Samuel nke Abụọ 5:1-25

  • E chiri Devid eze Izrel niile (1-5)

  • Devid weghaara Jeruselem (6-16)

    • Zayọn bụ Obodo Devid (7)

  • Devid meriri ndị Filistia (17-25)

5  Ka oge na-aga, ebo niile n’Izrel bịakwutere Devid na Hebrọn,+ sị ya: “Anyị na gị bụ otu ọbara.*+  N’oge gara aga, mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel aga agha.+ Jehova gwakwara gị, sị: ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ. Ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú Izrel.’”+  Ndị okenye niile n’Izrel wee bịakwute Eze Devid na Hebrọn. Ha na ya anọrọ ebe ahụ gbaa ndụ+ n’ihu Jehova. Ha tekwara Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel.+  Devid dị afọ iri atọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ iri anọ.+  Ọ nọ na Hebrọn chịa Juda afọ asaa na ọnwa isii. Ọ nọkwa na Jeruselem+ chịa Izrel na Juda afọ iri atọ na atọ.  Eze Devid na ndị agha ya wee gaa Jeruselem ịlụso ndị Jebus+ bi ebe ahụ agha. Ha mara ya aka, sị ya: “I mekataghị bata ebe a. Ọ bụ ndị ìsì na ndị ngwọrọ ga-achụghachi gị azụ.” Ha nọ na-asị n’obi ha: ‘Devid emekataghị bata ebe a.’+  Ma, Devid weghaara Zayọn, bụ́ obodo a rụsiri ike, nke a na-akpọzi Obodo Devid ugbu a.+  Devid wee kwuo n’ụbọchị ahụ, sị: “Ndị ga-alụso ndị Jebus agha kwesịrị isi n’ọwa mmiri gaa gbuo ma ‘ndị ngwọrọ ma ndị ìsì,’ ndị Devid* kpọrọ asị.” Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Ndị ìsì na ndị ngwọrọ emekataghị bata n’ụlọ a.”  Devid wee biri n’ebe a rụsiri ike. A kpọkwara* ebe ahụ Obodo Devid. Devid bidokwara ịrụ mgbidi na ihe ndị ọzọ, ma na Milo*+ ma n’ebe ndị ọzọ.+ 10  Devid nọkwa na-esikwu ike.+ Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha nọnyekwaara ya.+ 11  Haịram+ eze Taya ziri ndị ozi ka ha gakwuru Devid, ka ha hazie otú a ga-esi bute osisi sida,+ o zigakwara ndị ọkwá nkà na ndị na-eji nkume arụ mgbidi ka ha rụọrọ Devid ụlọ.*+ 12  Ihe a mere ka o doo Devid anya na Jehova emeela ka ọchịchị ya sie ezigbo ike n’Izrel+ nakwa na o jirila maka ndị ya bụ́ Izrel+ mee ka alaeze ya na-aga nke ọma.+ 13  Mgbe Devid si Hebrọn lọta Jeruselem, o nwetakwuru ndị iko,+ lụkwuokwa ụmụ nwaanyị. Ọ mụtakwukwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 14  Aha ndị a mụụrụ ya na Jeruselem bụ: Shamua, Shobab, Netan,+ Solomọn,+ 15  Ịbha, Elaịshua, Nifeg, Jefaya, 16  Elishama, Elayada, na Elifelet. 17  Mgbe ndị Filistia nụrụ na e teela Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel,+ ha niile pụtara na-achọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara nọrọ n’ebe a rụsiri ike.+ 18  Ma, ndị Filistia bịara na-agagharị na Ndagwurugwu Refeyim.+ 19  Devid wee jụọ Jehova,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa lụso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova asị ya: “Gawa, n’ihi na m ga-enyeferịrị ndị Filistia n’aka gị.”+ 20  Devid wee gaa Bel-perezim, gbuo ha ebe ahụ. Mgbe o gbuchara ha, ya asị: “Jehova akwadala ndị iro m+ n’ihu m ka ebe mmiri kwadara mgbidi.” Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Bel-perezim.*+ 21  Ndị Filistia hapụrụ arụsị ha niile ebe ahụ, Devid na ndị agha ya eburu ha gaa bibie. 22  Mgbe e mechara, ndị Filistia bịakwara ọzọ na-agagharị na Ndagwurugwu Refeyim.+ 23  Devid wee jụọ Jehova ma ọ̀ bụ ya gakwuru ha, ma, ọ sịrị ya: “Agakwurula ha ihu na ihu. Kama, gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo n’azụ ha, lụsokwa ha agha n’ihu ebe ahụ osisi beka juru. 24  Ị nụ ihe na-ada ka ụda ụkwụ ndị mmadụ n’elu osisi beka ndị ahụ, gaa lụso ha agha ozugbo, n’ihi na ọ pụtara na Jehova eburularị gị ụzọ pụta igbu ndị agha ndị Filistia.” 25  Devid mere nnọọ ihe Jehova gwara ya mee. O gbukwara ndị Filistia+ malite na Giba+ ruo Giza.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi Devid.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ kpọkwara.”
Ọ bụ okwu Hibru nke pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”
Ma ọ bụ “obí eze.”
Bel-perezim pụtara “Onyeisi Ndị Na-akwada Ihe.”