Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 32:1-33

  • Senakerib gara ka ọ lụso Jeruselem agha (1-8)

  • Senakerib mara Jehova aka (9-19)

  • Otu mmụọ ozi gara sụọ ndị agha Asiria akwụ (20-23)

  • Mgbe Hezekaya rịara ọrịa na mgbe ọ bịara dị mpako (24-26)

  • Otú ihe si gaziere Hezekaya na mgbe ọ nwụrụ (27-33)

32  Mgbe Hezekaya mechara ihe ndị a otú e kwesịrị isi eme ha,+ Senakerib eze Asiria batara Juda n’ike, nọchibidokwa obodo ndị a rụsiri ike na ya. O bukwa n’obi itipu mgbidi ha bata ma weghara ha.+  Mgbe Hezekaya hụrụ na Senakerib abịala, nakwa na o bu n’obi ịlụso Jeruselem agha,  ya na ndị o mere ndị isi na ndị agha ya gbara izu, ya ekpebie ikpochi iyi ndị dị n’azụ obodo ha.+ Ha kwadokwara ya.  A kpọkọtara ọtụtụ ndị, ha asụchie isi mmiri niile, kpochiekwa iyi na-asọfe n’ala ahụ ma sị: “Anyị achọghị ka ndị eze Asiria hụ nnukwu mmiri ha ga-aṅụ ma ha bịa.”  Ọ katakwara obi rụzie ebe ndị a kwaturu akwatu ná mgbidi obodo ha ma rụọ ụlọ nche dị iche iche n’elu ya. Ọ rụkwara mgbidi ọzọ n’ihu nke ochie. Ọ rụzikwara Milo*+ nke dị n’Obodo Devid. Ọ rụkwara ọtụtụ ngwá agha* na ọtụtụ ọta.  Ọ họpụtaziri ndị ọchịagha ga na-edu ndị ya aga agha, kpọkọọkwa ha n’ámá dị n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma gbaa ha ume,* sị:  “Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria+ nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya, maka na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya.+  Ihe o ji bụ ike ọkpụkpụ aka nkịtị,* ma, Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị. Ọ ga-enyere anyị aka, lụọkwara anyị agha.”+ Ihe a Hezekaya eze Juda kwuru mere ka obi sie ndị ọchịagha ahụ ike.+  Mgbe ihe a niile gachara, Senakerib eze Asiria na ndị agha ya niile nọ na Lekish.+ Ọ nọzi ebe ahụ zie ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa Jeruselem gwa Hezekaya eze Juda na ndị Judia niile bi na Jeruselem,+ sị: 10  “Senakerib eze Asiria kwuru, sị, ‘Gịnị kara unu obi mere unu ka ji nọrọ na Jeruselem anyị nọchibidoro?+ 11  Ùnu makwa na Hezekaya na-eduhie unu, na-achọ ka ụnwụ na akpịrị ịkpọ nkụ gbuo unu? Ọ bụ ya mere o ji na-asị: “Jehova bụ́ Chineke anyị ga-anapụta anyị n’aka eze Asiria.”+ 12  Ọ́ bụghị otu Hezekaya a wepụrụ ebe ndị dị elu+ na ebe ịchụàjà Chineke unu*+ ma gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị: “Na-akpọnụ isiala naanị n’ihu otu ebe ịchụàjà a, na-achụkwanụ àjà a na-esu ọkụ n’elu ya”?+ 13  Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe mụ na nna nna m hà mere ndị niile bi ná mba dị iche iche?+ Chi ndị mba ndị ahụ hà napụtaliri ala ha n’aka m?+ 14  N’ime chi niile nna nna m hà bibiri mba ndị na-efe ha, olee nke napụtaliri ndị ya n’aka m, mere Chineke unu ga-eji nwee ike ịnapụta unu n’aka m?+ 15  Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu ma ọ bụ si otú a rafuo unu.+ Unu atụkwasịkwala ya obi, n’ihi na ọ dịghị chi mba ọ bụla ma ọ bụ chi alaeze ọ bụla nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka m ma ọ bụ n’aka nna nna m hà. Oleezi otú Chineke unu ga-esi napụta unu n’aka m?’”+ 16  Ihe ndị na-ejere ya ozi kwuru banyere Jehova bụ́ ezi Chineke na Hezekaya ohu ya kadị ihe yanwa kwuru njọ. 17  O dekwara akwụkwọ ozi+ iji kparịa Jehova bụ́ Chineke Izrel+ na iji gwa ya okwu ọjọọ. Ihe a ka o dere: “Otú ahụ chi ndị mba ndị ahụ na-anapụtalighị ndị ha n’aka m,+ ka Chineke Hezekaya na-agaghị anapụtali ndị ya n’aka m.” 18  Ha nọkwa na-agwa ndị Jeruselem nọ ná mgbidi okwu n’asụsụ ndị Juu, na-eti ya ná mkpu iji menye ha egwu na iji kowe ha obi n’elu, ka ha wee weghara obodo ahụ.+ 19  Otú ha si na-akatọ chi ọzọ dị iche iche nke ndị bi n’ụwa, ndị bụ́ ọrụ aka mmadụ, ka ha si na-akatọ Chineke nke ndị bi na Jeruselem. 20  Ma Eze Hezekaya na Aịzaya onye amụma,+ bụ́ nwa Emọz, nọ na-ekpe ekpere gbasara ihe a, na-akpọku Chineke nke bi n’eluigwe ka o nyere ha aka.+ 21  Jehova zigaziri otu mmụọ ozi, ya agaa ebe eze Asiria mara ụlọikwuu, kpochapụ ndị bụ́ dike n’agha,+ ndị ndú, na ndị isi niile, nke mere na eze ahụ ji ihere laghachi n’ala ya. O mechakwara banye n’ụlọ chi ya, ụfọdụ n’ime ụmụ ya agaa ebe ahụ were mma agha gbuo ya.+ 22  Otú a ka Jehova si napụta Hezekaya na ndị bi na Jeruselem n’aka Senakerib eze Asiria nakwa n’aka ndị niile ọzọ, meekwa ka ha zuoro ndị iro ha niile ike. 23  Ọtụtụ ndị wetaara Jehova onyinye na Jeruselem, wetakwara Hezekaya eze Juda+ ihe ndị bara ezigbo uru. Mgbe ihe a niile mechara, mba niile bịaziri na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. 24  N’oge ahụ, Hezekaya rịawara ọrịa, nọrọkwa n’ọnụ ọnwụ. O wee kpee ekpere ka Jehova mee ka ọ gbakee.+ Ọ nụkwara ekpere ya ma gosi ya ihe àmà ọ ga-eji mara na ọ ga-agbake.+ 25  Ma Hezekaya emeghị ihe gosiri na ihe ọma e meere ya dị ya mma, n’ihi na ọ bịara dị mpako, nke mere ka Chineke wesa ya iwe, wesakwa Juda na Jeruselem. 26  Ma, Hezekaya wedara onwe ya ala wee kwụsị ịdị mpako,+ ya na ndị bi na Jeruselem. Jehova emeghịkwa ha ihe ọ bụla n’oge Hezekaya nọ ndụ.+ 27  Hezekaya wee nwee nnukwu akụnụba, a na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.+ Ọ rụkwaara onwe ya ụlọ a ga na-akwasa+ ọlaọcha, ọlaedo, nkume dị oké ọnụ,* mmanụ balsam, ọta, na ihe niile ọzọ bara ezigbo uru. 28  Ọ rụkwara ebe a ga na-edosa ọka ha wetara n’ubi, mmanya ọhụrụ, na mmanụ, rụọkwa ụlọ maka ụdị anụmanụ niile nakwa maka ewu na atụrụ. 29  Ọ rụkwaara onwe ya obodo dị iche iche, nwetakwa ọtụtụ anụmanụ, ìgwè ewu na atụrụ, nakwa ìgwè ehi, n’ihi na Chineke mere ka ọ bụrụ aka ji akụ̀. 30  Ọ bụ Hezekaya sụchiri ebe mmiri Gaịhọn si asọdata,+ nke dị n’ebe mgbago, ma mee ka ọ sọrọ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’Obodo Devid.+ Ihe ọ bụla Hezekaya na-eme na-agakwa nke ọma. 31  Ma, mgbe ndị isi Babịlọn zitere ndị bụ́ ọnụ na-ekwuru ha ka ha jụọ ya banyere ihe àmà ahụ+ Chineke gosiri ya n’obodo ya,+ ezi Chineke hapụrụ ya ka o mee ihe ọ chọrọ ime iji mara ihe ọ ga-eme+ nakwa iji mara ihe niile dị ya n’obi.+ 32  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Hezekaya na otú o si gosi na ya hụrụ Chineke n’anya+ n’akwụkwọ e dere ọhụụ Aịzaya onye amụma,+ bụ́ nwa Emọz, nakwa n’akwụkwọ e dere gbasara ndị eze Juda na Izrel.+ 33  Hezekaya mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya n’ebe e si agbago ebe a na-eli ụmụ Devid.+ Ndị Juda niile na ndị bi na Jeruselem kwanyekwaara ya ùgwù mgbe ọ nwụrụ. Manase nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ bụ okwu Hibru nke pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”
Ma ọ bụ “ube.”
Na Hibru, “gwa ha okwu ruru ha n’obi.”
Na Hibru, “Ogwe aka nke nọnyeere ya bụ anụ ahụ́.”
Na Hibru, “ebe ndị dị elu ya na ebe ịchụàjà ya.”
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”