Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọtụtụ Ajụjụ—Azịza Ole na Ole Na-eju Afọ

Ọtụtụ Ajụjụ—Azịza Ole na Ole Na-eju Afọ

Ọtụtụ Ajụjụ—Azịza Ole na Ole Na-eju Afọ

N’ỤTỤTỤ Ụbọchị Ndị Senti Nile, na November 1, 1755, otu oké ala ọma jijiji mere n’obodo Lisbon mgbe ọtụtụ ndị obodo ahụ nọ na chọọchị. Ọtụtụ puku ụlọ zere, ọtụtụ iri puku mmadụ nwụkwara.

Nwa oge ka ọdachi ahụ mesịrị, onye edemede bụ́ onye France bụ́ Voltaire bipụtara akwụkwọ ya bụ́ Poème sur le désastre de Lisbonne (Uri Banyere Ọdachi Mere na Lisbon), bụ́ ebe ọ nọ gbaghaa nzọrọ a zọọrọ na ọdachi ahụ bụ ihe Chineke ji kwụghachi ndị mmadụ ụgwọ maka mmehie ha. N’ikwu na ọdachi ndị dị otú ahụ karịrị nghọta ma ọ bụ nkọwa mmadụ, Voltaire dere, sị:

Ihe okike dara ogbi, anyị na-ajụ ya ajụjụ n’efu;

Anyị chọrọ Chineke nke na-agwa agbụrụ mmadụ okwu.

N’ezie, Voltaire abụghị onye mbụ jụrụ ajụjụ banyere Chineke. N’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, ọdachi dị iche iche akpalitewo ọtụtụ ajụjụ n’uche ndị mmadụ. Ọtụtụ puku afọ gara aga, nna ochie ahụ bụ́ Job, bụ́ onye ụmụ ya nile ka nwụpụrụ nakwa onye nọ n’ihe mgbu n’ihi ọrịa ọjọọ, jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka [Chineke] na-enye onye nọ n’ọnọdụ ọjọọ ìhè? N’ihi gịnịkwa ka Ọ na-enye ndị mkpụrụ obi ha dị ilu ndụ?” (Job 3:20) Taa, ọtụtụ ndị na-eche otú ezi Chineke nke na-ahụ n’anya pụrụ isi yie ka ọ gbara nkịtị ka ọ na-ahụ nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi jupụtara ebe nile.

Mgbe ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ụnwụ nri, agha, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ, ha na-ajụ kpam kpam echiche bụ́ na e nwere Onye Okike nke na-eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ. Otu ọka mmụta na-ekweghị na Chineke kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ka ụta ghara ịdịrị Chineke maka ikwe ka nwata na-ata ahụhụ, . . . ọ gwụla nnọọ ma ọ bụ na ọ dịghị adị.” Oké ọdachi dị iche iche, dị ka Oké Mgbukpọ ahụ e nwere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mere ka ọtụtụ ndị kwubie ihe yiri nke ahụ. Rịba ama ihe a obere akwụkwọ akụkọ nke onye edemede bụ́ onye Juu dere kwuru: “Nkọwa kasị mfe nke ihe kpatara ihe mere n’Auschwitz bụ na e nweghị Chineke nke na-etinye aka n’ihe omume nke mmadụ.” Dị ka otu nnyocha e mere na 1997 na France, bụ́ ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ekpe Katọlik si gosi, ihe dị ka pasent 40 nke ndị mmadụ na-agbagha ịdị adị nke Chineke n’ihi mgbuchapụ, dị ka nke ahụ mere na Rwanda na 1994.

Ọ̀ Bụ Ihe Na-egbochi Inwe Okwukwe?

Gịnị mere na Chineke adịghị etinye aka iji gbochie ihe ọjọọ ime? Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Katọlik kwuru na nye ọtụtụ ndị, ajụjụ a bụ “oké ihe na-egbochi inwe okwukwe.” Ọ na-ajụ, sị: “N’ezie, ọ̀ pụrụ ikwe omume ikwere na Chineke nke na-eguzo n’amaghị ihe ọ ga-eme ma na-ekiri nnọọ ka ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha na-anwụ, na-ekirikwa ka a na-egbuchapụ otu agbụrụ ma ghara ime ihe ọ bụla iji gbochie ya?”

Uche akwụkwọ akụkọ Katọlik bụ́ La Croix kwuru ihe yiri nke ahụ, sị: “Ma ọ̀ bụ ọdachi ndị mere n’oge gara aga, ihe ọghọm ndị nkà na ụzụ na-akpata, ọdachi ndị na-emere onwe ha, mpụ a haziri ahazi, ma ọ bụ ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, nke ọ bụla ọ bụ, ndị ụjọ ji na-eleli anya elu. Ebee ka Chineke nọ? Ha na-achọ azịza. Ọ́ bụghị ya bụ Onye Ukwu Na-enweghị Mmetụta, Onye Ukwu Na-adịghị Anọ Ya Mgbe A Chọrọ Ya?”

Popu John-Paul nke Abụọ tụlere okwu a n’akwụkwọ ozi ya nke o dere na 1984 nke a na-akpọ Salvifici Doloris. O dere, sị: “Ọ bụ ezie na ịdị adị nke ụwa na-eme ka ụmụ mmadụ ghọta na Chineke dị adị, matakwa banyere amamihe ya, ike na ịdị ukwuu ya, ihe ọjọọ na nhụjuanya yikwara ka ha na-ekpuchi àgwà ya ndị a, mgbe ụfọdụ n’ụzọ dị ukwuu, karịsịa mgbe ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ n’enweghị ihe ha mere, ọtụtụ ndị ana-emekwa ajọ omume n’enwetaghị ntaramahụhụ kwesịịrị ha.”

Ịdị adị nke Chineke nke na-ahụ nnọọ n’anya na nke kasị ike, dị ka Bible na-egosi, na nhụjuanya nke mmadụ bụ́ nke juru ebe nile hà nwere nkwekọ? Ọ̀ na-etinye aka iji gbochie ọdachi ịdakwasị ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ n’ìgwè? Ọ̀ dị ihe ọ na-emere anyị taa? Dị ka Voltaire si kwuo, ọ̀ dị “Chineke nke na-agwa agbụrụ mmadụ okwu” iji zaa ajụjụ ndị a? Biko gụọ isiokwu na-esonụ iji nweta azịza ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Mbibi nke Lisbon na 1755 kpaliri Voltaire ikwu na ihe omume ndị dị otú ahụ karịrị nghọta mmadụ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Voltaire: Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women; Lisbon: J.P. Le Bas, Praça da Patriarcal depois do terramoto de 1755. Foto: Museu da Cidade/Lisboa

[Foto dị na peeji nke 4]

Ụfọdụ na-agbagha ịdị adị nke Chineke n’ihi ajọ ihe ndị mgbuchapụ na-akpata dị ka nke ahụ mere na Rwanda

[Ebe E Si Nweta Foto]

FOTO AFP

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ, ụmụaka: USHMM, site n’aka Òtù Bụ́ Isi Na-ahụ Maka Ikpe Ikpe Mpụ E Mere Megide Mba Poland