Pita Nke Abụọ 2:1-22

  • A ga-enwe ndị nkụzi ụgha (1-3)

  • A ga-ebibirịrị ndị nkụzi ụgha (4-10a)

    • Chineke tụbara ndị mmụọ ozi n’ime Tatarọs (4)

    • Iju mmiri; Sọdọm na Gọmọra (5-7)

  • Ihe ndị e ji mara ndị nkụzi ụgha (10b-22)

2  Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.*+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme.  Ọtụtụ ndị ga-emewekwa ihe ọjọọ n’asọghị anya*+ otú ha na-eme. Ha ga-emekwa ka ndị mmadụ malite ịkatọ eziokwu a na-akụziri anyị.+  Ha ga na-aghakwara unu ụgha ka ha ghọgbuo unu n’ihi na ha dị anyaukwu. Ma, oge a ga-ata ha ahụhụ Chineke kpebiri ịta ha kemgbe oge ochie+ ji ọsọ na-abịa.+  N’eziokwu, Chineke tara ndị mmụọ ozi mehierenụ ahụhụ,+ tụba ha n’ime Tatarọs,*+ keekwa ha agbụ* ka ha nọrọ n’ebe gbara oké ọchịchịrị ruo mgbe ọ ga-eme ha ihe o kpebiri ime ha.+  Ọ takwara ụwa oge ochie ahụhụ.+ Ma o chebere Noa, onye nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume,+ chebekwa mmadụ asaa ndị ọzọ,+ mgbe o ji mmiri bibie ụwa ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke juru.+  Ọ makwara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe, gbaa ha ọkụ, ha aghọọ ntụ.+ O si otú ahụ mee ka ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke mara ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.+  Ma, ọ napụtara Lọt, onye ezi omume,+ onye obi nọ na-agbawa maka ihe ọjọọ ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme n’asọghị anya.*  N’eziokwu, mgbe onye ezi omume a na-ahụ otú ndị o bi n’obodo ha si ebi ndụ jọgburu onwe ya, na-anụkwa ihe ndị ha na-ekwu, obi* na-ajọ ya ezigbo njọ kwa ụbọchị.  Ihe ndị a gosiri na Jehova* ma otú o si anapụta ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ọnwụnwa.+ Ọ makwa otú ọ ga-esi hapụ ndị ajọ omume ruo mgbe a ga-ebibi ha n’ụbọchị ikpe,+ 10  karịchaa, ndị na-achọ idina ndị ọzọ ka ha mebie ha+ nakwa ndị na-elelị ndị isi.+ Ụjọ anaghị atụ ndị a ikwutọ ndị dị ebube n’ihi na ha dị ezigbote isi ike. 11  Ma, ùgwù ndị mmụọ ozi na-akwanyere Jehova*+ mere ka ha ghara ịna-agwa ha okwu ọjọọ, ọ bụ eziokwu na ndị mmụọ ozi ka ha nwee ume, karakwa ha ike. 12  Ma, ndị a na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ihe ha na-amaghị.+ A ga-ebibi ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Ha dị ka anụmanụ na-anaghị eche echiche, ndị a na-amụ, e mechaa e jide ha gbuo. 13  A ga-ata ha ahụhụ maka ihe ọjọọ ha na-eme. Ibi ndụ okomoko na-atọ ha ụtọ,+ ma n’oge ehihie. Ha dị ka uwe nwere ntụpọ na ọnyá dị mmadụ n’ihu. Obi na-atọ ha ezigbo ụtọ iji ụgha ha na-akụzi eduhie ndị ọzọ mgbe unu na ha nọ n’oriri.+ 14  Ịkwa iko na-agụsi ha agụụ ike.+ Ha enweghị ike isepụ aka ná mmehie. Ha na-aratakwa ndị* na-akwụsighị ike. Ihe juru n’obi ha bụ anyaukwu.* Chineke ga-ama ha ikpe. 15  E duhiela ha n’ihi na ha hapụrụ ezigbo ụzọ. Ha esorola ụzọ Belam+ nwa Biọ, onye mere ihe ọjọọ maka na obi ya dị nnọọ n’ụgwọ a ga-akwụ ya.+ 16  A baara ya mba maka ihe ọjọọ o mere.+ Jakị na-anaghị ekwu okwu kwuru okwu otú mmadụ si ekwu iji gbochie onye amụma ahụ ime ka onye nzuzu.+ 17  Ndị a bụ isi iyi nke mmiri na-adịghị na alụlụụ nke oké ifufe mmiri na-ebugharị. E doweere ha ebe gbara oké ọchịchịrị ha ga-anọ.+ 18  Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru nke na-atọ ụtọ ná ntị. Ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,* na-emekwa ka ihe ọjọọ na-agụ ndị chegharịrịnụ agụụ ọzọ,+ na-arata ha ka ha mewe ihe ọjọọ ndị ha kwụsịrịla ime.+ 19  Ndị nkụzi ụgha a na-ekwe ha nkwa na ha ga-enwere onwe ha, ma hanwa bụ ndị ohu mmehie.+ N’ihi na onye ọ bụla onye ọzọ meriri bụ ohu onye ahụ.*+ 20  N’eziokwu, ọ bụrụ na ha hapụrụ ime ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa+ maka na ha amatala nke ọma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ma mechaa mewe ihe ọjọọ ndị ahụ ọzọ, ihe ndị ahụ ana-achị ha, ikpeazụ ha akala mmalite ha njọ.+ 21  Ọ gaara akara ha mma na ha amaghị nke ọma gbasara otú mmadụ si ebi ndụ dị mma, karịa na mgbe ha matachara ya, ha ahapụ iwu dị nsọ e nyere ha.+ 22  Ilu a a tụrụ emezuola n’isi ha: “Nkịta alaghachila n’agbọ ọ gbọrọ, nne ézì a sara ahụ́ agaakwala na-adagharị n’apịtị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “onye nwe ha,” ya bụ, Jizọs.
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “tụbakwa ha n’olulu.”
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu, “mkpụrụ obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Ha zụrụ obi ha ka ọ dị anyaukwu.”
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “onye ọ bụla ihe ọzọ meriri bụ ohu ihe ahụ.”