Job 3:1-26

  • Job bụrụ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ (1-26)

    • Ọ jụrụ ihe mere o ji na-ata ahụhụ (20, 21)

3  Ọ bụ mgbe ihe a mechara ka Job kwuziri okwu ma bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.*+ 2  Job sịrị:  3  “M na-abụ ụbọchị a mụrụ m ọnụ,+Nakwa abalị ahụ mmadụ sịrị, ‘A dịla ime nwa nwoke.’  4  Ka ụbọchị ahụ gbaa ọchịchịrị. Ka Chineke chefuo ya. Ka ìhè gharakwa inwu na ya.  5  Ka oké ọchịchịrị gbachie ya. Ka urukpuru kpuchie ya. Ka oké ọchịchịrị kpuchie ìhè ya.  6  Ka oké itiri gbaa n’abalị ahụ.+ Ka a ghara ịṅụrị ọṅụ n’ụbọchị ahụ n’ime ụbọchị ndị e nwere n’afọ,Ka ọ ghara iso n’ụbọchị ndị e nwere n’ọnwa.  7  N’eziokwu, ọ gaara aka mma ma a sị na e nweghị onye a mụrụ n’abalị ahụ. Ka a ghara iti mkpu ọṅụ na ya.  8  Ka ndị na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ya ọnụ,Bụ́ ndị nwere ike ịkpọte Agụ Iyi.*+  9  Ka kpakpando nke pụtara mgbe chi malitere iji n’abalị ahụ gbaa ọchịchịrị. Ka o chere ìhè, ma ka ìhè ghara ịdị,Ka ọ gharakwa ịhụ ìhè na-apụta ma chi bọwa. 10  N’ihi na o mechighị akpa nwa nne m,+O meghịkwa ka m ghara ịhụ nsogbu. 11  Gịnị mere na anwụghị m mgbe a na-amụ m? Gịnị mere na anwụghị m mgbe m si n’akpa nwa pụta?+ 12  Gịnị mere mama m ji kuru m n’ụkwụ ya,Nyekwa m ara ka m ṅụọ? 13  N’ihi na ugbu a, m gaarala edinara ala n’enweghị onye na-enye m nsogbu.+ M gaarala na-ehi ụra, na-ezukwa ike,+ 14  Mụ na ndị eze ụwa na ndị na-adụ ha ọdụ,Ndị ebe ndị ha rụụrụ onwe ha dakpọsịziri adakpọsị,* 15  Ma ọ bụ, mụ na ụmụ ndị eze* bụ́ ndị nwere ọlaedo,Ndị ọlaọcha juru n’ụlọ ha. 16  Ma ọ bụ, gịnị mere na ime apụghị mama m mgbe ọ dị ime m,Mụ anwụọ ka ụmụaka ndị na-ahụtụghị ìhè? 17  N’ebe ahụ, ndị ajọ omume anaghịzi echegbu onwe ha. Ndị ike gwụrụ na-ezu ike n’ebe ahụ.+ 18  Ndị mkpọrọ niile na-atụsara ahụ́ n’ebe ahụ. Ha anaghị anụ olu onye na-amanye ha ịrụ ọrụ. 19  Onye ukwu na onye nta bụ otu n’ebe ahụ,+Ohu na-enwerekwa onwe ya n’aka nna ya ukwu. 20  Gịnị mere Chineke ji ekwe ka onye na-ata ahụhụ dịrị ndụ,*Na-enyekwa ndị na-ahụsi anya ndụ?+ 21  Gịnị mere na ọnwụ anaghị egbu ndị chọrọ ịnwụ?+ Ndị na-achọ ya karịa otú e si achọ akụ̀ zoro ezo, 22  Ndị na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,Ndị obi na-atọ ụtọ ịnwụ.* 23  Gịnị mere Chineke ji enye onye furu ụzọ ìhè,Bụ́ onye ọ gbachibidoro ogige?+ 24  N’ihi na m na-ama ọsụ kama iri ihe.+ Ude m na-asụ+ dị ka ebe mmiri na-agba n’akwụsịghị akwụsị. 25  N’ihi na ihe m tụrụ ụjọ ya abịarala m,Ihe m tụrụ egwu ya emeekwala m. 26  E nweghị mgbe obi ruru m ala. E nweghị mgbe m nọ jụụ. E nweghị mgbe m zuru ike,Kama nsogbu nọ na-abịa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “bụọ ụbọchị ya ọnụ.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “ndị rụụrụ onwe ha ebe dakpọsịrị adakpọsị.”
Ma ọ bụ “ndị ọkwá ha gbagotere n’ụlọ eze.”
Na Hibru, “enye onye na-ata ahụhụ ìhè.”
Na Hibru, “Ndị obi na-atọ ụtọ mgbe ha chọtara ili.”