwọ naanị ka i nwee ike iso ná ndị a na-anụ aha ha ma ọ bụ ka i mee ihe ndị mụrụ gị ma ọ bụkwanụ ndị ikwu gị chọrọ?

Chegodị banyere Grzegorz, bụ́ onye na-ede ihe kọmputa ji arụ ọrụ. Ndị ọrụ ibe ya nyere ya nsogbu ka ọ mụtụkwuo ihe banyere kọmputa iji ghọọ aka ochie, o mekwara ihe ha gwara ya. N’oge na-adịghị anya, o nweghịzi oge maka ihe ndị gbasara ofufe Jehova. O kwuru, sị: “O nweghị mgbe ahụ́ na-eru m ala. Akọnuche m na-ama m ikpe n’ihi na enweghị m ike ime ihe ndị m kpebiri ime n’ozi m na-ejere Jehova.”

Mmadụ Iji Oge Ya Niile Arụ Ọrụ Ego

Okwu Chineke gbara ezigbo Ndị Kraịst ume ka ha na-arụsi ọrụ ike ma jiri ọrụ ha kpọrọ ihe, ma hà bụ ndị e were n’ọrụ ma ọ̀ bụkwanụ ndị were mmadụ n’ọrụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya dị ka ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emere ya, ọ bụghị ndị mmadụ.” (Kọl. 3:22, 23) Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma ka anyị na-arụsi ọrụ ike, e nwere ihe ka ya mkpa. Ọ bụ mmekọrịta anyị na Onye kere anyị. (Ekli. 12:13) Ọ bụrụ na Onye Kraịst ji oge ya niile arụ ọrụ ego, ime ihe ndị gbasara ofufe Chineke nweziri ike ịbụ mgbe ọ dabara.

Ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-eme otú a, o nwere ike ime ka ọ gharazie inwe ike ime ihe ndị ga-eme ka ya na Chineke na-adị ná mma, gharakwa inyere ezinụlọ ya aka ka ha na Chineke na-adị ná mma. Eze Sọlọmọn chọpụtara na “ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè” na-abụkarị “ịchụso ifufe.” Ọ bụrụ na Onye Kraịst ejiri oge ya niile na-arụ ọrụ ego, ahụ́ nwere ike ịkpaghasị ya ruo ogologo oge. Onye ahụ nwedịrị ike ịghọrọ ọrụ ya ohu nke na ọ ga-aka nká n’ike. Ya dị otú ahụ, onye ahụ ò nwere ike “ịṅụrị ọṅụ . . . na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile”? (Ekli. 3:12, 13; 4:6) Nke ka nke, ọ̀ ga-enwe ike ọ ga-eji na-arụ ọrụ ndị dịịrị ya n’ezinụlọ nakwa nke ọ ga-eji eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova?

Otu nwanna, aha ya bụ Janusz, onye bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop, ji oge ya niile na-arụ ọrụ ịkụrụ ndị mmadụ ubi n’ụlọ ha. Ọ sịrị: “Ndị na-abụghị ndị Jehova na-eto m n’ihi na anaghị m eji ọrụ m egwu egwu, ana m ahụkwa na m rụchara ọrụ ọ bụla e nyere m. Ma ejighịzi m ihe gbasara ofufe Jehova kpọrọ ihe, akwụsịkwara m ịga ozi ọma. Emechakwara m kwụsị ịga ọmụmụ ihe. Adịwara m mpako nke na o nweghịzi ihe m ji ndụmọdụ ndị okenye kpọrọ, emechakwara m pụọ n’ọgbakọ.”

Ị Ga-enweli Ihe Ịga nke Ọma ná Ndụ

Anyị atụleela ihe atọ ọ ga-abụ Onye Kraịst jiri oge ya niile na-eme, ha emebie adịm ná mma ya na Jehova. Ò nwere nke ọ bụla n’ime ha gbasara gị? Ọ bụrụ na e nwere, ajụjụ ndị dị na paragraf ndị na-eso, na amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị na ha, nakwa ihe ndị mmadụ kwuru, ga-enyere gị aka ịma ma ị̀ na-eme ihe ndị ga-eme ka ihe gaara gị nke ọma ná ndụ.

Ihe ndị na-esoghị n’ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ na ihe ndị a na-eme iji tụrụ ndụ: Olee otú oge i ji eme ihe ndị a hà? Ihe ndị a, hà na-ewekọrọ oge ndị i jibu eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova? Obi ụtọ ị na-enwe ma gị na ụmụnna nọrọ ọ̀ na-anyụ ka ọkụ? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịa mee ka Eze Devid, bụ́ onye rịọrọ Jehova, sị: “Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ije ije na ya.”—Ọma 143:8.

Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nyeere Wiktor, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya, aka. Onye nlekọta ahụ gwara ya, sị: “Otú i si ekwu banyere vọlibọl ị na-akụ gosiri na o riela gị isi.” Wiktor sịrị: “Ihe ahụ o kwuru metụrụ m n’ahụ́. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na egwuregwu m ahụ eriela m ahụ́. N’oge na-adịghị anya, akwụsịrị m iso ndị na-abụghị ndị Jehova na-akpa, bụ́ ndị mụ ha nọ na klọb ahụ, ma mete ndị nọ n’ọgbakọ enyi.” Taa, Wiktor ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. O kwuru, sị: “Jụọ ndị enyi gị, ndị mụrụ gị, ma ọ bụ ndị okenye ọgbakọ ma agụmakwụkwọ ọ̀ na-eme ka ị na-abịaru Jehova nso ka ọ̀ na-eme ka ị na-agbara ya ọsọ.”

Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị na-eme ihe ndị ga-egosi ndị okenye ọgbakọ unu na ị na-agbalị ka i ruo eruo inwetakwu ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ? Ì nwere ike inyere ndị agadi aka, bụ́ ndị na-enweghị ndị ha na ha nọ ma ọ bụ ndị e kwesịrị inyere aka, ma eleghị anya na-agara ha ahịa ma ọ bụ agara ha ozi n’ụlọ? N’agbanyeghị afọ ole ị dị, i nwere ike ịbanye n’ozi oge niile, na-akọrọ ndị ọzọ ihe mere obi ji adị gị ụtọ.

Ịga Mahadum: Jizọs kwuru na ọ dịghị mma ka ‘ị chọwa otuto nke gị.’ (Jọn 7:18) Ebe i kpebiri na ị ga-agụru akwụkwọ, ọ na-egosi n’eziokwu na ị ‘na-achọpụta ihe ndị ka mkpa’?—Fil. 1:9, 10.

Grzegorz, bụ́ onye ahụ na-ede ihe kọmputa ji arụ ọrụ nke anyị kwuru okwu ya na mbụ, mere mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ya. Ọ sịrị: “Mgbe m chebachaara ndụmọdụ ndị okenye nyere m echiche, akwụsịrị m ịchụ ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ná ndụ m. M chọpụtara na o nweghị oké uru ịgakwu akwụkwọ ga-abara m. Ịgakwu akwụkwọ ga-eme ka m ghara inwe oge na ume m kwesịrị iji eme ihe ndị ọzọ dị mkpa.” Grzegorz mechiwere ihe ndị gbasara ọgbakọ anya. Ka oge na-aga, ọ gara ụlọ akwụkwọ a na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. N’eziokwu, ọ ‘zụtara oge’ ka ọ mụtakwuo ihe Chineke na-akụziri ndị ya.—Efe. 5:16.

Ọrụ Ego: Ì ji oge gị niile arụ ọrụ ego nke na ihe gbasara ofufe Jehova aghọọla ihe ị na-eme mgbe ọ dabara? Ị̀ na-enwe ezigbo oge gị na ndị ezinụlọ gị ji akparịta ụka? Ihe omume ndị ị na-eme n’ọgbakọ na nso nso a hà ka ndị nke mbụ ị na-eme mma? Mkparịta ụka gị na ndị ọzọ na-enwe ọ̀ na-ewuli elu? Ọ bụrụ na ị “tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu,” Jehova ga-agọzi gị nke ukwuu ma mee ka ị ‘hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike gị.’—Ekli. 2:24; 12:13.

Janusz, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, enweghị ihe ịga nke ọma n’ọrụ ya, nke bụ́ ịkụrụ ndị mmadụ mkpụrụ osisi n’ụlọ ha. Kama, ọrụ ahụ kụrụ afọ n’ala. Mgbe ego kọrọ ya, ya ejirikwa ndị mmadụ ụgwọ, ọ chọsiwere Jehova ike. Janusz mechara kpakọọ ndụ ya ọnụ ma malite ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, ọ bụkwa onye ọsụ ụzọ oge niile na okenye n’ọgbakọ ya. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na ihe ndị dị mụ mkpa m nwere na-eju m afọ, nakwa na m na-eji ike m eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova, ahụ́ na-eru m ala, obi na-adịkwa mụ mma.”—Fil. 4:6, 7.

Jiri nkeji ole na ole chee echiche ihe ndị i bu n’obi n’eziokwu eme ihe ndị ị na-eme nakwa ihe ndị ị na-ebute ụzọ ná ndụ gị. Ijere Jehova ozi bụ ihe na-eme ka ihe gaara mmadụ nke ọma ná ndụ ya niile. Mee ka ọ bụrụ ihe bụ́ isi i ji ndụ gị eme.

O nwere ike ịbụ na i kwesịrị ime mgbanwe ụfọdụ, i nwedịrị ike kwụsịchaa ime ihe ndị na-adịghị mkpa iji nwee ike chọpụta n’onwe gị “ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Rom 12:2) Ma, ‘ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma’ ma i jiri obi gị dum na-ejere Chineke ozi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Olee Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ụzọ Gị Gaa nke Ọma?

Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike iri oge gị, olee otú ị ga-esi hụ na ị hapụghị ihe ndị ka mkpa? Wepụta oge nyochaa ihe ndị i bu n’obi na ihe ndị ị na-ebute ụzọ ná ndụ. Ajụjụ ndị e depụtara ebe a ga-enyere gị aka ime nke a:

IHE NDỊ NA-ESOGHỊ N’IHE ỌMỤMỤ ỤLỌ AKWỤKWỌ NA IHE NDỊ A NA-EME IJI TỤRỤ NDỤ

▪ Olee ụdị àgwà e ji mara ndị gị na ha ga-eme ihe ndị ahụ?

▪ Olee otú oge i ji eme ihe ndị a hà?

▪ Hà nwere ike ịghọ ihe ndị i jizi ndụ gị achụ?

▪ Hà na-ewekọrọ oge i jibu eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova?

▪ Olee ụdị ndị ga-anọ ebe ahụ?

▪ Obi ọ̀ na-aka adị gị mma mgbe gị na ha nọ karịa mgbe gị na ụmụnna gị nọ?

ỊGA MAHADUM

▪ Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ i ji na-akpa afọ gị, ọ̀ dị mkpa ka i gbuwe oge gị, mefuwe ego gị na ume gị ebe ị na-agakwu akwụkwọ?

▪ Ọ̀ bụdị eziokwu na ị ga-agarịrị mahadum tupu gị enwee ike ịna-akpa afọ gị?

▪ Ị̀ ka ga na-agachikwa ọmụmụ ihe anya?

▪ Ị̀ ‘chọpụtala ihe ndị ka mkpa’?

▪ Ì kwesịrị ime ka obi sikwuo gị ike na Jehova ga-enyeli gị ihe ndị dị gị mkpa?

ỌRỤ EGO

▪ Ọrụ ị họọrọ ịrụ ọ̀ bụ nke na-eme ka ‘ị ṅụrịa ma hụ ihe ọma n’ọrụ ị gbalịsiri ike na-arụ’?

▪ Ọrụ ị na-arụ ọ̀ na-ekwe gị ka i nwee ike ịrụ ihe ndị dịịrị gị n’ezinụlọ na ihe ndị gbasara ofufe Jehova?

▪ Ị̀ na-enwe ezigbo oge gị na ezinụlọ gị ji akparịta ụka?

▪ Ọrụ ị na-arụ ọ̀ na-ewekọrọ oge gị nke na ị na-emezi ihe ndị gbasara ofufe Jehova mgbe ọ dabara?

▪ Ò meela ka ihe omume ndị ị na-eme n’ọmụmụ ihe gharazie ịna-adịcha ụtọ?

[Foto dị na peeji nke 30]

Jehova dọrọ Barọk aka ná ntị ka ọ ghara ịchọrọ onwe ya ihe ukwu