Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-eme Ka Anyị Mara Ịgụta Ụbọchị Anyị

Jehova Na-eme Ka Anyị Mara Ịgụta Ụbọchị Anyị

 Jehova Na-eme Ka Anyị Mara Ịgụta Ụbọchị Anyị

“Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.”—ABỤ ỌMA 90:12.

1. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị mara “ịgụta ụbọchị anyị”?

JEHOVA CHINEKE bụ Onye Okike anyị na Onye Na-enye Ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11) N’ihi ya, ọ dịghị onye ọzọ pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ka mma ime ka anyị mara ụzọ anyị ga-esi jiri afọ ndụ anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe. Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọbụ abụ ahụ rịọrọ Chineke, sị: “Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” (Abụ Ọma 90:12) N’ezie, o kwesịrị ka anyị jiri nlezianya tụlee Abụ Ọma nke 90, bụ́ ebe anyị na-achọta arịrịọ ahụ. Otú ọ dị, ka anyị buru ụzọ chịkọta abụ a sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ụzọ dị mkpirikpi.

2. (a) Ònye ka a kpọrọ aha dị ka onye dere Abụ Ọma nke 90, oleekwa mgbe ọ pụrụ ịbụ na e dere ya? (b) Abụ Ọma nke 90 kwesịrị isi aṅaa emetụta otú anyị si ele ndụ anya?

2 Ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 90 kpọrọ ya “ekpere Mosis, bụ́ onye nke Chineke.” Ebe ọ bụ na abụ ọma a na-emesi ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ ike, eleghị anya e dere ya mgbe a gbapụtasịrị ụmụ Israel n’agbụ Ijipt nakwa n’oge ha mere njem ahụ were afọ 40 n’ọzara, bụ́ mgbe ọnwụ nke ọtụtụ puku mmadụ mere ka ọgbọ na-enweghị okwukwe gwụsịa. (Ọnụ Ọgụgụ 32:9-13) Mgbe ọ sọrọ ya bụrụ, Abụ Ọma nke 90 na-egosi na ndụ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè dị mkpụmkpụ. N’ihi ya, o doro anya na anyị kwesịrị iji ụbọchị anyị dị oké ọnụ ahịa na-eme ihe n’ụzọ amamihe.

3. Olee isi ihe ndị dị n’Abụ Ọma nke 90?

3 Abụ Ọma nke 90, amaokwu nke 1 ruo 6 na-akọwa Jehova dị ka ebe obibi anyị na-adịru mgbe ebighị ebi. Amaokwu nke 7 ruo 12 na-egosi ihe dị anyị mkpa iji jiri afọ ndụ anyị dị mkpụmkpụ na-eme ihe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Dị ka e gosipụtakwara n’amaokwu nke 13 ruo 17, anyị chọsiri ike ịbụ ndị ga-enweta ebere na ngọzi Jehova. N’ezie, abụ ọma a adịghị  ebu amụma banyere ahụmahụ anyị nwere n’otu n’otu dị ka ndị ohu Jehova. Otú o sina dị, anyị kwesịrị iburu echiche e ji ekpere gosipụta na ya n’obi. Ya mere, ka anyị si n’aka ndị raara onwe ha nye Chineke lebakwuo anya n’Abụ Ọma nke 90.

Jehova—“Ebe Obibi” Anyị

4-6. Olee otú Jehova si bụrụ “ebe obibi” nye anyị?

4 Ọbụ abụ ahụ ji okwu ndị a meghee: “Onyenwe anyị, ebe obibi ka Gị onwe gị bụwooro anyị n’ọgbọ nile. Tupu a mụpụta ugwu, ma ọ bụ tupu Ị kpụọ ụwa na elu ụwa dum mmadụ bi [dị ka ime na-eme nwanyị dị ime, NW], ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke.”Abụ Ọma 90:1, 2.

5 “Chineke ebighị ebi,” bụ́ Jehova, bụụrụ anyị “ebe obibi”—ebe mgbaba ime mmụọ. (Ndị Rom 16:26) Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nọ ná nchebe, n’ihi na ọ nọ ya mgbe nile inyere anyị aka dị ka “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ebe anyị na-atụkwasị Nna anyị nke eluigwe nchegbu anyị site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, ‘udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, na-eche obi anyị na echiche uche anyị nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7; Matiu 6:9; Jọn 14:6, 14.

6 Anyị na-enweta nchebe ime mmụọ n’ihi na, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, Jehova bụụrụ anyị “ebe obibi.” Ọ na-enyekwa anyị ‘ime ụlọ’—ikekwe ndị e jikọrọ ha na ọgbakọ dị iche iche nke ndị ya n’ụzọ chiri anya—dị ka ebe nchebe ime mmụọ, bụ́ ebe ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na-ekere òkè dị ukwuu n’ime ka anyị na-enwe echiche nke ịnọ ná nchebe. (Aịsaịa 26:20; 32:1, 2; Ọrụ 20:28, 29) Ọzọkwa, ụfọdụ n’ime anyị si n’ezinụlọ jewooro Chineke ozi ruo ogologo oge ma chọpụta n’onwe anyị na ọ bụ ‘ebe obibi n’ọgbọ nile.’

7. N’echiche dị aṅaa ka ‘a mụrụ’ ugwu ma kpụọ ụwa dị ka “ime na-eme nwanyị dị ime”?

7 Jehova dịwara tupu ‘a mụọ’ ugwu ma ọ bụ tupu a kpụọ ụwa dị ka “ime na-eme nwanyị dị ime.” E lee ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, ikepụta ụwa a, tinyere ihe nile mejupụtara ya, ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ya, na ihe ndị dị mgbagwoju anya na ya chọrọ mgbalị dị nnọọ ukwuu. Sitekwa n’ịsị na ‘a mụrụ’ ugwu nakwa na a kpụrụ ụwa dị ka “ime na-eme nwanyị dị ime,” ọbụ abụ ahụ na-egosipụta nkwanye ùgwù dị ukwuu maka ókè ọrụ Jehova rụrụ mgbe o kere ihe ndị a haruru. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe nkwanye ùgwù na ekele yiri nke ahụ maka aka ọrụ Onye Okike?

Jehova Nọ Ya Mgbe Nile Inyere Anyị Aka

8. Gịnị ka okwu bụ́ na Jehova bụ Chineke “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi” pụtara?

8 “Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. N’akụkụ ihe odide mbụ, okwu a sụgharịrị ịbụ “mgbe ebighị ebi” pụrụ izo aka n’ihe ndị nwere ọgwụgwụ ma e kwubeghị kpọmkwem mgbe ha ga-agwụ. (Ọpụpụ 31:16, 17; Ndị Hibru 9:15) Otú ọ dị, n’Abụ Ọma 90:2 nakwa n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, “mgbe ebighị ebi” pụtara “oge na-enweghị ọgwụgwụ.” (Eklisiastis 1:4) Anyị apụghị ịghọta otú o si kwe omume na Chineke anọwo na-adị adị mgbe nile. Ma, Jehova enweghị mmalite, ọ gaghịkwa enwe ọgwụgwụ. (Habakuk 1:12) Ọ ga-anọgide na-adị ndụ ma na-adị njikere inyere anyị aka.

9. Gịnị ka ọbụ abụ ahụ ji tụnyere otu puku afọ nke ịdị adị mmadụ?

9 E nyere ọbụ abụ ahụ ike mmụọ nsọ iji otu puku afọ nke ịdị adị mmadụ tụnyere oge dị nnọọ mkpirikpi n’anya Onye Okike na-adịru mgbe ebighị ebi. N’ịgwa Chineke okwu, o dere, sị: “Ị na-eme ka mmadụ laghachi [n’ihe e gwepịara egwepịa, NW]; I wee sị, Laghachinụ, ụmụ mmadụ. N’ihi na [otu puku afọ] n’anya Gị dị ka ụnyaahụ mgbe ọ na-aga, na dị ka otu nche n’abalị.”Abụ Ọma 90:3, 4.

10. Olee otú Chineke si eme ka mmadụ “laghachi n’ihe e gwepịara egwepịa”?

10 Mmadụ na-anwụ anwụ, Chineke na-emekwa ka ọ “laghachi n’ihe e gwepịara egwepịa.” Ya bụ, mmadụ na-alaghachi ‘n’ájá,’ dị ka ala e gwepịara egwepịa. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jehova na-asị: ‘Laghachi n’ájá nke ala bụ́ nke e si na ya kpụọ gị.’ (Jenesis 2:7; 3:19) Nke a metụtara  mmadụ nile—ndị dị ike na ndị na-adịghị ike, ndị ọgaranya na ndị ogbenye—n’ihi na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè nke ‘pụrụ ịgbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ pụghịkwa inye Chineke ihe mgbapụta ya: ka o wee dịgide ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 49:6-9) Ma lee ka anyị si na-enwe ekele na ‘Chineke nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi’!—Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na oge dị ogologo n’anya anyị dị nnọọ mkpirikpi n’anya Chineke?

11 A bịa n’otú Jehova si ele ihe anya, ọbụna Metusela gbara afọ 969 adịrughị ndụ otu ụbọchị. (Jenesis 5:27) N’anya Chineke, otu puku afọ dị nnọọ ka ụnyaahụ—nanị awa 24—mgbe ọ na-aga. Ọbụ abụ ahụ kwukwara na n’anya Chineke, otu puku afọ dị ka awa anọ onye nche ji chee nche abalị n’ọmụma ụlọikwuu. (Ndị Ikpe 7:19) Mgbe ahụ, o doro anya na oge dị ogologo n’anya anyị dị nnọọ mkpirikpi n’anya Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova.

12. Olee otú Chineke si ‘awụchapụ’ ụmụ mmadụ?

12 Ndụ ụmụ mmadụ na-adị n’oge a dị mkpirikpi n’ezie ma e were ya tụnyere mgbe ebighị ebi Chineke na-adịru. Ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Ị wụchapụwo ha dị ka oké mmiri ozuzo; nanị ụra ka ha bụ: n’ụtụtụ ha dị ka ahịhịa na-eto eto. N’ụtụtụ ọ na-agbawa ụzarị, na-etokwa eto; n’anyasị ka a na-ebipụ ya, o wee kpọnwụọ.” (Abụ Ọma 90:5, 6) Mosis hụrụ ka ọtụtụ puku ụmụ Israel nwụrụ n’ọzara, Chineke ‘wụchapụrụ’ ha dị ka n’idei mmiri. A sụgharịwo akụkụ a nke abụ ọma ịbụ: “Ị na-ekpochapụ ụmụ mmadụ n’ụra ọnwụ.” (New International Version) N’aka nke ọzọ, oge ndụ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ “nanị ụra” na-adịru nwa oge—nke a ga-eji tụnyere nanị otu nhi ụra n’abalị.

13. Olee otú anyị si “dị ka ahịhịa,” oleekwa otú nke a kwesịrị isi emetụta echiche anyị?

13 Anyị ‘dị ka ahịhịa na-agbawa ụzarị n’ụtụtụ’ ma kpọnwụọ ka ọ na-erule n’anyasị mgbe oké okpomọkụ nke anyanwụ chakwasịrị ya. Ee, ndụ anyị dị mkpụmkpụ dị ka ahịhịa nke na-akpọnwụ n’otu ụbọchị. N’ihi ya, ka anyị ghara ịla ihe a dị oké ọnụ ahịa n’iyi. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịchọ enyemaka Chineke n’ịma otú anyị kwesịrị isi jiri oge fọdụụrụ anyị n’usoro ihe a na-eme ihe.

Jehova Na-enyere Anyị Aka “Ịgụta Ụbọchị Anyị”

14, 15. Olee otú Abụ Ọma 90:7-9 si mezuo n’ahụ ụmụ Israel?

14 Banyere Chineke, ọbụ abụ ahụ na-agbakwụnye, sị: “E mewo ka anyị gwụsịa n’iwe Gị, ọ bụkwa n’ọnụma Gị ka e meworo ka anyị maa jijiji. I dowo ajọ omume nile anyị n’ihu Gị, I dowo mmehie anyị zoro ezo n’ìhè nke ihu Gị. N’ihi na ụbọchị anyị nile agawo n’ime nrubiga ókè nke iwe Gị: anyị emewo ka afọ nile anyị gwụsịa dị ka otu nze ume.”Abụ Ọma 90:7-9.

15 Ụmụ Israel na-enweghị okwukwe ‘gwụsịrị n’iwe Chineke.’ ‘Ọnụma ya mere ka ha maa jijiji,’ ma ọ bụ ‘iwe ya yiri ha egwu.’ (New International Version) ‘A kwaturu ụfọdụ n’ọhịa’ n’ihi amamikpe Chineke. (1 Ndị Kọrint 10:5) Jehova ‘doro ajọ omume ha nile n’ihu ya.’ Ọ gbara ha ajụjụ maka ihe ọjọọ ha mere n’ihu ọha, ma ọbụna ‘mmehie ha zoro ezo,’ ma ọ bụ nke ha kpuchiri ekpuchi, dị ‘n’ìhè nke ihu ya.’ (Ilu 15:3) Dị ka ndị Chineke wesoro iwe, ụmụ Israel ahụ na-enweghị nchegharị ‘mere ka afọ ha gwụsịa dị ka otu nze ume.’ Ebe ọ dị otú ahụ, ndụ anyị dị  mkpụmkpu dị ka ume nke si n’egbugbere ọnụ anyị na-ekupụ dị ka nze ume nkịtị.

16. Ọ bụrụ na ụfọdụ na-eme mmehie na nzuzo, gịnị ka ha kwesịrị ime?

16 Ọ bụrụ na anyị emee mmehie na nzuzo, anyị pụrụ izonahụ ụmụ mmadụ ibe anyị omume ahụ ruo oge ụfọdụ. Ma mmehie anyị zoro ezo ga-anọ ‘n’ìhè nke ihu Jehova,’ omume anyị ga-emebikwa mmekọrịta anyị na ya. Iji soroghachi Jehova na-akpachi anya, ọ ga-adị anyị mkpa ikpe ekpere ka ọ gbaghara anyị, anyị ahapụ njehie anyị, ma jiri obi ekele nakwere enyemaka ime mmụọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. (Ilu 28:13; Jemes 5:14, 15) Lee ka nke ahụ ga-esi dị mma karịa, ma eleghị anya, ‘anyị ime ka afọ nile anyị gwụsịa dị ka otu nze ume,’ na-etinye olileanya nke ndụ ebighị ebi anyị n’ihe ize ndụ!

17. Afọ ole ka ndị mmadụ n’ozuzu na-adịrukarị ndụ, gịnịkwa jupụtara n’afọ ndụ anyị?

17 Banyere oge ndụ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.” (Abụ Ọma 90:10) Ọ bụ afọ 70 ka ụmụ mmadụ n’ozuzu na-adịrukarị ndụ, mgbe Keleb dịkwa afọ 85, o hotara ike ya pụrụ iche. E nwewo ndị afọ ndụ ha pụrụ iche, dị ka Erọn (123), Mosis (120), na Joshua (110). (Ọnụ Ọgụgụ 33:39; Deuterọnọmi 34:7; Joshua 14:6, 10, 11; 24:29) Ma n’ime ọgbọ ahụ na-enweghị okwukwe bụ́ ndị si n’Ijipt pụta, ndị a gụkọtara agụkọta site n’afọ 20 gbagoo nwụrụ n’ime afọ 40. (Ọnụ Ọgụgụ 14:29-34) Taa, n’ọtụtụ mba, oge ndụ nke ụmụ mmadụ n’ozuzu ha nọgidere na-abụ gburugburu ihe ahụ ọbụ abụ kwuru. Afọ ndụ anyị jupụtara ‘n’ịdọgbu onwe onye n’ọrụ na ajọ ihe.’ Ha na-agbapụ ọsọ ọsọ, “anyị [ewee] felaa dị ka nnụnụ.”—Job 14:1, 2.

18, 19. (a) Gịnị ka “ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa,” pụtara? (b) Anyị iji amamihe na-eme ihe ga-akpali anyị ime gịnị?

18 Ọzọkwa, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ònye maara ike nke iwe Gị, na nrubiga ókè nke iwe Gị dị ka egwu nke kwesịrị Gị sị dị? Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” (Abụ Ọma 90:11, 12) Ọ dịghị otu onye n’ime anyị mazuuru ike nke iwe Chineke ma ọ bụ otú nrubiga ókè nke iwe ya haruru, nke a kwesịkwara ime ka anyị na-atụkwu Jehova egwu nsọpụrụ. N’ezie, o kwesịrị ịkwali anyị ịrịọ ya ka o “mee ka anyị mara [otú anyị pụrụ isi gụta] ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.”

19 Okwu ọbụ abụ ahụ bụ ekpere o kpekuru Jehova ka ọ kụziere ndị ya otú ha ga-esi jiri amamihe na-eme ihe n’iji afọ ndụ ha fọdụrụnụ kpọrọ ihe na iji ya mee ihe n’ụzọ Chineke na-anakwere. Onye ga-adịru afọ 70 nwere olileanya ịdịru ihe dị ka ụbọchị 25,500. Otú ọ dị, n’agbanyeghị afọ ole anyị dị, ‘anyị bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi. N’ihi na anyị bụ alụlụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.’ (Jemes 4:13-15) Ebe ọ bụ na ‘mgbe na ihe ndapụta na-adabara anyị nile,’ anyị apụghị ikwu afọ ole anyị ka ga-adịkwu ndụ. Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere maka amamihe iji na-emeri ọnwụnwa, iji na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na iji na-eme ike anyị nile n’ozi Jehova ugbu a—taa! (Eklisiastis 9:11; Jemes 1:5-8) Jehova na-eduzi anyị site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya. (Matiu 24:45-47; 1 Ndị Kọrint 2:10; 2 Timoti 3:16, 17) Iji amamihe na-eme ihe na-akpali anyị ‘ibu ụzọ achọ Alaeze Chineke’ na iji ụbọchị anyị na-eme ihe n’ụzọ na-ewetara Jehova otuto ma na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Matiu 6:25-33; Ilu 27:11) N’ezie, iji obi anyị dum na-efe ya ofufe agaghị ewepụ nsogbu anyị nile, ma ọ na-eweta ọṅụ dị ukwuu n’ezie.

Ngọzi Jehova Na-ewetara Anyị Ọṅụ

20. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Chineke si ‘echegharị obi ya’? (b) Olee otú Jehova ga-esi emeso anyị ihe ma ọ bụrụ na anyị emehie n’ụzọ dị njọ ma gosipụta ezi nchegharị?

20 Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ ná ndụ anyị nile! N’akụkụ a, Mosis na-arịọ, sị: “Lọta, Jehova; ruo ole mgbe? Chegharịakwa obi Gị banyere ndị ohu Gị. Were ebere [ma ọ bụ, “ezi ịhụnanya”] Gị mee ka afọ ju anyị n’ụtụtụ; ka anyị wee tie mkpu ọṅụ, ṅụrịakwa, ụbọchị anyị nile.” (Abụ Ọma 90:13, 14; ihe odide ala ala peeji nke NW)  Chineke adịghị emehie ihe. Otú o sina dị, ọ ‘na-echegharị obi ya’ ma ‘na-echigharị’ site n’iwe ya na site n’inye ntaramahụhụ mgbe ịdọ aka ná ntị o nyere banyere ime ihe dị otú ahụ mere ka onye mmehie nwere nchegharị gbanwee àgwà na omume ya. (Deuterọnọmi 13:17) Ya mere, ọ bụrụgodị na anyị emehie n’ụzọ dị oké njọ ma gosipụta ezi nchegharị, Jehova ‘ga-ewere ebere ya mee ka afọ ju anyị,’ anyị ga-enwekwa ihe mere anyị ga-eji “tie mkpu ọṅụ.” (Abụ Ọma 32:1-5) Sitekwa n’ịgbaso ụzọ ezi omume, anyị ga-ahụ ezi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, anyị ga-enwekwa ike ‘ịṅụrị ọṅụ ụbọchị anyị nile’—ee, ruo afọ ndụ anyị fọdụrụnụ.

21. N’okwu ndị ahụ e dekọrọ n’Abụ Ọma 90:15, 16, gịnị ka ọ pụrụ ịbụwo na Mosis na-arịọ maka ya?

21 Ọbụ abụ ahụ kpesiri ekpere ike, sị: “Mee ka anyị ṅụrịa dị ka ụbọchị nile si dị I wedaworo anyị n’ala n’ime ha, na dị ka afọ si dị nke anyị hụworo ihe ọjọọ n’ime ha. Kwee ka ndị ohu Gị hụ ọrụ Gị, kweekwa ka a hụ ịma mma gị n’ahụ ụmụ ha.” (Abụ Ọma 90:15, 16) Ọ pụrụ ịbụwo na Mosis na-arịọ Chineke ka o jiri ọṅụ gọzie ụmụ Israel, bụ́ ọṅụ nke ya na oge ha nọrọ ná mweda n’ala na afọ ndị ha hụrụ ihe ọjọọ hà nhata, ma ọ bụ nke ga-adịte aka ka ya. Ọ rịọrọ ka ndị ohu Chineke hụ “ọrụ” Ya nke ịgọzi ụmụ Israel nakwa ka ịma mma Ya pụta ìhè n’ahụ ụmụ ha. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ikpe ekpere ka a wụkwasị ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13.

22. Dị ka Abụ Ọma 90:17 si kwuo, gịnị ka anyị pụrụ izi ezi ikpe ekpere maka ya?

22 Abụ Ọma nke 90 ji arịrịọ a mechie: “Ka ịdị ụtọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Chineke anyị, dịkwasị anyị: Gị meekwa ka ọrụ aka anyị guzosie  ike n’ahụ anyị; ee, ọrụ aka anyị, mee ka o guzosie ike.” (Abụ Ọma 90:17) Okwu ndị a na-egosi na, n’ụzọ ziri ezi, anyị pụrụ ịrịọ Chineke ka ọ gọzie mgbalị ndị anyị na-eme n’ozi ya. Dị ka ndị Kraịst e tere mmanụ ma ọ bụ ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, anyị na-aṅụrị ọṅụ na “ịdị ụtọ nke Onyenwe anyị” dịkwasịrị anyị. (Jọn 10:16) Lee obi ụtọ anyị na-enwe na Chineke ‘emewo ka ọrụ aka anyị guzosie ike’ dị ka ndị nkwusa Alaeze na n’ụzọ ndị ọzọ!

Ka Anyị Nọgide Na-agụta Ụbọchị Anyị

23, 24. Ànyị pụrụ isi aṅaa rite uru site n’ịtụgharị uche n’Abụ Ọma nke 90?

23 Ịtụgharị uche n’Abụ Ọma nke 90 kwesịrị ime ka anyị daberekwuo n’ebe Jehova, bụ́ “ebe obibi” anyị, nọ. Site n’ịtụgharị uche n’ihe ndị o kwuru banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, anyị kwesịrị ịmatakwu nke ọma mkpa nduzi Chineke dị n’ịgụta ụbọchị anyị. Ọ bụrụkwa na anyị anọgidesie ike n’ịchọ na n’iji amamihe Chineke na-eme ihe, anyị ga-ejide n’aka na anyị ga-enweta ebere na ngọzi Jehova.

24 Jehova ga-anọgide na-eme ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị. Ọ bụrụkwa na anyị agbasoo ntụziaka ya, anyị ga-enwe ike ịnọgide na-agụta ụbọchị anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. (Jọn 17:3) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ga-eburu mgbe ebighị ebi n’uche, Jehova aghaghị ịbụ ebe mgbaba anyị. (Jud 20, 21) Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, e mere ka isi ihe a pụta nnọọ ìhè n’ihe ndị na-emesi obi ike e kwuru n’Abụ Ọma nke 91.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Jehova si bụrụ “ebe obibi” nye anyị?

• Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na Jehova dị njikere mgbe nile inyere anyị aka?

• Olee otú Jehova si enyere anyị aka “ịgụta ụbọchị anyị”?

• Gịnị na-eme ka anyị nwee ike ‘ịṅụrị ọṅụ n’ụbọchị anyị nile’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Jehova bụ Chineke “tupu a mụpụta ugwu”

[Foto dị na peeji nke 12]

A bịa n’otú Jehova si ele ihe anya, Metusela gbara afọ 969 adịrughị ndụ otu ụbọchị

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Jehova ‘emewo ka ọrụ aka anyị guzosie ike’