Joshụa 1:1-18
1 Mgbe Mosis ohu Jehova nwụrụ, Jehova gwara Joshụa*+ nwa Nọn, onye na-ejere Mosis ozi,+ sị:
2 “Mosis ohu m anwụọla.+ Jikere ka gị na ndị a niile, bụ́ ndị Izrel,+ gafee Osimiri Jọdan, banye n’ala ahụ m ga-enye ha.
3 M ga-enye unu ebe ọ bụla ọbụ ụkwụ unu ga-azọsa, otú ahụ m kwere Mosis+ ná nkwa.
4 Ọ bụ unu ga-enwe malite n’ala ịkpa ruo ma Lebanọn ma nnukwu osimiri bụ́ Osimiri Yufretis, ya bụ, ala ndị Het+ niile, ruokwa n’Oké Osimiri Mediterenian* dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+
5 Ị ga-emeri ndị niile ga-alụso gị agha n’oge niile ị dị ndụ.+ M ga-anọnyere gị+ otú m nọnyeere Mosis. Agaghị m ahapụ gị, agaghịkwa m agbakụta gị azụ.+
6 Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-enyere ndị a aka ka ha nweta ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na m ga-enye ha.+
7 “Nwee nnọọ obi ike, dịkwa ezigbo ike. Leziekwa anya na-eme ihe niile dị n’Iwu Mosis ohu m nyere gị. Ahapụla ime ya,+ ka i wee na-akpa àgwà onye ma ihe n’ihe ọ bụla ị na-eme.+
8 Akwụsịla ịna-ekwu gbasara ihe e dere n’akwụkwọ Iwu a.+ I kwesịrị ịna-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya* ehihie na abalị, ka i wee lezie anya na-eme ihe niile e dere na ya.+ Ime ihe ndị a ga-eme ka ihe na-agaziri gị, meekwa ka ị na-akpa àgwà onye ma ihe.+
9 Ọ̀ bụ na mụ agwabeghị gị ka i nwee obi ike, ka ị dịkwa ike? Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”+
10 Joshụa wee gwa ndị na-elekọta ndị Izrel, sị:
11 “Gagharịanụ ebe niile unu mara ụlọikwuu gwa ndị Izrel, sị, ‘Kwadebenụ ihe unu ga-eri, n’ihi na abalị atọ taa unu ga-agafe Osimiri Jọdan ka unu nweta ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.’”+
12 Joshụa gwakwara ebo Ruben na ebo Gad na ọkara ebo Manase, sị:
13 “Chetanụ na Mosis ohu Jehova gwara unu, sị:+ ‘Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka unu zuru ike. O nyekwala unu ala a.
14 Ndị nwunye unu, ụmụ unu na anụ ụlọ unu ga-anọ n’ala ahụ Mosis nyere unu n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ Ma unu niile, bụ́ ndị dike,+ ga-ahazi onwe unu ka ndị agha, buru ụmụnne unu+ ụzọ gafee Osimiri Jọdan. Unu ga na-enyekwara ha aka
15 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike otú ahụ o meere ununwa, ha enwetakwa ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye ha. E mechaa, unu ga-alaghachizi n’ala nke e kenyere unu ma biri na ya, ya bụ, ala ahụ Mosis ohu Jehova nyere unu n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.’”+
16 Ha wee sị Joshụa: “Anyị ga-eme ihe niile ị gwara anyị, gaakwa ebe ọ bụla ị sị anyị gaa.+
17 Anyị ga-eme ihe niile i kwuru otú ahụ anyị mere ihe niile Mosis kwuru. Ka Jehova bụ́ Chineke gị nọnyere gị otú ahụ ọ nọnyeere Mosis.+
18 A ga-egbu onye ọ bụla nupụụrụ gị isi wee jụ ime ihe ọ bụla ị gwara ya ka o mee.+ Nwee obi ike, dịkwa ike.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Jehoshụa.” Ọ pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”
^ Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
^ Na Hibru, “ịna-agụ ya n’olu dị ala.”