Job 36:1-33

  • Elaịhu kwuru otú Chineke si dị ukwuu (1-33)

    • Ihe na-agaziri ndị na-erube isi, ma a na-ajụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke (11-13)

    • “È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi?” (22)

    • Job kwesịrị ịja Chineke mma (24)

    • “Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata” (26)

    • Chineke na-eduzi mmiri ozuzo na àmụ̀mà (27-33)

36  Elaịhu kwukwara, sị:   “Nwetụkwuoro m ndidi ka m kọwaara gị ihe m na-ekwu,N’ihi na m ka nwere ihe m ga-ekwu n’aha Chineke.   M ga-ekwu ihe m ma otú ga-edo anya,M ga-akpọkwa Onye kere m onye ezi omume.+   N’eziokwu, ihe m na-ekwu abụghị ụgha. Onye ma ihe niile+ nọ gị n’ihu n’ebe a.   N’eziokwu, Chineke dị ike,+ ọ naghịkwa ajụ onye ọ bụla. Ọ na-aghọta ihe nke ọma.   Ọ gaghị ahapụ ndị ajọ omume ndụ.+ Ma ọ ga-ekpere ndị na-ata ahụhụ ikpe ziri ezi.+   Ọ naghị ewepụ anya ya n’ebe ndị ezi omume nọ.+ Ọ na-eme ka ha nọrọ n’ocheeze,*+ a na-ebulikwa ha elu ruo mgbe ebighị ebi.   Ma ọ bụrụ na e kee ha agbụ ígwè, Jirikwa ụdọ e ji ata mmadụ ahụhụ jide ha,   Ọ ga-eme ka ha mata ihe ha mere,Bụ́ mmehie ndị ha mere maka na ha dị mpako. 10  Ọ na-adọ ha aka ná ntị,Na-agwakwa ha ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ.+ 11  Ọ bụrụ na ha erube isi ma fee ya,Ihe ga-agaziri ha ná ndụ ha niile,Ndụ ha ga-atọkwa ha ụtọ.+ 12  Ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi, a ga-eji mma agha* gbuo ha,+Ha ga-anwụkwa n’amaghị ihe. 13  Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ebu iwe n’obi. Ọ bụrụgodị na o kee ha agbụ, ha anaghị arịọ ka e nyere ha aka. 14  Ha na ụmụ nwoke bụ́ ndị akwụna* na-anọ,*+Ha* na-anwụkwa mgbe ha ka bụ okorobịa.+ 15  Ma Chineke* na-anapụta ndị na-ata ahụhụ n’ahụhụ ha. Ọ na-emeghe ntị ha n’oge a na-emegbu ha. 16  Ọ na-anapụta gị n’ahụhụ+Ka ị nọrọ n’ebe sara mbara, n’ebe a na-enweghị ihe na-akpagide gị,+N’ebe ezigbo nri nke dị na tebụl gị ga-eme ka obi gị jụrụ.+ 17  Mgbe ahụ, ikpe a mara ndị ajọ omume ga-eju gị afọ,+Mgbe e kpere ha ikpe ziri ezi, meekwa ha ihe e kpebiri. 18  Ma kpachara anya ka iwe ghara ime ka i mewe ihe ọjọọ,*+Anakwala aka azụ, ka ọ ghara idufu gị. 19  Ákwá ị na-ebe ka e nyere gị akaMa ọ bụ mbọ ị na-agbasi ike ọ̀ ga-eme ka ị kwụsị ịta ahụhụ?+ 20  Atụla anya ka abalị ruo,Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-apụ n’ebe ha nọ. 21  Lezie anya ka ị ghara imewe ihe ọjọọ,N’ihi na ọ bụ ya ka ị na-ahọrọ kama ịta ahụhụ.+ 22  Lee, a na-eto Chineke n’ihi ike ya. È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi? 23  Ònye gwatụrụla ya ihe ọ ga-eme*+Ma ọ bụ sị ya, ‘Ihe i mere adịghị mma’?+ 24  Cheta ka ị jaa ọrụ ya mma,+Bụ́ nke ndị mmadụ jirila bụọ abụ.+ 25  Mmadụ niile ahụla ya. Mmadụ efu nọ n’ebe dị anya na-ele ya. 26  N’eziokwu, Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata.+ E nweghị ike ịghọta* afọ ndụ ya.+ 27  Ọ na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala.+ Ha na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ. 28  Ha na-esizi n’ígwé ojii zoo.+ Ha na-ezo, onye ọ bụla enweta mmiri. 29  È nwere onye ga-aghọtali otú e si gbasaa urukpuruMa ọ bụ ghọta ụda égbè eluigwe nke si n’ebe o bi?*+ 30  Lee otú o si agbasa àmụ̀mà* ya+ n’elu ya,Na-ekpuchikwa ogbu* oké osimiri. 31  Ọ na-eji ihe ndị a eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ.* Ọ na-enye ha ihe oriri n’ụba.+ 32  Ọ na-eji aka ya ekpuchi àmụ̀mà,Ọ na-eduzikwa ya ka ọ gaa n’ebe ọ na-aga.+ 33  Égbè eluigwe ya na-akọ banyere ya,Anụ ụlọ na-ekwukwa onye* na-abịa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Ọ na-echi ndị mmadụ eze.”
Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”
Ma ọ bụ “Ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
O nwere ike ịbụ, “na-anwụkọ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “ọ.”
Na Hibru, “ka ị kụọ aka,” ya bụ, ụdị ịkụ aka na-egosi mkparị.
O nwere ike ịbụ, “katọtụrụla ya; kpọtụrụla ya ka ọ zaa ajụjụ.”
Ma ọ bụ “ịchọpụta.”
Ma ọ bụ “n’ụlọikwuu ya.”
Na Hibru, “ìhè.”
Ma ọ bụ “ala ala.”
O nwere ike ịbụ, “na-eji ihe ndị a ekpechitere ndị mmadụ ọnụ.”
O nwere ike ịbụ, “ihe.”