Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntachi Obi N’ọnwụnwa Na-ewetara Jehova Otuto

Ntachi Obi N’ọnwụnwa Na-ewetara Jehova Otuto

 Ntachi Obi N’ọnwụnwa Na-ewetara Jehova Otuto

“Ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ihe ọma ma na-ata ahụhụ, unu atachie obi, nke a bụ ihe dị mma n’ebe Chineke nọ.”—1 PITA 2:20.

1. Ebe ọ bụ na ezi Ndị Kraịst na-enwe nchegbu banyere ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye ha, olee ajụjụ a na-aghaghị ịtụle?

NDỊ KRAỊST raara onwe ha nye Jehova ma na-achọ ime uche ya. Iji bie ndụ kwekọrọ ná nraranye ha, ha na-eme ike ha nile ịgbaso nzọụkwụ nke Onye Nlereanya ha, bụ́ Jizọs Kraịst, nakwa ịgbara eziokwu ahụ àmà. (Matiu 16:24; Jọn 18:37; 1 Pita 2:21) Otú ọ dị, Jizọs na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nyere ndụ ha ma nwụọ n’ihi okwukwe ha. Nke a ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst nile pụrụ ịtụ anya ịnwụ n’ihi okwukwe ha?

2. Olee otú Ndị Kraịst si ele ọnwụnwa na ahụhụ anya?

2 Dị ka Ndị Kraịst, a na-agba anyị ume ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ bụchaghị ịnwụ n’ihi okwukwe anyị. (2 Timoti 4:7; Mkpughe 2:10) Nke a pụtara na n’agbanyeghị na anyị dị njikere ịta ahụhụ—na, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ịnwụ—n’ihi okwukwe anyị, ọ dịghị agụ anyị agụụ. Ịta ahụhụ adịghị atọ anyị ụtọ, anyị adịghịkwa enwe obi ụtọ inwe ihe mgbu ma ọ bụ ịbụ ndị e wedara n’ala. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na a ga-atụ anya ọnwụnwa na mkpagbu, ọ dị anyị mkpa iji nlezianya tụlee otú anyị pụrụ isi meghachi omume mgbe ụdị ihe ahụ bịakwasịrị anyị.

Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Ule

3. Olee ihe atụ ndị dị na Bible nke ndị nagidere mkpagbu bụ́ ndị ị pụrụ ịkọ banyere ha? (Lee igbe bụ́ “Otú Ha Si Mee Ihe Banyere Mkpagbu,” na peeji na-esonụ.)

3 N’ime Bible anyị na-achọta ọtụtụ ihe ndekọ nke otú ndị ohu Chineke n’oge ndị gara aga si meghachi omume mgbe ha zutere ọnọdụ ndị na-eyi ndụ egwu. Ụzọ dị iche iche ha si meghachi omume bụ ihe nduzi nye Ndị Kraịst taa ma ọ bụrụ na ha echee ihe ịma aka ndị yiri nke ahụ ihu mgbe ọ bụla. Tụlee ihe ndekọ ndị dị n’igbe bụ́ “Otú Ha Si Mee Ihe Banyere Mkpagbu,” ma lee ihe ị pụrụ ịmụta site na ha.

4. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere otú Jizọs na ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi si meghachi omume mgbe ha zutere ọnwụnwa?

4 Ọ bụ ezie na Jizọs na ndị ohu Chineke ndị ọzọ meghachiri omume n’ụzọ dịgasị iche iche mgbe ha zutere mkpagbu, dabere n’ọnọdụ ndị e nwere, o doro anya na ha etinyeghị ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ụzọ na-enweghị isi. Mgbe ha chọtara onwe ha n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ, ha na-enwe obi ike ma dị akọ. (Matiu 10:16, 23) Nzube ha bụ ime ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu na ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova. Mmeghachi omume ha n’ọnọdụ dịgasị iche iche bụ ihe nlereanya nye Ndị Kraịst taa bụ́ ndị na-eche ọnwụnwa na mkpagbu ihu.

5. Mkpagbu dị aṅaa bilitere na Malawi n’afọ ndị 1960, oleekwa otú Ndịàmà nọ ebe ahụ si meghachi omume?

5 N’oge a, ndị Jehova achọtawo onwe ha n’ọnọdụ oké ihe isi ike na nke ịbụ ndị a napụrụ ihe ha n’ihi agha, mmachibido iwu, ma ọ bụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị 1960, a kpagburu Ndịàmà Jehova nọ na Malawi n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. E bibiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ebe obibi ha, ebe ndị ha si enweta ihe oriri, na ọrụ achụmnta ego ha—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ha nwere. E tiri ha ihe ma mekpọọ ha ọnụ. Olee otú ụmụnna ndị ahụ si meghachi omume? Ọtụtụ puku gbapụrụ n’obodo ha. Ọtụtụ n’ime ha zoro n’ime ọhịa, ebe ndị ọzọ gbagara nwa oge ná mba ha na ha gbara agbata obi bụ́ Mozambique. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ, ndị ọzọ họọrọ isi n’ebe ndị ahụ dị ize ndụ gbapụ, nke yiri nnọọ ihe ezi uche  dị na ya ime n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. N’ime otú ahụ, ụmụnna ndị ahụ gbasoro ihe nlereanya nke Jizọs na Pọl setịpụrụ.

6. Gịnị ka Ndịàmà nọ na Malawi na-elegharaghị anya n’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwetara?

6 Ọ bụ ezie na ụmụnna ndị Malawi gbapụrụ ma ọ bụ zopụ, ha chọsiri nduzi ọchịchị Chineke ike ma gbasoo ya, ha nọgidekwara na-arụ ọrụ Ndị Kraịst ha na nzuzo ruo n’ókè ha nwere ike. Gịnị si na ya pụta? Ha ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze dị 18,519 tupu mmachibido iwu ahụ na 1967. Ọ bụ ezie na ha ka nọ ná mmachibido iwu, ọtụtụ ndị agbagawokwa Mozambique, na 1972 ha nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa dị 23,398. Ha nyere ihe karịrị nkezi awa 16 kwa ọnwa. Obi abụọ adịghị ya na omume ha wetaara Jehova otuto, Jehova gọzikwara ụmụnna ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ndị ahụ sibigara ike ókè. *

7, 8. Olee ihe ndị mere ụfọdụ ndị ji ahọrọ ịghara ịgbapụ, ọ bụ ezie na mmegide nọ na-akpatara ha nsogbu?

 7 N’aka nke ọzọ, ná mba ebe ndị mmegide na-akpata nsogbu, ụfọdụ ụmụnna pụrụ ikpebi ịghara ịgbapụ, ọ bụ ezie na ha nwere ike ime otú ahụ. Ịgbapụ pụrụ ịgwọta nsogbu ụfọdụ ma ikekwe, ọ ga-eweta ihe ịma aka ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, hà ga-enwe ike iso òtù ụmụnna Ndị Kraịst na-akpakọrịta ma ghara ịbụ ndị e kewapụrụ ekewapụ n’ụzọ ime mmụọ? Hà ga-enwe ike ịnọgide na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ ka ha na-agbalị ịmaliteghachi ndụ n’isi n’ebe ọzọ, ikekwe ná mba ka baa ọgaranya ma ọ bụ nke na-enyekwu ohere maka inwe ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe?—1 Timoti 6:9.

8 Ndị ọzọ na-ahọrọ ịghara ịgbapụ n’ihi na ha na-echegbu onwe ha banyere ọdịmma ime mmụọ nke ụmụnna ha. Ha na-ahọrọ ịnọgide ma chee ọnọdụ ahụ ihu iji nwee ike ịnọgide na-eme nkwusa n’ókèala ha na ịbụ ihe agbamume nye ndị ha na ha na-efekọ ofufe. (Ndị Filipaị 1:14) Site n’ime nhọrọ dị otú ahụ, ọbụna ụfọdụ atụnyewo ụtụ n’ime ka e nwee mmeri n’okwu ikpe n’ala ha. *

9. Olee ihe ndị mmadụ na-aghaghị ịtụle mgbe ọ na-ekpebi ma ọ̀ ga-anọgide ka ọ ga-agbapụ n’ihi mkpagbu?

9 Ịnọgide ma ọ bụ ịgbapụ—nke ahụ n’ezie bụ mkpebi onwe onye. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ime mkpebi ndị dị otú ahụ nanị mgbe anyị kpesịrị ekpere maka nduzi Jehova. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke anyị họọrọ, anyị aghaghị iburu ihe a Pọl onyeozi kwuru n’uche: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:12) Dị ka anyị hụtara na mbụ, ihe Jehova na-achọ bụ ka ndị ohu ya nile nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’okpuru ọnọdụ ọ bụla ha zutere. Ụfọdụ ndị ohu ya na-eche ọnwụnwa na mkpagbu ihu taa; ebe ndị ọzọ pụrụ ime otú ahụ n’ọdịnihu. A ga-ele mmadụ nile ule n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ọ dịghịkwa onye kwesịrị iche na a ga-agụpụ ya. (Jọn 15:19, 20) Dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha  nye, anyị apụghị ịgbanahụ ihe iseokwu eluigwe na ala bụ́ nke gụnyere ido aha Jehova nsọ na igosi na o ruuru ya ịbụ ọkaaka.—Ezikiel 38:23; Matiu 6:9, 10.

“Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ”

10. Ụkpụrụ dị aṅaa dị mkpa ka Jizọs na ndịozi setịpụụrụ anyị n’ihe banyere ịnagide nrụgide na mmegide?

10 Ụkpụrụ ọzọ dị mkpa anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jizọs na ndịozi si meghachi omume mgbe ha nọ ná nrụgide bụ ịghara imegwara ndị ahụ na-emegide anyị. Ọ dịghị ebe anyị ga-achọta n’ime Bible bụ́ ebe na-enye echiche na Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya haziri onwe ha ịbụ òtù nnupụisi ma ọ bụ mee ihe ike iji lụso ndị na-emegide ha ọgụ. Kama nke ahụ, “ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ,” ka Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst n’ọdụ. “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’” Ọzọkwa, “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17-21; Abụ Ọma 37:1-4; Ilu 20:22.

11. Gịnị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere àgwà Ndị Kraịst n’ebe Ọchịchị dị?

11 Ndị Kraịst oge mbụ nakweere ndụmọdụ ahụ. N’akwụkwọ ya bụ́ The Early Church and the World, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Cecil J. Cadoux kọwara àgwà Ndị Kraịst nwere n’ebe Ọchịchị dị n’afọ 30-70 O.A. Ọ na-ede, sị: “Anyị enweghị ihe àmà doro anya na Ndị Kraịst nke oge a gbalịrị ime ihe ike iji guzogide mkpagbu. Ihe kachasịnụ ha na-eme n’akụkụ a bụ ịkatọsi ndị ọchịchị ike ma ọ bụ ime ka ike gwụ ha site n’ịgbalaga. Otú ọ dị, mmeghachi omume Ndị Kraịst nye mkpagbu na-abụkarị ọjụjụ a chịkwara achịkwa na nke siri ike ha na-ajụ irube isi n’iwu ọchịchị ndị ha lere anya na ha megidere nrubeisi ha nye Kraịst.”

12. N’ihi gịnị ka o ji akasị mma ịtachi obi n’ahụhụ karịa imegwara?

12 Àgwà dị otú ahụ nke yiri ka ọ bụ emeghị ihe ọ bụla ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya? Ndị na-emeghachi omume n’ụzọ dị otú ahụ hà agaghị abụ ndị dịịrị ndị kpebisiri ike ikpochapụ ha mfe nnweta? Ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya mmadụ ichebe onwe ya? Site n’otú mmadụ si ele ihe anya, nke ahụ pụrụ iyi ihe kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, dị ka ndị ohu Jehova, anyị nwere obi ike na ịgbaso nduzi Jehova n’ihe nile bụ ụzọ kachasị mma. Anyị na-eburu n’uche okwu Pita bụ́: “Ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ihe ọma ma na-ata ahụhụ, unu atachie obi, nke a bụ ihe dị mma n’ebe Chineke nọ.” (1 Pita 2:20) Anyị nwere obi ike na Jehova maara ọnọdụ ahụ nke ọma, ọ gaghịkwa ekwe ka ihe nọgide na-aga otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ànyị si aṅaa mara na nke ahụ bụ eziokwu? Jehova gwara ndị ya e ji eji na Babilọn, sị: ‘Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya m.’ (Zekaraịa 2:8) Ogologo oge ha aṅaa ka mmadụ ga-ekwe ka a na-emetụ nwa anya ya aka? Jehova ga-eme ka ha nwere onwe  ha n’oge kwesịrị ekwesị. Obi abụọ adịghị na nke ahụ.—2 Ndị Tesalonaịka 1:5-8.

13. N’ihi gịnị ka Jizọs ji nnọọ kwere ka ndị iro ya jide ya?

13 Banyere nke a, anyị pụrụ ilegara Jizọs anya dị ka onye nlereanya anyị. Mgbe o kwere ka ndị iro ya jide ya n’ogige Getsemeni, ọ bụghị n’ihi na ọ pụghị ichebe onwe ya. N’ezie, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ùnu chere na mụ apụghị ịrịọ Nna m ka o zitere m ugbu a ihe karịrị ìgwè ndị mmụọ ozi iri na abụọ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo na ọ ghaghị iwere ọnọdụ otú a?’ (Matiu 26:53, 54) Mmezu nke uche Jehova bụ ihe kachasị Jizọs mkpa, ọbụna ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-apụtara ya ịta ahụhụ. O nwere obi ike zuru ezu n’amụma Devid nke dị n’abụ ọma bụ́: “Ị gaghị ahapụrụ [Shiol, NW ] mkpụrụ obi m; ị gaghị enyekwa onye ebere gị ka ọ hụ mbibi.” (Abụ Ọma 16:10) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl onyeozi kwuru banyere Jizọs, sị: “N’ihi ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, na-eleda ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 12:2.

Ọṅụ nke Ido Aha Jehova Nsọ

14. Ọṅụ dị aṅaa kwagidere Jizọs n’oge nile ọ nọ n’ọnwụnwa?

14 Ọṅụ dị aṅaa kwagidere Jizọs mgbe ọ nọ n’ule kasị taa akpụ a pụrụ ichetụ n’echiche? N’ime ndị ohu Jehova nile, Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke ọ hụrụ n’anya, bụ n’ezie onye Setan kasị lekwasị anya. Ya mere, Jizọs ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-enye nzaghachi kasịnụ nye ụta Setan na-ata Jehova. (Ilu 27:11) Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ụdị ọṅụ na afọ ojuju Jizọs na-aghaghị inweworị mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ? Lee obi ụtọ ọ na-aghaghị inweworị ịghọta na ya arụzuwo ọrụ e nyere ya dị ka mmadụ zuru okè  n’igosi na o ruuru Jehova ịbụ ọkaaka na ido aha Ya nsọ! Tụkwasị na nke ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịnọdụ ala “n’aka nri nke ocheeze Chineke” bụ ihe ùgwù dị ebube na ihe kasị ewetara Jizọs ọṅụ.—Abụ Ọma 110:1, 2; 1 Timoti 6:15, 16.

15, 16. Mkpagbu obi ọjọọ dị aṅaa ka Ndịàmà nọ na Sachsenhausen tachiri obi na ya, gịnịkwa nyere ha ume ime otú ahụ?

15 Nye Ndị Kraịst, ọ bụkwa ihe ọṅụ iso kere òkè n’ido aha Jehova nsọ site n’ịtachi obi n’ọnwụnwa na mkpagbu, n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs. Otu ihe atụ bụ ahụmahụ nke Ndịàmà hụjuru anya n’ogige ịta ahụhụ e ji mmekpọ ọnụ mara nke Sachsenhausen ma lanarị njem ọnwụ na-agwụ ike ha mere ná ngwụsị Agha Ụwa nke Abụọ. N’oge ha na-eme njem ahụ, ọtụtụ puku ndị mkpọrọ nwụrụ n’ihi ọnọdụ ihu ígwé, ọrịa, ma ọ bụ agụụ ma ọ bụ bụrụ ndị ndị nche SS gburu n’akụkụ ụzọ. Ndịàmà 230 nile so mee njem ahụ lanarịrị site n’ịnọ onwe ha nso na inyerịtara onwe ha aka n’agbanyeghị na nke ahụ tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ.

16 Gịnị nyere Ndịàmà a ume ịtachi obi n’ụdị mkpagbu ahụ jọgburu onwe ya? Ozugbo ha ruru ebe na-adịzighị ize ndụ, ha kwupụtara ọṅụ ha na ekele ha nwere nye Jehova n’ihe odide nke isiokwu ya bụ “Nkwupụta nke ndịàmà Jehova 230 sitere ná mba isii, bụ́ ndị gbakọrọ n’ọhịa dị nso na Schwerin nke dị na Mecklenburg.” N’ime ya, ha dere sị: “Ogologo oge nke ule siri ike agafewo, ndị ahụ e chebeworo, ndị e sikwa n’oké ọkụ ahụ napụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, enweghị ọbụna ísì ọkụ ọ bụla n’ahụ́ ha. (Lee Daniel 3:27.) Kama nke ahụ, ha nwere ume na ike zuru ezu bụ́ nke sitere n’aka Jehova, ha na-echerekwa iwu Eze ahụ ga-enye iji mee ka ihe ndị metụtara Ọchịchị Chineke gaa n’ihu.” *

17. Ule ndị dị aṅaa ka ndị Chineke na-eche ihu ugbu a?

17 Dị ka mmadụ 230 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, a pụrụ ile okwukwe anyị ule, ọ bụ ezie na anyị “anọgidebeghị na ya ruo n’ọbara.” (Ndị Hibru 12:4) Ma ule pụrụ ịbịa n’ọtụtụ ụzọ. Ọ pụrụ ịbụ ịkwa emo site n’aka ụmụ klas ibe anyị, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ nrụgide nke ndị ọgbọ iji mee ka anyị tinye aka n’omume rụrụ arụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ọzọkwa, mkpebi nke izere ọbara, ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị, ma ọ bụ ịzụlite ụmụ anyị n’eziokwu n’ime ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe pụrụ mgbe ụfọdụ iweta nrụgide na ule ndị siri ike.—Ọrụ 15:29; 1 Ndị Kọrint 7:39; Ndị Efesọs 6:4; 1 Pita 3:1, 2.

18. Olee ihe mmesi obi ike anyị nwere na anyị pụrụ ịtachi obi ọbụna n’ọnwụnwa kasị sie ike?

18 Otú ọ dị, n’agbanyeghị ụdị ule na-abịakwasị anyị, anyị maara na anyị na-ata ahụhụ n’ihi na anyị tinyere Jehova na Alaeze ya n’ọnọdụ mbụ, anyị na-ewerekwa ya dị ka ihe ùgwù na ihe na-enye ọṅụ ime otú ahụ. Anyị na-enweta obi ike n’okwu Pita na-emesi obi ike bụ́: “Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, obi dị unu ụtọ, n’ihi na mmụọ nke ebube, ọbụna mmụọ nke Chineke, na-adịkwasị unu.” (1 Pita 4:14) Site n’ike nke mmụọ Jehova, anyị nwere ume ịtachi obi ọbụna n’ọnwụnwa kasị sie ike, iji wetara ya otuto.—2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Efesọs 3:16; Ndị Filipaị 4:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ihe ndị ahụ mere n’afọ ndị 1960 bụ nanị mmalite nke ọtụtụ mkpagbu obi ọjọọ na-eyi ndụ egwu ndị Ndịàmà nọ na Malawi tachiri obi na ha ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ atọ. Maka ihe ndekọ zuru ezu, lee 1999 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 171-212.

^ par. 8 Lee isiokwu bụ́ “Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Ezi Ofufe ‘n’Ala Ararat,’” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 2003, peeji nke 11-14.

^ par. 16 Maka ndepụta zuru ezu nke nkwupụta ahụ, lee 1974 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 208-209. A pụrụ ịchọta ahụmahụ nke onye lanarịrị njem ahụ ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1, 1998, peeji nke 25-29.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú Ndị Kraịst si ele ahụhụ na mkpagbu anya?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ụzọ Jizọs na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi si meghachi omume mgbe ha zutere ọnwụnwa?

• N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ịghara imegwara mgbe a na-akpagbu anyị?

• Ọṅụ dị aṅaa kwagidere Jizọs n’ọnwụnwa ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 15]

Otú Ha Si Mee Ihe Banyere Mkpagbu

• Tupu ndị agha Herọd erute Betlehem igbu ụmụaka nwoke nile a mụrụ ọhụrụ site ná ndị dị afọ abụọ gbadawa, Josef na Meri kpọọrọ nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs gbaga Ijipt site ná nduzi nke mmụọ ozi.—Matiu 2:13-16.

• Ọtụtụ mgbe n’oge ozi Jizọs, ndị iro ya chọrọ igbu ya n’ihi àmà siri ike ọ na-agba. Jizọs gbanahụrụ ha na nke ọ bụla.—Matiu 21:45, 46; Luk 4:28-30; Jọn 8:57-59.

• Mgbe ndị agha bịara n’ogige Getsemeni ijide Jizọs, ọ gwara ha na ọ bụ ya ka ha na-achọ, na-agwa ha ugboro abụọ, sị: “Ọ bụ m.” Ọbụna ọ kwụsịrị ndị na-eso ụzọ ya igbochi ìgwè mmadụ ahụ na-eme ihe ike ijide ya ma kwe ka ha kpụrụ ya.—Jọn 18:3-12.

• Na Jeruselem, e jidere Pita na ndị ọzọ, pịa ha ihe ma nye ha iwu ka ha ghara ikwu banyere Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe a tọhapụrụ ha, ha ‘lara, kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.’—Ọrụ 5:40-42.

• Mgbe Sọl bụ́ onye mesịrị ghọọ Pọl onyeozi, matara banyere izu ndị Juu nọ na Damaskọs gbara igbu ya, ụmụnna tinyere ya na nkata n’abalị ma si ná mgbidi butuo ya, ọ gbalagakwara.—Ọrụ 9:22-25.

• Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pọl họọrọ ka Siza kpegharịa ikpe ya, ọ bụ ezie na ma Gọvanọ Festọs ma Eze Agripa ahụghị ‘ihe ọ bụla kwesịrị ọnwụ ma ọ bụ agbụ’ o mere.—Ọrụ 25:10-12, 24-27; 26:30-32.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ọ bụ ezie na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ manyere ha ịgbapụ, ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Malawi ji ọṅụ na-eje ozi Alaeze ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ọṅụ nke ido aha Jehova nsọ kwagidere ndị a kwesịrị ntụkwasị obi n’oge njem ọnwụ ahụ na n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Njem ọnwụ: KZ-Gedenkstätte Dachau, site n’aka USHMM Photo Archives

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ọnwụnwa na nrụgide pụrụ ịbịa n’ụdị dị iche iche