Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Sitia—Ndị Oge Ochie Dị Mgbagwoju Anya

Ndị Sitia—Ndị Oge Ochie Dị Mgbagwoju Anya

 Ndị Sitia—Ndị Oge Ochie Dị Mgbagwoju Anya

N’ỊGBA ịnyịnya, mba na-awagharị awagharị, bụ́ ndị bukọjuru akpa ihe nkwata juru na ha, si n’ala uzuzu bịa. Ndị a dị mgbagwoju anya chịrị n’ógbè ndị osisi na-adịghị na ha nke Europe na Esia site n’ihe dị ka 700 ruo 300 T.O.A. E mesịa, ha apụọ n’anya—ma nke ahụ bụ mgbe ha banyesịrị n’akụkọ ihe mere eme. A kpọtụrụ ha aha ọbụna na Bible. Ha bụ ndị Sitia.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị mwagharị na ìgwè ịnyịnya ọhịa awagharịwo n’ala ahịhịa ndụ jupụtara bụ́ nke gbasapụrụ site n’Ugwu Carpathian nke ebe ọwụwa anyanwụ Europe ruo n’ebe a maara ugbu a dị ka ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Russia. Ka ọ na-erule na narị afọ nke asatọ T.O.A., agha Eze Ukwu China bụ́ Hsüan busoro ha mere ka ha kwaga n’ebe ọdịda anyanwụ. N’ịga n’ebe ọdịda anyanwụ, ndị Sitia lụsoro ndị Cimmeria agha ma chụpụ ha, bụ́ ndị chịrị Caucasus na ógbè dị n’ebe ugwu nke Oké Osimiri Ojii.

N’ịchọ akụ̀ na ụba, ndị Sitia bibiri isi obodo Asiria bụ́ Nineve ma kwakọrọ ihe dị na ya. E mesịa, ha sooro Asiria jikọọ aka megide Midia, Babilọn, na mba ndị ọzọ. Ha mere mwakpo ọbụna ruo n’ebe ugwu Ijipt. Eziokwu ahụ bụ́ na e mesịrị kpọọ obodo Beth-shan nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Israel, Scythopolis, pụrụ igosi na e nwere oge ndị Sitia biri n’ebe ahụ.—1 Samuel 31:11, 12.

E mesịa, ndị Sitia biri n’ógbè ndị osisi na-adịghị na ha ndị dị na Romania, Moldova, Ukraine, na n’ebe ndịda Russia nke oge a. N’ebe ahụ, ha bara ọgaranya site n’ịgba mgbere ahịa n’agbata ndị Gris na ndị na-akọpụta ọka n’ebe bụ́ Ukraine na Russia n’oge a. Ndị Sitia ji ọka, mmanụ aṅụ, ajị anụ, na ehi zụrụ mmanya, ákwà, ngwá agha, na ọrụ nkà ndị Gris. Ha  si otú a kpakọba akụ̀ na ụba hiri nne.

Ndị Aka Ochie n’Ịgba Ịnyịnya

Ịnyịnya bụụrụ ndị dike a bi n’ógbè ndị osisi na-adịghị na ha ihe camel bụụrụ ndị bi n’ọzara. Ndị Sitia bụ aka ochie n’ịgba ịnyịnya, ha sokwa ná ndị mbụ ji ihe a na-edebe n’elu ịnyịnya iji nọrọ ọdụ na nke a na-agbado ụkwụ na ya mee ihe. Ha na-eri anụ ịnyịnya ma na-aṅụ mmiri ara nne ịnyịnya. N’ezie, ha ji ịnyịnya chụọ àjà nsure ọkụ. Mgbe onye dike Sitia nwụrụ, a na-egbu ịnyịnya ya ma lie ya n’ụzọ dị ùgwù—na-etinyejuru ya ihe ịchọ mma dị iche iche.

Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus si kọwaa, ndị Sitia nwere omenala ndị jọgburu onwe ha, bụ́ ndị gụnyere iji okpokoro isi nke ndị ha gburu eme iko e ji aṅụ ihe ọṅụṅụ. Mgbe ha wakporo ndị iro ha, ha na-eji mma agha ígwè, anyụike e ji alụ agha, na ube ebibi ha, na-ejikwa akụ́ ndị nwere ọnụ ígwè bụ́ ndị na-adọkasị anụ ahụ.

Ili Ndị A Chọrọ Mma Maka Mgbe Ebighị Ebi

Ndị Sitia tara amoosu, gbaa afa ma fee ọkụ na chi nne ofufe. (Deuterọnọmi 18:10-12) Ha weere ili dị ka ebe obibi nke ndị nwụrụ anwụ. A na-achụ ndị ohu na ụmụ anụmanụ n’àjà ka ndị nwe ha nwụrụ anwụ jiri ha mee ihe. E kweere na akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa na ndị ohu na-eso ndị isi abanye ‘n’ụwa ọzọ.’ N’ili otu eze, a hụrụ ozu ndị ikom ise bụ́ ndị ohu ka ha tọgbọ ma chee ụkwụ n’ebe nna ha ukwu nọ, dị njikere ibili ma malite ọrụ ha.

A na-eji onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa eli ndị ọchịchị, n’oge iru újú kwa, ndị Sitia na-awụsị ọbara ha n’ala ma na-akpụpụ ntutu isi ha. Herodotus dere, sị: “Ha na-ebepụ akụkụ ụfọdụ nke ntị ha, kpụọ isi ha, bepụ onwe ha ọnyá gburugburu ogwe aka ha, bekasịa egedege ihu ha na imi ha, ma jiri akụ́ mapuo aka ekpe ha.” N’ụzọ dị iche, Iwu Chineke nye ụmụ Israel bụ́ ndị bikwara ndụ n’otu oge ahụ, sịrị: “Unu egbula egbugbu n’anụ ahụ unu n’ihi mkpụrụ obi [nwụrụ anwụ, NW].”—Levitikọs 19:28.

Ndị Sitia hapụrụ ọtụtụ puku kurgan (ili). Ọtụtụ ihe ịchọ mma ndị a hụrụ n’ime kurgan ndị ahụ na-egosi ụdị ndụ ndị Sitia biri kwa ụbọchị. Eze Ukwu Russia bụ́ Peter Onye Ukwu malitere iwekọta ihe ndị ahụ na 1715, a pụkwara ịhụ ihe ndị a na-egbuke egbuke ugbu a n’ebe ndebe ihe mgbe ochie ndị dị na Russia na Ukraine. ‘Ụmụ anụmanụ a a kpụrụ akpụ’ gụnyere ịnyịnya, ugo, agụ nkwọ, nwamba, agụ owuru, ele, mgbada, nnụnụ nwere ọdịdị ọdụm, na ọdụm nwere ọdịdị nnụnụ (ihe okike ndị dị n’akụkọ ifo bụ́ ndị nwere nku nke otu nnụnụ ma ọ bụ ghara inwe, nweekwa isi anụmanụ ọzọ).

Ndị Sitia na Bible

Ọ bụ nanị n’otu ebe ka Bible kpọtụrụ ndị Sitia aha kpọmkwem. Ná Ndị Kọlọsi 3:11, anyị na-agụ, sị: “Ebe onye Grik na onye Juu, obibi úgwù na ebighị úgwù, onye na-asụ asụsụ ọzọ, onye Sitia, ohu, onye nweere onwe ya, na-apụghị ịdị: ma Kraịst bụ ihe nile, dịkwa n’ime mmadụ nile.” Mgbe onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere okwu ndị ahụ, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “Sitia” pụtara, ọ bụghị otu mba, kama ndị kasị bụrụ ndị ime ọhịa. Pọl na-emesi ya ike na site ná mkpali nke mmụọ nsọ Jehova, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, ọbụna ndị dị otú ahụ pụrụ iyikwasị àgwà nsọpụrụ Chineke.—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ihe ochie kweere na aha ahụ bụ́ Ashkenaz nke dị na Jeremaịa 51:27 na okwu Asiria bụ́ Ashguzai, bụ́ nke e ji mee ihe maka ndị Sitia, bụ otu ihe. Ihe e dere na nkume cuneiform dị iche iche kwuru banyere njikọ aka nke ndị a na ndị Mannai ná nnupụisi megide ndị Asiria na narị afọ nke asaa T.O.A. Kpọmkwem tupu Jeremaịa amalite ibu amụma, ndị Sitia si n’ala Juda gafee mgbe ha na-aga Ijipt na mgbe ha na-alọta alọta n’emerụghị onye ọ bụla ahụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nụrụ mgbe Jeremaịa buru amụma banyere mwakpo a ga-awakpo Juda site n’ebe ugwu, pụrụ ịrụ izi ezi nke amụma ya ụka.—Jeremaịa 1:13-15.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-eche na e zoro aka n’ebe ndị Sitia nọ na Jeremaịa 50:42, bụ́ nke na-agụ, sị: “Ụta na ube ka ha na-ejide; mba dị irè ka ha bụ, ha adịghị enwe obi ebere; olu ha na-ebigbọ dị ka oké osimiri, ọ bụkwa ịnyịnya ka ha na-anọkwasị; e doro mba ahụ n’usoro, dị ka onye na-ebu agha, imegide gị, ada Babilọn.” Ma amaokwu a na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’ebe ndị Midia na Peasia nọ, bụ́ ndị meriri Babilọn na 539 T.O.A.

A tụwo aro na “ala Megọg” nke e zoro aka na ya n’Ezikiel isi 38 na 39 na-ezo aka n’ebe agbụrụ ndị Sitia nọ. Otú ọ dị, “ala Megọg” nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ. Ihe àmà na-egosi na ọ na-ezo aka n’ebe ógbè elu ala nọ, bụ́ ebe a chụdara Setan na ndị mmụọ ozi ya mgbe agha ahụ a lụrụ n’eluigwe bisịrị.—Mkpughe 12:7-17.

Ndị Sitia tinyere aka ná mmezu nke amụma Nehum bụ́ nke na-ekwu banyere nkwatu Nineve. (Nehum 1:1, 14) Ndị Kaldea, ndị Sitia, na ndị Midia, bibiri Nineve na 632 T.O.A., na-akpata ọdịda nke Alaeze Ukwu Asiria.

Ọdịda Dị Mgbagwoju Anya

Ndị Sitia apụwo n’anya, ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? “Nke bụ́ eziokwu bụ, anyị amaghị nnọọ ihe merenụ,” ka ọkà mmụta ihe ochie a ma ama bụ́ onye Ukraine na-ekwu. Ụfọdụ ndị kweere na, n’ịbụ ndị mmasị ha nwere n’akụ̀ na ụba mere ka ha gharakwa ịdị ike, ìgwè ọhụrụ na-awagharị awagharị si Esia—ndị Sarmatia—meriri ha na narị afọ mbụ na nke abụọ T.O.A.

Ndị ọzọ na-eche na ọ bụ esemokwu dị n’etiti ebo ndị Sitia mere ha ji gwụsịa. Ma, ndị ọzọ na-ekwu na a pụrụ ịchọta ihe fọdụrụnụ ná ndị Sitia n’etiti ndị Ossetia nke Caucasus. Otú o sina dị, a kọrọ banyere ndị oge ochie a dị mgbagwoju anya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—akụkọ nke mere ka aha ahụ bụ́ Sitia na mmekpọ ọnụ pụta otu ihe.

[Map dị na peeji 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

□ Obodo Oge Ochie

• Obodo nke Oge A

Danube

SITIA ỤZỌ E SI AGA MBA ỌZỌ

• Kiev

Dnieper

Dniester

Oké Osimiri Ojii

OSSETIA

Ugwu Caucasus

Oké Osimiri Caspian

ASIRIA ỤZỌ NDỊ E SI GAA MEE MWAKPO

□ Nineve

Taịgris

MIDIA ỤZỌ NDỊ E SI GAA MEE MWAKPO

MESỌPỌTEMIA

BABYLONIA ỤZỌ NDỊ E SI GAA MEE MWAKPO

□ Babilọn

Yufretis

ALAEZE UKWU PEASIA

□ Susa

Ọwara Oké Osimiri Peasia

PALESTINE

• Bet-shan (Scythopolis)

IJIPT ỤZỌ NDỊ E SI GAA MEE MWAKPO

Naịl

Oké Osimiri Mediterranean

GRIS

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ndị Sitia bụ ndị na-alụ agha

[Ebe E Si Nweta Foto]

The State Hermitage Museum, St. Petersburg

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ndị Sitia ji ngwá ahịa ha zụrụ ọrụ nkà nke ndị Gris ma baa ezigbo ọgaranya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Ukraine Historic Treasures Museum, Kiev