Jeremaya 43:1-13

  • Ndị Juu nupụrụ isi gawa Ijipt (1-7)

  • Jehova gwara Jeremaya okwu n’Ijipt (8-13)

43  Jeremaya gwara mmadụ niile ahụ ihe Jehova bụ́ Chineke ha gwara ya ka ọ gwa ha. O nweghị nke ọ na-agwaghị ha. Mgbe ọ gwachara ha ihe Jehova bụ́ Chineke ha kwuru, 2  Azaraya nwa Hoshaya, Johenan+ nwa Kariya, na ụmụ nwoke niile onwe ha na-ebu isi sịrị Jeremaya: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha. Jehova bụ́ Chineke anyị agwaghị gị ka ị gwa anyị ka anyị ghara ịga biri n’Ijipt. 3  Kama, ọ bụ Barọk+ nwa Neraya na-aranye gị ikwu ihe ị na-ekwu n’ihi na ọ chọrọ ka ndị Kaldia kpara anyị aka, ka ha wee gbuo anyị ma ọ bụkwanụ dọrọ anyị n’agha laa Babịlọn.”+ 4  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile nakwa ndị ahụ niile erubereghị Jehova isi. Ha jụrụ ịnọrọ na Juda. 5  Kama ịnọrọ na Juda, Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ kpọọrọ ndị Juda niile fọdụrụ gbapụ. Ndị a ha kpọọrọ bụ ndị si ná mba niile a chụsasịrị ha lọta ka ha biri na Juda.+ 6  Ha kpọọrọ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị, ụmụ nwaanyị eze mụrụ, nakwa onye* ọ bụla Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ka ya na Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ nọrọ. Ha kpọkwaara ma Jeremaya onye amụma ma Barọk nwa Neraya. 7  Ha kpọ ha bata Ijipt, si otú a nupụrụ Jehova isi. Ha gagidere ruo Tapanhis.+ 8  Ka ha ruru Tapanhis, Jehova gwara Jeremaya, sị: 9  “Buru nkume ndị buru ibu, nọrọ n’ihu ndị Juu zoo ha n’ụrọ dị n’ebe e doro brik, n’ebe e si abanye n’ụlọ Fero dị na Tapanhis. 10  I zochaa ya, gwazie ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-akpọ Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m.+ M ga-adọsa ocheeze ya n’elu nkume ndị a m zoro. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’elu ha.+ 11  Ọ ga-abịakwa lụso ndị Ijipt agha.+ Ọrịa ga-egbu ụfọdụ n’ime unu. A ga-adọrọ ụfọdụ n’ime unu n’agha. A ga-ejikwa mma agha gbuo ụfọdụ n’ime unu.+ 12  M ga-amụnye ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.+ Eze ahụ ga-agbakwa ụlọ ndị ahụ ọkụ ma buru chi ndị ahụ laa. Otú ahụ ọ na-adịrị onye ọzụzụ atụrụ mfe iyiri uwe mwụda ya, ka ọ ga-adịrị ya mfe imeri ndị Ijipt niile. Ọ ga-esikwa n’Ijipt laa n’udo.* 13  Ọ ga-akụrisị ogidi niile dị na Bet-shimesh,* nke dị n’Ijipt. Ọ ga-agbakwa ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Ọkọ agaghị akọ ya ya esi n’Ijipt laa.”
Ma ọ bụ “Ụlọ Chi Anyanwụ,” ya bụ, Heliopolis.