Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe

Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe

Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe

Ị̀ NỤTỤLA banyere Noa, nwoke na-atụ egwu Chineke, onye wuru ụgbọ maka ichebe ndụ n’oge iju mmiri zuru ụwa ọnụ? N’agbanyeghị otú akụkọ a siworo mee ochie, ọtụtụ nde mmadụ maara ya nke ọma. Otú ọ dị, ihe ọtụtụ ndị na-aghọtaghị bụ na ndụ Noa nwere ihe ọ pụtara nye anyị nile.

N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ihe e dekọrọ ọtụtụ puku afọ gara aga? È nwere myirịta dị n’etiti ọnọdụ Noa na nke anyị? Ọ bụrụ na e nwere, olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya ya?

Ụwa nke Oge Noa

Usoro ọgụgụ oge Bible na-egosi na a mụrụ Noa na 2970 T.O.A.—afọ 126 mgbe Adam nwụsịrị. Ka ọ na-erula n’oge Noa, ụwa ejupụtawo n’ime ihe ike, ihe kakwa ọtụtụ n’ụmụ Adam họọrọ ịgbaso ihe nlereanya nnupụisi nke nna nna ha. Ya mere, “Jehova [hụrụ] na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5, 11, 12.

Ọ bụghị nanị nnupụisi nke mmadụ wutere Jehova. Ihe ndekọ Jenesis na-akọwa, sị: “Ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara. . . . Nefilim nọ n’ụwa na mgbe ahụ, ha nọkwa ma e mesịa, mgbe ụmụ ndị ikom nke Chineke na-abakwuru ụmụ ndị inyom nke mmadụ, mgbe ha na-amụkwara ha ụmụ: ndị ahụ bụ ndị dike ahụ ndị nọrịị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a maara aha ha.” (Jenesis 6:2-4) Iji amaokwu ndị a tụnyere ihe Pita onyeozi dekọrọ na-egosi na “ụmụ ndị ikom nke Chineke” bụ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi. Ndị Nefilim bụ ọkara mmadụ ọkara mmụọ, bụ́ ndị a mụrụ site ná mmekọahụ rụrụ arụ dịrị n’etiti ndị inyom na ndị mmụọ ozi nupụrụ isi bụ́ ndị nwoghara onwe ha.—1 Pita 3:19, 20.

“Nefilim,” nke pụtara “Ndị Ntida,” na-egosipụta ndị na-eme ka ndị ọzọ daa. Ha bụ ndị ọchọ okwu dị obi ọjọọ, e jikwa mmehie nke ndị bụ́ nna ha agụụ mmekọahụ na-agụgbu tụnyere arụrụala nke Sọdọm na Gọmọra. (Jud 6, 7) Ha nile kpalitere ajọ omume na-ekweghị odidi n’ụwa.

“Onye Zuru Okè n’Ọgbọ Ya Nile”

Ihe ọjọọ juru ebe nile nke na Chineke kpebisiri ike ibibi ihe a kpọrọ mmadụ. Ma ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, na-asị: “Noa hụtara amara n’ihu Jehova. . . . Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:8, 9) Olee otú ya na ‘Chineke ịyịkọ na-ejegharị’ si kwe omume n’ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke nke kwesịrị nnọọ mbibi?

Obi abụọ adịghị ya na Noa mụtara ihe dị ukwuu n’aka nna ya bụ́ Lemek, bụ́ nwoke nke nwere okwukwe na onye ya na Adam dịkọrọ ndụ. Mgbe ọ na-aba nwa ya nwoke aha ahụ bụ́ Noa (nke e chere na ọ pụtara “Ezumike,” ma ọ bụ “Ngụgụ Obi”), Lemek buru amụma, sị: “Onye a ga-akasi anyị obi banyere ọrụ anyị, banyekwara ndọgbu anyị ji aka anyị adọgbu onwe anyị n’ọrụ, bụ́ nke pụtara n’ala Jehova bụworo ọnụ.” E mezuru amụma ahụ mgbe Chineke wepụrụ ọbụbụ ọnụ ọ bụrụ ala.—Jenesis 5:29; 8:21.

Mmadụ inwe ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke abụghị ihe ga-eme ka e jide n’aka na ọ ga-eji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’ihi na onye ọ bụla aghaghị ịzụlite mmekọrịta nke ya na Jehova. Noa ‘na Chineke yịkọrọ jegharịa’ site na ya ịgbaso ụzọ ndụ nke dị Chineke mma. Ihe Noa mụtara banyere Chineke kpaliri ya ijere Ya ozi. Okwukwe Noa amaghị jijiji mgbe a gwara ya banyere nzube Chineke ‘ibibi anụ ahụ nile bụ́ mmadụ n’iju mmiri ahụ.’—Jenesis 6:13, 17.

N’inwe obi ike na ọdachi a a na-enwetụbeghị ụdị ya mbụ ga-eme, Noa gere ntị n’iwu Jehova bụ́: “Meere onwe gị ụgbọ nke osisi gopher; ụlọ mwubi dị iche iche ka ị ga-eme n’ụgbọ ahụ, werekwa bitumen techie ya ime na azụ.” (Jenesis 6:14) Imezu ihe nile Chineke kwuru banyere ụgbọ ahụ abụghị obere ọrụ. Otú o sina dị, “Noa [mere] ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya.” N’ezie, “otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22) Noa mere nke a site n’enyemaka nke nwunye ya na ụmụ ha, bụ́ Shem, Ham, na Jefet na ndị nwunye ha. Jehova gọziri okwukwe dị otú ahụ. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ahụ bụụrụ ezinụlọ dị iche iche taa!

Gịnị ka iwu ụgbọ ahụ ga-agụnye? Jehova nyere Noa ntụziaka iwu akatamkpo ụgbọ a ga-eji osisi mee nke mmiri na-agaghị abanye n’ime ya, nke ga-adị okpukpu atọ, bụ́ nke ga-adị ihe dị ka mita 133 n’ogologo, mita 22 n’obosara, na mita 13 n’ịdị elu. (Jenesis 6:15, 16) Ime ụgbọ dị otú ahụ ga-aha ka nnukwu ụgbọ mmiri dị iche iche e ji ebu ibu n’oge a.

Lee ọrụ buru ibu nke ahụ bụ! O yikarịrị ka ọ ga-apụta igbutu ọtụtụ puku osisi, buru ha gaa n’ebe a ga-anọ wuo ụgbọ ahụ, ma waa ha awaa. Ọ pụtara ịrụ ihe dị elu ebe ndị ọrụ ga-arịgoro wee na-arụ ọrụ, imepụta ntu, inweta bitumen maka itechi ya ka mmiri ghara ịbanye na ya, inweta ihe ndị e ji etinyeju ihe na ngwá ọrụ, na ihe ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ na ọrụ ahụ chọrọ ka e soro ndị ahịa kwerịta ọnụ ahịa nakwa ka a kwụọ ụgwọ maka ngwá ahịa na ije ozi. O doro anya na ọ chọrọ nkà n’ọrụ ịkwa nkà ka e wee nwee ike ịkụnye osisi ndị ahụ n’ebe kwesịrị ekwesị ma wuo ihe owuwu siri nnọọ ike. Cheedị banyere ya—ihe owuwu ahụ were ma eleghị anya ihe dị ka afọ 50 ma ọ bụ 60!

Noa aghaghị ilekwasịzi anya n’ịkwadebe ihe oriri na nri ụmụ anụmanụ ga-ezunụ. (Jenesis 6:21) Ọ ghaghị ịchịkọta ma duba ọtụtụ anụmanụ n’ime ụgbọ ahụ. Noa mezuru ihe nile Chineke nyere ya n’iwu, a rụchakwara ọrụ ahụ. (Jenesis 6:22) Ngọzi Jehova mere ka o nwee nnọọ ihe ịga nke ọma.

“Onye Na-ekwusa Ezi Omume”

E wezụga iwu ụgbọ, Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị ma jeere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.” Ma ndị ahụ ‘amaghị ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.’—2 Pita 2:5; Matiu 24:38, 39.

N’iburu n’uche ịdị njọ nke ọnọdụ ime mmụọ na nke omume nke oge ahụ, ọ dị mfe ịhụ otú ezinụlọ Noa pụrụ isiwo bụrụ ndị ndị agbata obi ha kpọrọ ekwo nkụ ji mee ihe ọchị, ndị e nyere mkparị ma mee akaje. Ndị mmadụ aghaghị ilewo ha anya dị ka ndị isi mgbaka. Otú ọ dị, Noa nwere ihe ịga nke ọma n’inye ezinụlọ ya agbamume na nkwado n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ bụla ha gbasoro ụzọ ime ihe ike, nke omume rụrụ arụ, na nke nnupụisi nke ndị ha na ha dịkọrọ ndụ bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Site n’okwu ọnụ na n’omume Noa, bụ́ nke gosipụtara okwukwe ya, ọ mara ụwa nke oge ahụ ikpe.—Ndị Hibru 11:7.

Ndị E Chebere Gabiga Iju Mmiri Ahụ

Nwa oge tupu oké mmiri ozuzo ahụ amalite, Chineke gwara Noa ka ọ banye n’ụgbọ ahụ e wuchaworo. Mgbe ezinụlọ Noa na ụmụ anụmanụ banyechara, ‘Jehova mechiri ụzọ,’ na-eme ka ha gharakwa ịnụ ọchị ịkwa emo ọ bụla. Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, o doro anya na ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi nwoghara onwe ha ma gbanahụ mbibi. Ma gịnị banyere ndị ọzọ? Ihe mere ha doro anya, ihe nile e kere eke dị ndụ nọ n’ala ọkpọ nkụ n’èzí ụgbọ ahụ, gụnyere ndị Nefilim ahụ, lara n’iyi! Nanị Noa na ezinụlọ ya lanarịrị.—Jenesis 7:1-23.

Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ otu afọ na ụbọchị iri n’ikwekọ ná mpụta nke ọnwa. Ha ji ọrụ n’aka n’inye ụmụ anụmanụ nri na mmiri, n’ikpopụsị ihe ndị ruru unyi, na n’ịgụkọ oge. E dekọrọ oge akụkụ nile nke Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ na Jenesis n’ụzọ a kapịrị ọnụ, dị ka ihe ndekọ njem ụgbọ mmiri, na-egosi izi ezi nke akụkọ ahụ.—Jenesis 7:11, 17, 24; 8:3-14.

Mgbe Noa na ezinụlọ ya nọ n’ụgbọ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o duziri ha ná nkwurịta okwu dabeere n’ihe ime mmụọ na n’inye Chineke ekele. Ihe àmà na-egosi na site n’aka Noa na ezinụlọ ya, e chebere akụkọ banyere ihe ndị mere tupu Iju Mmiri ahụ. Akụkọ ọdịnala ndị a pụrụ ịtụkwasị obi ha nụrụ ma ọ bụ akwụkwọ akụkọ ihe mere eme ndị ha nwere ga-eme ka ha nwee ihe ndị mara mma ma baa uru ha ga-atụle n’oge Iju Mmiri ahụ.

Lee ka obi na-aghaghị isiwo dị Noa na ezinụlọ ya ụtọ ịgba ụkwụ n’ala ọzọ n’ala akọrọ! Ihe mbụ o mere bụ iwu ebe ịchụàjà ma rụọ ọrụ dị ka onye nchụàjà nye ezinụlọ ya, na-achụrụ Onye ahụ zọpụtara ha àjà.—Jenesis 8:18-20.

“Dị Ka Ụbọchị Noa Dịịrị”

Jisọs Kraịst sịrị: “Dị ka ụbọchị Noa dịịrị, otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:37) Taa, ndị Kraịst bụkwa ndị na-ekwusa ezi omume, na-agba ndị mmadụ ume ichegharị. (2 Pita 3:5-9) N’iburu myirịta ahụ n’uche, anyị pụrụ iche ihe dị n’uche Noa tupu Iju Mmiri ahụ. Ọ̀ dị mgbe o chere na nkwusa ọ na-eme enweghị isi? Ọ̀ dị mgbe ike gwụrụ ya? Bible ekwughị. A gwara anyị nanị na Noa rubeere Chineke isi.

Ị̀ na-ahụ otú ọnọdụ Noa si metụta nke anyị? O rubeere Jehova isi n’agbanyeghị mmegide na ihe isi ike. Ọ bụ ya mere Jehova jiri gụọ ya n’onye ezi omume. Ezinụlọ Noa amaghị kpọmkwem mgbe Chineke ga-eweta Iju Mmiri ahụ, ma ha maara na ọ ga-abịa. Okwukwe Noa nwere n’okwu Chineke kwagidere ya n’ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike na ihe pụrụ iyiwo ka ọ bụ nkwusa na-adịghị amịpụta mkpụrụ. N’ezie, a gwara anyị, sị: “Noa, mgbe Chineke dụsịrị ya ọdụ banyere ihe a ka-ahụghị anya ruo oge ahụ, ebe ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ okwukwe ka o ji dozie ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ Ya; o sitekwara na nke a maa ụwa ikpe, wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke dị n’ụzọ okwukwe.”—Ndị Hibru 11:7.

Olee otú Noa si nweta okwukwe dị otú ahụ? O doro anya na o wepụtara oge iji tụgharịa uche n’ihe nile ọ maara banyere Jehova ma kwe ka ihe ọmụma ahụ duzie ya. Obi abụọ adịghị ya na Noa gwara Chineke okwu n’ekpere. N’ezie, o sooro Jehova nwee mmekọrịta chiri nnọọ anya nke na ‘ya na Chineke yịkọrọ jegharịa.’ Dị ka onyeisi ezinụlọ, Noa ji obi ụtọ wepụta oge soro ezinụlọ ya nọkọọ ma jiri ịhụnanya lekọta ha. Nke a gụnyere ịhụ maka ọdịmma ime mmụọ nke nwunye ya, ụmụ ya atọ, na ndị nwunye ụmụ ya.

Dị ka Noa, ezi ndị Kraịst taa maara na Jehova ga-eweta usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke ná njedebe n’isi nso. Anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ awa ọ ga-abụ, ma anyị maara na iṅomi okwukwe na nrubeisi nke ‘onye a na-ekwusa ezi omume’ ga-arụpụta ‘ichebe mkpụrụ obi.’—Ndị Hibru 10:36-39, NW.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Ò Mere n’Ezie?

Ndị ọkà mmụta banyere ịdị adị mmadụ achịkọtawo akụkọ mgbe ochie ruru 270 banyere iju mmiri ahụ site n’agbụrụ na mba dị iche iche. “A na-achọta akụkọ banyere iju mmiri ahụ gburugburu ụwa,” ka ọkà mmụta bụ́ Claus Westermann na-ekwu. “Dị ka akụkọ banyere okike, o so n’ihe nketa ọdịbendị bụ́ isi anyị nwere. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya n’ezie: n’ebe nile n’ụwa, anyị na-anụ akụkọ banyere oké iju mmiri mere n’oge ochie.” Gịnị ka ọ pụtara? Onye na-akọwa ihe bụ́ Enrico Galbiati na-asị: “Otú ndị dịgasị iche iche biri ndụ n’oge dịrịtara iche si nọgide na-akọ akụkọ banyere iju mmiri bụ ihe àmà na isi ihe ndị dị n’akụkọ ndị ahụ mere eme n’ezie.” Otú ọ dị, ihe dị ndị Kraịst mkpa karịa ihe ndị ọkà mmụta kwuru bụ na ha maara na Jisọs n’onwe ya kwuru banyere Iju Mmiri ahụ dị ka ihe mere eme n’akụkọ ihe mere nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Luk 17:26, 27.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Akụkọ Banyere Ndị Nefilim Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

Akụkọ banyere mmekọahụ ndị dịrị n’etiti ndị bụ́ chi na ụmụ mmadụ—na “ndị dike” ma ọ bụ “ndị bụ́ ọkara mmadụ ọkara mmụọ” a mụrụ site ná mmekọahụ ndị a—dị na nkà mmụta okpukpe ndị Gris, Ijipt, Ugarit, Hurria, na Mesọpọtemia. Chi ndị dị n’akụkọ ifo ndị Gris nwere ọdịdị mmadụ ma maa mma dị egwu. Ha riri ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, rahụọ ụra, nwee mmekọahụ, see okwu, lụọ ọgụ, rafuo, ma dinaa ndị mmadụ n’ike. Ọ bụ ezie na e lere ha anya dị ka ndị dị nsọ, ha nwere ike iduhie ndị mmadụ na ime mpụ. E kwuru na ndị dike dị ka Achilles bụ ma ụmụ mmadụ ma ndị bụ́ chi mụrụ ha nakwa na e nyere ha ikike karịrị nke mmadụ ma e nyeghị ha anwụghị anwụ. Ya mere, ihe Jenesis na-ekwu banyere ndị Nefilim na-enye anyị ihe ọmụma banyere ebe akụkọ ọdịbendị ndị dị otú ahụ pụrụ isite.