Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná Ntị

Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná Ntị

Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná Ntị

OLEE ihe na-agbata gị n’uche mgbe ị nụrụ okwu ahụ bụ́ “ịdọ aka ná ntị”? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ịdọ aka ná ntị dị ka “omume nke ime ka ndị mmadụ na-erube isi n’iwu ma ọ bụ n’ụkpụrụ omume, na ịta ha ahụhụ mgbe ha na-erubeghị isi na ha.” Ọ bụ ezie na nke a abụghị nanị nkọwa e nwere, ọtụtụ ndị taa nwere echiche ndị na-ezighị ezi yiri nke ahụ banyere ihe ọ bụla yiri ịdọ aka ná ntị.

Otú ọ dị, Bible nwere ụzọ ọzọ o si akọwa ịdọ aka ná ntị. “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova,” ka Eze Solomọn maara ihe dere. (Ilu 3:11) Okwu ndị a na-ezo aka, ọ bụghị n’ịdọ aka ná ntị n’ozuzu ya, kama “n’ịdọ aka ná ntị nke Jehova,” ya bụ, n’ịdọ aka ná ntị dabeere n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke. Ọ bụ nanị ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta ihe dị mma n’ụzọ ime mmụọ ma baa uru—ọbụna bụrụ ihe a na-achọsi ike. N’ụzọ dị iche, ịdọ aka ná ntị nke dabeere n’echiche ụmụ mmadụ bụ́ nke na-emegide ụkpụrụ dị elu nke Jehova na-abụkarị mkparị na ihe na-akpasu iwe. Nke a bụ ihe mere ọtụtụ ndị ji ele ịdọ aka ná ntị anya ọjọọ.

N’ihi gịnị ka e ji agba anyị ume ịnakwere ịdọ aka ná ntị Jehova? N’ime Akwụkwọ Nsọ, a na-akọwa ịdọ aka ná ntị Chineke dị ka ngosipụta nke ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ o kere eke nọ. N’ihi ya, Solomọn gara n’ihu ikwu, sị: “Onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.”—Ilu 3:12.

Ịdọ Aka ná Ntị Ka Ọ Bụ Ntaramahụhụ—Ole Nke?

Ịdọ aka ná ntị dị ka e si kọwaa ya n’ime Bible, nwere ọtụtụ akụkụ—nduzi, ntụziaka, ọzụzụ, ịba mba, mgbazi, na ọbụna ntaramahụhụ. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ọ bụla, ọ bụ ịhụnanya na-akpali ịdọ aka ná ntị Jehova, nzube ya na-abụkwa iji mee ka onye a na-enye ya rite uru. Ịdọ aka ná ntị Jehova nke na-agbazi agbazi abụghị nanị n’ebumnobi nke inye ntaramahụhụ.

N’aka nke ọzọ, ọ bụghị mgbe nile ka ntaramahụhụ Chineke na-enye na-abụ iji gbazie ma ọ bụ zie onye a na-enye ya ihe. Dị ka ihe atụ, malite n’ụbọchị ahụ Adam na Iv mehiere, ha malitere ịta ahụhụ maka nnupụisi ha. Jehova chụpụrụ ha site n’ogige Iden ahụ bụ́ paradaịs, ha malitekwara inwe mmetụta nke ezughị okè, ọrịa na nká. Mgbe ọtụtụ narị afọ nke ndụ ihe isi ike gasịrị, ha lara n’iyi ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a nile bụ n’ezie ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke ma ha abụghị ịdọ aka ná ntị na-agbazi agbazi. N’ihi ịkpachara anya nupụ isi, n’enweghịkwa nchegharị, Adam na Iv enweghị mmekwata.

Akụkọ ndị ọzọ banyere ntaramahụhụ Jehova nyere gụnyere Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, mbibi nke Sọdọm na Gọmọra, nakwa mbibi e bibiri ndị agha Ijipt n’Oké Osimiri Uhie. Ihe omume ndị a nke Jehova abụghị iji duzie ndị o metụtara, zie ha ihe, ma ọ bụ nye ha ọzụzụ. Banyere ụdị ntaramahụhụ a sitere n’aka Chineke, Pita onyeozi dere, sị: “Ọ laghịkwa azụ n’inye ụwa oge ochie ahụhụ, kama o chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ mgbe o wetara iju mmiri n’elu ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke; sitekwa n’ime ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, ọ mara ha ikpe, na-esetịpụrụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ihe atụ nke ihe ndị gaje ịbịa.”—2 Pita 2:5, 6.

N’echiche dị aṅaa ka ntaramahụhụ ndị a “na-esetịpụrụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ihe atụ nke ihe ndị gaje ịbịa”? N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Tesalonaịka, ọ kpọtụrụ uche n’oge anyị dị ka mgbe Chineke ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst weta “ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” Pọl na-agbakwụnye, sị: “Ndị a kpọmkwem ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:8, 9) N’ụzọ doro anya, e nyeghị ntaramahụhụ dị otú ahụ iji zie ndị e nyere ya ihe ma ọ bụ iji nụchaa ha. Otú ọ di, mgbe Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha nara ịdọ aka ná ntị ya, ọ dịghị ekwu banyere ntaramahụhụ a na-enye ndị mmehie na-enweghị nchegharị.

Ọ dị ịrịba ama na Bible adịghị akọwa Jehova n’ụzọ bụ́ isi dị ka onye na-ata mmadụ ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ na-akọwakarị ya dị ka onye ozizi na-ahụ n’anya na onye nkụzi nwere ndidi. (Job 36:22; Abụ Ọma 71:17; Aịsaịa 54:13) Ee, ịdọ aka ná ntị Chineke nke e nyere n’ihi mgbazi na ịhụnanya na ndidi na-agakarị ụkwụ na ụkwụ. Site n’ịghọta nzube nke ịdọ aka ná ntị, Ndị Kraịst na-anọ n’ọnọdụ ka mma iji àgwà kwesịrị ekwesị na-anakwere ma na-enye ịdọ aka ná ntị.

Ịdọ Aka ná Ntị nke Ndị Nne na Nna Na-ahụ n’Anya

N’ime ezinụlọ na n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ dị mkpa ka mmadụ nile ghọta nzube nke ịdọ aka ná ntị. Nke a bụ eziokwu karịsịa nye ndị nọ n’ọnọdụ ịbụisi, dị ka ndị nne na nna. Ilu 13:24 na-ekwu, sị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.”

Olee otú ndị mụrụ ụmụ kwesịrị isi na-adọ aka ná ntị? Bible na-akọwa, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) E nyeghachiri ndụmọdụ a n’okwu ndị a na-esonụ: “Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị ghọtara nzube nke ịdọ aka ná ntị agaghị eji obi ọjọọ na-eme ihe. A pụrụ iji ụkpụrụ ahụ dị na 2 Timoti 2:24 mee ihe n’ihe banyere otú ndị nne na nna kwesịrị isi na adọ aka ná ntị. Pọl dere, sị: “Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, ruo eru izi ihe.” Oké iwe a na-achịkwaghị achịkwa, iti mkpu, na okwu mkparị ma ọ bụ ndị na-eweda n’ala abụtụghị ịdọ aka ná ntị ịhụnanya, ha enweghịkwa ọnọdụ ọ bụla ná ndụ Onye Kraịst.—Ndị Efesọs 4:31; Ndị Kọlọsi 3:8.

Mgbazi ndị nne na nna na-agụnye ihe karịrị nanị ahụhụ e nyere ngwa ngwa na n’ụzọ siri ike. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụaka chọrọ ndụmọdụ ọtụtụ ugboro tupu ha agbazie echiche ha. N’ihi ya, ndị nne na nna aghaghị ịdị na-ewepụta oge, na-enwe ndidi ma na-echebara ụzọ ha si adọ aka ná ntị echiche. Ha kwesịrị ịdị na-eburu n’uche na e kwesịrị ịzụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” Nke a bụ ọzụzụ na-ewe ọtụtụ afọ.

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ́ Ndị Kraịst Na-eji Ịdị Nwayọọ Enye Ịdọ Aka ná Ntị

Otu ụkpụrụ ahụ metụtakwara Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. Dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, ha na-agbalị iwusi ìgwè atụrụ ahụ ike site n’inye ntụziaka, nduzi, na ịba mba mgbe ọ dị mkpa. N’ime nke ahụ, ha na-eburu n’uche ihe bụ́ ezi nzube nke ịdọ aka ná ntị. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Ọ bụrụ na ha elegide anya nanị n’inye ntaramahụhụ, nanị ihe ha ga-eme bụ ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ ma hapụ ya. Ịdọ aka ná ntị Chineke gụnyere ihe karịrị nke ahụ. N’ịbụ ndị ịhụnanya kpaliri, ndị okenye na-anọgide na-enyere ndị ha nyere ndụmọdụ aka. N’ihi na ha nwere nchegbu n’ezie, mgbe mgbe, ha na-ahazi ọtụtụ nnọkọ iji nye agbamume na ọzụzụ.

Dị ka ndụmọdụ dị na 2 Timoti 2:25, 26 si kwuo, ọbụna mgbe ha na-emeso ndị na-adịghị anakwerekarị ịdọ aka ná ntị ihe, ndị okenye kwesịrị ịdị na-eji “ịdị nwayọọ” na-ezi ihe. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ kwuziri ihe bụ́ nzube nke ịdọ aka ná ntị: “Ma eleghị anya Chineke pụrụ inye ha nchegharị na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu, anya ewee doo ha pụọ n’ọnyà nke Ekwensu.”

Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ịchụpụ onye mmehie nke na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ. (1 Timoti 1:18-20) A ka kwesịrị ile ọbụna nzọụkwụ siri ike dị otú ahụ anya dị ka ịdọ aka ná ntị, ọ bụghị nanị ntaramahụhụ. Site n’oge ruo n’oge, ndị okenye na-agbalị ileta ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-anọgideghị na-eme omume ọjọọ. N’oge nleta ndị ahụ, ndị okenye na-eme ihe kwekọrọ n’ihe bụ́ n’ezie nzube nke ịdọ aka ná ntị site n’ikwupụta nzọụkwụ ndị a chọrọ ka mmadụ were iji laghachi n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

Jehova Bụ Onyeikpe Zuru Okè

Ndị nne na nna, Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị ọzọ nwere ikike Akwụkwọ Nsọ kwadoro inye ịdọ aka ná ntị kwesịrị iwere ibu ọrụ ahụ dị ka ihe dị mkpa. Ha agaghị anwa ikpe ndị ọzọ ikpe dị ka ndị na-agaghị ekwe mmekwata ma ọlị. N’ihi ya, ịdọ aka ná ntị ha ekwesịghị ịbụ nke mmegwara ma ọ bụ inye ntaramahụhụ obi ọjọọ.

N’eziokwu, Bible na-ezo aka n’ebe Jehova nọ dị ka onye ga-enye ntaramahụhụ ikpeazụ na nke siri ike. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na “ọ bụ ihe na-atụ egwu ịdaba n’aka Chineke ahụ dị ndụ.” (Ndị Hibru 10:31) Ma mmadụ ọ bụla ekwesịghị ịnwa anwa jiri onwe ya tụnyere Jehova n’akụkụ a ma ọ bụ n’akụkụ ọzọ. Ọ dịghịkwa onye kwesịrị inwe ihe mere ọ ga-eji chee na ọ bụ ihe na-atụ ụjọ ịdaba n’aka nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ n’aka otu okenye n’ọgbakọ.

Jehova nwere ike inwe nguzozi zuru okè mgbe ọ na-enye ntaramahụhụ. Ụmụ mmadụ adịghị otú ahụ. Chineke pụrụ inyocha obi ma kpebie mgbe mmadụ na-enwekwaghị mmekwata ma si otú a na-eche ntaramahụhụ ikpeazụ ihu. N’aka nke ọzọ, ụmụ mmadụ apụghị ikpe ikpe dị otú ahụ. N’ihi ya, mgbe ọ dị mkpa inye ịdọ aka ná ntị, ndị nwere ikike ịbụisi kwesịrị mgbe nile ime ya ná nzube nke inye mgbazi.

Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị Jehova

Ịdọ aka ná ntị Jehova dị anyị nile mkpa. (Ilu 8:33) N’ezie, anyị kwesịrị ịdị na-atụ anya ịdọ aka ná ntị nke dabeere n’Okwu Chineke. Ka anyị na-amụ Okwu Chineke, anyị pụrụ ịnakwere ịdọ aka ná ntị Jehova na-enye n’onwe ya site n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, anyị ga-enweta ịdọ aka ná ntị site n’aka Ndị Kraịst ibe anyị. Ịghọta mmụọ e ji nye ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ ga-enyere anyị aka iji ezi obi nakwere ya.

Pọl onyeozi kwetara, sị: “N’eziokwu, ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla na-eyi mgbe ahụ ka ọ bụ ihe ọṅụ, kama ihe mwute.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ma n’ikpeazụ, nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ịdọ aka ná ntị Jehova bụ ngosipụta nke ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe anyị nọ. Mgbe ọ bụla anyị na-anata ma ọ bụ na-enye ịdọ aka ná ntị, ka anyị buru n’obi mgbe nile nzube nke ịdọ aka ná ntị Chineke ma gbasoo ndụmọdụ Bible a nke amamihe dị na ya: “Jide ịdọ aka ná ntị aka; ahala ya aka: chebe ya; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị.”—Ilu 4:13.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ndị mmehie na-enweghị nchegharị na-enweta ikpe ntaramahụhụ nke Chineke, ọ bụghị nke ịdọ aka ná ntị na-agbazi agbazi

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

N’ịbụ ndị ịhụnanya kpaliri, ndị okenye na-etinye oge ha n’ime nnyocha na inyere ndị na-agahie agahie aka

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ndị mụrụ ụmụ na-eji ndidi na ịhụnanya “na-azụlite [ụmụ ha] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova”