Job 3:1-26

  • Job bụrụ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ (1-26)

    • Ọ jụrụ ihe mere o ji na-ata ahụhụ (20, 21)

3  Ọ bụ mgbe ihe a mechara ka Job kwuziri okwu ma bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.*+  Job sịrị:   “M na-abụ ụbọchị a mụrụ m ọnụ,+Nakwa abalị ahụ mmadụ sịrị, ‘A dịla ime nwa nwoke.’   Ka ụbọchị ahụ gbaa ọchịchịrị. Ka Chineke chefuo ya. Ka ìhè gharakwa inwu na ya.   Ka oké ọchịchịrị gbachie ya. Ka urukpuru kpuchie ya. Ka oké ọchịchịrị kpuchie ìhè ya.   Ka oké itiri gbaa n’abalị ahụ.+ Ka a ghara ịṅụrị ọṅụ n’ụbọchị ahụ n’ime ụbọchị ndị e nwere n’afọ,Ka ọ ghara iso n’ụbọchị ndị e nwere n’ọnwa.   N’eziokwu, ọ gaara aka mma ma a sị na e nweghị onye a mụrụ n’abalị ahụ. Ka a ghara iti mkpu ọṅụ na ya.   Ka ndị na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ya ọnụ,Bụ́ ndị nwere ike ịkpọte Agụ Iyi.*+   Ka kpakpando nke pụtara mgbe chi malitere iji n’abalị ahụ gbaa ọchịchịrị. Ka o chere ìhè, ma ka ìhè ghara ịdị,Ka ọ gharakwa ịhụ ìhè na-apụta ma chi bọwa. 10  N’ihi na o mechighị akpa nwa nne m,+O meghịkwa ka m ghara ịhụ nsogbu. 11  Gịnị mere na anwụghị m mgbe a na-amụ m? Gịnị mere na anwụghị m mgbe m si n’akpa nwa pụta?+ 12  Gịnị mere mama m ji kuru m n’ụkwụ ya,Nyekwa m ara ka m ṅụọ? 13  N’ihi na ugbu a, m gaarala edinara ala n’enweghị onye na-enye m nsogbu.+ M gaarala na-ehi ụra, na-ezukwa ike,+ 14  Mụ na ndị eze ụwa na ndị na-adụ ha ọdụ,Ndị ebe ndị ha rụụrụ onwe ha dakpọsịziri adakpọsị,* 15  Ma ọ bụ, mụ na ụmụ ndị eze* bụ́ ndị nwere ọlaedo,Ndị ọlaọcha juru n’ụlọ ha. 16  Ma ọ bụ, gịnị mere na ime apụghị mama m mgbe ọ dị ime m,Mụ anwụọ ka ụmụaka ndị na-ahụtụghị ìhè? 17  N’ebe ahụ, ndị ajọ omume anaghịzi echegbu onwe ha. Ndị ike gwụrụ na-ezu ike n’ebe ahụ.+ 18  Ndị mkpọrọ niile na-atụsara ahụ́ n’ebe ahụ. Ha anaghị anụ olu onye na-amanye ha ịrụ ọrụ. 19  Onye ukwu na onye nta bụ otu n’ebe ahụ,+Ohu na-enwerekwa onwe ya n’aka nna ya ukwu. 20  Gịnị mere Chineke ji ekwe ka onye na-ata ahụhụ dịrị ndụ,*Na-enyekwa ndị na-ahụsi anya ndụ?+ 21  Gịnị mere na ọnwụ anaghị egbu ndị chọrọ ịnwụ?+ Ndị na-achọ ya karịa otú e si achọ akụ̀ zoro ezo, 22  Ndị na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,Ndị obi na-atọ ụtọ ịnwụ.* 23  Gịnị mere Chineke ji enye onye furu ụzọ ìhè,Bụ́ onye ọ gbachibidoro ogige?+ 24  N’ihi na m na-ama ọsụ kama iri ihe.+ Ude m na-asụ+ dị ka ebe mmiri na-agba n’akwụsịghị akwụsị. 25  N’ihi na ihe m tụrụ ụjọ ya abịarala m,Ihe m tụrụ egwu ya emeekwala m. 26  E nweghị mgbe obi ruru m ala. E nweghị mgbe m nọ jụụ. E nweghị mgbe m zuru ike,Kama nsogbu nọ na-abịa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “bụọ ụbọchị ya ọnụ.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “ndị rụụrụ onwe ha ebe dakpọsịrị adakpọsị.”
Ma ọ bụ “ndị ọkwá ha gbagotere n’ụlọ eze.”
Na Hibru, “enye onye na-ata ahụhụ ìhè.”
Na Hibru, “Ndị obi na-atọ ụtọ mgbe ha chọtara ili.”