Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Inwe Obi Dị Elu

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Inwe Obi Dị Elu

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Inwe Obi Dị Elu

“Chineke na-emegide ndị mpako.”—JEMS 4:6.

1. Nye ihe atụ nke nganga ndị ziri ezi.

Ọ̀ DỊTỤLA ihe mere ka nganga ju gị obi? Ọ dịtụla ihe ka ọtụtụ n’ime anyị otú ahụ. Ịkpatụ nganga mgbe ụfọdụ adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, mgbe di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst gụrụ ihe ndị nkụzi nwa ha nwanyị dere banyere àgwà ọma ya na otú o si arụsi ọrụ ike n’ụlọ akwụkwọ, o yikarịrị ka obi ụtọ ọ̀ ga-eju ha obi n’ihi ihe nwa ha rụzuru. Pọl onyeozi na ndị ọrụ ibe ya ji ọgbakọ ọhụrụ ha nyere aka guzobe nyaa isi n’ihi na ụmụnna nọ na ya ji ikwesị ntụkwasị obi die mkpagbu.—1 Ndị Tesalonaịka 1:1, 6; 2:19, 20; 2 Ndị Tesalonaịka 1:1, 4.

2. Gịnị mere ịkpa nganga ji abụkarị àgwà na-ezighị ezi?

2 Site n’ihe atụ ndị e nyere ebe a, anyị na-ahụ na nganga pụrụ ịpụta mmadụ inwe ọṅụ n’ihi ihe o mere ma ọ bụ ihe o nwere. Otú ọ dị, mgbe mgbe, nganga na-egosi mmadụ ibuli onwe ya elu n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, mmadụ iche na ọ ka ndị ọzọ mma n’ihi ihe ndị ọ pụrụ ime, ọdịdị ya, akụ̀ na ụba ya, ma ọ bụ ọkwá ya. Onye ahụ na-egosipụtakarị ya site n’ịkagide ndị ọzọ anya. N’ezie, dị ka Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị na-akpa ụdị nganga ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị bu mmụọ nke ịchọ ọdịmma onwe anyị nanị pụta ụwa bụ́ nke anyị ketara site n’aka nna anyị ochie bụ́ Adam. (Jenesis 8:21) N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị mfe obi anyị iduhie anyị ma mee ka anyị na-akpa nganga n’ihi ihe ndị na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst ga-akpachara anya ka ha ghara ịdị na-eji agbụrụ ha, akụ̀ na ụba ha, ebe ha gụruru akwụkwọ, ikike ndị ha bu pụta ụwa, ma ọ bụ ịka ndị ọzọ arụ ọrụ akpa nganga. Iji ihe ndị dị otú ahụ akpa nganga ezighị ezi, ọ dịghịkwa eme Jehova obi ụtọ.—Jeremaịa 9:23; Ọrụ 10:34, 35; 1 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Galeshia 5:26; 6:3, 4.

3. Gịnị bụ mpako, gịnịkwa ka Jizọs kwuru banyere ya?

3 E nwere ihe ọzọ mere a ga-eji zere nganga na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke a bilite n’obi anyị, ọ pụrụ ịghọ ụdị nganga jọgburu nnọọ onwe ya a na-akpọ mpako. Gịnị bụ mpako? Tụkwasị n’iche na ya ka ndị ọzọ, onye mpako na-eleda ndị ọzọ anya, bụ́ ndị ọ na-ele anya dị ka ndị ọ ka. (Luk 18:9; Jọn 7:47-49) Jizọs gụnyere “mpako” mgbe ọ na-agụsị àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-esite “n’obi” ma “na-emerụ mmadụ.” (Mak 7:20-23) Nke a kwesịrị ime ka Ndị Kraịst hụ mkpa ọ dị izere inwe obi dị elu.

4. Olee otú ịtụle ihe atụ nke ndị mpako e kwuru banyere ha na Bible pụrụ isi nyere anyị aka?

4 Ịtụle ihe atụ nke ndị mpako bụ́ ndị e dekọrọ na Bible pụrụ inyere gị aka ịghara ịdị mpako. Nke ahụ ga-eme ka i nwee ike ịhụ nganga na-ezighị ezi nke pụrụ ịdị n’ime gị ma ọ bụ nke pụrụ ibilite ka oge na-aga. Nke a ga-enyere gị aka ịjụ echiche na mmetụta ndị pụrụ ime ka i nwee obi dị elu. N’ihi ya, a ga-echebe gị mgbe Chineke ga-emezu ihe a ọ dọrọ aka ná ntị na ya ga-eme: “M ga-ewezụga n’etiti gị ndị gị na-aṅụrị ọṅụ agha n’ime mpako, ị gaghị adịkwa mpako ọzọ n’ugwu nsọ m.”—Zefanaịa 3:11.

Chineke Na-emegide Ndị Mpako

5, 6. Olee otú Fero si gosi na ya dị mpako, gịnịkwa si na ya pụta?

5 Ị pụkwara ịhụ otú Jehova si ele mpako anya n’otú o si mesoo ndị eze dị ike dị ka Fero ihe. Obi abụọ adịghị ya na Fero nwere obi dị elu. O ledara ndị ohu ya, bụ́ ụmụ Izrel, anya n’ihi na ọ na-ele onwe ya anya dị ka chi a ga-efe ofufe. Tụlee ihe o kwuru mgbe a rịọrọ ya ka o kwe ka Izrel gaa n’ọzara ‘meere Jehova ememe.’ Fero ji mpako zaa, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya izipụ Izrel?”—Ọpụpụ 5:1, 2.

6 Mgbe e tisịrị Fero ihe otiti isii, Jehova gwara Mozis ka ọ jụọ onye ọchịchị Ijipt ahụ, sị: “Ị̀ nọ na-atụli onwe gị elu dị ka obo ihe imegide ndị m ruo ugbu a, na ị gaghị ezipụ ha?” (Ọpụpụ 9:17) Mozis maziri ọkwa ihe otiti nke asaa—akụ́ mmiri igwe nke bibiri ala ahụ. Ozugbo a hapụrụ ụmụ Izrel ka ha laa ka ihe otiti nke iri gasịrị, Fero gbanwere obi ya ma chụwa ha. N’ikpeazụ, Fero na usuu ndị agha ya tọrọ n’Oké Osimiri Uhie. Cheedị ihe ha ga na-eche mgbe mmiri ahụ na-erikpu ha! Gịnị si ná mpako Fero pụta? Ndị agha ya ọ kasị tụkwasị obi kwuru, sị: “Ka anyị gbapụ n’ihu Izrel; n’ihi na Jehova na-eburu ha agha megide ndị Ijipt.”—Ọpụpụ 14:25.

7. Olee otú ndị ọchịchị Babilọn si gosi na ha dị mpako?

7 Jehova wedakwara ndị ọchịchị ọzọ dị mpako ala. Otu n’ime ha bụ Senakerib, bụ́ eze Asiria. (Aịsaịa 36:1-4, 20; 37:36-38) Ndị Babilọn mesịrị merie Asiria, ma, e wedakwara ndị eze abụọ dị mpako nke Babilọn ala. Cheta oké oriri ahụ Eze Belshaza mere bụ́ mgbe ya na ndị isi ọ kpọrọ oriri jiri arịa ndị a kwakọọrọ n’ụlọ nsọ Jehova ṅụọ mmanya vaịn, na-eto chi dị iche iche nke Babilọn. Na mberede, aka mmadụ pụtara ma dee ihe ná mgbidi. Mgbe a gwara Daniel onye amụma ka ọ kọwaa ihe odide ahụ dị omimi, o chetaara Belshaza, sị: “Chineke Nke kachasị ihe nile elu nyere Nebukadneza, bụ́ nna gị alaeze a . . . Ma mgbe obi ya dị elu, . . . e mere ka o si n’ocheeze nke alaeze ya rịdata, ọ bụkwa ebube ya ka e wezụgara n’ebe ọ nọ: . . . Ma gị onwe gị, bụ́ nwa ya, Belshaza, i meghị ka obi gị dị ala, ọ bụ ezie na ị maara ihe a nile.” (Daniel 5:3, 18, 20, 22) N’abalị ahụ, ndị agha Midia na Peasia meriri Babilọn, e gbukwara Belshaza.—Daniel 5:30, 31.

8. Olee otú Jehova si meso ndị mpako dịgasị iche iche ihe?

8 Cheekwa banyere ndị mpako ọzọ bụ́ ndị ledara ndị Jehova anya: dike ndị Filistia bụ́ Golaịat, praịm minista ndị Peasia bụ́ Heman, na Eze Herọd Agripa, bụ́ onye chịrị ógbè Judia. N’ihi mpako ha, Chineke mere ka ndị ikom atọ a nwụọ ọnwụ ihere. (1 Samuel 17:42-51; Esta 3:5, 6; 7:10; Ọrụ 12:1-3, 21-23) Otú Jehova si meso ndị ikom ahụ dị mpako ihe mere ka eziokwu a pụta ìhè: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” (Ilu 16:18) N’ezie, obi abụọ adịghị ya na “Chineke na-emegide ndị mpako.”—Jems 4:6.

9. Olee otú ndị eze Taịa si ghọọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi?

9 N’adịghị ka ndị ọchịchị dị mpako nke Ijipt, Asiria, na Babilọn, eze Taịa nyeere ndị Chineke aka n’otu oge. N’oge ọchịchị Eze Devid na Eze Solomọn, o nyere ha ndị ikom nwere nkà n’iwu ihe, nyekwa ha ihe ndị a ga-eji wuo ụlọ eze na ụlọ nsọ Chineke. (2 Samuel 5:11; 2 Ihe E Mere 2:11-16) Ọ bụ ihe dị mwute na ka oge na-aga, ndị Taịa malitere imegide ndị Jehova. Gịnị kpatara nke ahụ?—Abụ Ọma 83:3-7; Joel 3:4-6; Emọs 1:9, 10.

“Obi Gị Adịwo Elu”

10, 11. (a) Ònye ka a pụrụ iji tụnyere ndị eze Taịa? (b) Gịnị mere àgwà ndị Taịa na-akpaso Izrel ji gbanwee?

10 Jehova nyere Izikiel onye amụma mmụọ ya ikpughe na ịma usoro ndị eze Taịa ikpe. Ozi ahụ e ziri “eze Taịa” nwere okwu ndị kọwara ma usoro ndị eze Taịa ma onye sabo mbụ, bụ́ Setan, bụ́ onye ‘na-eguzosighị ike n’eziokwu.’ (Ezikiel 28:12; Jọn 8:44) Setan bụbu mmụọ ozi na-eguzosi ike n’ihe nke so ná nzukọ Jehova nke ụmụ eluigwe ya. Site n’ọnụ Izikiel, Jehova Chineke kwuru isi ihe mere ma usoro ndị eze Taịa ma Setan ji nupụ isi:

11 “N’Iden, bụ́ ubi Chineke a gbara ogige, ka ị nọworo; nkume nile ọ bụla nke dị oké ọnụ ahịa bụ ihe mkpuchi gị . . . Gị onwe gị bụ cherub ahụ e tere mmanụ nke na-ekpuchi ekpuchi . . . Onye zuru okè ka ị bụ n’ụzọ gị nile site n’ụbọchị e kere gị, ruo mgbe a hụrụ ajọ omume n’ime gị. Ha ejiwo ịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị mejuo etiti gị n’ihe ike, i wee mehie: M wee mee . . . ka ị laa n’iyi, gị cherub nke na-ekpuchi ekpuchi . . . Obi gị adịwo elu n’ihi ịma mma gị, i bibiwo amamihe gị n’ihi onwunwu ìhè gị.” (Ezikiel 28:13-17) Ee, mpako mere ka ndị eze Taịa meso ndị Jehova ihe ike. Taịa bịara baa ọgaranya gabiga ókè dị ka ebe azụmahịa bụ́ isi ma ghọọ ebe a ma ama n’ihi ihe ndị mara mma a na-emepụta na ya. (Aịsaịa 23:8, 9) Ndị eze Taịa malitere iche banyere onwe ha gabiga ókè, ha malitekwara imekpọ ndị Chineke ọnụ.

12. Gịnị dugara Setan n’ịghọ aghụghọ, gịnịkwa ka ọ nọgideworo na-eme?

12 N’ụzọ yiri nke ahụ, mmụọ ahụ e kere eke ghọrọ Setan nweburu amamihe dị ya mkpa iji rụọ ọrụ ọ bụla Chineke nyere ya. Kama ya inwe ekele, ọ malitere ‘iji nganga afụli onwe ya elu’ na ileda ụzọ Chineke si achị anya. (1 Timoti 3:6) O buliri onwe ya elu gabiga ókè nke na ọ malitere ịchọ ka Adam na Iv fewe ya. Ọchịchọ ọjọọ a tụụrụ ime ma mụpụta mmehie. (Jems 1:14, 15) Setan rafuru Iv iri mkpụrụ nke nanị otu osisi Chineke sịrị ha erila. Setan jizi Iv rata Adam iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. (Jenesis 3:1-6) Mmadụ abụọ mbụ ahụ si otú a jụ ọbụbụeze Chineke ma ghọọ nnọọ ndị na-efe Setan. Setan dị mpako gabiga ókè. Ọ na-agbalị ịrafu ndị nile e kere eke nwere ọgụgụ isi n’eluigwe na n’ụwa, gụnyere Jizọs Kraịst, ịjụ ọchịchị Jehova ma fewe ya.—Matiu 4:8-10; Mkpughe 12:3, 4, 9.

13. Olee ihe ọjọọ ndị siworo ná mpako pụta?

13 Ya mere, ị pụrụ ịhụ na mpako si n’aka Setan malite; ọ bụ mpako bụ ihe bụ́ isi kpatara mmehie, ahụhụ, na mpụ ndị e nwere n’ụwa taa. Ebe ọ bụ “chi nke usoro ihe a,” Setan nọgidere na-akwalite nganga na-ezighị ezi na mpako. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ maara na oge ya dị mkpirikpi, ya mere, ọ na-alụso ezi Ndị Kraịst ọgụ. Ebumnobi ya bụ ime ka ha gbakụta Chineke azụ, ka ha ghọọ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị na-anya isi na ndị mpako. Bible buru amụma na àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ ga-ejupụta ebe nile “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a.—2 Timoti 3:1, 2; Mkpughe 12:12, 17.

14. Ụkpụrụ dị aṅaa ka Jehova ji emeso ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi ihe?

14 Jizọs Kraịst n’onwe ya ji obi ike kpughee ihe ọjọọ siworo ná mpako Setan pụta. Jizọs kwupụtara ụkpụrụ Jehova ji emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe ya dịkarịa ala ugboro atọ nakwa n’ihu ndị iro ya bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha. Ụkpụrụ ahụ bụ: “Onye na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Luk 14:11; 18:14; Matiu 23:12.

Ekwela Ka Obi Gị Dị Elu

15, 16. Gịnị mere Hega ji ghọọ onye mpako?

15 Ọ pụrụ ịbụ na ị chọpụtara na ndị mpako e kwuru banyere ha ebe a bụ ndị a ma ama. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ndị nkịtị apụghị ịdị mpako? Mbanụ. Tụlee ihe mere n’ezinụlọ Ebreham. Nna ochie ahụ enweghị nwa nwoke ga-eketa ihe ya, nwunye ya, bụ́ Sera, agafeekwala afọ ndụ ịmụ nwa. Ihe nwoke nọ n’ọnọdụ Ebreham na-emekarị bụ ịlụrụ nwunye nke abụọ ma mụọ ụmụ. Chineke kwere ka alụmdi na nwunye dị otú ahụ dịrị n’ihi na oge ọ ga-eji guzobeghachi ụkpụrụ mbụ ya banyere alụmdi na nwunye n’etiti ndị na-efe ya ezi ofufe erubeghị.—Matiu 19:3-9.

16 N’ihi arịrịọ nwunye ya, Ebreham kwetara inweta onye ga-eketa ihe ya site n’ohu nwanyị Sera, bụ́ onye Ijipt nke aha ya bụ Hega. Dị ka nwunye nke abụọ nke Ebreham, Hega tụụrụ ime. O kwesịrị inwe ezigbo ekele maka ihe ùgwù e nyere ya. Kama nke ahụ, o kwere ka obi ya dị elu. Bible na-akọ, sị: “O wee hụ na ọ tụụrụ ime, e wee leda nwanyị nwe ya n’anya ya.” Àgwà ahụ kpatara nnọọ esemokwu n’ezinụlọ Ebreham nke na Sera chụpụrụ Hega. Ma, e nwere ihe ga-edozi esemokwu ahụ. Mmụọ ozi Chineke dụrụ Hega ọdụ, sị: “Laghachikwuru nwanyị nwe gị, wedakwa onwe gị ala n’okpuru aka ya.” (Jenesis 16:4, 9) Ihe àmà gosiri na Hega gbasoro ndụmọdụ a, gbanwee otú o si emeso Sera ihe, ma ghọọ nne ochie nke ìgwè mmadụ.

17, 18. Gịnị mere o ji dị anyị nile mkpa izere mpako?

17 Ihe atụ Hega na-egosi na mgbe ihe dịwaara mmadụ mma, ọ pụrụ ịghọ onye mpako. Ihe anyị na-amụta na ya bụ na ọbụna Onye Kraịst ji ezi obi ejere Chineke ozi pụrụ ịghọ onye mpako mgbe o nwewere ego ma ọ bụ ikike. Ọ pụkwara ịdị mpako ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-eto ya maka ihe ịga nke ọma ya, amamihe ya, ma ọ bụ ikike ya. Ee, Onye Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka obi ya ghara ịdị elu. Nke ahụ ga-adị mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na ihe agawara ya nke ọma ma ọ bụ ya enwetakwuo ibu ọrụ.

18 Ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji zere ịdị mpako bụ otú Chineke si ele àgwà a anya. Okwu ya na-ekwu, sị: “Anya mpako na obi dị nganga, ọbụna oriọna nke ndị na-emebi iwu, bụ mmehie.” (Ilu 21:4) N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible dọrọ Ndị Kraịst “bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a” aka ná ntị kpọmkwem ka ha ghara “inwe anya dị elu,” ma ọ bụ ịdị “mpako.” (1 Timoti 6:17; Deuterọnọmi 8:11-17) Ndị Kraịst na-abaghị ọgaranya kwesịrị izere inwe “anyaụfụ,” ha kwesịkwara icheta na onye ọ bụla—ma ọ bụ ọgaranya ma ọ bụ ogbenye—pụrụ ịghọ onye mpako.—Mak 7:21-23; Jems 4:5.

19. Olee otú Ụzaịa si mebie aha ọma ya?

19 Mpako na àgwà ọjọọ ndị ọzọ pụrụ imebi ezi mmekọrịta mmadụ na Jehova. Dị ka ihe atụ, tụlee akụkụ mbụ nke ọchịchị Eze Ụzaịa: “O mee ihe ziri ezi n’anya Jehova . . . O wee nọọ n’ịchọ Chineke . . . , ma n’ụbọchị ọ na-achọ Jehova, Chineke mere ka ihe gaara ya nke ọma.” (2 Ihe E Mere 26:4, 5) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, Eze Ụzaịa mebiri aha ọma ya, n’ihi na “obi ya dị elu ruo mbibi.” O buliri onwe ya elu gabiga ókè nke na ọ bara n’ụlọ nsọ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Mgbe ndị nchụàjà dọrọ ya aka ná ntị ka ọ ghara ịkpa àgwà mpako a, “Ụzaịa wee koo ọnụma.” N’ihi ya, Jehova tiri ya ekpenta, ọ nwụkwara dị ka onye na-enweghị ihu ọma Chineke.—2 Ihe E Mere 26:16-21.

20. (a) Olee otú ezi aha Eze Hezekaịa meere onwe ya si chọọ ifunahụ ya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Ị pụrụ ịhụ ọdịiche dị na nke a na ihe atụ nke Eze Hezekaịa. N’otu oge, aha ọma eze ahụ meere onwe ya nọ na-achọ ifunahụ ya n’ihi na “obi ya dị elu.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, “Hezekaịa wee huru ala [ma ọ bụ, “dị umeala n’obi”] n’ihi ịdị elu nke obi ya” ma nwetaghachi ihu ọma Chineke. (2 Ihe E Mere 32:25, 26) Rịba ama na ihe gwọrọ mpako Hezekaịa bụ ịdị umeala n’obi. Ee, ịdị umeala n’obi na-eme ka mmadụ ghara ịdị mpako. N’ihi ya, n’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú anyị pụrụ isi malite ịdị umeala n’obi ma nọgide na-adị umeala n’obi dị ka Ndị Kraịst.

21. Gịnị ka Ndị Kraịst dị umeala n’obi pụrụ ịtụ anya ya?

21 Otú ọ dị, ka anyị ghara ichefu ihe ọjọọ nile siworo ná mpako pụta. Ebe ọ bụ na “Chineke na-emegide ndị mpako,” ka anyị kpebisie ike ịjụ nganga na-ezighị ezi. Ka anyị na-agbalị ịbụ Ndị Kraịst na-adị umeala n’obi, anyị pụrụ ịtụ anya ịlanahụ oké ụbọchị Chineke, bụ́ mgbe a ga-ewepụ ndị mpako na ihe ọjọọ ha kpataworo n’ụwa. Mgbe ahụ, “a ghaghịkwa ihuda mpako mmadụ, a ghaghịkwa ime mbuli elu nke ndị nile ka ọ dị ala: a ghaghị ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu n’ụbọchị ahụ.”—Aịsaịa 2:17.

Ihe Ndị A Ga-atụgharị Uche na Ha

• Olee otú ị ga-esi kọwaa onye dị mpako?

• Olee otú mpako si malite?

• Gịnị pụrụ ime ka mmadụ ghọọ onye mpako?

• N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji zere mpako?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Mpako Fero dugara n’iweda ya ala

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọnọdụ Hega kara mma mere ka ọ dị mpako

[Foto dị na peeji nke 25]

Hezekaịa wedara onwe ya ala ma nwetaghachi ihu ọma Chineke