Jeremaya 45:1-5

  • Ihe Jehova gwara Barọk (1-5)

45  E nwere ihe Jeremaya onye amụma gwara Barọk,+ nwa Neraya, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda. Jeremaya gwara ya ihe a n’oge Barọk ji akwụkwọ na-ede ihe ọ na-agwa ya.+ Ọ gwara ya, sị:  “Barọk, Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru banyere gị, sị,  ‘Ị sịrị: “Efuola m, n’ihi na e nwere ihe na-echegbu m, Jehova abịakwa mee ka m na-eru uju. Ike agwụla m n’ihi ude m na-asụ. Enweghịkwa m ebe m ga-ezu ike.”’  “Gwa Barọk, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-akwatu ihe m rụrụ. M ga-efopụkwa ihe m kụrụ. M ga-eme ihe a n’ala a niile.+  Ma, ị na-achọrọ onwe gị* ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.”’ “Jehova kwuru, sị, ‘N’oge na-adịghị anya, m ga-eme ka ọdachi dakwasị mmadụ niile.*+ Ma, n’ebe ọ bụla ị ga-aga, m ga-echebe gị ndụ, ya abụrụ ụgwọ ọrụ gị.’”*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ị na-atụ anya.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụrụ ihe ị kwatara.”