Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ebe Ihu Abụọ Dị?

Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ebe Ihu Abụọ Dị?

 Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ebe Ihu Abụọ Dị?

N’OGIGE Getsemane, Judas Iskarịọt bịakwutere Jisọs ma “sutụ Ya ọnụ nke ukwuu.” Nke a bụ ụzọ omenala e si egosipụta mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ. Ma omume Judas bụ nanị ihu abụọ iji mee ka ndị ahụ bịara n’abalị ijide Jisọs mata ya. (Matiu 26:48, 49) Judas bụ onye ihu abụọ—onye na-eme ka ọ̀ bụ ihe ọ na-abụghị, onye na-eji ngosipụta nke obi eziokwu ekpuchi ajọ ebumnobi ya. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “onye ihu abụọ” pụtara “onye na-aza,” ọ pụtakwara onye na-eme ihe nkiri. Ka oge na-aga, okwu ahụ bịara na-ezo aka n’ebe onye ọ bụla nke na-eme ka a ga-asị na ọ bụ ihe ọ na-abụghị iji duhie ndị ọzọ, nọ.

Olee otú i si emeghachi omume n’ebe ihu abụọ dị? Dị ka ihe atụ, ị̀ na-ewe iwe mgbe ị hụrụ ka ndị na-emepụta siga na-akwalite ise siga n’agbanyeghị ihe àmà nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike nke na-egosi na ngwá ahịa ha na-emerụ ahụ? Ihu abụọ nke ndị nlekọta bụ́ ndị na-emetọ ndị e nyere ha ilekọta ọ̀ na-agbawa gị obi? Ọ̀ na-ewute gị mgbe onye i chere na ọ bụ ezigbo enyi gị mesịrị ghọọ enyi ọjọọ? Olee otú ihu abụọ nke okpukpe si emetụta gị?

“Ahụhụ Ga-adịrị Unu . . . Ndị Ihu Abụọ”

Tụlee ọnọdụ okpukpe e nwere mgbe Jisọs nọ n’ụwa. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-eme ka a ga-asị na ha bụ ndị nkụzi na-eguzosi ike n’ihe nke Iwu Chineke, ma n’ezie, ha ji ozizi mmadụ nke na-adọpụ uche n’ebe Chineke nọ mejupụta uche ndị mmadụ. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii siri nnọọ ọnwụ ịhụ na e debezuru ihe nile dị n’iwu, ma ha leghaara ụkpụrụ ndị bụ́ isi bụ́ ndị na-egosipụta ịhụnanya na ọmịiko anya. N’ihu ọha, ha na-eme ka hà na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke, ma na nzuzo, ha jupụtara n’ajọ ihe. Ọ dịghị mgbe omume ha na-ekwekọ n’okwu ha. Ihe ha bu n’obi eme ihe bụ ka “mmadụ wee kirie ha.” Ha yiri “ili e teworo nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ, na adịghị ọcha nile.” N’iji anya ike ekpughe ihu abụọ ha, Jisọs gwara ha ugboro ugboro, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ.”—Matiu 23:5, 13-31.

Ọ bụrụ na i biri ndụ n’oge ahụ, dị ka ndị ọzọ nwere obi eziokwu, n’ezie, ihu abụọ okpukpe dị otú ahụ pụrụ iwutewo gị nke ukwuu. (Ndị Rom 2:21-24; 2 Pita 2:1-3) Ma ị̀ gaara ekwewo ka ihu abụọ nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wute gị nke ukwuu ruo n’ókè nke na ị ga-ajụ okpukpe nile, gụnyere nke Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ nke ha kụzikwara banyere ya? Ọ̀ bụ na nke ahụ agaaraghị aghọ gị ahịa?

Àgwà ihu abụọ nke ndị okpukpe pụrụ ime ka anyị jiri iwe gbakụta okpukpe azụ. Otú ọ dị, imeghachi omume n’ụzọ dị otú a pụkwara igbochi anyị ịghọta ezi obi nke ndị na-efe ezi ofufe. N’ezie, kpọmkwem àgwà anyị zụlitere iji chebe onwe anyị pụọ n’ihu abụọ pụrụ ime ka anyị gbakụta ndị bụ́ ezi ndị enyi azụ. Mgbe ahụ, mmeghachi omume anyị n’ebe ihu abụọ dị kwesịrị ịbụ nke ezi uche dị na ya na nke kwesịrị ekwesị.

“Ghewenụ Anya Unu Oghe”

Nke mbụ, anyị aghaghị ịmụta ịmata ndị ihu abụọ. Nke a anaghị adịcha mfe. Otu ezinụlọ  mụtara nke a mgbe o fuchara ha ihe dị ukwuu. Mama ha tụbọrọ atụbọ. N’ịgba ndị ụlọ ọgwụ ihe a mere na nke ha akwụkwọ n’ụlọikpe maka omume ọjọọ ha, ezinụlọ ahụ kuru ọkàiwu bụ́kwa onye okwuchukwu na chọọchị dị n’ógbè ha. Ọ bụ ezie na ndị ụlọ ọgwụ ahụ kwụrụ nde $3.4 dị ka ego iti aka n’obi, ọdachi ezinụlọ ahụ kara njọ. Mama ha nwụrụ dị ka ogbenye ọnụ ntụ, ọ dịghịkwa ego dịnụ maka ememe olili ozu ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọkàiwu ahụ gbara ihe ka ukwuu n’ego ahụ n’akpa. Banyere ọkàiwu a, otu akwụkwọ iwu kwuru, sị: “Ọ bụrụ na o kwusara banyere ụdị àgwà a ọ kpara . . . , ozi ya ga-abụ: ka anyị rigbuwe ndị anyị ga-erigbuli.” Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ n’aka ndị dị otú ahụ?

“Ghewenụ anya unu oghe,” bụ ndụmọdụ Jisọs nyere ndị oge ya bụ́ ndị na-ahụ ihu abụọ nke okpukpe. (Matiu 16:6, NW; Luk 12:1) Ee, anyị aghaghị ịkpachara anya. Ndị mmadụ pụrụ ịzọrọ na ha bu ezigbo ihe n’obi ma na-egosipụta na obi ha dị ọcha, ma ọ dị anyị mkpa ịkpachara nnọọ anya ma ghara ịnakwere onye ọ bụla n’ajụghị ase. Ọ̀ bụ na anyị agaghị eji nlezianya enyocha akwụkwọ ego anyị ma ọ bụrụ na anyị maara na e ji ego adịgboroja na-eme ihe?

Ndị ihu abụọ apụtawo ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Jud onye na-eso ụzọ dọrọ aka ná ntị banyere ha, na-asị: “Ndị a bụ ndị nke bụ́ nkume zoro ezo [n’ala ala mmiri] n’oriri ịhụnanya unu mgbe ha na-eso unu rikọọ ihe n’atụghị egwu, ndị na-azụ onwe ha dị ka atụrụ; ha bụ igwe ojii nke mmiri na-adịghị, nke ifufe na-efegharị; bụrụkwa osisi na-amịghị mkpụrụ n’oge mkpụrụ.”—Jud 12.

‘Ighewe anya anyị oghe’ pụtara izere nduhie nke onye na-eme ka o nwere ịhụnanya ma bụrụ n’ezie onye na-eche nanị banyere onwe ya ma na-akwalite echiche na-adabereghị n’Okwu Chineke. Dị ka nkume nke ọnụ ya pịrị apị nke dị nnọọ n’ala ala nke mmiri dị jụụ, onye dị otú ahụ pụrụ ime ka ụgbọ ime mmụọ nke onye ike na-adịghị kpuo. (1 Timoti 1:19) Onye ihu abụọ pụrụ ikwe nkwa ime ka e nwee nnọọ ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ ma mesịa ghọọ “igwe ojii nke mmiri na-adịghị”—n’ezoghị mmiri ọ bụla. Dị ka osisi na-adịghị amị mkpụrụ, onye nduhie adịghị amị mkpụrụ nke ezi onye Kraịst. (Matiu 7:15-20; Ndị Galetia 5:19-21) Ee, ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide ndị nduhie dị otú ahụ. Ma, anyị aghaghị ime otú ahụ n’enyoweghị ebumnobi nke mmadụ nile enyo.

“Unu Ekpela Ikpe”

Lee ka o si dị mfe ụmụ mmadụ na-ezughị okè ikwupụta amaghị eme nke ndị ọzọ ma na-eleghara nke ha anya! Otú ọ dị, àgwà a na-eme ka anyị bụrụ ndị ọ na-adịrị mfe inwe ihu abụọ. “Onye ihu abụọ,” ka Jisọs kwuru. “Buru ụzọ tụpụ ntụhie ahụ n’anya nke gị; mgbe ahụ ka ị ga-elegide anya ịtụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya nwanna gị.” Anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị na ndụmọdụ ya bụ́: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu . . . Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị?”—Matiu 7:1-5.

Mgbe ndị ọzọ mere omume yiri nke ihu abụọ mgbe ụfọdụ, anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ịdị ngwa ịkpọ ha ndị ihu abụọ. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi “wezugawara wee kewapụ onwe ya” n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị Jentaịl bi n’Antiọk nọ iji mee ka obi dị ndị ọbịa bụ́ ndị Juu si Jerusalem bịa mma. ‘Ihu abụọ a nke Pita na ndị ọzọ dọrọkwaara  Banabas.’ Pita mere nke a n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na o nwewo ihe ùgwù nke imeghe ụzọ maka ịnabata ndị Jentaịl n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Galetia 2:11-14; Ọrụ 10:24-28, 34, 35) N’ezie, ndaghachi azụ a nke Banabas na Pita daghachiri emeghị ka ha na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ma ọ bụ Judas Iskarịọt bụrụ otu.

“Ka Ịhụnanya Unu Bụrụ nke Ihu Abụọ Na-adịghị na Ya”

“Mgbe ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma,” ka Jisọs dụrụ n’ọdụ, “akpọla onye na-afụ opi ka ọ nọrọ n’ihu—dị ka ndị na-eme ihe nkiri n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá bụ́ ndị na-ejide n’aka na ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ha nọ.” (Matiu 6:2, Phillips) “Ka ịhụnanya unu bụrụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Rom 12:9, NW) Ọ gbara nwa okorobịa bụ́ Timoti ume ka o nwee “ịhụnanya sitere n’obi ọcha . . . na okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya.” (1 Timoti 1:5) Ọ bụrụ na ịhụnanya na okwukwe anyị bụ ezigbo ya—n’abụghị nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na aghụghọ metọrọ—ndị ọzọ ga-atụkwasị anyị obi. Anyị ga-abụrụ ndị gbara anyị gburugburu isi iyi nke ezigbo ike na agbamume. (Ndị Filipaị 2:4; 1 Jọn 3:17, 18; 4:20, 21) Karịsịakwa, anyị ga-enweta nnwapụta Jehova.

N’aka nke ọzọ, ihu abụọ ga-emesị gbuo ndị nwere ya. N’ikpeazụ, a ga-ekpughe ihu abụọ n’ihu ọha. “Ọ dịghị ihe ọ bụla e kpuchiworo ekpuchi, nke a na-agaghị ekpughe,” ka Jisọs Kraịst kwuru, “ọ dịghịkwa ihe e zoro ezo, nke a na-agaghị ama.” (Matiu 10:26; Luk 12:2) Eze Solomọn maara ihe kwupụtara, sị: “Ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 12:14.

Ka ọ dịgodị, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji kwere ka ihu abụọ nke ndị ọzọ metụta anyị ruo n’ókè nke na anyị agaghịzi enweta ezi ịhụnanya nke ezi ndị enyi? Anyị pụrụ ịkpachara anya n’abụghị ndị na-enyo ihe enyo gabiga ókè. Ma biko, ka anyị mee ka ịhụnanya na okwukwe anyị bụrụ ndị ihu abụọ na-adịghị na ha.—Jemes 3:17; 1 Pita 1:22.

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ị̀ gaara ekwe ka ihu abụọ nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dọpụ gị n’ebe Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya nọ?